Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe Na-agwọ Otubo Gị”

“Ihe Na-agwọ Otubo Gị”

“Ihe Na-agwọ Otubo Gị”

E KWEERE na ọ bụ nrụgide mmetụta uche ndị dị ka egwu, iru újú, anyaụfụ, iwe, ịkpọasị, na obi amamikpe na-akpata ihe ka ukwuu ná nrịanrịa nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ihi nke a, lee ka okwu Bible bụ́ na ‘ịtụ egwu Jehova’ bụ ‘ihe na-agwọ otubo gị, bụrụkwa ụmị dịịrị ọkpụkpụ gị nile’ si bụrụ nke na-akasi obi!—Ilu 3:7, 8.

Ọkpụkpụ bụ ihe na-akwado ahụ. N’ihi ya, Bible na-eji okwu bụ́ “ọkpụkpụ” eme ihe n’ụzọ ihe ntụnyere, iji nọchite anya ọdịdị mmadụ—karịsịa dị ka mmetụta ndị miri emi na mmetụta uche si emetụta ya. Ma olee otú ịtụ egwu Jehova si bụrụ “ihe na-agwọ otubo gị”?

Ndị ọkà mmụta Bible ekwekọrịtaghị n’echiche ha banyere mkpọtụ a kpọtụrụ “otubo” aha n’akụkụ ihe odide a. Otu onye nkọwa na-ekwu na ebe ọ bụ na “otubo” dị n’ebe “etiti nke ahụ,” ọ pụrụ ịnọchite anya akụkụ ahụ nile ndị dị mkpa. Onye ọkà mmụta ọzọ na-enye echiche na okwu ahụ bụ́ “otubo” pụrụ ịpụta alọ, dị ka e si jiri ya mee ihe n’Ezikiel 16:4. Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na Ilu 3:8 na-eme ka mkpa ọ dị anyị ịdabere kpam kpam n’ebe Chineke nọ pụta ìhè—dị nnọọ ka nwa e bu n’afọ nke na-apụghị ichebe onwe ya na-adabere n’ebe nne ya nọ maka ihe oriri. Ma, echiche ọzọ bụ na n’ebe a “otubo” pụrụ izo aka n’uru ahụ na akwara nke ahụ. N’ihe a na-ekwu maka ya n’amaokwu a, ọ pụrụ ịbụ na a na-egosi ọdịiche dị n’etiti akụkụ ahụ ndị a na “ọkpụkpụ”—akụkụ ahụ ka sie ike.

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ihe ọ pụtara kpọmkwem, e ji otu ihe n’aka: Igosipụta egwu nsọpụrụ n’ebe Jehova nọ bụ ihe amamihe dị na ya. Ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke pụrụ ịtụnye ụtụ n’ọdịmma anụ ahụ anyị ugbu a. Karịa nke ahụ, ọ pụrụ iwetara anyị ihu ọma Jehova, bụ́ nke ga-eduga ná ndụ agwụghị agwụ n’ahụ ike zuru okè—n’ụzọ anụ ahụ nakwa n’ụzọ mmetụta uche—n’ụwa ọhụrụ ya na-abịanụ.—Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:4; 22:2.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Dr. G. Moscoso/SPL/Photo Researchers