Jehova Na-enye Onye Ike Gwụrụ Ume
Jehova Na-enye Onye Ike Gwụrụ Ume
“[Jehova] na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba.”—AỊSAỊA 40:29.
1. Nye ihe atụ nke ike dị n’ihe ndị Chineke keworo.
A KPAARAGHỊ ike Jehova ókè. Leekwa ike dị ukwuu ihe ndị o kere eke nwere! Atọm pere nnọọ mpe—kpọmkwem ihe mejupụtara ihe nile—dị nnọọ nta nke na otu ntapụ mmiri nwere ijeri kwuru ijeri atọm. Ihe nile dị ndụ n’ụwa anyị na-adabere n’ike atọm sitere n’anyanwụ na-ewepụta. Ma ike hà aṅaa sitere n’anyanwụ dị mkpa iji kwagide ndụ n’ụwa? Ụwa na-enweta nanị ike dị nnọọ ntakịrị n’ime ike nile anyanwụ na-ewepụta. Otú o sina dị, akụkụ pere nnọọ mpe nke ike anyanwụ nke na-abịa n’ụwa karịrị n’ụzọ n’enweghị atụ ike ndị e ji eme ihe n’ụlọ ọrụ ndị dị n’ụwa, ma e jikọta ha ọnụ.
2. N’ụzọ bụ́ isi, gịnị ka Aịsaịa 40:26 na-ekwu banyere ike Jehova?
2 Ma ànyị na-eche banyere atọm ma ọ bụ na-eche banyere eluigwe na ala sara mbara, ike na-emenye ụjọ nke Jehova na-akpali anyị. Ka a sịkwa ihe mere o ji nwee ike ikwu, sị: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a? ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị”! (Aịsaịa 40:26) Ee, Jehova “nwere ume n’ike,” ọ bụkwa Isi Iyi nke “ike” e ji kee eluigwe na ala dum.
A Chọrọ Ihe Karịrị Ike Nkịtị
3, 4. (a) Olee ihe ụfọdụ pụrụ ime ka ike gwụ anyị? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka a tụlee?
3 Ọ bụ ezie na a kpaaraghị ike Chineke ókè, ike na-agwụ ụmụ mmadụ. Ebe ọ bụla anyị gara, anyị na-ahụ ndị ike gwụrụ. Ha na-eteta ụra n’ike ọgwụgwụ, na-aga ọrụ ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ n’ike ọgwụgwụ, na-alọta n’ebe obibi ha n’ike ọgwụgwụ, na-alakpukwa ụra ọ bụghị nanị n’ike ọgwụgwụ kama n’oké ike ọgwụgwụ. Ụfọdụ na-enwe ọchịchọ ịga otu ebe ma nwetatụ ezumike ha na-achọsi ike. Dị ka ndị ohu Jehova, ike na-agwụkwa anyị, n’ihi na ndụ nsọpụrụ Chineke anyị na-ebi na-achọ njisi ike. (Mak 6:30, 31; Luk 13:24; 1 Timoti 4:8) E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-eme ka ike gwụ anyị.
4 Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị Kraịst, a gụpụghị anyị ná nsogbu ndị ụmụ mmadụ n’ozuzu ha na-enwe. (Job 14:1) Nrịanrịa, ndakpọ akụ̀ na ụba, ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ bụ́ ndị a na-ahụkarị ná ndụ pụrụ ime ka e nwee nkụda mmụọ, tinyere mmetụta ya na-agwụ ike. Tụkwasị n’ihe ịma aka ndị a, e nwere ọnwụnwa ndị ndị a na-akpagbu n’ihi ezi omume na-eche ihu. (2 Timoti 3:12; 1 Pita 3:14) N’ihi nrụgide ụwa na-akpata kwa ụbọchị na mmegide a na-emegide ọrụ nkwusa Alaeze anyị, ike pụrụ nnọọ ịgwụ ụfọdụ n’ime anyị nke na ọ ga-adị anyị ka anyị selata aka n’ozi Jehova. Ọzọkwa, ná mgbalị Setan bụ́ Ekwensu na-eme iji mebie nguzosi ike n’ezi ihe anyị nye Chineke, ọ na-eji ụzọ ọ bụla ruru ya aka eme ihe. Oleezinụ otú anyị pụrụ isi nweta ike ime mmụọ a chọrọ iji nọgide n’enweghị ike ọgwụgwụ nakwa n’akwụsịghị akwụsị?
5. N’ihi gịnị ka e ji chọọ ihe karịrị ike mmadụ iji na-eje ozi ndị Kraịst?
5 Iji nweta ike ime mmụọ, anyị aghaghị ịdabere n’ebe Jehova, bụ́ Onye Okike kasị ike, nọ. Pọl onyeozi mere ka ọ pụta ìhè na ozi ndị Kraịst ga-achọ ihe karịrị ike nkịtị nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè. O dere, sị: “Anyị nwere akụ̀ a n’ite ájá, ka ọkịka nke ike ahụ wee bụrụ nke Chineke, gharakwa isite n’anyị onwe anyị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ndị Kraịst e tere mmanụ na-eje “ozi nke ime ka a dị n’otu” site ná nkwado nke ndị enyi ha bụ́ ndị nwere olileanya ndụ elu ala. (2 Ndị Kọrint 5:18; Jọn 10:16; Mkpughe 7:9) Ebe ọ bụ na anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-arụ ọrụ Chineke n’ime mkpagbu, anyị apụghị ịrụ ya nanị n’ike nke aka anyị. Jehova na-eji mmụọ nsọ ya enyere anyị aka, adịghị ike anyị sikwa otú a na-eme ka ike ya dị ukwuu. Leekwa ka mmesi obi ike ahụ bụ́ na “Jehova na-akwagide ndị ezi omume,” si akasi anyị obi!—Abụ Ọma 37:17.
‘Jehova Bụ Ike Anyị’
6. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si emesi anyị obi ike na Jehova bụ Isi Iyi nke ike anyị?
6 Nna anyị nke eluigwe nwere “ume n’ike,” ọ pụkwara inye anyị ume n’ụzọ dị mfe. N’ezie, a gwara anyị, sị: “[Jehova] na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba. Ọbụna ụmụ okoro na-ada mbà, ike na-agwụkwa ha, ọbụna ụmụ okorobịa na-asụ ngọngọ daa: ma ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu na nkù dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.” (Aịsaịa 40:29-31) N’ihi nrụgide na-akawanye njọ, ọ pụrụ ịdị anyị mgbe ụfọdụ ka anyị bụ ndị ọsọ ụkwụ na-eji. Ma anyị eruwela nnọọ n’ebe a na-agbadebe ọsọ nke ndụ ahụ, anyị agaghịkwa ada mbà ma ọlị. (2 Ihe E Mere 29:11) Onye Iro anyị, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị “dị ka ọdụm na-agbọ ụja,” ọ na-achọkwa ịkwụsị anyị. (1 Pita 5:8) Ka anyị cheta na ‘Jehova bụ ike anyị na ọta anyị,’ o mewokwa ndokwa n’ụba iji ‘nye onye dara mbà ike.’—Abụ Ọma 28:7.
7, 8. Ihe akaebe dị aṅaa ka e nwere na Jehova mere ka Devid, Habakuk, na Pọl sikwuo ike?
7 Jehova nyere Devid ike dị ya mkpa iji gaa n’ihu n’agbanyeghị oké ihe mgbochi dị iche iche. Ya mere, Devid ji okwukwe na obi ike zuru ezu dee, sị: “N’ime Chineke anyị ga-eme ihe dimkpa: ọ bụkwa Ya onwe ya ga-azọda ndị na-akpagbu anyị.” (Abụ Ọma 60:12) Jehova nyekwara Habakuk ume ka o wee nwee ike ịrụchapụ ọrụ e nyere ya dị ka onye amụma. Habakuk 3:19 na-ekwu, sị: “Jehova, bụ́ Onyenwe anyị, bụ ike m, Ọ na-emekwa ụkwụ m abụọ ka ha dị ka ụkwụ ele, ọ bụkwa n’ebe m nile dị elu ka Ọ ga-eme ka M zọọ ije.” Ihe ọzọ kwesịkwara ịrịba ama bụ ihe nlereanya Pọl, bụ́ onye dere, sị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime [Chineke] Nke na-eme m ka m dị ike.”—Ndị Filipaị 4:13.
8 Dị ka Devid, Habakuk, na Pọl, anyị kwesịrị inwe okwukwe n’ikike Chineke nwere ime ka anyị sikwuo ike nakwa n’ike o nwere ịzọpụta anyị. Ebe anyị mataworo na Eze Onyenwe anyị Jehova bụ Isi Iyi nke “ike” anyị, ka anyị tụlezie ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi nweta ike ime mmụọ site ná ndokwa ndị Chineke na-eme n’ụba.
Ndokwa Ime Mmụọ Iji Nye Anyị Ume
9. Òkè dị aṅaa ka mbipụta ndị Kraịst na-ekere n’idozi anyị ahụ?
9 Iji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ site n’enyemaka nke mbipụta ndị Kraịst pụrụ inye anyị ume ma kwagide anyị. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ . . . [nke ọ bụ] n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị. Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” (Abụ Ọma 1:1-3) Dị nnọọ ka anyị na-aghaghị iri nri iji nọgide na-adị ike n’anụ ahụ, ọ dị anyị mkpa iri nri ime mmụọ Chineke na-akwadebe site n’Okwu ya na mbipụta ndị Kraịst iji nọgide na-adị ike n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, ọmụmụ ihe na ntụgharị uche nwere nzube dị oké mkpa.
10. Olee mgbe anyị pụrụ iwepụta oge maka ọmụmụ ihe na ntụgharị uche?
10 Ọ bụ ihe na-akwụghachi ụgwọ n’ezie bụ́ ịtụgharị uche ‘n’ihe nile dị omimi nke Chineke.’ (1 Ndị Kọrint 2:10) Ma olee mgbe anyị pụrụ ịchọta oge maka ntụgharị uche? Ọkpara Abraham bụ́ Aịsak “[pụrụ ka o wee tụgharịa] uche ya n’ọhịa na mgbe anyasị.” (Jenesis 24:63-67) Ọbụ abụ bụ́ Devid ‘tụgharịrị uche banyere Chineke n’ime nche abalị nile.’ (Abụ Ọma 63:6) Anyị pụrụ ịmụ Okwu Chineke ma tụgharịa uche na ya n’ụtụtụ, n’uhuruchi, n’abalị—n’ezie, n’oge ọ bụla. Ụdị ọmụmụ ihe na ntụgharị uche ahụ na-eduga ná ndokwa ọzọ n’ime ndokwa ndị Jehova mere bụ́ ndị na-eme ka anyị sikwuo ike n’ụzọ ime mmụọ—ekpere.
11. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-ewere ikpechi ekpere anya dị ka ihe dị oké mkpa?
11 Ikpeku Chineke ekpere mgbe nile na-enye aka eme ka anyị nwee ume. Ya mere, ka anyị “na-anọgidesinụ ike” n’ekpere. (Ndị Rom 12:12) Mgbe ụfọdụ, ọ dị anyị mkpa ịrịọ kpọmkwem maka amamihe na ike a chọrọ iji nagide ọnwụnwa. (Jemes 1:5-8) Ka anyị na-ekelekwa ma na-eto Chineke mgbe anyị chọpụtara mmezu nke nzube ya ma ọ bụ hụ na o mewo ka anyị sikwuo ike ịga n’ihu n’ozi ya. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-anọ Jehova nso n’ekpere, ọ gaghị agbahapụ anyị ma ọlị. “Lee,” ka Devid bụrụ n’abụ, “Chineke bụ onye na-enyere m aka.”—Abụ Ọma 54:4.
12. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-arịọ Chineke maka mmụọ nsọ ya?
12 Nna anyị nke eluigwe na-enye anyị ume ma na-eme ka anyị sikwuo ike site ná mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ. Pọl dere, sị: “[Ana m egbu] ikpere m abụọ n’ala nye Nna anyị, . . . ka O wee nye unu, dị ka akụ̀ nke ebube Ya si dị, ka e were ike mee ka unu dị ike site n’aka Mmụọ Ya na-abata n’ime mmadụ ime unu.” (Ndị Efesọs 3:14-16) Anyị kwesịrị ikpe ekpere maka mmụọ nsọ, na-enwe obi ike na Jehova ga-eji ya gọzie anyị. Jisọs chere echiche, sị: Ọ bụrụ na nwatakịrị arịọ azụ̀, nna na-ahụ n’anya ọ̀ ga-enye ya agwọ? Ọ dịghị ma ọlị. N’ihi ya, o kwubiri, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu [na-emehie emehie ma si otú a bụrụ ndị] jọrọ njọ, ma unu na-amata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke eluigwe ga-esi aṅaa ghara iwere karị Mmụọ Nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ Ya?” (Luk 11:11-13) Ka anyị jiri obi ike dị otú ahụ na-ekpe ekpere ma na-echeta mgbe nile na Chineke pụrụ ime ka ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi “dị ike” site ná mmụọ ya.
Ọgbakọ, Ihe Enyemaka Na-ewusi Ike
13. Ànyị kwesịrị isi aṅaa na-ele nzukọ ndị Kraịst anya?
13 Jehova na-enye anyị ume site ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ ndị Kraịst. Jisọs kwuru, sị: “Ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọworo n’aha m, n’ebe ahụ ka M nọ n’etiti ha.” (Matiu 18:20) Mgbe Jisọs kwere nkwa ahụ, ọ na-ekwu banyere okwu ndị ọ dị mkpa ka ndị na-edu ndú n’ọgbakọ lebara anya. (Matiu 18:15-19) Otú ọ dị, ụkpụrụ dị n’okwu ya metụtara nzukọ na mgbakọ nile anyị, bụ́ ndị a na-eji ekpere e kpere n’aha ya emeghe ma na-emechi. (Jọn 14:14) Ya mere, ọ bụ ihe ùgwù ịga mgbakọ ndị Kraịst dị otú ahụ, ma ọ̀ bụ mmadụ ole na ole na-aga ha ma ọ̀ bụ ọtụtụ puku mmadụ na-aga ha. Ya mere, ka anyị na-egosipụta ekele maka ihe omume ndị a e dokwara iji wusie anyị ike n’ụzọ ime mmụọ na iji na-akpasu n’ime anyị ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche.—Ndị Hibru 10:24, 25.
14. Uru dị aṅaa ka anyị na-erite site ná mgbalị nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye?
14 Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-enye aka ma na-enye agbamume ime mmụọ. (1 Pita 5:2, 3) Pọl nyeere ọgbakọ ndị o letara aka ma gbaa ha ume, dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eme taa. N’ezie, ọ gụsiri ya agụụ ike iso ndị kwere ekwe ibe ya nọrọ ka ha wee nwee ike ịgbarịta ibe ha ume n’ụzọ na-ewuli elu. (Ọrụ 14:19-22; Ndị Rom 1:11, 12) Ka anyị na-egosi ekele mgbe nile maka ndị okenye ọgbakọ anyị na ndị Kraịst ndị ọzọ bụ́ ndị nlekọta, bụ́ ndị na-ekere òkè dị ukwuu n’iwusi anyị ike n’ụzọ ime mmụọ.
15. Olee otú ndị kwere ekwe ibe anyị nọ n’ọgbakọ anyị si egosi na ha bụ “ndị ngụgụ obi”?
15 Ndị kwere ekwe ibe anyị bụ́ ndị mejupụtara ọgbakọ anyị pụrụ ịbụrụ anyị “ndị ngụgụ obi.” (Ndị Kọlọsi 4:10, 11) Dị ka ‘ezi ndị enyi,’ ha pụrụ inyere anyị aka n’oge nsogbu. (Ilu 17:17) Dị ka ihe atụ, mgbe a tọhapụrụ ndị ohu Chineke dị 220 n’ogige ịta ahụhụ Sachsenhausen nke dị n’aka ndị nche Nazi na 1945, ha ji ụkwụ mee njem ruru kilomita 200. Ha mere njem ahụ n’ìgwè, ndị ka ike jikwa obere ụgbọ ole na ole e ji aka akwagharị buru ndị na-esighị ike karị. Gịnị si na ya pụta? Na njem ọnwụ nke tara isi ihe karịrị 10,000 mmadụ a kpọchiri n’ogige ịta ahụhụ, ọ dịghị otu n’ime Ndịàmà Jehova nwụrụnụ. Ihe ndekọ ndị dị otú ahụ bụ́ ndị na-apụta n’akwụkwọ ndị Watch Tower na-ebipụta, gụnyere Yearbook of Jehovah’s Witnesses na Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, na-egosi na Chineke na-enye ndị ya ume, nke mere na ike adịghị agwụ ha.—Ndị Galetia 6:9. *
Ozi Ubi Anyị Na-ewusi Anyị Ike
16. Olee otú ikerechi òkè anya n’ozi si ewusi anyị ike n’ụzọ ime mmụọ?
16 Ikerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa Alaeze na-ewusi anyị ike n’ụzọ ime mmụọ. Ọrụ dị otú ahụ na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’Alaeze Chineke na iburu mgbe ebighị ebi nakwa atụmanya ya Jud 20, 21) Nkwa ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị anyị na-ekwu banyere ha n’ozi anyị na-enye anyị olileanya, ha pụkwara ime ka anyị nwee mkpebi siri ike dị ka Maịka onye amụma, bụ́ onye kwuru, sị: “Anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Maịka 4:5.
ndị dị ngọzi n’uche. (17. Aro ndị dị aṅaa ka a tụrụ banyere ọmụmụ Bible ebe obibi?
17 A na-eme ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike ka anyị na-ejikwu Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’izi ndị ọzọ ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị ji akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịgụ na ịkọwa ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Nke a na-enyere onye ahụ a na-amụrụ ihe aka, na-emekwa ka nghọta anyị nwere banyere ihe ime mmụọ gbanyekwuo mkpọrọgwụ. Ọ bụrụ na ọ na-esiri onye a na-amụrụ ihe ike ịghọta otu echiche ma ọ bụ otu ihe atụ nke Bible, a pụrụ iji ihe karịrị otu ugboro mụchaa otu isiakwụkwọ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Lee ka anyị si enwe obi ụtọ ịkwadebe nke ọma na imekwu mgbalị iji nyere ndị ọzọ aka ịbịaru Chineke nso!
18. Nye ihe atụ nke otú e si eji akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe n’ụzọ dị irè.
18 Kwa afọ, a na-eji akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe n’ụzọ dị irè iji nyere ọtụtụ puku mmadụ aka ịghọ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye, nke a na-agụnyekwa ọtụtụ bụ́ ndị na-enweghị ihe ọmụma ọ bụla banyere Bible. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwoke bụ́ onye Hindu nke nọ na Sri Lanka ka bụ nwata, ọ nụpeere ka otu Onyeàmà na-ekwu banyere Paradaịs. Afọ ụfọdụ mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gakwuuru Onyeàmà ahụ, n’oge na-adịghịkwa anya, di ya malitere iduziri ya ọmụmụ Bible. N’ezie, nwa okorobịa ahụ na-abịa kwa ụbọchị maka ọmụmụ ihe, ọ mụchakwara akwụkwọ Ihe Ọmụma n’oge dịtụ mkpirikpi. Ọ malitere ịga nzukọ nile, kewapụ onwe ya n’okpukpe ọ na-ekpebu, ma ghọọ onye nkwusa Alaeze. Mgbe e mere ya baptism, ọ nọworị na-eduziri otu onye ọ maara nke ọma ọmụmụ Bible ebe obibi.
19. Ka anyị na-ebu ụzọ achọ Alaeze ahụ, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka?
19 Ibu ụzọ achọ Alaeze ahụ na-ewetara anyị ọṅụ nke na-ewusi anyị ike. (Matiu 6:33) Ọ bụ ezie na anyị na-enweta ule dị iche iche, anyị na-anọgide na-eji obi ụtọ na ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma ahụ. (Taịtọs 2:14) Ọtụtụ n’ime anyị na-eru ihe a chọrọ maka ozi ọsụ ụzọ oge nile, ụfọdụ na-ejekwa ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị na-ezisa ozi ọma. Ma ànyị ji ọṅụ akwalite ọdịmma Alaeze n’ụzọ ndị a ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ, anyị nwere obi ike na Jehova agaghị echezọ ọrụ anyị na ịhụnanya anyị gosiri n’ebe aha ya dị.—Ndị Hibru 6:10-12.
Na-aga n’Ihu n’Ike Jehova
20. Olee otú anyị pụrụ isi na-egosi na anyị na-elegara Jehova anya maka ike?
20 Ka anyị jiri ọchịchọ obi anyị dum na-egosipụta na anyị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ma na-elegara ya anya maka ike. Anyị pụrụ ime nke ahụ site n’irite uru n’ụzọ zuru ezu ná ndokwa ime mmụọ ndị o si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi,” na-eme. (Matiu 24:45) Ịmụ Okwu Chineke n’onwe anyị nakwa n’ọgbakọ site n’iji mbipụta ndị Kraịst na-eme ihe, ikpe ekpere sitere n’ala ala obi, enyemaka ime mmụọ nke ndị okenye, ezi ihe nlereanya nke ndị kwere ekwe ibe anyị na-ekwesị ntụkwasị obi, na ikerechi òkè anya n’ozi socha ná ndokwa ndị na-eme ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike ma na-enye anyị ike ịga n’ihu n’ozi ya dị nsọ.
21. Olee otú ndị ozi bụ́ Pita na Pọl si gosipụta mkpa ike Chineke na-enye dị?
21 N’agbanyeghị adịghị ike anyị dị ka ụmụ 1 Pita 4:11) Pọl gosipụtakwara ndabere ọ dabeere n’ike Chineke na-enye mgbe o kwuru, sị: “Adịghị ike nile na ime m ihe ihere nile na mkpa nile na nsogbu nile na oké mkpa nile n’ihi Kraịst dị m ezi mma: n’ihi na mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:10) Ka anyị na-egosi otu nkwenye ahụ ma na-ewetara Eze Onyenwe anyị Jehova otuto, bụ́ onye na-enye onye ike gwụrụ ume.—Aịsaịa 12:2.
mmadụ, Jehova ga-eme ka anyị sikwuo ike n’ime uche ya ma ọ bụrụ na anyị adabere n’ebe ọ nọ maka enyemaka. N’ịmara banyere mkpa enyemaka dị otú ahụ dị, Pita onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eje ozi, ya jee dị ka o sitere n’ike ahụ Chineke na-enyezu.” ([Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 15 Ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• N’ihi gịnị ka ihe karịrị ike nkịtị ji dị ndị Jehova mkpa?
• Olee ihe akaebe dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na Chineke na-enye ndị ohu ya ike?
• Olee ụfọdụ ndokwa ime mmụọ ndị Jehova meworo iji wusie anyị ike?
• Ànyị pụrụ isi aṅaa na-egosi na anyị na-elegara Chineke anya maka ike?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 12]
A na-eme ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike ka anyị na-eji Bible ezi ndị ọzọ ihe