Imesapụ Aka N’ụba Na-eweta Ọṅụ
Imesapụ Aka N’ụba Na-eweta Ọṅụ
DỊ KA onye Kraịst bụ́ onye nlekọta na-ahụ n’anya, Pọl onyeozi bu ọdịmma kasịnụ nke ndị kwere ekwe ibe ya n’obi. (2 Ndị Kọrint 11:28) N’ihi ya, mgbe ọ haziri ụtụ ego maka ndị Kraịst nọ ná mkpa na Judia n’etiti afọ ndị 50 nke narị afọ mbụ nke Oge Anyị, o ji ohere ahụ mee ihe ịkụzi ihe bara uru banyere mmesapụ aka. Pọl mere ka ọ pụta ìhè na Jehova ji mmadụ iji obi ụtọ na-enye ihe akpọrọ oké ihe: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.”—2 Ndị Kọrint 9:7.
Ndị Bụ́ Ogbenye Ọnụ Ntụ Ma Na-emesapụ Aka
Ihe ka ọtụtụ ná ndị Kraịst narị afọ mbụ abụghị ndị a ma ama n’obodo. Pọl kwuru na “ọ dịghị ọtụtụ ndị ike” nọ n’etiti ha. Ha bụ “ihe na-adịghị ike nke ụwa,” “ihe dị ala nke ụwa.” (1 Ndị Kọrint 1:26-28) Dị ka ihe atụ, ndị Kraịst bi na Masedonia bụ “ogbenye ọnụ ntụ” ma nọrọkwa ná “mkpagbu.” Ma, ndị Masedonia ahụ kwere ekwe bụ́ ndị nwere obi umeala rịọrọ maka ihe ùgwù nke inye onyinye ego maka “ozi a na-ejere ndị nsọ”; Pọl gbakwara àmà na ihe ha nyere ‘karịrị ike ha’!—2 Ndị Kọrint 8:1-4.
Ma, inye ihe n’ụzọ mmesapụ aka dị otú ahụ abụghị nke e ji ego ole e nyere kpebie. Kama nke ahụ, inwe mkpali, ọchịchọ iso ndị ọzọ kerịta ihe, na ọnọdụ obi, bụ ihe ndị dị mkpa. Pọl gosiri ndị Kọrint bụ́ ndị Kraịst na a na-eji ma uche ma obi enye onyinye. O kwuru, sị: “Amatara m obi dị ọkụ unu, nke m na-anyara ndị Masedonia isi banyere unu, . . . ịnụ ọkụ unu kwalikwara obi ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha.” Ha ‘kpebiri n’obi ha’ inye onyinye n’ụzọ mmesapụ aka.—2 Ndị Kọrint 9:2, 7.
‘Mmụọ Ha Kpaliri Ha’
Pọl onyeozi pụrụ ibuwo n’uche ihe nlereanya e nwere na mbụ nke inye ihe n’ụzọ mmesapụ aka, nke weere ọnọdụ n’ọzara n’ihe karịrị narị afọ 15 tupu oge ya. E mewo ka ebo 12 nke Israel nwere onwe ha pụọ n’ịgbara ndị Ijipt ohu. Ha nọ ugbu a n’ala ala Ugwu Saịnaị, Jehova nyekwara ha iwu ka ha wuo ụlọikwuu maka ofufe ma kwanye ya arịa e ji efe ofufe. Nke a ga-ewe ọtụtụ akụ̀ na ụba, a kpọkwara mba ahụ òkù inye onyinye.
Olee otú ndị Israel ahụ si meghachi omume? “Ha wee bịa, onye ọ bụla nke obi ya kwaliri ya, na onye ọ bụla nke mmụọ ya mere ka o nwee afọ ofufo, ha wee weta àjà mbuli Jehova, iji jee ozi ụlọikwuu nzute ahụ.” (Ọpụpụ 35:21) Mba ahụ ò nyere onyinye n’ụzọ mmesapụ aka? Eenụ! A kọọrọ Mosis ihe ndị na-esonụ: “Ndị Israel na-eweta ọtụtụ ihe karịa nke ga-ezuru ofufe nke dịịrị ozi ahụ nke Jehova nyere iwu ka e jee ya.”—Ọpụpụ 36:5.
Olee ókè ụmụ Israel n’oge ahụ nweruru ego? N’oge na-adịghị anya tupu oge ahụ, ha abụwo ndị ohu na-ahụsi anya, ‘ndị e weere ibu wedaa ala,’ ndị na-adị ‘ndụ dị ilu,’ ndụ nke “mweda n’ala.” (Ọpụpụ 1:11, 14; 3:7; 5:10-18) Mgbe ahụ, o yighị ka hà nwere akụ̀ na ụba. N’eziokwu, ụmụ Israel ji ìgwè atụrụ na ìgwè ewu hapụ ala ha nọbu n’ohu na ya. (Ọpụpụ 12:32) Ma ihe ndị ahụ apụghị ihiwo nne, ebe ọ bụ na n’oge na-adịghị anya ha hapụsịrị Ijipt, ha mere mkpesa na ha enweghị ma anụ ma nri ha ga-eri.—Ọpụpụ 16:3.
Oleezinụ ebe ụmụ Israel si nweta ihe onwunwe ndị ahụ ha nyere n’onyinye maka owuwu nke ụlọikwuu ahụ? Ọ bụ site n’aka ndị bụbu Ọpụpụ 12:35, 36.
nna ha ukwu, ndị Ijipt. Bible na-ekwu, sị: Ụmụ Israel . . . wee rịọ n’aka ndị Ijipt ihe ọlaọcha, na ihe ọlaedo, na uwe mgbokwasị: . . . [ndị Ijipt] wee mee ka ha rịọta ihe.” Omume mmesapụ aka a nke ndị Ijipt mere bụ ngọzi sitere n’aka Jehova, ọ bụghị n’aka Fero. Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke na-ekwu, sị: “Jehova wee nye ndị Israel amara n’ihu ndị Ijipt, ha wee mee ka ha rịọta ihe.”—Mgbe ahụ, cheedị banyere mmetụta ụmụ Israel nwere. Ọtụtụ ọgbọ enwewo ahụmahụ dị ilu nke ịbụ ohu na nke ịbụ ndị a napụrụ ihe. Ugbu a, ha enwerewo onwe ha ma bụrụ ndị nwere ihe onwunwe n’ụba. Olee otú ọ ga-adị ha inyepụ ụfọdụ n’ime ihe onwunwe ndị ahụ? Ha pụrụ ichewo na ha bụ ihe ha rụtara n’ọrụ ma bụrụ ihe ruuru ha idebe ha. Otú ọ dị, mgbe a kpọrọ ha inye onyinye ego iji kwado ofufe dị ọcha, ha mere otú ahụ—ọ bụghịkwa n’ụzọ enwechaghị ọchịchọ ma ọ bụ n’ụzọ aka ntagide! Ha echefughị na ọ bụ Jehova mere ka o kwe ha omume inweta ihe onwunwe ndị ahụ. N’ihi ya, ha nyere ọlaọcha na ọlaedo na anụ ụlọ ha n’ụba. “Obi [ha] nwere afọ ofufo.” ‘Obi ha kwaliri ha.’ ‘Mmụọ ha mere ka ha nwee afọ ofufo.’ N’ezie, ọ bụ “onyinye afọ ofufo nye Jehova.”—Ọpụpụ 25:1-9; 35:4-9, 20-29; 36:3-7.
Ịdị Njikere Inye Ihe
Otú onyinye haruru adịghị egosikarị otú onye nyere ya na-emesapụru aka. N’otu oge, Jisọs Kraịst nọ na-ele anya ka ndị mmadụ na-atụnye ego n’ebe a na-edebe ụtụ a na-atụ n’ụlọ nsọ. Ndị ọgaranya tụnyere ọtụtụ ego, ma ọ masịrị Jisọs mgbe ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ nke bụ́ ogbenye ka ọ tụnyere ego nta abụọ. O kwuru, sị: “Nwanyị a, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ọ tụbara karịa ha nile: . . . [o] sitere n’ụkọ ya tụba ihe nile o nwere nke o ji biri.”—Luk 21:1-4; Mak 12:41-44.
Okwu Pọl gwara ndị Kọrint kwekọrọ n’echiche a nke Jisọs. A bịa n’ihe banyere inye onyinye iji nyere ndị kwere ekwe ibe anyị nọ ná mkpa aka, Pọl kwuru, sị: “A sị na obi dị ọkụ dị ya, ọ bụ ihe a ga-anara nke ọma dị ka ihe ọ bụla mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe ọ na-enweghị.” (2 Ndị Kọrint 8:12) Ee, inye onyinye abụghị ihe a ga-eji na-amarịta aka ma ọ bụ ihe a ga-eji ihe otu onye nyere na-atụnyere ihe onye ọzọ nyere. Mmadụ na-enye ihe aka ya ruru, Jehova na-enwekwa obi ụtọ n’ebe mmụọ nke mmesapụ aka dị.
Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye pụrụ ịkpanye Jehova, bụ́ onye nwere ihe nile, akụ̀, inye onyinye bụ ihe ùgwù nke na-enye ndị na-efe ofufe ohere igosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ. (1 Ihe ) Onyinye mmadụ nyere, ọ bụghị iji mee ka a hụ ya ma ọ bụ maka ebumnobi ndị ọzọ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, kama nke o nyere n’ụzọ kwesịrị ekwesị na iji mee ka ezi ofufe gaa n’ihu, na-eweta ọṅụ nakwa ngọzi Chineke. ( E Mere 29:14-17Matiu 6:1-4) Jisọs kwuru, sị: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Anyị pụrụ iso nweta obi ụtọ ahụ site n’inye ume anyị n’ozi Jehova nakwa site n’iwepụta ihe site n’ihe onwunwe anyị maka iji kwado ezi ofufe na iji nyere ndị kwesịrị ka e nyere aka, aka.—1 Ndị Kọrint 16:1, 2.
Ịdị Njikere Inye Ihe Taa
Taa, Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ ịhụ ọganihu a na-enwe n’ụwa nile ná nkwusa nke “ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe.” (Matiu 24:14) N’iri afọ ikpeazụ nke narị afọ nke 20, e mere ihe karịrị mmadụ 3,000,000 baptism iji gosipụta nrara ha raara onwe ha nye Jehova Chineke, e guzobekwara ihe dị ka ọgbakọ ọhụrụ 30,000. Ee, e guzobere otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị taa n’ime afọ iri gara aga! Ihe kasị ukwuu ná mmụba a sitere ná nrụsi ọrụ ike nke ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst, bụ́ ndị na-etinye oge na ume ọrụ ha iji leta ndị agbata obi ha ma gwa ha banyere nzube Jehova. Ụfọdụ n’ime mmụba ndị a sitere n’ọrụ ndị ozi ala ọzọ na-arụ, bụ́ ndị na-ahapụ ebe obibi ha ma gaa n’ala ndị dị anya iji nye aka n’ebe ahụ n’ọrụ nkwusa Alaeze. Mmụba ahụ emewo ka a hazie sekit ndị ọhụrụ, bụ́ ndị meworo ka ọ dị mkpa ịhọpụta ndị nlekọta sekit ọhụrụ. Tụkwasị na nke a, e nwewo mkpa maka Bible ka ukwuu iji jiri ha mee ihe n’ime nkwusa nakwa n’ọmụmụ ihe onwe onye. E nwekwuola mkpa maka akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Sitekwa n’otu mba gaa n’ọzọ, e wusakwuola ụlọ ndị dị n’alaka ụfọdụ ma ọ bụ jiri ndị ka saa mbara gbanwee ha. E gbowo mkpa ndị a e nwekwuru site n’enyemaka nke onyinye afọ ofufo ndị sitere n’aka ndị Jehova.
Mkpa Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze
Mkpa pụtara ìhè e nwere bụ́ nke doworo anya n’ihi mmụba n’ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà Jehova bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nnyocha e mere ná mmalite afọ 2000 kpughere mkpa e nwere maka ihe karịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze 11,000 ná mba ndị ka na-emepe emepe, bụ́ ebe ego na-adịchaghị. Tụlee ihe banyere Angola. N’agbanyeghị ọtụtụ afọ nke agha obodo, mba ahụ na-enwe nkezi mmụba kwa afọ nke ihe dị ka pasent 10 n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ime ọgbakọ 675 dị ná mba a buru ibu dị n’Africa na-ezukọ n’èzí. E nwere nanị Ụlọ Nzukọ Alaeze 22 ná mba ahụ, n’ime ha, ọ bụ nanị 12 nwere ihe e ji mechie elu ha.
E nwere ọnọdụ yiri nke ahụ na Democratic Republic of Congo. N’agbanyeghị na e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọgbakọ 300 n’isi obodo ya bụ́ Kinshasa, e nwere nanị Ụlọ Nzukọ Alaeze iri. Ná mba ahụ dum, e nwere mkpa chọrọ ime ihe ngwa ngwa maka Ụlọ Nzukọ Alaeze karịrị 1,500. N’ihi mmụba dị ngwa a na-enwe ná mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, Russia na Ukraine kwuru na ha abụọ nwere mkpa maka ọtụtụ narị Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mmụba dị ngwa a na-enwe na Latin America na-egosipụta onwe ya na Brazil, bụ́ ebe e nwere ihe karịrị ọkara nde Ndịàmà na mkpa dị ukwuu maka inwekwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Iji gboo mkpa ndị dị ná mba ndị dị otú ahụ, Ndịàmà Jehova na-etinye usoro na-aga ngwa ngwa maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’ọrụ. Ọ bụ onyinye mmesapụ aka nke òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ ka e ji ahụ maka usoro ihe owuwu a, nke na ọbụna ọgbakọ ndị kasị daa ogbenye ga-enwe ike inwe ebe ofufe kwesịrị ekwesị.
Dị ka ọ dị n’oge Israel oge ochie, a pụrụ ịrụzu ihe dị ukwuu n’ihi na ndị Kraịst nwere ezi obi ‘na-asọpụrụ Jehova site n’akụ̀ ha.’ (Ilu 3:9, 10) Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ga-achọ iji ohere a gosipụta ekele miri emi ha nwere nye onye ọ bụla obi ya kpaliworo ya ikere òkè n’inye ihe n’afọ ofufo a. Anyị pụkwara inwe obi ike na mmụọ Jehova ga-anọgide na-akpali obi ndị ya ịkwado mkpa ndị e nwere n’ọrụ Alaeze ahụ na-amụba n’ike n’ike.
Ka mgbasawanye ahụ zuru ụwa ọnụ na-aga n’ihu, ka anyị nọgide na-atụ anya ohere ndị anyị ga-eji egosipụta obi ụtọ na ọchịchọ anyị nwere itinye ume anyị, oge anyị, na inye ihe onwunwe anyị. Ka anyị nwetakwa ezi ọṅụ nke mmụọ inye ihe dị otú ahụ na-eweta.
[Igbe dị na peeji nke 29]
‘JIRI YA MEE IHE N’ỤZỌ AMAMIHE!’
“Adị m afọ iri. Ana m ezitere unu ego a ka unu wee nwee ike ịzụta akwụkwọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ iji mepụta akwụkwọ.”—Cindy.
“Ọ masịrị m izitere unu ego a iji mepụtakwuoro anyị akwụkwọ. Enwetara m ego a site n’inyere papa m aka. Ya mere jirinụ ya mee ihe n’ụzọ amamihe!”—Pam, afọ asaa.
“Ihe banyere oké ifufe hurricane ahụ wutere m. Enwere m olileanya na unu emerụghị ahụ. Nke a [$2, U.S.] bụ ego nile dị n’ebe m na-etinye ego.”—Allison, afọ anọ.
“Aha m bụ Rudy, adịkwa m afọ 11. Nwanne m nwoke bụ́ Ralph dị afọ isii. Nwanne m nwanyị bụ́ Judith dị afọ abụọ na ọkara. Anyị anọwo na-edebe ego site n’ego mmachi akpa anyị ruo ọnwa atọ iji nyere ụmụnna anyị nọ [n’ógbè agha tisasịrị] aka. Anyị chekwara dollar 20 bụ́ nke anyị na-ezitere unu ugbu a.”
“Ebere ụmụnna ahụ [oké ifufe hurricane metụtara] na-eme m. Akpatara m dollar 17 site n’iso papa m na-arụ ọrụ. Ọ dịghị ihe m na-ezite ego a maka ya kpọmkwem, ya mere, m ga-ahapụ unu ka unu kpebie.”—MacLean, afọ asatọ.
[Igbe dị na peeji nke 31]
Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Ahọrọ Inye Ihe
ONYINYE NDỊ A NA-ENYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ
Ọtụtụ ndị na-ewepụta ma ọ bụ mawapụta ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ bụ́: “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ nke Society—Matiu 24:14.” Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’ógbè ha.
A pụkwara iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ gaa n’ụlọ ọrụ Society nke na-elekọta mba unu. A pụkwara ịtụnye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.
ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI
A pụrụ inye Watch Tower Society ego n’okpuru ndokwa pụrụ iche nke na a ga-enyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko kpọtụrụ Treasurer’s Office n’adres e dere n’elu.
ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE
Tinyere inye onyinye ego kpọmkwem na onyinye ego ndị a pụrụ ịnaraghachi, e nwere ụzọ ndị ọzọ nke inye ihe iji baara ozi Alaeze zuru ụwa ọnụ uru. Ndị a gụnyere:
Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká.
Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ bụrụ nke a ga-akwụnye Watch Tower Society mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso.
Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam.
Ala na Ụlọ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mmadụ kwesịrị ime ka Society mara tupu o denyere Society ala na ụlọ ọ bụla.
Ike Ekpe na Ihe Ntụkwasị Obi: A pụrụ idenyere Watch Tower Society ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego ndị e mere ka ha baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego ụtụ isi ọ ga-akwụ.
Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ime atụmatụ ụfọdụ n’aka onye ahụ na-enye onyinye. Iji nyere ndị na-achọ ime ka Society rite uru site n’ụdị ụfọdụ nke atụmatụ ọrụ ebere aka, Society akwadebewo otu broshuọ dị n’asụsụ Bekee na Spanish a kpọrọ Charitable Planning to Benefit Kingdom Service Worldwide. E dere broshuọ ahụ ná nzaghachi nye ọtụtụ ajụjụ ndị Society nataworo metụtara onyinye, ike ekpe, na ihe ntụkwasị obi. O nwekwara n’ime ya ihe ọmụma ndị ọzọ bara uru metụtara ime atụmatụ ala na ụlọ, ego, na ụtụ isi. A hazikwara ya iji nyere ndị bi na United States aka bụ́ ndị na-eme atụmatụ inye Society onyinye pụrụ iche ugbu a ma ọ bụ ikenyere Society ihe onwunwe n’ekpe mgbe ha nwụrụ, ịhọrọ ụzọ ndị kasị baa uru na ndị kasị dị irè, na-eburu ọnọdụ ezinụlọ na nke onwe ha n’uche. A pụrụ inweta broshuọ a site n’ịrịọ maka otu kpọmkwem site n’aka Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere.
Mgbe ha gụsịrị broshuọ ahụ ma soro ndị na-arụ ọrụ n’Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere kparịta ụka, ọtụtụ ndị enwewo ike ịkwado Society ma n’otu mgbe ahụ, mụbaa ihe a na-esepụrụ ha n’ụtụ isi n’ihi ime otú ahụ. E kwesịrị ime ka Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere mara banyere akwụkwọ ndị bara uru metụtara nke ọ bụla ná ndokwa ndị a ma nweta otu akwụkwọ ahụ. Ọ bụrụ na i nwere mmasị na nke ọ bụla n’ime ndokwa atụmatụ ọrụ ebere ndị a, i kwesịrị ịkpọtụrụ Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere, n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ na telifon, n’adres e dere n’okpuru ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ Society nke na-elekọta mba gị.
CHARITABLE PLANNING OFFICE
Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
100 Watchtower Drive, Patterson, New York 12563-9204
Telephone: (845) 306-0707