Cyril na Methodius—Ndị Nsụgharị Bible Chepụtara Mkpụrụ Okwu
Cyril na Methodius—Ndị Nsụgharị Bible Chepụtara Mkpụrụ Okwu
“E mewo ndị mba anyị baptism ma anyị enwebeghị onye nkụzi. Anyị adịghị aghọta ma Grik ma Latịn. . . . Anyị adịghị aghọta mkpụrụ okwu ndị e dere ede ma ọ bụ ihe ha pụtara; n’ihi ya, zitere anyị ndị nkụzi bụ́ ndị pụrụ ime ka anyị mara okwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ na ihe ha pụtara.” —Rostislav, eze Moravia, 862 O.A.
TAA, ihe karịrị nde mmadụ 435 bụ́ ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nke Slavic nwere nsụgharị Bible n’asụsụ ala ha. * Nde 360 n’ime ha na-eji mkpụrụ okwu Cyrillic eme ihe. Ma, na narị afọ 12 gara aga e nweghị asụsụ ma ọ bụ mkpụrụ okwu e dere ede n’ire okwu nke ndị nna nna ha. Ndị ikom nyere aka n’idozi ọnọdụ ahụ bụ ụmụnne abụọ aha ha bụ Cyril na Methodius. Ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya ga-achọpụta na mgbalị obi ike na nke ichepụta ihe ọhụrụ nke ụmụnne abụọ a mere bụ akụkụ na-akpali akpali n’akụkọ ihe mere eme nke nchekwa na nkwalite nke Bible. Ole ndị ka ndị ikom a bụ, gịnịkwa bụ ihe mgbochi ndị ha chere ihu?
“Onye Ọkà Ihe Ọmụma” na Gọvanọ
A mụrụ Cyril (827-869 O.A., onye a kpọburu Constantine) na Methodius (825-885 O.A.) n’ezinụlọ a ma ama na Tesalọnaịka, Gris. Tesalọnaịka bụ obodo na-asụ asụsụ abụọ mgbe ahụ; ndị bi na ya na-asụ Grik na ụdị nke Slavic. Inwe ọtụtụ ndị Slav n’ebe ahụ na iso ụmụ amaala ya na ndị nke obodo Slav ndị ọzọ gbara ha gburugburu nwee mkpakọrịta pụrụ inyeworo Cyril na Methodius ohere inwe ihe ọmụma miri emi banyere asụsụ ndị bi na ndịda Slav. Ọbụna otu onye dere akụkọ ndụ Methodius kwukwara na mama ha bụ onye Slav.
Mgbe nna ya nwụsịrị, Cyril kwagara Constantinople bụ́ isi obodo nke Alaeze Ukwu Byzantium. Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum nke ndị eze ukwu ma soro ndị nkụzi bụ́ ndị ọkà kpakọrịta. Ọ ghọrọ onye na-elekọta ọ́bá akwụkwọ nke Hagia Sophia, bụ́ ụlọ chọọchị a kasị mara amara n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ, ma mesịa ghọọ prọfesọ nkà ihe ọmụma. N’eziokwu, n’ihi agụmakwụkwọ ya, Cyril nwetara utu aha bụ́ Onye Ọkà Ihe Ọmụma.
Ka ọ dịgodị, Methodius chụsoro ụdị ọrụ nna ya rụrụ—ndọrọ ndọrọ ọchịchị. O ruru n’ọkwá majie (gọvanọ) n’ógbè dị n’ókè nke Byzantium, bụ́ ebe ọtụtụ ndị Slav biri. Otú o sina dị, ọ banyere n’ebe obibi ndị mọnk na Bitinia, Asia Minor. Cyril mesịrị gaa soro ya nọrọ n’ebe ahụ na 855 O.A.
Na 860 O.A., onyeisi ndị bishọp nke Constantinople
zijere ụmụnne abụọ ahụ ije ozi ná mba ọzọ. E zijere ha n’ebe ndị Khazar, bụ́ ndị bi n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke Oké Osimiri Ojii, bụ́ ndị ka na-ala azụ ikpebi ma ha ga-esonyere okpukpe Alakụba, nke ndị Juu, ma ọ bụ Iso Ụzọ Kraịst. Ka ọ na-aga ebe ahụ, Cyril nọrọ oge ụfọdụ na Chersonese nke dị na Crimea. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na ọ mụtara asụsụ Hibru na nke Sameria n’ebe ahụ nakwa na ọ sụgharịrị ụtọasụsụ Hibru gaa n’asụsụ nke ndị Khazar.Ọkpụkpọ Òkù Sitere Moravia
Na 862 O.A., Rostislav, bụ́ eze Moravia (bụ́ ebe ọwụwa anyanwụ Czechia, ebe ọdịda anyanwụ Slovakia, na ebe ọdịda anyanwụ Hungary nke oge a), rịọrọ Eze Ukwu nke Byzantium bụ́ Michael nke Atọ arịrịọ, bụ́ nke e depụtara na paragraf mbụ—ka o zite ndị nkụzi nke Akwụkwọ Nsọ. Ndị ozi ala ọzọ sitere n’alaeze Ebe Ọwụwa Anyanwụ nke Frank (nke bụ́ Germany na Austria ugbu a) akụzitụwororị ụmụ amaala Moravia bụ́ ndị na-asụ asụsụ Slav, ozizi chọọchị. Otú ọ dị, Rostislav nwere nchegbu banyere ikike ọchịchị na nke chọọchị ndị agbụrụ Germany nwere. O nwere olileanya na isoro Constantinople nwee njikọ ga-enyere ya aka ime ka mba ya nọgide bụrụ nke nweere onwe ya n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa nke okpukpe.
Eze ukwu ahụ kpebiri izije Methodius na Cyril na Moravia. Ụmụnne abụọ ahụ nwere ihe a chọrọ n’ụzọ agụmakwụkwọ, n’ụzọ mmụta, na n’ịma ọtụtụ asụsụ, iji gaa ozi dị otú ahụ. Onye na-ede akụkọ ndụ na narị afọ nke itoolu na-agwa anyị na n’ịgba ha ume ka ha jee Moravia, eze ukwu ahụ gwara ha, sị: “Unu abụọ bụcha ụmụ afọ Tesalọnaịka, ndị Tesalọnaịka nile na-asụkwa ezigbo Slav.”
E Wepụta Otu Mkpụrụ Okwu na Otu Nsụgharị Bible
N’ọnwa ndị bu ụzọ tupu ọpụpụ ha, Cyril kwadebere maka njem ahụ site n’imepụta mkpụrụ okwu a na-ede ede maka ndị Slav. E kwuwo na o nwere ntị dị nkọ n’ịnụ ụda asụsụ. Ya mere, n’iji mkpụrụ okwu Grik na nke Hibru eme ihe, ọ gbalịrị imepụta mkpụrụ okwu maka ụda okwu ọ bụla e nwere na Slavonic. * Ụfọdụ ndị nchọpụta kweere na o buwo ụzọ jiri ọtụtụ afọ tọọ ntọala maka mkpụrụ okwu dị otú ahụ. A ka nwekwara ihe na-edobeghị anya banyere kpọmkwem ọdịdị nke mkpụrụ okwu nke Cyril mepụtara.—Lee igbe bụ́ “Cyrillic ka ọ̀ bụ Glagolitic?”
N’otu oge ahụ, Cyril malitere ọrụ dị ngwa nke ịsụgharị Bible. Dị ka e si kọọ, ọ malitere site n’ịsụgharị nkebi okwu mbụ nke Oziọma Jọn site
na Grik gaa na Slavonic, na-eji mkpụrụ okwu ahụ e mepụtara ọhụrụ eme ihe: “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrịị . . . ” Cyril gara n’ihu ịsụgharị Oziọma anọ ndị ahụ, akwụkwọ ozi Pọl, na akwụkwọ Abụ Ọma.Ọ̀ bụ nanị ya rụrụ ọrụ? O yikarịrị ka Methodius ò nyere aka n’ọrụ ahụ. Ọzọkwa, akwụkwọ bụ́ The Cambridge Medieval History na-ekwu, sị: “Ọ dị mfe iche na [Cyril] nwere ndị ọzọ nyeere ya aka, bụ́ ndị, nke mbụ, na-aghaghị ịbụ ụmụ afọ Slav gụrụ akwụkwọ na Gris. Ọ bụrụ na anyị enyochaa nsụgharị ndị kasị ochie, . . . anyị nwere ihe àmà kasịnụ na asụsụ Slavonic e ji sụgharịa ha bụ nke kasị mma, bụ́ nke a na-aghaghị ikwu na ọ bụ n’ihi ndị nyere aka ná nsụgharị ahụ ndị bụ́kwa ndị Slav n’onwe ha.” Ọ bụ Methodius sụgharịchaziri akụkụ ndị ọzọ nke Bible ahụ, dị ka anyị ga-ahụ.
“Dị Ka Ebe Aṅụ Kpụgidere Mmadụ”
Na 863 O.A., Cyril na Methodius malitere ozi ha na Moravia, bụ́ ebe a nabatara ha n’ụzọ na-ekpo ọkụ. E wezụga ịsụgharị Bible na akwụkwọ ememe okpukpe dị iche iche, ọrụ ha gụnyere ịkụziri otu ìgwè ndị obodo ahụ mkpụrụ okwu Slavonic ahụ e chepụtara ọhụrụ.
Otú ọ dị, ihe nile adịchaghị mfe. Ndị ụkọchukwu Frank nọ na Moravia megidere n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ iji Slavonic eme ihe. Ha kwenyesiri ike n’echiche nke iji nanị asụsụ atọ na-eme ihe, na-ekwu na ọ bụ nanị Latịn, Grik, na Hibru ka a nakweere iji na-eme ihe n’ofufe. N’inwe olileanya inweta nkwado nke popu maka asụsụ ọhụrụ a na-ede ede nke ha chepụtara, ụmụnne abụọ ahụ jere Rom na 867 O.A.
Ka ha na-aga, na Venice, Cyril na Methodius zutere otu ìgwè ọzọ nke ndị ụkọchukwu Latịn bụ́ ndị kwenyere n’iji nanị asụsụ atọ na-eme ihe. Otu onye dere akụkọ ndụ Cyril mgbe ụwa na-emepechabeghị anya na-agwa anyị na ndị bishọp nke obodo ahụ, ndị ụkọchukwu, na ndị mọnk, wakporo ya “dị ka ebe aṅụ kpụgidere mmadụ.” Dị ka ihe ndekọ ahụ si kwuo, Cyril zaghachiri ha site n’ihota 1 Ndị Kọrint 14:8, 9, sị: “N’ihi na a sịkwa na opi ike na-ada nke a na-amaghị isi ya, ònye ga-akwadebe onwe ya ije agha? Otú a unu onwe unu kwa, ma ọ bụrụ na unu ejighị ire kwuo okwu dị mfe ịghọta, à ga-esi aṅaa mara ihe a na-ekwu? n’ihi na unu ga na-ekwu okwu nye ifufe.”
Mgbe ụmụnne ahụ mesịrị ruo Rom, Popu Adrian nke Abụọ nyere ojiji ha ji Slavonic mee ihe nkwado zuru ezu. Mgbe ọnwa ụfọdụ gasịrị, mgbe ha ka nọkwa na Rom, Cyril dara oké ọrịa. N’ihe na-erughị ọnwa abụọ ka e mesịrị, ọ nwụrụ mgbe ọ dị afọ 42.
Popu Adrian nke Abụọ gbara Methodius ume ka ọ laghachi n’ọrụ na Moravia nakwa na gburugburu obodo Nitra, nke bụ́ Slovakia ugbu a. N’ịchọ ime ka ikike Methodius ga-enwe n’ógbè ahụ sikwuo ike, popu ahụ nyere ya akwụkwọ ozi ndị na-enye ya ikike iji Slavonic eme ihe ma họpụta ya dị ka achịbishọp. Otú ọ dị, na 870 O.A., site n’enyemaka nke Eze Svatopluk nke Nitra, Hermanrich, bụ́ bishọp nke Frank, jidere Methodius. A tụrụ ya mkpọrọ afọ abụọ na ọkara n’ebe obibi ndị mọnk nke dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke Germany. N’ikpeazụ, onye nọchiri Adrian nke Abụọ, bụ́ Popu John nke Asatọ, nyere iwu ka a tọhapụ Methodius, weghachi ya na dayọsis ya ma mesighachi nkwado popu kwadoro ka e jiri Slavonic na-eme ihe n’ofufe, ike.
Ma mmegide sitere n’aka ndị ụkọchukwu nke Frank gara n’ihu. Methodius nwere ihe ịga nke ọma n’ịgọpụ ebubo ịjụ okwukwe nke e boro ya, o mesịrị nweta akwụkwọ ozi bu akara e ji amata akwụkwọ ozi ndị popu site n’aka Popu John nke Asatọ bụ́ nke na-enye ikike kpọmkwem iji Slavonic eme ihe na chọọchị. Dị ka popu nke nọ ugbu a, bụ́ John Paul nke Abụọ, kwetaworo, Methodius biri ndụ nke “ime njem, ịnọ n’ụkọ, ịta ahụhụ, ịbụ onye e busoro iro na onye e megidere, . . . ọbụna oge nke ịbụ onye a tụrụ mkpọrọ obi ịta mmiri.” N’ụzọ na-emegide onwe ya, nke a bụ n’aka ndị bishọp na ndị eze ndị ha na Rom dị ná mma.
A Sụgharịa Bible Dum
N’agbanyeghị nguzogide ahụ siri ike, site n’enyemaka nke ọtụtụ ndị na-eji shorthand ede ihe, Methodius sụgharịchara akụkụ Bible ndị fọdụrụnụ gaa na Slavonic. Dị ka e si kọọ, ọ rụzuru ọrụ a dị ukwuu nanị n’ime ọnwa asatọ. Otú ọ dị,
ọ sụgharịghị akwụkwọ apọkrịfa nke ndị Maccabee.Taa, ọ dịghị mfe ikwu otú nsụgharị ahụ Cyril na Methodius sụgharịrị dị n’ụzọ ziri ezi. Ọ bụ nanị ihe odide ole na ole bụ́ ndị e dere na nso oge nsụgharị nke mbụ ahụ, ka dị. Site n’inyocha ihe odide ndị mbụ ahụ dị ụkọ, ndị ọkà mmụta asụsụ chọpụtara na nsụgharị ahụ ziri ezi ma dị mfe. Akwụkwọ bụ́ Our Slavic Bible na-ekwu na ụmụnne abụọ ahụ “mepụtara ọtụtụ okwu na ahịrịokwu ọhụrụ . . . Ha jikwa izi ezi dị ịtụnanya mee ha nile [ma] mee ka asụsụ Slavic nwee ụba okwu n’ụzọ a na-enwetụbeghị ụdị ya.”
Ihe Nketa Na-adịgide Adịgide nke A Hapụrụ
Mgbe Methodius nwụsịrị na 885 O.A., ndị Frank na-emegide ndị na-eso ụzọ ya chụpụrụ ha na Moravia. Ha gbagara Bohemia, ebe ọdịda anyanwụ Poland, nakwa Bulgaria. N’ụzọ dị otú a, e ji ọrụ Cyril na Methodius gaa n’ihu, ọ gbasakwara n’ezie. Asụsụ Slavonic, bụ́ nke ụmụnne abụọ ahụ mere ka ọ dị n’ụdị a na-ede ede ma na-adịgide adịgide karị, mụbara, too etoo, ma mesịa dịgasịa ọtụtụ. Taa, asụsụ Slavic gụnyere asụsụ 13 dịrịta iche na ọtụtụ ire okwu.
Ọzọkwa, mgbalị Cyril na Methodius ji obi ike mee n’ịsụgharị Bible mịpụtara mkpụrụ n’ọtụtụ nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Slavic ndị e nwere taa. Ọtụtụ nde ndị na-asụ asụsụ ndị a na-erite uru site n’inwe Okwu Chineke n’asụsụ nke ha. N’agbanyeghị mmegide dị ilu, lee otú okwu ndị a si bụrụ eziokwu: “Okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi”!—Aịsaịa 40:8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A na-asụ asụsụ Slavic n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ebe Etiti Europe, ha gụnyekwara asụsụ Russian, Ukrainian, Serbian, Polish, Czech, Bulgarian, nakwa asụsụ ndị yiri ha.
^ par. 13 “Slavonic,” dị ka e si jiri ya mee ihe n’isiokwu a, na-apụta ire okwu nke Slav bụ́ nke Cyril na Methodius jiri mee ihe maka njem ha na ọrụ odide ihe ha. Ụfọdụ ndị taa na-eji okwu bụ́ “Slavonic Ochie” ma ọ bụ “Slavonic nke Chọọchị Ochie,” eme ihe. Ndị ọkà mmụta asụsụ kweere na e nweghị otu asụsụ nke ndị Slav nile na-asụ na narị afọ nke itoolu O.A.
[Igbe dị na peeji nke 29]
Cyrillic Ka Ọ Bụ Glagolitic?
Ọdịdị nke mkpụrụ okwu ahụ Cyril mepụtara akpalitewo ọtụtụ arụmarụ, ebe ọ bụ na ndị ọkà mmụta asụsụ ejighị n’aka mkpụrụ okwu nke ọ bụ. Mkpụrụ okwu ahụ a kpọrọ Cyrillic sitere nnọọ ná mkpụrụ okwu Grik, bụ́ nke e chepụtakwuru iri na abụọ n’ime ha ma ọ bụ karịa ịnọchite anya ụda olu dị iche iche nke Slavonic bụ́ ndị na-adịghị n’asụsụ Grik. Otú ọ dị, ụfọdụ n’ime ihe odide Slavonic ndị mbụ mbụ ji mkpụrụ okwu dị nnọọ iche, ndị a maara dị ka Glagolitic mee ihe, ọ bụkwa mkpụrụ okwu ndị a ka ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na ọ bụ Cyril chepụtara ha. Ole na ole n’ime mkpụrụ okwu Glagolitic ndị ahụ yiri ka ha sitere n’aka akwụkwọ nsekọ Grik ma ọ bụ nke Hibru. Ụfọdụ pụkwara isite n’akara ụda olu e nwere mgbe ụwa na-emepechabeghị anya, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị e mepụtara nnọọ ọhụrụ ma dị mgbagwoju anya. Glagolitic yiri nke dị nnọọ iche na nke e mepụtara nnọọ ọhụrụ. Otú ọ dị, e wezụga asụsụ 22 ndị ọzọ, ndị ụfọdụ n’ime ha na-abụghị Slavonic, ọ bụ na Cyrillic ka e si nweta mkpụrụ okwu Russian, Ukrainian, Serbian, Bulgarian, na Macedonian nke oge a.
[Artwork—Cyrillic and Glagolitic characters]
[Map/Foto dị na peeji nke 31]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Oké Osimiri Baltic
(Poland)
Bohemia (Czechia)
Moravia (E. Czechia, W. Slovakia, W. Hungary)
Nitra
ALAEZE EBE ỌWỤWA ANYANWỤ NKE FRANK (Germany & Austria)
ITALI
Venice
Rom
Oké Osimiri Mediterranean
BULGARIA
GRIS
Tesalọnaịka
(Crimea)
Oké Osimiri Ojii
Bitinia
Constantinople (Istanbul)
[Foto dị na peeji nke 31]
Bible Slavonic nke e ji mkpụrụ okwu Cyrillic dee na 1581
[Ebe E Si Nweta Foto]
Bible: Narodna dị na univerzitetna knjiz̆nica-Slovenija-Ljubljana