Ndị Ji Obi Ike Eguzosi Ike n’Ezi Ihe Emerie Mkpagbu Ndị Nazi
Guzonụ Dị Ka Ndị Zuru Okè, Ndị Kwezuwokwara Ihe Nile
Ndị Ji Obi Ike Eguzosi Ike n’Ezi Ihe Emerie Mkpagbu Ndị Nazi
“MARA ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Arịrịọ a e ji mmetụta rịọ na-ekpughe na ihe ndị Chineke kere eke nwere ọgụgụ isi nwere ike ime ka obi Jehova ṅụrịa n’ihi na ha na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-eguzosi ike n’ihe nye ya. (Zefanaịa 3:17) Otú ọ dị, Setan, bụ́ ọta ụta, kpebisiri ike imebi nguzosi ike n’ezi ihe nke ndị na-ejere Jehova ozi.—Job 1:10, 11.
Karịsịa kemgbe mmalite narị afọ nke 20 bụ́ mgbe e si n’eluigwe chụdata ya n’ụwa, Setan egosipụtawo oké ọnụma n’ebe ndị Jehova nọ. (Mkpughe 12:10, 12) Otú o sina dị, ezi ndị Kraịst anọwo na-eguzo dị ka ndị “zuru okè ndị kwezuwokwara ihe nile” ma nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke. (Ndị Kọlọsi 4:12) Ka anyị tụlee n’ụzọ dị mkpirikpi otu ihe atụ pụtara ìhè nke nguzosi ike n’ezi ihe dị otú ahụ—nke Ndịàmà Jehova nọ na Germany tupu nakwa n’oge Agha Ụwa nke Abụọ.
Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Arụ Ọrụ Eduga n’Ule nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe
N’afọ ndị 1920 nakwa ná mmalite afọ ndị 1930, Bibelforscher, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova na Germany n’oge ahụ, kesara ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke akwụkwọ e ji amụ Bible. N’agbata 1919 na 1933, ná nkezi, ha kesaara ezinụlọ ọ bụla nọ na Germany akwụkwọ, akwụkwọ nta, ma ọ bụ magazin asatọ.
N’oge ahụ, ọ bụ na Germany ka e nwere ọnụ ọgụgụ kasịnụ nke ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ. N’ezie, n’ime mmadụ 83,941 riri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ụwa nile na 1933, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 30 bi na Germany. N’oge na-adịghị anya, Ndịàmà a bụ́ ndị Germany nwetara ule tara akpụ nke iguzosi ike n’ezi ihe. (Mkpughe 12:17; 14:12) Ịchụ n’ọrụ, ịwakpo ebe obibi, ịchụ n’ụlọ akwụkwọ mụbara ngwa ngwa gaa n’iti ihe, njide, na ịtụ mkpọrọ. (Foto nke 1) N’ihi ya, n’afọ ndị bu Agha Ụwa nke Abụọ ụzọ, Ndịàmà Jehova mejupụtara pasent 5 ruo 10 nke ndị nile e ji eji n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche.
Ihe Mere Ndị Nazi Ji Kpagbuo Ndịàmà
Otú ọ dị, gịnị mere Ndịàmà Jehova ji kpasuo ọchịchị ndị Nazi iwe? N’akwụkwọ ya bụ́ Hitler—1889-1936: Hubris, prọfesọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Ian Kershaw na-ekwu na Ndịàmà ghọrọ ndị e legidere anya maka mkpagbu n’ihi na ha jụrụ “ime ihe nile ọchịchị ndị Nazi na-achọ.”
Akwụkwọ bụ́ Betrayal—German Churches and the Holocaust, nke prọfesọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Robert P. Ericksen na prọfesọ ihe ọmụmụ ndị Juu bụ́ Susannah Heschel dezigharịrị, kọwara na Ndịàmà “jụrụ ikere òkè n’ime ihe ike ma ọ bụ n’iji usuu ndị agha mee ihe. . . . Ndịàmà kweere ná nnọpụiche na ndọrọ ndọrọ
ọchịchị, nke pụtara na ha agaghị atụliri Hitler aka elu ma ọ bụ gbuchapụrụ Hitler.” Nke a, ka otu akwụkwọ ahụ na-agbakwụnye, kpasuru ndị Nazi iwe ma mee ka Ndịàmà nọrọ n’ọnọdụ a pụrụ imerụ ha ahụ n’ihi na “Ọchịchị Ndị Nazi agaghị anabata ọjụjụ dị otú ahụ.”Mkpesa Zuru Ụwa Ọnụ na Mwakpo E Mere n’Eleghị Anya n’Azụ
Na February 9, 1934, Joseph F. Rutherford, bụ́ onye na-ebute ụzọ n’ọrụ ahụ n’oge ahụ, si n’aka otu onye ozi pụrụ iche zigara Hitler akwụkwọ ozi mkpesa n’ihi omume ekweghị ibe nọrọ nke ndị Nazi. (Foto nke 2) N’October 7, 1934, akwụkwọ ozi na telegram mkpesa dị ihe dị ka 20,000 bụ́ ndị Ndịàmà Jehova nọ ná mba 50, gụnyere Germany, zigaara Hitler, sochiri akwụkwọ ozi Rutherford.
Ndị Nazi meghachiri omume site n’itinyekwu ihe ná mkpagbu ha. N’April 1, 1935, a machibidoro Ndịàmà iwu gburugburu mba ahụ. N’August 28, 1936 kwa, ndị Gestapo malitere ịwakpo ha n’eleghị anya n’azụ. Ma, Ndịàmà “nọgidere na-ekesa akwụkwọ nta dị iche iche ma nọgide na-enwe okwukwe n’ụzọ ndị ọzọ,” ka akwụkwọ bụ́ Betrayal—German Churches and the Holocaust na-ekwu.
Dị ka ihe atụ, ka ha nọ nnọọ ndị Gestapo nso na December 12, 1936, ihe dị ka Ndịàmà 3,500 kesara ọtụtụ iri puku nkwupụta e biri ebi banyere mmeso ọjọọ a na-emeso ha. Banyere mkpọsa a, Ụlọ Nche kọrọ, sị: “Ọ bụ oké mmeri na ihe obi mgbawa dị ukwuu nye ndị iro ahụ, ma bụrụ ihe na-enye ọṅụ na-enweghị atụ nye ndị ọrụ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.”—Ndị Rom 9:17.
Mkpagbu Akụọ Afọ n’Ala!
Ndị Nazi nọgidere na-achọgharị Ndịàmà Jehova. Ka ọ na-erule 1939, a tụọla puku isii n’ime ha mkpọrọ, zigakwa ọtụtụ puku n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. (Foto nke 3) Olee ọnọdụ e nwere ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke Agha Ụwa nke Abụọ? Ihe dị ka Ndịàmà 2,000 a tụrụ mkpọrọ anwụọla, e gburu ihe karịrị 250 egbu. Ka o sina dị, ndị prọfesọ bụ́ Ericksen na Heschel dere, sị, “N’ụzọ dị ukwuu, Ndịàmà Jehova nọgidere na-enwe okwukwe n’agbanyeghị nsogbu.” N’ihi ya, mgbe ọchịchị Hitler dara, ihe karịrị otu puku Ndịàmà si n’ogige ndị ahụ pụta dị ka ndị nwere mmeri.—Foto nke 4; Ọrụ 5:38, 39; Ndị Rom 8:35-37.
Gịnị nyere ndị Jehova ikike ịtachi obi ná mkpagbu? Otu onye dị ndụ pụta n’ogige ịta ahụhụ bụ́ Adolphe Arnold kọwara, sị: “Ọ bụrụgodị na ị dara nnọọ mbà, Jehova na-ahụ gị, ọ maara ahụhụ ị na-ata, ọ ga-enyekwa gị ikike dị mkpa iji merie ọnọdụ ahụ ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Aka ya adịkarịghị mkpụmkpụ.”
Lee nnọọ ka okwu Zefanaịa onye amụma si kwekọọ n’ebe ndị Kraịst ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nọ! O kwupụtara, sị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, nọ n’etiti gị, Ọ bụ dike nke na-azọpụta: Ọ ga-eji ọṅụ nwee obi ụtọ n’ahụ gị.” (Zefanaịa 3:17) Ka ndị nile na-efe ezi Chineke ahụ taa ṅomie okwukwe nke Ndịàmà ahụ guzosiri ike n’ihe bụ́ ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị mkpagbu ndị Nazi ma meekwa ka obi Jehova ṅụrịa.—Ndị Filipaị 1:12-14.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]
Państwowe Muzeum Oświȩcim-Brzezinka, site n’ikike USHMM Photo Archives