Èmewo M ka Mmụọ Nsọ Bụrụ Ihe Inyeaka M?
Èmewo M ka Mmụọ Nsọ Bụrụ Ihe Inyeaka M?
NDỊ ọkà mmụta okpukpe, gụnyere ndị mmadụ n’ozuzu ha, nwere echiche dịgasị iche banyere ihe mmụọ nsọ Chineke bụ. Ma, ejighị ihe n’aka dị otú ahụ adịghị mkpa. Bible na-akọwa n’ụzọ doro anya ihe mmụọ nsọ bụ. Kama ịbụ onye, dị ka ụfọdụ ndị na-azọrọ, ọ bụ ike Chineke nọ n’ọrụ nke ọ na-eji emezu uche ya.—Abụ Ọma 104:30; Ọrụ 2:33; 4:31; 2 Pita 1:21.
Ebe ọ bụ na e jikọrọ nnọọ mmụọ nsọ na imezu nzube Chineke, anyị kwesịrị ime ka ndụ anyị kwekọọ na ya. Anyị kwesịrị ịchọ ka ọ bụrụ ihe inyeaka anyị.
Ihe Inyeaka —N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa?
Ka Jisọs na-atụ anya ọpụpụ ya n’ụwa, o mesighachiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike, sị: “M ga-arịọkwa Nna ahụ, ọ ga-enyekwa unu onye inyeaka ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi.” O kwukwara, sị: “Otú o sina dị, ana m agwa unu eziokwu, Ọ bụ maka abamuru unu ka m ji na-ala. N’ihi na ọ bụrụ na alaghị m, onye inyeaka ahụ agaghị abịakwute unu ma ọlị; ma ọ bụrụ na mụ alaa, m ga-ezitere unu ya.”—Jọn 14:16, 17; 16:7, NW.
Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ siri ike site n’ịtụziri ha, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu: ma lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:19, 20) Nke a agaghị abụ ọrụ dị mfe, n’ihi na a ga-arụ ya n’agbanyeghị mmegide.—Matiu 10:22, 23.
A ga-atụkwasị esemokwu ụfọdụ sitere n’ime ọgbakọ n’elu mmegide sitere n’èzí. “Ma ana m arịọ unu, ụmụnna m,” ka Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Rom n’ihe dị ka 56 O.A., “ka unu lee ha anya, bụ́ ndị na-eweta nkewa dị iche iche ahụ na ọnyà dị iche iche ahụ, na-emegide ozizi nke unu onwe unu mụtara: ka unu na-ezekwa ha.” (Ndị Rom 16:17, 18) Ọnọdụ a ga-aka njọ ozugbo ndị ozi nwụrụ. Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Mụ onwe m matara na mgbe m lasịrị agụ jọgburu onwe ha ga-aba n’etiti unu, ghara imere ìgwè atụrụ ebere; ndị ikom ga-esitekwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe dị iche iche na-eduhie mmadụ ụzọ, ka ha dọpụ ndị na-eso ụzọ Jisọs iso ha n’azụ.”—Ọrụ 20:29, 30.
Enyemaka Chineke dị mkpa iji guzogide ihe mgbochi ndị a. O wetara nke ahụ site n’aka Jisọs. Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., ihe dị ka mmadụ 120 n’ime ụmụazụ ya “[jupụtara] na Mmụọ Nsọ.”—Ọrụ 1:15; 2:4.
Ndị na-eso ụzọ ahụ ghọtara na mmụọ nsọ ahụ a wụpụrụ n’oge ahụ bụ ihe inyeaka ahụ Jisọs kwere ná nkwa. Obi abụọ adịghị ya na ugbu a ha ghọtara ihe ahụ Jisọs nyere a ga-eji amata ya nke ọma karị: “Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna ahụ ga-ezite n’aha m, nke ahụ ga-akụziri unu ihe nile ma chetara unu ihe nile m gwara unu.” (Jọn 14:26, NW) Ọ kpọkwara ya ‘ihe inyeaka ahụ, mmụọ nke eziokwu ahụ.’—Jọn 15:26, NW.
Olee Otú Mmụọ Nsọ Si Bụrụ Ihe Inyeaka?
Mmụọ nsọ ga-eje ozi dị ka ihe inyeaka n’ụzọ dịgasị iche. Nke mbụ, Jisọs kwere nkwa na ọ ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya cheta ihe ndị Ọ gwaworo ha. Site n’ikwu nke a, o bu n’uche ihe karịrị nanị inyere ha aka icheta okwu. Mmụọ Jọn 16:12-14) N’igbu ya nkenke, mmụọ ahụ gaje ime ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta eziokwu ahụ n’ụzọ ka mma. Pọl onyeozi mesịrị dee, sị: “Ọ bụ anyị onwe anyị ka Chineke kpugheere ha site n’aka Mmụọ Nsọ: n’ihi na Mmụọ Nsọ na-enyocha ihe nile, ọbụna ihe nile dị omimi nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 2:10) Ụmụazụ Jisọs e tere mmanụ aghaghị inwe nghọta miri emi iji nwee ike inyefe ndị ọzọ ezi ihe ọmụma.
nsọ ga-enyere ha aka ịghọta ihe ihe ndị ọ kụziwooro ha pụtara n’ụzọ ka mie emi. (Nke abụọ, Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere nakwa ime nnọọ otú ahụ mgbe mgbe. Ọ bụrụ na mgbe ụfọdụ ha ejichaghị ihe ha ga-ekpe ekpere banyere ya n’aka, mmụọ nsọ pụrụ ịrịọchitere ha arịrịọ ma ọ bụ nyere ha aka. “Otú ahụ Mmụọ Nsọ na-enyekwara adịghị ike anyị aka: n’ihi na anyị amataghị ihe anyị ga-ekpe n’ekpere dị ka anyị na-aghaghị ikpe; kama ọ bụ Mmụọ Nsọ onwe ya weere ịsụ ude a na-apụghị ikwu na-arịọrọ anyị arịrịọ.”—Ndị Rom 8:26.
Nke atọ, mmụọ nsọ ga-enyere ndị na-eso ụzọ Jisọs aka ịgbachitere eziokwu ahụ. Ọ dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Ha ga-arara unu nye n’aka nnọkọ ikpe dị iche iche, n’ụlọ nzukọ nile ha ka ha ga-apịakwa unu ihe; ee, n’ihu ndị isi na ndị eze ka a ga-ekurukwa unu jee n’ihi m, ịbụrụ ha na ndị mba ọzọ àmà. Ma mgbe ọ bụla ha ga-arara unu nye, unu echegbula onwe unu otú unu ga-ekwu ma ọ bụ okwu unu ga-ekwu: n’ihi na a ga-enye unu n’oge awa ahụ okwu unu ga-ekwu. N’ihi na ọ bụghị unu onwe unu na-ekwu, kama ọ bụ Mmụọ nke Nna unu Nke na-ekwu n’ime unu.”—Matiu 10:17-20.
Mmụọ nsọ ga-enyekwa aka ime ka a mata ọgbakọ ndị Kraịst ma kwalie ndị nọ na ya ime mkpebi onwe onye ndị amamihe dị na ha. Ka anyị tụlee akụkụ abụọ a nke isiokwu a n’ụzọ ka zuo ezu ma hụ ihe ha pụtara nye anyị taa.
Ịrụ Ọrụ Dị Ka Akara Mmata
Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị Juu jere ozi n’okpuru Iwu Mosis dị ka ndị Chineke họọrọ. Ebe ọ bụ na ha jụrụ Jisọs dị ka Mesaịa, o buru amụma na n’oge na-adịghị anya, a ga-ajụkwa ha onwe ha: “Ọ́ dịghị mgbe ọ bụla unu gụrụ n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ, Nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ahụ ka e mere isi nkuku ụlọ: ọ bụ n’aka Onyenwe anyị ka nke a sitere, ọ bụkwa oké ọrụ n’anya anyị? N’ihi nke a ka M ji sị unu, A ga-anara unu alaeze Chineke, wee nye mba ọzọ nke na-amị mkpụrụ ya.” (Matiu 21:42, 43) Ozugbo e guzobere ọgbakọ ndị Kraịst na Pentikọst 33 O.A., ụmụazụ Kraịst ghọrọ “mba . . . nke na-amị mkpụrụ ya.” Site n’oge ahụ gaa n’ihu, ọgbakọ a bụ usoro Chineke si na ya agwa ndị ya okwu. Iji mee ka ndị mmadụ nwee ike ịghọta na Chineke ewefeela ihu ọma ya n’ebe ọgbakọ ahụ dị, Chineke nyere akara mmata doro anya.
Na Pentikọst, mmụọ nsọ mere ka ndị na-eso ụzọ nwee ike ikwu okwu n’asụsụ ndị ha na-amabeghị ma ọlị, bụ́ nke mere ka ndị na-ekiri ihe na-emenụ nwee ihe ijuanya ma na-ajụ, sị: “Ànyị onwe anyị sikwa aṅaa nụ n’otu n’otu n’asụsụ nke aka anyị, nke a mụrụ anyị n’ime ya?” (Ọrụ 2:7, 8) Ikike nke ikwu okwu n’asụsụ ndị a na-amaghị, gụnyere “ọtụtụ ọrụ ebube na ihe ịrịba ama [sitere] n’aka ndị ozi,” mere ka ihe dị ka puku mmadụ atọ mata na mmụọ Chineke na-arụ ọrụ n’ezie.—Ọrụ 2:41, 43.
Ọzọkwa, site n’ịmịpụta “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”—ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè—a maara ndị na-eso ụzọ Kraịst nke ọma dị ka ndị ohu Chineke. (Ndị Galetia 5:22, 23) N’ezie, e ji ịhụnanya mara ezi ọgbakọ ndị Kraịst n’ụzọ pụtara ìhè. Jisọs buru n’amụma, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”—Jọn 13:34, 35.
Ndị òtù nke ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ nakweere nduzi nke mmụọ nsọ Chineke ma jiri enyemaka ya mee ihe bara uru. Ọ bụ ezie na ndị Kraịst taa ghọtara na Chineke adịghịzi akpọlite ndị nwụrụ anwụ ma na-arụ ọrụ ebube ugbu a dị ka o mere na narị afọ mbụ, ha na-ekwe ka mkpụrụ nke mmụọ Chineke mee ka a mata ha dị ka ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst.—1 Ndị Kọrint 13:8.
Ihe Inyeaka n’Ime Mkpebi Onwe Onye
E dere Bible n’ike mmụọ nsọ. N’ihi ya, mgbe anyị kwere ka Bible mee ka anyị kwenye, ọ 2 Timoti 3:16, 17) Ọ pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha. Ma ànyị na-ekwe ya?
na-adị nnọọ ka a ga-asị na mmụọ nsọ na-enye anyị ntụziaka. (Gịnị banyere nhọrọ anyị na-eme maka ọrụ? Mmụọ nsọ ga-eme ka anyị nwee ike ile ọrụ anyị na-aga inweta anya n’ụzọ Jehova si ele ihe anya. Ọrụ anyị aghaghị ikwekọ n’ụkpụrụ Bible, n’ụzọ kasịkwa mma, o kwesịrị inyere anyị aka ịchụso ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke. Ụgwọ ọrụ ma ọ bụ ịbụ onye a ma ama na ùgwù ndị e jikọtara ha na ọrụ ahụ abụghị ihe ka mkpa. Ihe ka mkpa bụ ma ọ̀ na-enye anyị ihe ndị dị mkpa ná ndụ ma na-enye anyị oge na ohere zuru ezu ịrụzu ibu ọrụ anyị dị ka ndị Kraịst.
Inwe ọchịchọ ịnụ ụtọ ndụ bụ ihe dị otú o kwesịrị na nke ziri ezi. (Eklisiastis 2:24; 11:9) Ya mere onye Kraịst nwere nguzozi pụrụ ịchụso ntụrụndụ maka inweta ume ọhụrụ na obi ụtọ. Ma o kwesịrị ịhọrọ ntụrụndụ na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ọ bụghị ụdị nke na-egosi “ọrụ nile nke anụ ahụ.” Pọl na-akọwa, sị: “Ma ọrụ nile nke anụ ahụ pụtara ìhè, nke dị ka ndị a, ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ ịkwa iko, ikpere arụsị, ịgwọ nsí, ibu iro, esemokwu, ekworo, ọnụma, ịkpa iche iche, nkewa, ịrọ òtù, ịkpọasị, ịṅụbiga mmanya ókè, ite egwú, na ihe yiri ihe ndị a.” Ọ ga-ezerekwa ịghọ onye ‘na-achọ otuto efu, na-achọ ibe ya okwu, na-akpọ ibe ya asị.’—Ndị Galetia 5:16-26.
Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe banyere ịhọrọ ndị enyi. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịhọrọ ha na-adabere n’ọnọdụ ime mmụọ ha, ọ bụghị na-adabere n’ọdịdị elu ahụ ha ma ọ bụ ihe onwunwe ha. O doro anya na nwoke ahụ bụ́ Devid bụ enyi Chineke, n’ihi na Chineke kọwara ya dị ka “nwoke nke dị ka obi [ya] si achọ.” (Ọrụ 13:22) N’ileghara ọdịdị elu ahụ anya, Chineke họọrọ Devid ịbụ eze Israel, na-adabere n’ụkpụrụ bụ́: “Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.”—1 Samuel 16:7.
Ọtụtụ puku ọbụbụenyi etisawo n’ihi na e mere ha na-adabere n’ọdịdị elu ahụ ma ọ bụ n’ihe onwunwe. Ọbụbụenyi ndị dabeere n’akụ̀ na ụba a na-ejighị n’aka pụrụ ijedebe na mberede. (Ilu 14:20) Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ na-adụ anyị ọdụ na mgbe anyị na-ahọrọ ndị enyi, anyị kwesịrị ịhọrọ ndị pụrụ inyere anyị aka ijere Jehova ozi. Ọ na-agwa anyị ka anyị tụkwasị uche n’inye ihe kama n’ịnara anara n’ihi na inye ihe na-eweta ọṅụ ka ukwuu. (Ọrụ 20:35) Oge na mmetụta ịhụnanya so n’ihe ndị kasị oké ọnụ ahịa anyị pụrụ inye ndị enyi anyị.
Bible na-enye onye Kraịst na-achọ di ma ọ bụ nwunye ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ. N’otu echiche, ọ na-ekwu, sị: ‘Lee anya gabiga ihu ya na ọdịdị ahụ ya. Lee anya n’ụkwụ ya.’ Ụ̀kwụ ya? Ee, n’echiche a: À na-eji ha eme ihe n’ịrụ ọrụ Jehova nke ikwusa ozi ọma ahụ, hà makwara mma, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, n’anya ya? Hà yi ozi nke eziokwu na ozi ọma nke udo dị ka akpụkpọ ụkwụ? Anyị na-agụ, sị: “Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-ezisa ozi ọma, bụ́ onye na-eme ka a nụrụ okwu udo, onye na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe, onye na-eme ka a nụrụ okwu nzọpụta; onye na-asị Zaịọn, Chineke gị bụ eze!”—Aịsaịa 52:7; Ndị Efesọs 6:15.
N’ịbụ ndị bi ‘n’oge dị oké egwu,’ enyemaka dị anyị mkpa n’ime uche Chineke. (2 Timoti 3:1) Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ Chineke, kwadoro ọrụ nke ndị Kraịst na narị afọ mbụ n’ụzọ dị ike, gụnyere ịbụ ihe inyeaka ha. Iji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke, bụ́ nke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ otu ụzọ bụ́ isi anyị onwe anyị kwa pụrụ isi mee ka mmụọ nsọ bụrụ ihe inyeaka anyị. Ànyị emewo otú ahụ?
[Foto dị na peeji nke 23]