Ikwusa Alaeze ahụ n’Altiplano nke Peru
Anyị Dị N’etiti Ndị Kwere Ekwe
Ikwusa Alaeze ahụ n’Altiplano nke Peru
N’AGBATA ebe ọwụwa anyanwụ na ebe ọdịda anyanwụ nke Ugwu Andes—ebe Bolivia na Peru gbara—ka Altiplano dị. Aha ya pụtara “ugwu elu ya dị larịị,” ma ọ bụ “ala dị larịị.” Ihe ka ukwuu na ya dị na Bolivia.
Altiplano dị 100 kilomita n’obosara na ihe karịrị 1,000 kilomita n’ogologo, ná nkezi, ịdị elu ya ji ihe dị ka mita 3,700 karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri. Ọ bụrụ na ị banye ụgbọelu na-efega ebe ahụ site n’isi obodo Peru, bụ́ Lima, bụ́ nke dị n’ụsọ oké osimiri, ị ga-agafe ugwu El Misti nke snow na-ekpuchi, bụ́ ugwu mgbawa ịdị elu ya ruru mita 5,822 n’igwe ojii. Ihe kpọliri elu ruo ihe karịrị mita 6,000 n’ebe dị anya bụ ọnụ ọnụ ugwu Nevado Ampato na Nevado Coropuna bụ́ ndị snow na-ekpuchi elu ha. Na mberede, ị ga-ahụ ala dị larịị sara mbara—ebe ndịda Altiplano nke Peru.
Isi obodo nke Altiplano nke Peru bụ Puno, bụ́ nke dị ná nsọtụ ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Ọdọ Mmiri Titicaca, bụ́ ọdọ mmiri ụgbọ mmiri kasị aga na ya n’ụwa. Ebe ọ bụ na ógbè ahụ karịrị kilomita atọ n’ịdị elu, ọ na-ewetụ oge tupu ikuku jụrụ oyi nke ebe ahụ amara ndị si esi bịa ahụ. Ndị Quechua India na ndị Aymara India bi n’akụkụ Ọdọ Mmiri Titicaca. A pụrụ ịhụ ha ka ha yi uwe ndị tụrụ àgwà ọbara ọbara, akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, ma ọ bụ anụnụ anụnụ na-arụ ọrụ na chacras, ma ọ bụ ugbo nta ha. Ọ bụ ezie na Spanish bụ asụsụ bụ́ isi nke Peru, a na-asụkwa Quechua na Aymara n’Altiplano.
Ibute Ụzọ n’Ọrụ Nkwusa Ahụ
Ọtụtụ n’ime ndị na-asụ Quechua na Aymara bụ́ ndị dị umeala n’obi ma dị ike ọrụ abịawo nweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu Bible. N’ụzọ dị ukwuu, nke a bụ n’ihi ngọzi bara ụba nke Jehova na-agọzi mgbalị nke ndị nkwusa oge nile nke Alaeze, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ji ịnụ ọkụ n’obi na-etinye.
Dị ka ihe atụ, e kenyere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche bụ́ José na Silvia ọrụ n’obodo Putina, nke dị ihe dị ka kilomita 50 site n’Ọdọ Mmiri Titicaca. N’ime ọnwa abụọ, Silvia nọ na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi 16, José na-eduzikwa 14. N’ime ọnwa isii nanị, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa ọgbakọ mụbara site ná mmadụ 23 ruo 41. Ka ọ dịgodị, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ rịrị elu site na 48 ruo ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ́ 132.
“Mgbe anyị na-amalite nzukọ ọgbakọ n’ógbè ndị a dịpụrụ adịpụ,” ka José na-ekwu, “anyị na-ahụ na iji Nzukọ Ihu Ọha na Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ malite na-adị irè. Nke a na-eme ka ọ dịrị ndị ọhụrụ nwere mmasị mfe karị ịmalite na-abịa nzukọ.”
Ụmụnna nwanyị abụọ—otu bụ ọsụ ụzọ—bụ ndị mbụ wetaara ógbè dịpụrụ adịpụ bụ́ Muñani, nke dị ihe dị ka kilomita 20 site na Putina, ozi ọma ahụ. N’ebe ahụ, ha malitere iduziri otu nwoke kpuru ìsì nke aha ya bụ Lucio * ọmụmụ Bible. Ọ kpọrọ nwanne ya nwoke bụ́ Miguel, bụ́ onye ozi ala ọzọ nkịtị nke Katọlik na onye ndú obodo nke si n’otu ógbè dị nso. Mgbe otu enyi Miguel jụrụ ya ihe mere o ji aga Muñani kwa izu, o kwuru na ọ bụ iji mụta banyere Jehova na Okwu ya. Ajụjụ biliteziri bụ: “Gịnị ma anyị nwewa ọmụmụ Bible ahụ n’ebe a?” N’ihi mmasị ndị mmadụ gosipụtara n’ógbè Miguel, Ndịàmà ahụ mere ndokwa n’oge na-adịghị anya ịnọ n’ebe ahụ na-enwe nzukọ.
Miguel malitere ịgwa ndị ọzọ ihe ọ na-amụta. Ma gịnị banyere ọkwá ya dị ka onye ozi ala ọzọ nkịtị nke Katọlik nakwa osote gọvanọ? Ná nzukọ a nọ n’ụlọ ezumezu nke obodo ahụ nwee, ọ mara ọkwà na ya agaghịzi abụ onye ozi ala ọzọ nke Katọlik. À ga-ahọpụta onye ọzọ? Otu onye n’etiti ndị na-ege ntị kwuru, sị: “N’ihi gịnị ka anyị ji na-achọ onye ozi ala ọzọ ọzọ ebe anyị na-amụ eziokwu ahụ?” N’ezie, ọ
na-ezo aka n’ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi. Onye ọzọ gbakwụnyere, sị: “Anyị ekweghị ka nanị gị pụọ. Gịnị mere anyị nile agaghị apụ?” Mgbe ahụ, mmadụ nile bịaranụ ji otu olu kwuo, sị: “Anyị nile apụọla!”N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, e kwurịtara banyere arụsị na ihe oyiyi Kraịst n’elu obe ná nzukọ obodo ahụ. Otu nwoke kwuru ka mmadụ nile bịaranụ gụọ Deuterọnọmi 7:25, nke na-asị: “Unu ga-esure arụsị nile a pịrị apị nke chi nile ha n’ọkụ: enwela anyaukwu n’ọlaọcha na ọlaedo nke dị n’ahụ ha, ewekwala n’onwe gị, ka a ghara ịma gị n’ọnyà n’ime ya: n’ihi na ihe arụ nke Jehova, bụ́ Chineke gị, ka ọ bụ.”
Mgbe ahụ, nwoke ahụ sịrị ka ndị kwere ka a kpọọ arụsị nile ahụ ọkụ welie aka ha. Mmadụ nile weliri aka ozugbo. (Ọrụ 19:19, 20) Ugbu a, ezinụlọ 23 n’ime ezinụlọ 25 bi n’ógbè ahụ na-amụ Okwu Chineke. Mmadụ abụọ na-eje ozi dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism, ndị di na nwunye ise na-emekwa atụmatụ idebanye alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro iji dị ọcha n’ihu Jehova.—Taịtọs 3:1; Ndị Hibru 13:4.
Iji Kaseti Ndị E Kwunyere Okwu n’Ime Ha Ezi Ihe
Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị bi n’Altiplano amaghị ịgụ na ide ihe, kaseti vidio na nke a na-ege ege nke Watch Tower mepụtara bụ́ ndị dị n’asụsụ ndị a na-asụ n’ógbè ahụ bụ ihe enyemaka dị ukwuu—ọbụna maka iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. Site n’iji kaseti a na-ege ege eme ihe, otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche aha ya bụ Dora na-eji broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? eduzi ọmụmụ ihe. Ọ na-eme, ya kpọọ otu paragraf, ya ajụọ onye ahụ ọ na-amụrụ Bible ajụjụ banyere ebe ahụ e gere.
Otu ụlọ ọrụ redio dị n’ógbè ahụ na-akpọsa ihe ọmụmụ ndị sitere na broshuọ Na-achọ n’asụsụ Quechua mgbe nile. Ọ na-ejikwa akụkụ ndị sitere na magazin Teta! eme otú ahụ n’asụsụ Spanish. N’ihi ya, ọtụtụ mmadụ na-aghọta ozi Alaeze ahụ ma na-achọ ịmụtakwu ihe mgbe Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ha n’ebe obibi ha.
Anya ụmụ mmadụ n’ozuzu ha adịghị eru n’Altiplano ma anya Chineke na-eru ya. N’ihi ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ, ọtụtụ ndị bi n’Altiplano nke Andes ahụ dị elu na-aghọ akụkụ nke ìgwè ndị na-eme ka ọmarịcha ụlọ ezi ofufe ya dị ebube.—Hagaị 2:7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 E jiriwo aha nnọchianya ụfọdụ mee ihe n’isiokwu a.