Ịchọta Nchebe n’Ụwa nke Jupụtara n’Ihe Ize Ndụ
Ịchọta Nchebe n’Ụwa nke Jupụtara n’Ihe Ize Ndụ
IJE ije n’ebe e liri ogbunigwe pụrụ ịkpata ọnwụ. Otú ọ dị, ọ̀ bụ na ọ gaghị enye aka ma ọ bụrụ na i nwere map na-egosi ebe ndị e liri ogbunigwe ahụ? Tụkwasị na nke a, gịnị ma ọ bụrụ na a zụwo gị ịmata ogbunigwe ndị ahụ. N’ụzọ doro anya, ihe ọmụma dị otú ahụ ga-ebelata ihe ize ndụ i nwere ịbụ onye ọ ga-akwarụ ma ọ bụ gbuo.
A pụrụ iji Bible tụnyere map ahụ nakwa inweta ọzụzụ n’otú e si amata ogbunigwe. Bible nwere ihe ọmụma na-enweghị atụ ma a bịa n’izere ihe ize ndụ na idozi nsogbu ndị na-ebilite ná ndụ.
Rịba ama nkwa na-emesi obi ike a na-achọta n’Ilu 2:10, 11: “N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị.” Amamihe na nghọta a kpọtụrụ aha ebe a esiteghị n’aka mmadụ kama ha sitere n’aka Chineke. “Ma onye na-ege [amamihe Chineke] ntị ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ ga-anọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.” (Ilu 1:33) Ka anyị hụ otú Bible pụrụ isi mee ka anyị nọrọkwuo ná nchebe ma nyere anyị aka izere ọtụtụ nsogbu.
Izere Ihe Mberede Ndị Na-akpata Ọnwụ
Ọnụ ọgụgụ Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) bipụtara na nso nso a na-egosi na ọnwụ ndị ihe mberede okporo ụzọ na-akpata n’otu afọ n’ụwa nile dị ihe dị ka 1,171,000. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ 40 ọzọ na-emerụ ahụ, ihe karịrị nnọọ nde mmadụ 8 na-enwe nkwarụ na-adịte aka.
Ọ bụ ezie na inwe nchebe zuru ezu mgbe a na-akwọ ụgbọala apụghị ikwe omume, anyị na-aka enwe nchebe mgbe anyị na-erube isi n’iwu ndị na-achịkwa okporo ụzọ. N’ikwu banyere ndị ọchịchị, bụ́ ndị na-enye ma na-ahụ na e debere iwu ndị na-achịkwa okporo ụzọ, Bible na-ekwu, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya.” (Ndị Rom 13:1) Ndị ọkwọ ụgbọala bụ́ ndị na-erube isi na ndụmọdụ a na-ebelata ihe ize ndụ nke inwe ihe mberede, ya na ihe ndị dị egwu ọ na-arụpụta.
Ihe ọzọ na-akpali iji mkpachapụ anya akwọ ụgbọala bụ nkwanye ùgwù maka ndụ. Bible na-ekwu banyere Jehova Chineke, sị: “N’ebe Ị nọ ka isi iyi ndụ dị.” (Abụ Ọma 36:9) Ya mere ndụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke. N’ihi ya, o rughịrị anyị ịnapụ onye ọ bụla onyinye ahụ ma ọ bụ igosipụta enweghị nkwanye ùgwù maka ndụ, gụnyere, n’ezie, nke anyị onwe anyị.—Jenesis 9:5, 6.
Dị ka o kwesịrị ịdị, ịkwanyere ndụ mmadụ ùgwù na-agụnye ijide n’aka na ụgbọala anyị na ebe obibi anyị dị nnọọ nchebe ruo n’ókè ezi uche dị na ya o kwere mee. N’Israel oge ochie, nchebe bụ ihe a na-ebute nnọọ ụzọ n’akụkụ nile nke ndụ. Dị ka ihe atụ, mgbe e wuru ụlọ, Iwu Chineke chọrọ ka elu ya—bụ́ ebe ezinụlọ na-anọ Deuterọnọmi 22:8) Ọ bụrụ na mmadụ adaa n’ihi na e debeghị iwu nchebe a, Chineke na-ajụta ọbara onye ahụ n’aka onye nwe ụlọ ahụ. Obi abụọ adịghị ya na idebe ụkpụrụ ịhụnanya ahụ nke dị n’iwu a ga-ebelata ihe mberede n’ebe ọrụ ma ọ bụ ọbụna n’ebe ntụrụndụ.
nnọọ eme ọtụtụ ihe—nwee ihe mgbochi gburugburu. “Ị ga-emekwara elu ụlọ gị ihe mgbochi gburugburu, ka ị ghara ime ka ọbara dị n’ụlọ gị, mgbe mmadụ ga-esi na ya daa.” (Imeri Ihe Iri Ahụ Ndị Na-egbu Egbu
Dị ka WHO (Òtù Ahụ Ike Ụwa) si kwuo, e nwere ugbu a ihe karịrị otu ijeri ndị na-ese ụtaba n’ụwa, a pụkwara ikwu na ihe dị ka nde mmadụ anọ na-anwụ kwa afọ n’ihi ụtaba. A na-atụ anya na ọnụ ọgụgụ a ga-arị elu ruo ihe dị ka nde 10 n’afọ 20 ruo 30 na-abịanụ. Ọtụtụ nde ndị ọzọ na-ese ụtaba, nakwa ndị na-eji ọgwụ “ntụrụndụ” eme ihe, ga-emebi ahụ ike na ọdịdị nke ndụ ha n’ihi ịbụ ndị ha riri ahụ.
N’agbanyeghị na Okwu Chineke akpọtụghị iji ụtaba na ọgwụ ọjọọ eme ihe aha kpọmkwem, ụkpụrụ ya pụrụ ichebe anyị pụọ n’omume ndị a. Dị ka ihe atụ, 2 Ndị Kọrint 7:1 na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ka anyị sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ.” Obi abụọ adịghị ya na ọgwụ na-emerụ ahụ ndị dị n’ụtaba na ọgwụ ọjọọ dị iche iche na-emetọ mmadụ. Ọzọkwa, Chineke chọrọ ka ahụ anyị dị “nsọ,” nke pụtara ịdị ọcha. (Ndị Rom 12:1) Ọ̀ bụ na i kweghị na itinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ ga-ebelata ihe ize ndụ pụtara ìhè ná ndụ mmadụ?
Imeri Àgwà Ndị Dị Ize Ndụ
Ọtụtụ mmadụ adịghị emeru ihe n’ókè ma a bịa n’iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ. Ihe ndị na-esi n’iribiga ihe ókè apụta pụrụ ịgụnye ọrịa shuga, ọrịa cancer, na ọrịa obi. Ịnụbiga mmanya na-aba n’anya ókè na-eduga ná nsogbu ndị ọzọ, dị ka aṅụrụma, ọrịa cirrhosis, ezinụlọ tisasịrị etisasị, na ihe mberede okporo ụzọ. N’akụkụ nke ọzọ gabigara ókè, ịhọbiga nri ókè pụkwara imerụ ahụ, ọ pụkwara iduga ná nsogbu iri ihe bụ́ nke na-eyi ndụ egwu dị ka nsogbu achọghị iri ihe.
Ọ bụ ezie na Bible abụghị akwụkwọ ahụ ike, ọ na-enye ndụmọdụ guzo kwem ná mkpa ọ dị iriru ihe na ịṅụru ihe ọṅụṅụ n’ókè. “Nụrụ, gị onwe gị, nwa m, wee mara ihe, meekwa ka obi gị gazie agazie n’ụzọ. Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya vine ókè; n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè: n’ihi na onye na-aṅụbiga mmanya ókè na onye na-eribiga ihe ókè ka a ga-anapụ ihe nile.” (Ilu 23:19-21) Ma, Bible na-asị na iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ kwesịrị ịbụ ihe na-enye obi ụtọ. “Mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bụ.”—Eklisiastis 3:13.
Bible na-agbakwa ume ka e nwee omume kwesịrị ekwesị n’ebe mmega ahụ dị, na-ekwenye na “ọnwụnwa nke ahụ bara uru nye ihe nta.” Ma ọ na-agbakwụnye, sị: “Nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Ị pụrụ ịjụ sị, ‘Olee otú nsọpụrụ Chineke si baa uru ọbụna ugbu a?’ N’ọtụtụ ụzọ. E wezụga ime ka e nwee akụkụ ime mmụọ dị oké mkpa ná ndụ mmadụ, nsọpụrụ Chineke na-eme ka a zụlite àgwà ndị bara uru dị ka ịhụnanya, ọṅụ, udo, na ogologo ntachi obi—ndị na-atụnyecha ụtụ n’inwe echiche ziri ezi na ezi ahụ ike.—Ndị Galetia 5:22, 23.
Ihe Ndị Dị Ilu Omume Rụrụ Arụ Na-akpata
Taa, ọtụtụ nde mmadụ agbahapụla iwu nile na-achịkwa omume ọma. Ntiwapụ nke ọrịa AIDS bụ otu n’ime ihe ndị si na ya pụta. Dị ka òtù WHO si kwuo, ihe karịrị nde mmadụ 16 anwụwo kemgbe ọrịa AIDS tiwapụrụ, ugbu a kwa, ihe dị ka nde mmadụ 34 bu nje HIV, bụ́ nje na-akpata AIDS. Ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa AIDS butere ya site n’ịkwa iko aghara aghara, na ndụdụ ndị e metọrọ emetọ nke ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ na-eji eme ihe, ma ọ bụ ná mmịnye ọbara.
Ilu 7:23 na-akọwa ihe na-atụ egwu na-esi n’ịkwa iko abịa dị ka ‘akụ́ na-agbapu imeju.’ Ọrịa ọta kpụrụkpụrụ na-awakpokarị imeju, dịkwa ka ịba ọcha n’anya na-eme. Ee, lee ka ndụmọdụ Bible bụ́ ka ndị Kraịst ‘hapụ ọbara na ịkwa iko’ si bụrụ nke e nyere n’oge ya na nke ịhụnanya’!—Ọrụ 15:28, 29.
Ihe ndị ọzọ omume rụrụ arụ na-akpata gụnyere ọrịa herpes, gonorrhea, ịba ọcha n’anya nke B na C, na ọrịa ọta kpụrụkpụrụ. Ọ bụ ezie na e jighị okwu ahụ ike ndị dị otú ahụ mee ihe n’oge Bible, a maara akụkụ ahụ ndị ọrịa ụfọdụ a na-ebutekarị site ná mmekọahụ n’oge ahụ na-emetụta. Dị ka ihe atụ,Ọnyà nke Ịhụ Ego n’Anya
Ná mgbalị iji baa ọgaranya ngwa ngwa, ọtụtụ ndị na-eji ego ha eme ihe ndị dị nnọọ ize ndụ. N’ụzọ dị mwute, ime ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ na-eduga ná mfu ma ọ bụ n’ibibi ego. Otú ọ dị, Bible na-agwa onye na-ejere Chineke ozi, sị: “Ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka ya abụọ rụọ ezi ihe, ka o wee nwee ihe ya na onye nọ ná mkpa ga-eketa.” (Ndị Efesọs 4:28) N’eziokwu, ọ bụghị mgbe nile ka onye na-arụsi ọrụ ike na-emesị ghoọ ọgaranya. Ma, ọ na-enwe obi iru ala, ùgwù onwe onye, na ikekwe ọbụna ego ndị o nwere ike itinye n’ihe ndị kwesịrị ekwesị.
Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpuo n’ime mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi 1 Timoti 6:9, 10) A gaghị agọnahụ na ọtụtụ “ndị na-ezube ịbụ ọgaranya” na-aba ọgaranya. Ma gịnị ka ọ na-efu ha? Ọ̀ bụ na ọ bụghị eziokwu na ọ na-enwe mmetụta ọjọọ n’ahụ ike, ezinụlọ, ọnọdụ ime mmụọ, na ọbụna ụra ha?—Eklisiastis 5:12.
ike, . . . ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dupuo onwe ha.” (Onye maara ihe na-aghọta na “ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị.” (Luk 12:15) Ego na ihe onwunwe ụfọdụ dị mkpa n’ihe ka n’ọtụtụ obodo. N’ezie, Bible na-ekwu na “ego bụkwa ndò,” ma ọ na-agbakwụnye na “ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:12) N’adịghị ka ego, ezi ihe ọmụma na amamihe pụrụ inyere anyị aka n’ọnọdụ nile, ma karịsịa n’okwu ndị metụtara ndụ anyị.—Ilu 4:5-9.
Mgbe Nanị Amamihe Ga-echebe Anyị
N’isi nso, ezi amamihe ‘ga-eme ka ndị nwe ya dị ndụ’ n’ụzọ na-enweghị atụ—nchebe gabiga “mkpagbu ukwu” nke ji ọsọ na-abịa, bụ́ mgbe Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume. (Matiu 24:21) N’oge ahụ, ndị mmadụ ga na-atụfu ego ha n’okporo ámá dị ka “ihe ịsọ nsọ,” dị ka Bible si kwuo. N’ihi gịnị? N’ihi na ha ga-amụtawo n’ụzọ dị ilu na ọlaedo na ọlaọcha agaghị azụtara ha ndụ “n’ụbọchị nrubiga ókè nke iwe Jehova.” (Ezikiel 7:19) N’aka nke ọzọ, “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị ji amamihe ‘kpadoo akụ̀ n’eluigwe’ site n’ibute ọdịmma ime mmụọ ụzọ ná ndụ ha, ga-erite uru site n’ebe e ji n’aka ha tinyere akụ̀ ha ma nweta ndụ agwụghị agwụ n’ụwa paradaịs.—Mkpughe 7:9, 14; 21:3, 4; Matiu 6:19, 20.
Olee otú anyị pụrụ isi nweta ọdịnihu a dị nchebe? Jisọs na-aza, sị: “Ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọtụtụ nde mmadụ achọtawo ihe ọmụma a n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ọ bụghị nanị na ndị dị otú ahụ nwere olileanya dị ebube maka ọdịnihu kamakwa ha na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke udo na ịnọ ná nchebe ugbu a. Ọ dị nnọọ dị ka ọbụ abụ ahụ si kwuo ya: “N’udo ka m ga-eji otu mgbe ahụ dinaa ala, rahụ ụra: n’ihi na Gị onwe gị, Jehova, nanị Gị, na-eme ka m biri ná ntụkwasị obi.”—Abụ Ọma 4:8.
Ị̀ pụrụ icheta ebe ọzọ e si enweta ihe ọmụma nke pụrụ inye aka belata ihe ize ndụ nke ahụ ike nakwa nke ndụ gị ruo n’ókè a na-enweta ya na Bible? Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ nwere ikike Bible nwere, ọ dịghịkwa akwụkwọ ọzọ pụrụ inyere gị aka ịchọta ezi nchebe n’ụwa taa nke jupụtara n’ihe ize ndụ. Gịnị ma ị tụlekwuo ya?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]
Ahụ Ike na Nchebe Ka Mma—Site n’Enyemaka Bible
Iji gbanahụ ihe ndị na-eme ná ndụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ́ Jane * zụlitere àgwà nke iji wii wii, ụtaba, cocaine, amphetamine, LSD, na ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ eme ihe. Ọ nọ na-aṅụbigakwa mmanya ókè. Dị ka Jane si kwuo, di ya nọkwa n’ọnọdụ yiri nke ahụ. Ọdịnihu ha yiri nke olileanya na-adịghị na ya. Mgbe ahụ, Jane zutere Ndịàmà Jehova. Ọ malitere ịga nzukọ ndị Kraịst na ịgụ Ụlọ Nche na magazin a na-ebipụtakọ ya na ya, bụ́ Teta!, bụ́ nke o sooro di ya gụọ. Ha abụọ malitere iso Ndịàmà na-amụ Bible. Ka ha bịara ghọta ụkpụrụ ndị dị elu nke Jehova, ha kwụsịrị iji ihe nile na-eri ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Gịnị si na ya pụta? “Ndụ ọhụrụ anyị ewetaworo anyị ọṅụ dị nnọọ ukwuu,” ka Jane dere mgbe afọ ụfọdụ gasịrị. “Enwere m nnọọ ekele n’ebe Jehova nọ maka ike ịsachapụ mmadụ nke Okwu ya nwere nakwa maka ndụ ahụ efe na nke ahụ isi ike bụ́ nke anyị na-adị ugbu a.”
Abamuru nke ịbụ onye e were n’ọrụ na-akwụwa aka ọtọ pụtara nnọọ ìhè n’ọnọdụ Kurt, bụ́ onye ọrụ ya gụnyere ilekọta kọmputa. Ngwá ọrụ ndị ọhụrụ bịara dị mkpa, onye wekwara Kurt n’ọrụ nyere ya ọrụ nke inweta ha n’ọnụ ahịa dị mma. Kurt chọtara onye kwesịrị ekwesị ga-eresị ha ngwá ahịa ndị ahụ, ha kwekọrịtakwara n’ọnụ ahịa ha. Otú ọ dị, akawo nke onye ahụ resịrị ha ngwá ahịa ndị ahụ dehiere ihe n’ebe o depụtara ọnụ ahịa nke ngwá ahịa ndị ahụ, nke mere na ọnụ ahịa ha ji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ $40,000 (U.S.) dị ala karịa ihe ha kwekọrịtara. Mgbe Kurt hụrụ ndehie ihe ahụ, ọ kpọrọ ụlọ ọrụ ahụ, onye manịja ya kwukwara na n’afọ 25 ya rụworo ọrụ, na ya ahụtụbeghị ụdị ịkwụwa aka ọtọ ahụ. Kurt kọwara na ọ bụ Bible kpụziri akọ na uche ya. Ihe si na ya pụta bụ na onye manịja ahụ rịọrọ ka e nye ya mkpụrụ 300 n’ime mbipụta Teta! nke kwuru banyere ịkwụwa aka ọtọ n’achụmnta ego ka o wee nye ya ndị ọrụ ibe ya. N’ebe Kurt nọ, ịkwụwa aka ọtọ ya dugara ya n’ịbụ onye e buliri n’ọkwá.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 30 A gbanwewo aha ndị ahụ.
[Foto dị na peeji nke 7]
“Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru.”—AỊSAỊA 48:17