Gịnị Bụ Paradaịs Ime Mmụọ?
Gịnị Bụ Paradaịs Ime Mmụọ?
A ZỤLITERE Gustavo n’otu obodo nta dị na Brazil. * Kemgbe ọ bụ nwata, a kụziworo ya na ndị ezi omume na-aga eluigwe mgbe ha nwụsịrị. Ọ dịghị ihe ọ maara banyere nzube Chineke bụ́ na otu ụbọchị, ihe a kpọrọ mmadụ ga-adị ndụ zuru okè na paradaịs elu ala. (Mkpughe 21:3, 4) Ọ dịkwa ihe ọzọ ọ na-amaghị. Ọ ghọtaghị na ọbụna ugbu a, ọ pụrụ ịnọ na paradaịs ime mmụọ.
Ị̀ nụtụwo banyere paradaịs ime mmụọ ahụ? Ị̀ maara ihe ọ bụ na ihe a chọrọ iji banye na ya? Ọ dị onye ọ bụla nke chọrọ inwe obi ụtọ n’ezie mkpa ịmara banyere paradaịs ahụ.
Ịchọta Ebe Paradaịs Ime Mmụọ ahụ Dị
Ikwu na mmadụ pụrụ ibi na paradaịs ọbụna ugbu a, pụrụ ịda ka ihe ezi uche na-adịghị na ya. Ụwa a abụtụghị paradaịs. E nwere ọtụtụ ndị na-enwe ahụmahụ ahụ otu eze onye Hibru oge ochie kọwara: “Lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.” (Eklisiastis 4:1) Imerime mmadụ na-ata ahụhụ n’okpuru usoro ọchịchị, okpukpe, na ọnọdụ akụ̀ na ụba rụrụ arụ, ha enweghịkwa ahụ efe na “onye nkasi obi.” Ọtụtụ ndị ọzọ na-agba mbọ ịkwụ ụgwọ ha ji, ịzụlite ụmụ ha, na ime ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa iji mee ka ndụ na-aga n’ihu. Ma eleghị anya, ndị a kwa ga-anabata onye nkasi obi, onye ga-eme ka ibu dịtụrụ ha mfe. Nye ha nile, ndụ adịtụghị ka paradaịs.
Oleezi ebe bụ paradaịs ime mmụọ? Okwu bụ́ “paradaịs” yiri okwu Grik, Persian, na nke Hibru ndị na-enyecha echiche nke ogige ntụrụndụ, bụ́ ebe dị jụụ a na-anọ enweta ume ọhụrụ. Bible na-ekwe nkwa na otu ụbọchị, ụwa ga-aghọ paradaịs a na-ahụ anya, bụ́ ebe obibi yiri ubi a gbara ogige maka agbụrụ mmadụ na-adịghị eme mmehie. (Abụ Ọma 37:10, 11) N’iburu nke a n’uche, anyị na-ahụ na paradaịs ime mmụọ bụ gburugburu ebe na-adị anya mma na nke na-adị jụụ n’ahụ, na-enye mmadụ ohere isoro mmadụ ibe ya na Chineke dịrị n’udo. Taa, dị ka Gustavo chọpụtara, paradaịs dị otú ahụ dị adị, ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ụmụ mmadụ nọkwa n’ime ya.
Mgbe ọ dị afọ 12, Gustavo kpebiri na ya chọrọ ịbụ ụkọchukwu Roman Katọlik. Ná nkwado nke ndị mụrụ ya, ọ banyere otu seminarị okpukpe. N’ebe ahụ, o tinyere aka n’ịkụ egwú, ime ihe nkiri, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, bụ́ nke chọọchị ahụ na-akwalite iji rata ndị ntorobịa. Ọ maara na ụkọchukwu kwesịrị ịrara onwe ya nye n’ijere ndị mmadụ ozi nakwa na ọ pụghị ịlụ nwanyị. Ma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ụmụ akwụkwọ seminarị ndị Gustavo maara na-etinye aka n’omume rụrụ arụ. N’ịbụ onye nọ n’ebe dị otú ahụ, n’oge na-adịghị anya, Gustavo malitere ịṅụ oké mmanya. N’ụzọ doro anya, ọ chọtabeghị paradaịs ime mmụọ ahụ.
Otu ụbọchị, Gustavo gụrụ otu traktị Bible na-ekwu banyere paradaịs elu ala. O mere ka o chee echiche banyere nzube nke ndụ. O kwuru, sị: “Amalitere m ịgụ Bible ugboro ugboro, ma aghọtaghị m ya. Ahụghịdị m na Chineke nwere aha.” Ọ hapụrụ seminarị ahụ ma jekwuru
Ndịàmà Jehova, na-achọ enyemaka iji ghọta Bible. Mgbe nke ahụ gasịrị, o nwere ọganihu dị ngwa ma rara ndụ ya nye Chineke n’oge na-adịghị anya. Gustavo nọ na-amụ banyere paradaịs ime mmụọ ahụ.Otu Ndị E Wepụtaara Aha Chineke
Gustavo mụtara na aha Chineke, bụ́ Jehova, abụghị nanị ihe na-adọrọ mmasị nye onye mmụta Bible. (Ọpụpụ 6:3) Ọ bụ akụkụ dị oké mkpa nke ezi ofufe. Jisọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ.” (Matiu 6:9) N’ikwu banyere ndị Jentaịl ghọrọ ndị Kraịst, onye na-eso ụzọ bụ́ Jemes, sịrị: ‘Chineke letara ndị mba ọzọ, isi n’etiti ha wepụtara aha Ya otu ndị.’ (Ọrụ 15:14) Na narị afọ mbụ, ‘ndị e wepụtaara aha ya’ bụ ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ̀ dị ndị e wepụtaara aha Chineke taa? Ee, Gustavo bịakwara ghọta na Ndịàmà Jehova bụ ndị ahụ.
Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike n’ala na n’ókèala 235. Ọnụ ọgụgụ ha dị ihe karịrị nde ndị ozi isii, nde mmadụ asatọ ọzọ nwere mmasị agawokwa nzukọ ha. N’ịbụ ndị a maara n’ebe nile n’ihi ozi ha na-eje maka ọha, ha na-emezu okwu Jisọs, bụ́: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14) Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka Gustavo ji chee na ya achọtawo paradaịs ime mmụọ n’etiti Ndịàmà Jehova? Ọ na-ekwu, sị: “Eji m ihe m hụworo n’ụwa ma karịsịa na seminarị tụnyere ihe m hụrụ n’etiti Ndịàmà Jehova. Oké ọdịiche e nwere bụ ịhụnanya nke dị n’etiti Ndịàmà.”
Ndị ọzọ ekwuwo ihe yiri nke ahụ banyere Ndịàmà Jehova. Otu nwa agbọghọ onye Brazil, bụ́ Miriam, kwuru, sị: “Amaghị m otú e si enwe obi ụtọ, ọbụnadị n’ezinụlọ m. Ọ bụ n’etiti Ndịàmà Jehova ka m hụrụ ịhụnanya e tinyere n’ọrụ na nke mbụ ya.” Otu nwoke aha ya bụ Christian kwuru, sị: “Etinyere m aka ná mgbaasị mgbe ụfọdụ, ma okpukpe adịghị m mkpa. Eji m ọkwá m na ọrụ m dị ka injinịa kpọrọ ihe karị. Ma, mgbe nwunye m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ahụrụ m ihe dị iche n’ebe ọ nọ. Ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi nke ndị inyom bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị letara ya nwere, masịkwara m.” N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji ekwu ihe ndị dị otú ahụ banyere Ndịàmà Jehova?
Gịnị Bụ Paradaịs Ime Mmụọ Ahụ?
Otu ihe na-eme ka Ndịàmà Jehova pụta ìhè bụ nghọta ha ghọtara ihe ọmụma Bible. Ha kweere na Bible bụ eziokwu nakwa na ọ bụ Okwu Chineke. N’ihi ya, ha adịghị enwe afọ ojuju nanị n’ịmara ihe ndị bụ́ isi banyere okpukpe ha. Ha nwere usoro ihe omume na-aga n’ihu nke ọmụmụ ihe onwe onye na ọgụgụ Bible. Ka mmadụ na-esonyere Ndịàmà Jehova ruo ogologo oge karị, otú ahụ ka ọ na-amụtakwu banyere Chineke na uche Ya dị ka e kpughere ha n’ime Bible.
Ihe ọmụma dị otú ahụ na-atọhapụ Ndịàmà Jehova pụọ n’ihe ndị na-anapụ mmadụ obi ụtọ, dị ka nkwenkwe ụgha na echiche ndị na-emerụ ahụ. Jisọs kwuru, sị: “Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu,” Ndịàmà Jehova na-achọpụtakwa na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị. (Jọn 8:32) Fernando, bụ́ onye mere mgbaasị n’otu oge, na-ekwu, sị: “Ịmụta banyere ndụ ebighị ebi bụụrụ m nnukwu ihe ahụ efe. Anọ m na-atụ egwu na mụ ma ọ bụ ndị mụrụ m pụrụ ịnwụ.” Eziokwu tọhapụrụ Fernando pụọ n’egwu nke ógbè ndị bụ́ mmụọ na ihe a sị na ọ bụ ndụ mgbe a nwụsịrị.
Na Bible, e jikọtara ihe ọmụma Chineke na paradaịs n’ụzọ chiri anya. Aịsaịa onye amụma kwuru, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.
N’ezie, nanị ihe ọmụma ezughị iji weta udo ahụ Aịsaịa buru n’amụma. Mmadụ aghaghị Ndị Galetia 5:22, 23.
ime ihe ọ na-amụta. Fernando kwuru, sị: “Mgbe mmadụ na-azụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ọ na-atụnye ụtụ na paradaịs ime mmụọ ahụ.” Fernando nọ na-ezo aka n’okwu Pọl onyeozi, bụ́ onye kpọrọ àgwà ọma ndị onye Kraịst kwesịrị ịzụlite “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” O depụtara ha dị ka “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.”—Ị̀ pụrụ ịhụ ihe mere iso ìgwè ndị na-agbalịsi ike ịzụlite àgwà ndị dị otú ahụ na-akpakọrịta ga-eji dị ka ịnọ na paradaịs n’ezie? Paradaịs ime mmụọ ahụ Zefanaịa onye amụma buru n’amụma ga-adị n’etiti ndị dị otú ahụ. O kwuru, sị: “[Ha] agaghị eme ajọ omume, ha agaghị ekwukwa okwu [ụgha]; a gaghị ahụkwa ire aghụghọ n’ọnụ ha: n’ihi na ndị ahụ ga-azụ onwe ha makpuokwa amakpu dị ka atụrụ, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.”—Zefanaịa 3:13.
Òkè Dị Oké Mkpa Ịhụnanya Na-ekere
Ị pụrụ ịrịbawo ama na nke mbụ n’ime mkpụrụ nke mmụọ nsọ ndị ahụ Pọl kpọtụrụ aha bụ ịhụnanya. Nke a bụ àgwà nke Bible na-ekwukarị okwu banyere ya. Jisọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) N’eziokwu, Ndịàmà Jehova ezughị okè. Ha na-enwe nghọtahie n’etiti onwe ha mgbe ụfọdụ dị nnọọ ka ndị ozi Jisọs nwere. Ma ha hụrụ ibe ha n’anya n’ezie, ha na-ekpekwa ekpere maka nkwado nke mmụọ nsọ, ka ha na-azụlite àgwà a.
N’ihi ya, mkpakọrịta ha pụrụ iche. E nweghị ịkpa ókè agbụrụ ma ọ bụ nkewa nke ịhụ mba n’anya n’etiti ha. N’ezie, ọtụtụ Ndịàmà bụ́ ndị chọtara onwe ha n’etiti mkpocha na mgbukpọ nke agbụrụ n’afọ ndị ikpeazụ nke narị afọ nke 20 chebere ibe ha ọbụna na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ. N’agbanyeghị na ha si “ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta,” ha nwere ịdị n’otu nke siri ike nghọta ruo mgbe i nwere ahụmahụ ya.—Mkpughe 7:9.
Paradaịs n’Etiti Ndị Na-eme Uche Chineke
E nweghị ọnọdụ ọ bụla na paradaịs ime mmụọ maka anyaukwu, omume rụrụ arụ, na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. A na-agwa ndị Kraịst, sị: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ́ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Mgbe anyị na-ebi ndụ dị ọcha na nke omume ọma, ma na-eme uche Chineke n’ụzọ ndị ọzọ, anyị na-enye aka iwulite paradaịs ime mmụọ ahụ, anyị na-atụnyekwa ụtụ n’obi ụtọ nke onwe anyị. Carla chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Ọ na-ekwu, sị: “Nna m kụziiri m ịrụsi ọrụ ike iji na-egboro onwe m mkpa ego. Ma, ọ bụ ezie na ihe ọmụmụ m na mahadum mere ka m nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe, ịdị n’otu ezinụlọ na ịnọ ná nchebe nke ọ bụ nanị ihe ọmụma nke Okwu Chineke pụrụ inye anyị gụrụ m agụụ.”
N’ezie, ịnụ ụtọ paradaịs ime mmụọ ahụ adịghị ewepụ nsogbu anụ ahụ nke ndụ. Ndị Kraịst ka na-ada ọrịa. Mba ha bi na ya pụrụ itinye Abụ Ọma 55:22; 86:16, 17) Chineke na-ekwe nkwa ịnọnyere ndị na-efe ya ọbụna na “ndagwurugwu onyinyo ọnwụ.” (Abụ Ọma 23:4) Inwe obi ike ná njikere Chineke dị ịkwado anyị ga-enyere anyị aka ichekwa “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile” bụ́ nke anyị nwere, nke bụ́ isi ihe na-eduga na paradaịs ime mmụọ ahụ.—Ndị Filipaị 4:7.
aka n’ọgụ ime obodo. Ọtụtụ ndị dara ogbenye. Ma, anyị na Jehova Chineke inwe mmekọrịta chiri anya—nke bụ́ akụkụ dị oké mkpa nke paradaịs ime mmụọ ahụ—pụtara na anyị pụrụ ilegara ya anya maka nkwado. N’ezie, ọ na-agba anyị ume ‘ịtụkwasị ya ibu anyị,’ ọtụtụ ndị pụkwara ịgba akaebe nye ụzọ dị ebube o siworo kwadoo ha n’ọnọdụ ndị kasị taa akpụ. (Ịtụnye Ụtụ n’Inwe Paradaịs Ime Mmụọ
Ọ na-atọ ihe ka ukwuu n’ụmụ mmadụ ụtọ ịga n’ogige ntụrụndụ. Ọ na-atọ ha ụtọ ịgagharị na ya ma ọ bụ ikekwe ịnọdụ n’oche ma nụ ụtọ gburugburu ya. N’otu aka ahụ, ọ na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ isoro Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta. Ha na-achọpụta na mkpakọrịta ahụ na-enye ume ọhụrụ, na-enye udo, ma na-edo ahụ. Otú ọ dị, ọ dị mkpa ilekọta ogige mara mma anya ma ọ bụrụ na ọ ga-anọgide na-adị ka paradaịs. N’ụzọ yiri nke ahụ, e nwere paradaịs ime mmụọ ahụ n’ụwa a nke na-abụtụghị paradaịs, nanị n’ihi na Ndịàmà Jehova zụlitere ya, Chineke na-agọzikwa mgbalị ha. Oleezi otú mmadụ pụrụ isi tụnye ụtụ bara uru n’inwe paradaịs ahụ?
Nke mbụ, ọ dị gị mkpa isoro ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta, soro ha na-amụ Bible, ma nweta ihe ọmụma Bible nke bụ́ ntọala nke paradaịs ime mmụọ ahụ. Carla kwuru, sị: “E nweghị paradaịs ime mmụọ ma ọ bụrụ na nri ime mmụọ adịghị.” Nke a na-agụnye ịgụchi Okwu Chineke anya na iche echiche banyere ihe ị na-agụ. Ihe ọmụma i nwetara ga-adọtakwu gị nso n’ebe Jehova Chineke nọ, ị ga-abịakwa hụ ya n’anya. Ị ga-amụtakwa ịgwa ya okwu n’ekpere ma rịọ ya maka nduzi ya nakwa maka mmụọ ya ịkwado gị ka ị na-eme uche ya. Jisọs gwara anyị ka anyị nọgide na-ekpe ekpere. (Luk 11:9-13) Pọl onyeozi kwuru, sị: “Na-ekpenụ ekpere n’ewepụghị aka.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Ihe ùgwù nke ịgwa Chineke okwu n’ekpere n’inwe obi ike zuru ezu na ọ na-anụ ihe ị na-ekwu bụ akụkụ dị mkpa nke paradaịs ime mmụọ ahụ.
Ka oge na-aga, ihe ị na-amụ ga-agbanwe ndụ gị n’ụzọ ka mma, n’ikpeazụkwa, ị ga-achọ ịgwa ndị ọzọ banyere ya. Mgbe ahụ ị ga-enwe ike irube isi n’iwu Jisọs bụ́: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.” (Matiu 5:16) Isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst nakwa ito ịhụnanya dị ukwuu ha gosiworo n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ, na-eweta obi ụtọ dị ukwuu.
Oge na-abịa mgbe ụwa nile ga-abụ paradaịs a na-ahụ anya—ebe dị ka ogige, nke mmetọ na-adịghị nakwa ebe obibi kwesịrị ekwesị nye ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi. Ịdị adị nke paradaịs ime mmụọ ahụ ‘n’oge a dị oké egwu’ bụ ihe àmà nke ike Chineke na ngosipụta dị nta nke ihe ọ pụrụ na ihe ọ ga-arụzu n’ọdịnihu.—2 Timoti 3:1.
Ọbụna ugbu a, ndị na-anụ ụtọ paradaịs ime mmụọ ahụ na-enweta mmezu nke Aịsaịa 49:10 n’ụzọ ime mmụọ: “Agụụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ; mirage na anyanwụ agaghị amagbukwa ha: n’ihi na Onye nwere obi ebere n’ahụ ha ga-edu ha, ọ bụkwa n’akụkụ isi iyi nile jupụtara na mmiri ka Ọ ga-edu ha nwayọọ.” José ga-agba akaebe na nke ahụ bụ eziokwu. Ọ chọsiri ike ịbụ oti egwú a ma ama, ma ọ chọtara afọ ojuju ka ukwuu n’iso ọgbakọ ndị Kraịst na-ejere Chineke ozi. Ọ na-ekwu, sị: “Ugbu a ana m ebi ndụ nwere nzube. Enwere m mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’etiti òtù ụmụnna m bụ́ ndị Kraịst, amakwaara m Jehova dị ka Nna na-ahụ n’anya bụ́ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi.” N’ihi ya a kọwara obi ụtọ José—na nke ọtụtụ nde ndị ọzọ dị ka ya—nke ọma n’Abụ Ọma 64:10: “Onye ezi omume ga-aṅụrị na Jehova, gbabakwa n’ime Ya.” Lee nkọwa dị mma banyere paradaịs ime mmụọ ahụ nke a bụ!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Ndị mmadụ a kpọrọ aha dị adị n’ezie, ma a gbanwewo aha ụfọdụ.
[Foto dị na peeji nke 10]
Ka ị na-anụ ụtọ paradaịs ime mmụọ ahụ, nye aka gbasakwuo ya!