Ihe Nketa Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?
Ihe Nketa Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?
“Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.”—MATIU 25:34.
1. Ihe ndị dị aṅaa ka ndị mmadụ nwetaworo dị ka ihe nketa?
MMADỤ nile nwere ihe ndị ha ketara eketa. Nye ụfọdụ ndị, ihe nketa ha pụrụ ịgụnye ihe onwunwe nke na-eme ka ha bie ndụ dị ụtọ. Nye ndị ọzọ, ọ bụ ndụ ogbenye. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọgbọ ndị bu ụzọ, n’ihi ahụmahụ ha nweworo ma ọ bụ ihe ha nụworo, na-ahapụrụ ụmụ ha ihe nketa nke inwe oké ịkpọasị n’ebe agbụrụ ọzọ dị. Otú ọ dị, anyị nile nwekọrọ otu ihe ọnụ. Anyị nile ketara mmehie site n’aka nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam. Ihe nketa ahụ na-eduga n’ọnwụ n’ikpeazụ.—Eklisiastis 9:2, 10; Ndị Rom 5:12.
2, 3. Ihe nketa dị aṅaa ka Jehova mere ka o kwe ụmụ Adam na Iv omume inweta ná mmalite, gịnịkwa mere ha enwetaghị ya?
2 Ná mmalite, Jehova, dị ka Nna nke eluigwe na-ahụ n’anya, nyere ihe a kpọrọ mmadụ ihe nketa dị nnọọ iche—ndụ ebighị ebi n’izu okè n’ime Paradaịs. E kere nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, ná mmalite n’ụzọ zuru okè, n’enweghị mmehie. Jehova Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ mbara ala bụ́ Ụwa dị ka onyinye. (Abụ Ọma 115:16) O nyere ha ubi Iden ịbụ ihe atụ nke ihe ụwa dum pụrụ ịghọ, nyekwa nne na nna anyị mbụ ọrụ dị ebube ma na-akpali akpali. Ha gaje ịmụ ụmụ, ilekọta ụwa nakwa ihe ọkụkụ na anụmanụ ndị dị na ya, na ime ka ụwa nile bụrụ Paradaịs. (Jenesis 1:28; 2:8, 9, 15) Ụmụ ha ga-ekere òkè na nke a. Lee ihe nketa dị ebube ha pụrụ inye ha!
3 Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha gaje ịnụ ụtọ ihe a nile, Adam na Iv na ụmụ ha aghaghị iso Chineke na-enwe ezi mmekọrịta. Ha ji Jehova ụgwọ ịhụnanya na nrubeisi, ma Adam na Iv enweghị ekele maka ihe Chineke nyeworo ha, ha nupụkwara isi n’iwu ya. Ebe obibi ha bụ́ Paradaịs na atụmanya ndị dị ebube nke Chineke debere n’ihu ha funahụkwara ha. N’ihi ya, ha apụghị inyefe ụmụ ha ihe ndị a.—Jenesis 2:16, 17; 3:1-24.
4. Ànyị pụrụ isi aṅaa nweta ihe nketa ahụ Adam tụfuru?
4 Jehova ji obi ebere mee ndokwa ka ụmụ Adam na Iv nwee ike inwe ohere nke inweta ihe nketa ahụ Adam tụfuru. N’ụzọ dị aṅaa? N’oge Chineke kara aka, Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, tọgbọrọ ndụ mmadụ ya zuru okè n’ihi ụmụ Adam. Kraịst si otú a zụrụ ha nile. Otú ọ dị, ihe nketa ahụ adịghị aghọ nke ha ma ha arụghị ọrụ. Ọ dị ha mkpa iso Chineke dịrị ná mma, bụ́ nke ha pụrụ ime site n’igosipụta okwukwe n’uru mkpuchi mmehie nke àjà Jisọs bara nakwa site n’iji nrubeisi gosipụta okwukwe ahụ. (Jọn 3:16, 36; 1 Timoti 2:5, 6; Ndị Hibru 2:9; 5:9) Ụzọ ndụ gị ọ̀ na-egosi na i nwere ekele maka ndokwa ahụ?
Ihe Nketa nke Si n’Aka Abraham
5. Olee otú Abraham si gosipụta ekele maka mmekọrịta ya na Jehova?
5 Ka Jehova na-emezu nzube ya maka ụwa, o mesoro Abraham ihe n’ụzọ pụrụ iche. O nyere nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi Jenesis 12:1, 2, 7) Olee otú Abraham si meghachi omume? Ọ dị njikere ijere Jehova ozi n’ebe ọ bụla nakwa n’ụzọ ọ bụla Chineke si tụziere ya ka ụmụ ya wee nwee ike inweta ihe nketa ha. Abraham jeere Jehova ozi n’ala na-abụghị nke ya ruo 100 afọ, ruo mgbe ọ nwụrụ. (Jenesis 12:4; 25:8-10) Ị̀ gaara emewo nke ahụ? Jehova kwuru na Abraham bụ “enyi” ya.—Aịsaịa 41:8.
ntụziaka ịhapụ mba ya ma gaa n’ala nke Chineke n’onwe ya ga-egosi ya. Abraham ji obi ya nile rube isi. Mgbe Abraham rutesịrị ebe ahụ, Jehova kwuru na ụmụ Abraham, ọ bụghị Abraham n’onwe ya, ga-enweta ala ahụ dị ka ihe nketa. (6. (a) Gịnị ka Abraham gosipụtara site ná njikere ọ dị ịchụ nwa ya nwoke n’àjà? (b) Ihe nketa dị aṅaa dị oké ọnụ ahịa ka Abraham pụrụ ịhapụrụ ụmụ ya?
6 Abraham cheere ruo ọtụtụ afọ maka nwa nwoke, bụ́ Aịsak, bụ́ onye ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. Ihe àmà na-egosi na mgbe nwa ahụ toruru okorobịa, Jehova nyere Abraham ntụziaka iwere nwa okoro ahụ chụọrọ ya àjà. Abraham amaghị na ọ na-aga igosipụta ihe Chineke n’onwe ya ga-eme n’inye Ọkpara ya dị ka ihe mgbapụta; ma, o rubere isi ma gawa ịchụ Aịsak n’àjà tupu mmụọ ozi Jehova akwụsị ya. (Jenesis 22:9-14) Jehova adịlarị mbụ kwuo na ọ bụ site n’Aịsak ka nkwa ndị o kwere Abraham ga-emezu. N’ihi ya, Abraham nwere nnọọ okwukwe na, ọ bụrụ na ọ dị mkpa, Chineke pụrụ ịkpọlite Aịsak n’ọnwụ, ọ bụ ezie na e metụbeghị ihe dị otú ahụ mbụ. (Jenesis 17:15-18; Ndị Hibru 11:17-19) Ebe ọ bụ na Abraham ejichighị ọbụna nwa ya nwoke, Jehova kwupụtara, sị: “Ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jenesis 22:15-18) Nke a gosiri na Mkpụrụ ahụ a kpọtụrụ aha na Jenesis 3:15, bụ́ onye mgbapụta bụ́ Mesaịa, ga-esi n’eriri Abraham bịa. Lee ihe nketa dị oké ọnụ ahịa ọ ga-ahapụrụ ụmụ ya!
7. Olee otú Abraham, Aịsak, na Jekọb si gosi ekele maka ihe nketa ha?
7 Abraham amaghị ihe ihe Jehova na-eme n’oge ahụ pụtara; nwa ya nwoke bụ́ Aịsak ma ọ bụ nwa nwa ya bụ́ Jekọb, bụ́ “ndị sooro ya na-eketakọ otu nkwa ahụ,” amaghịkwa. Ma ha nile nwere obi ike n’ebe Jehova nọ. Ha ekekọtaghị onwe ha n’ebe alaeze nke mba ndị dị n’ala ahụ dị n’ihi na ha na-atụ anya ihe ka mma—“obodo ahụ nke nwere ntọala ahụ, nke Chineke bụ onye ọkà ya na onye rụrụ ya.” (Ndị Hibru 11:8-10, 13-16) Ma, ọ bụghị ụmụ Abraham nile ghọtara ịdị oké ọnụ ahịa nke ihe nketa ahụ Abraham hapụụrụ ha.
Ụfọdụ Bụ́ Ndị Ledara Ihe Nketa ahụ Anya
8. Olee otú Isọ si gosi na ọ ghọtaghị ịdị oké ọnụ ahịa nke ihe nketa ya?
8 Isọ, bụ́ ọkpara Aịsak, ejighị ọnọdụ ya dị ka diọkpara kpọrọ ihe. O nweghị ekele maka ihe ndị dị nsọ. Ya mere otu ụbọchị mgbe Jenesis 25:29-34; Ndị Hibru 12:14-17) Mba a ga-esi na ya mezuo nkwa Chineke kwere Abraham si n’eriri Jekọb, bụ́ onye Chineke gbanwere aha ya ịbụ Israel. Ohere ndị dị aṅaa ka ihe nketa ahụ kpọmkwem megheere ha?
agụụ na-agụ Isọ, o resịrị nwanne ya nwoke, bụ́ Jekọb, ọnọdụ ọkpara ya. Maka gịnị? Ọ bụ iji nweta achịcha na ofe lentil! (9. N’ihi ihe nketa ime mmụọ ha, mgbapụta dị aṅaa ka ụmụ Jekọb, ma ọ bụ Israel, nwetara?
9 N’oge e nwere ụnwụ nri, Jekọb na ezinụlọ ya kwagara Ijipt. N’ebe ahụ, ha mụbara ma dị nnọọ ọtụtụ, ma ha ghọkwara ndị ohu. Otú ọ dị, Jehova echefughị ọgbụgba ndụ ya na Abraham. Mgbe oge Chineke kara aka ruru, ọ gbapụtara ụmụ Israel pụọ n’agbụ ma gwa ha na ya gaje iduru ha banye ‘n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,’ bụ́ ala ahụ o kweworo Abraham ná nkwa.— Ọpụpụ 3:7, 8; Jenesis 15:18-21.
10. N’Ugwu Saịnaị, olee ihe ndị ọzọ pụrụ iche mere n’ihe banyere ihe nketa nke ụmụ Israel?
10 Mgbe ụmụ Israel na-aga n’Ala Nkwa ahụ, Jehova kpọkọtara ha n’Ugwu Saịnaị. N’ebe ahụ, ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karịa ndị nile: n’ihi na ọ bụ Mụ nwe ụwa nile: unu onwe unu ga-abụkwara m alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ.” (Ọpụpụ 19:5, 6) Mgbe ndị ahụ jisịrị ọchịchọ obi na otu olu kwekọrịta ime nke a, Jehova nyere ha Iwu ya—ihe ọ na-emetụbeghịrị ndị ọ bụla ọzọ.—Abụ Ọma 147:19, 20.
11. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị dị oké ọnụ ahịa a gụnyere n’ihe nketa ime mmụọ nke ụmụ Israel?
11 Lee ihe nketa ime mmụọ mba ọhụrụ ahụ nwere! Ha fere onye nanị ya bụ ezi Chineke ofufe. O siwo n’Ijipt gbapụta ha, ha jikwa anya ha hụ ihe omume ndị na-atụ egwu bụ́ ndị mere mgbe e nyere ha Iwu ahụ n’Ugwu Saịnaị. E mekwuru ka ihe nketa ha kakwuo mma mgbe ndị amụma gwara ha “okwu si n’ọnụ Chineke pụta.” (Ndị Rom 3:1, 2) Jehova họpụtara ha ịbụ ndị àmà ya. (Aịsaịa 43:10-12) Mkpụrụ ahụ bụ́ Mesaịa gaje ịpụta ná mba ha. Iwu ahụ na-arụtụ aka n’ebe ọ nọ, ọ ga-eme ka ha mata ya, o kwesịkwara inyere ha aka ịghọta mkpa ọ dị ha. (Ndị Galetia 3:19, 24) Ọzọkwa, a ga-enye ha ohere iso Mkpụrụ ahụ bụ́ Mesaịa na-ejekọ ozi dị ka alaeze ndị nchụàjà na mba dị nsọ.—Ndị Rom 9:4, 5.
12. Ọ bụ ezie na ha banyere n’Ala Nkwa ahụ, gịnị ka ụmụ Israel na-enwetaghị? N’ihi gịnị?
12 N’ikwekọ ná nkwa ya, Jehova duuru ụmụ Israel banye n’Ala Nkwa ahụ. Ma dị ka Pọl onyeozi mesịrị kọwaa, n’ihi enweghị okwukwe ha, ala ahụ egosipụtaghị onwe ya ịbụ “ebe izu ike.” (NW) Dị ka otu ndị, ha abaghị ‘n’izu ike Chineke’ n’ihi na ha aghọtaghị ma rụọ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube nke ụbọchị izu ike Chineke, bụ́ nke malitere mgbe e kesịrị Adam na Iv.—Ndị Hibru 4:3-10.
13. Gịnị ka mba Israel tụfuru n’ihi enweghị ekele maka ihe nketa ime mmụọ ha?
13 Israel anụ ahụ pụrụ imezuwo ọnụ ọgụgụ nke ndị ga-eso Mesaịa ahụ chịa n’Alaeze eluigwe ya dị ka alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ. Ma ha enweghị ekele maka ihe nketa ha dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụ nanị ihe fọdụrụ n’Israel anụ ahụ nabatara Mesaịa ahụ mgbe ọ bịara. N’ihi ya, ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị nta ka a gụnyere n’alaeze ndị nchụàjà ahụ e buru n’amụma. A napụrụ Israel anụ ahụ Alaeze ahụ ma were ya “nye mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya.” (Matiu 21:43) Olee mba ọ bụ?
Ihe Nketa n’Eluigwe
14, 15. (a) Mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, olee otú mba nile si malite ịgọzi onwe ha site ná “mkpụrụ” Abraham? (b) Gịnị ka ndị so ‘n’Israel nke Chineke’ na-enweta dị ka ihe nketa?
14 Mba e nyere Alaeze ahụ bụ “Israel nke Chineke,” bụ́ Israel ime mmụọ, nke ụmụazụ Jisọs Kraịst 144,000 e ji mmụọ nsọ mụta mejupụtara. (Ndị Galetia 6:16; Mkpughe 5:9, 10; 14:1-3) Ụfọdụ n’ime 144,000 ahụ bụ ndị Juu anụ ahụ, ma ihe ka ọtụtụ si ná mba ndị Jentaịl. N’ụzọ dị otú ahụ, a malitere imezu nkwa Jehova kwere Abraham, na a ga-esi ná “mkpụrụ” ya gọzie mba nile. (Ọrụ 3:25, 26; ) Ná mmezu mbụ ahụ, e ji mmụọ nsọ tee ndị mba ọzọ mmanụ, Jehova Chineke dokwara ha dị ka ụmụ ime mmụọ ya, ụmụnna Jisọs Kraịst. N’ụzọ dị otú a, ha onwe ha kwa ghọrọ akụkụ nke abụọ nke “mkpụrụ” ahụ.— Ndị Galetia 3:8, 9Ndị Galetia 3:28, 29.
15 Tupu Jisọs anwụọ, o guzobeere ndị Juu gaje iso ná mba ọhụrụ ahụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ bụ́ nke ọbara ya ga-eme ka ọ dị irè. Ná ndabere nke okwukwe ha nwere n’àjà ahụ bụ́ nke ga-eme ka ọ dị irè, a ga-eme ka ndị ahụ a kpọbatara n’ọgbụgba ndụ ahụ “zuo okè mgbe nile.” (Ndị Hibru 10:14-18) A pụrụ “[ịgụ] ha ná ndị ezi omume” ma gbaghara ha mmehie ha. (1 Ndị Kọrint 6:11) N’ihi ya, n’echiche ahụ, ha ga-adị otú Adam dị tupu ya emehie. Otú ọ dị, ndị a agajeghị ibi na paradaịs elu ala. Jisọs kwuru na ya na-aga idoziri ha ebe n’eluigwe. (Jọn 14:2, 3) Ha hapụrụ olileanya elu ụwa ha iji nweta ‘ihe nketa nke e debewooro ha n’eluigwe.’ (1 Pita 1:4) Gịnị ka ha ga-eme n’ebe ahụ? Jisọs kọwara, sị: “M na-agbakwa ndụ inye unu alaeze.”—Luk 22:29.
16. Ọrụ dị aṅaa dị ebube na-echere ndị Kraịst e tere mmanụ?
16 Site n’eluigwe, ndị ga-eso Kraịst chịa, tinyere ihe ndị ọzọ, ga-enye aka iwepụ ụdị nile nke nnupụisi megide ọbụbụeze Jehova n’ụwa. (Mkpughe 2:26, 27) Dị ka akụkụ nke abụọ nke mkpụrụ ime mmụọ nke Abraham, ha ga-ekere òkè n’iwetara ndị si ná mba nile ngọzi nke ndụ zuru okè. (Ndị Rom 8:17-21) Lee ihe nketa dị oké ọnụ ahịa ha nwere!—Ndị Efesọs 1:16-18.
17. Akụkụ ndị dị aṅaa nke ihe nketa ha ka ndị Kraịst e tere mmanụ na-anụ ụtọ ha mgbe ha ka nọ n’ụwa?
17 Ma ọ bụghị n’ọdịnihu ka ụmụazụ Jisọs e tere mmanụ ga-enweta ihe nketa ha nile. N’ụzọ ọ na-adịghị onye ọzọ ga-emeli ya, Jisọs nyeere ha aka ịmara Jehova, onye nanị ya bụ ezi Chineke. (Matiu 11:27; Jọn 17:3, 26) O ji okwu ọnụ na omume kụziere ha ihe ‘ịtụkwasị Jehova obi’ pụtara na ihe irubere Jehova isi na-agụnye. (Ndị Hibru 2:13; 5:7-9) Jisọs nyefere ha ihe ọmụma nke eziokwu banyere nzube Chineke ma mesie ha obi ike na mmụọ nsọ ga-eme ka ha ghọta ya n’ụzọ ka zuo ezu. (Jọn 14:24-26) Ọ kụnyere ịdị mkpa nke Alaeze Chineke n’uche na n’obi ha. (Matiu 6:10, 33) Jisọs nyefekwara ha ọrụ nke ịgba àmà na ime ndị na-eso ụzọ site ná ndị nọ na Jerusalem, Judia, Sameria, nakwa n’ebe ụwa sọtụrụ.—Matiu 24:14; 28:19, 20; Ọrụ 1:8.
Ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa Maka Oké Ìgwè Mmadụ
18. N’ụzọ dị aṅaa ka e si emezu taa nkwa Jehova kwere na mba nile ga-agọzi onwe ha site ná “mkpụrụ” Abraham?
18 O yiri ka a họtazuwo ọnụ ọgụgụ nke Israel ime mmụọ ahụ, bụ́ “ìgwè atụrụ nta” nke ndị nketa Alaeze ahụ. (Luk 12:32) Ruo ọtụtụ iri afọ ugbu a, Jehova adọrọwo uche gaa n’ịchịkọta oké ìgwè mmadụ nke ndị ọzọ si ná mba nile. N’ụzọ dị otú a, a na-emezu n’ụzọ ka ukwuu, nkwa ahụ Jehova kwere Abraham na site ná “mkpụrụ” ya mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha. N’ụzọ na-enye ọṅụ, ndị a a gọziri agọzi na-ejekwara Jehova ozi dị nsọ, ha na-aghọtakwa na nzọpụta ha na-adabere n’okwukwe ha nwere n’ebe Nwa Atụrụ Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ. (Mkpughe 7:9, 10) Ị̀ zawo òkù Jehova ji amara na-akpọ gị ka i soro n’ìgwè ahụ na-enwe obi ụtọ?
19. Ihe nketa dị aṅaa ka ndị mba ọzọ bụ́ ndị a na-agọzi ugbu a na-atụ anya ya?
19 Ihe nketa dị aṅaa dị oké ọnụ ahịa ka Jehova na-enye ndị na-esoghị n’ìgwè atụrụ nta ahụ? Ee e, ọ bụghị ihe nketa n’eluigwe. Ọ bụ ihe nketa ahụ Adam gaara enyewo ụmụ ya—atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’izu okè na paradaịs nke ga-eji nke nta nke nta zuo ụwa ọnụ. Ọ ga-abụ ụwa nke “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Mgbe ahụ, ọ bụ gị ka Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ na-agwa, sị: “Tụkwasị Jehova obi, meekwa ezi ihe; biri n’ala, na-azụkwa onwe gị n’ikwesị ntụkwasị obi. Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ; Ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ. Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ. Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:3, 4, 10, 11, 29.
20. Olee otú “atụrụ ọzọ” ahụ si anụ ụtọ ọtụtụ akụkụ nke ihe nketa ime mmụọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ?
20 “Atụrụ ọzọ” nke Jisọs nwere ihe nketa n’ógbè elu ala nke Alaeze eluigwe ahụ. (Jọn 10:16a) Ọ bụ ezie na ha agaghị anọ n’eluigwe, a na-enye ha ọtụtụ akụkụ nke ihe nketa ime mmụọ ahụ ndị e tere mmanụ na-anụ ụtọ ha. Ọ bụ site n’ìgwè e jikọrọ ọnụ nke ndị e tere mmanụ, bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ka e siworo mee ka atụrụ ọzọ ahụ ghọta nkwa ndị dị oké ọnụ ahịa dị n’Okwu Chineke. (Matiu 24:45-47; 25:34) Ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ maara ma na-efekọ onye ahụ nanị ya bụ ezi Chineke, bụ́ Jehova, ọnụ. (Jọn 17:20, 21) Ha na-agbakọ aka ekele Chineke maka uru mkpuchi mmehie nke àjà Jisọs bara. Ha na-ejekọ ozi ọnụ dị ka otu ìgwè atụrụ n’okpuru otu Onye Ọzụzụ Atụrụ, bụ́ Jisọs Kraịst. (Jọn 10:16b) Ha nile so n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ bụ́ nke na-ahụ n’anya. Ha na-ekerekọ òkè n’ihe ùgwù nke ịbụ Ndịàmà nke Jehova na Alaeze ya. Ee, ọ bụrụ na ị bụ ohu Jehova raara onwe ya nye nke e mekwara baptism, ihe a nile socha n’ihe nketa ime mmụọ gị.
21, 22. Olee otú anyị nile pụrụ isi gosi na anyị ji ihe nketa ime mmụọ anyị kpọrọ ihe?
21 Ruo ókè ha aṅaa ka ihe nketa ime mmụọ Ndị Hibru 10:24, 25) Ihe nketa ahụ ọ̀ dị nnọọ oké ọnụ ahịa nye gị nke na ị na-anọgide na-ejere Chineke ozi n’agbanyeghị ihe isi ike? Ekele i nwere maka ya ò siri ike nke na ọ na-ewusi gị ike iguzogide ọnwụnwa ọ bụla nke ịgbaso ụzọ pụrụ iduga gị n’ịtụfu ya?
a dị oké ọnụ ahịa nye gị? Ị̀ na-eji ya akpọrọ ihe n’ụzọ zuru ezu iji mee ka ime uche Chineke bụrụ ihe kasị mkpa ná ndụ gị? Dị ka ihe na-agba akaebe nke ahụ, ị̀ na-aṅa ntị na ndụmọdụ nke Okwu ya na nzukọ ya na-enye bụ́ ịgachi nzukọ nile nke ọgbakọ ndị Kraịst anya? (22 Ka anyị nile jiri ihe nketa ime mmụọ nke Chineke nyeworo anyị kpọrọ ihe. Ka anyị na-elekwasị nnọọ anya na Paradaịs na-abịanụ, ka anyị na-ekerechi òkè anya n’ihe ùgwù ime mmụọ ndị Jehova na-enye anyị ugbu a. Site n’ime ka ndụ anyị hiwe isi n’ezie ná mmekọrịta anyị na Jehova, anyị na-enye ihe àmà doro anya banyere otú ihe nketa Chineke nyere anyị dịruru nnọọ oké ọnụ ahịa nye anyị n’ezie. Ka anyị soro ná ndị na-ekwupụta, sị: “M ga-eme Gị ka Ị dị elu, Chineke m, bụ́ Eze; m ga-agọzikwa aha Gị ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Abụ Ọma 145:1.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Kọwaa?
• A sị na Adam guzosiri ike n’ihe nye Chineke, ihe nketa dị aṅaa ka ọ gaara enyefe anyị?
• Olee otú ụmụ Abraham si mesoo ihe nketa a hapụụrụ ha?
• Gịnị ka ihe nketa nke ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ gụnyere?
• Gịnị bụ ihe nketa nke oké ìgwè mmadụ ahụ, oleekwa otú ha pụrụ isi gosi na ha ji ya kpọrọ ihe n’ezie?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
E kwere ụmụ Abraham nkwa ihe nketa dị oké ọnụ ahịa
[Foto dị na peeji nke 23]
Ị̀ na-enwe ekele maka ihe nketa ime mmụọ gị?