“Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ”
“Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ”
Ọ BỤ onye na-ede uri, onye na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ, na eze. N’ịbụ onye ihe ọ na-akpata n’afọ karịrị nde dollar 200, ọ bara ọgaranya karịa eze ọ bụla ọzọ n’ụwa. A makwaara nwoke ahụ maka amamihe ya. A kpaliri nnọọ mmasị nke otu eze nwanyị bịara leta ya nke na o kwupụrụ, sị: “Lee, e gosighị m nkera ya: ị tụkwasịwo amamihe na ịdị mma n’akụkọ nke m nụrụ.” (1 Ndị Eze 10:4-9) Ọ bụ ọkwá dị otú ahụ ka Eze Solomọn nke Israel oge ochie nọrọ na ya.
Solomọn nwere ma akụ̀ na ụba ma amamihe. Nke ahụ mekwara ka o ruo eru karịsịa ikpebi n’ime ha abụọ nke a na-apụtụghị ileghara anya n’ezie. O dere, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ, ya na mmadụ nke na-enwepụta nghọta. N’ihi na ọzụzụ ahịa ya dị mma karịa ọzụzụ ahịa ọlaọcha, uru ya dị mma karịa ọlaedo ọma. Ihe dị oké ọnụ ahịa ka ọ bụ karịa ruby: ihe nile kwa nke na-atọ gị ụtọ, ha agaghị aha ka ya.”—Ilu 3:13-15.
Otú ọ dị, olee ebe a pụrụ ịchọta amamihe? N’ihi gịnị ka o ji baa uru karịa akụ̀ na ụba? Olee akụkụ ya ndị na-adọrọ mmasị? Isi nke 8 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu, nke Solomọn dere, na-aza ajụjụ ndị a n’ụzọ na-adọrọ mmasị. N’ebe ahụ, a kọwara amamihe dị ka mmadụ, dị ka a ga-asị na o nwere ike ikwu okwu na ime ihe. Amamihe n’onwe ya kpughekwara ihe o nwere na-adọrọ mmasị nakwa abamuru ya.
“Ọ Na-etisi Mkpu Ike”
Isi nke 8 nke Ilu ji ajụjụ na-akpali echiche malite: “Amamihe, ọ́ dịghị akpọ òkù? Nghọta kwa, ọ́ dịghị eme ka olu ya daa ụda?” * Ee, amamihe na nghọta na-akpọ òkù, ma ọ dịghị nnọọ ka nwanyị ahụ rụrụ arụ bụ́ onye na-ezo n’ebe ndị gbara ọchịchịrị ma na-atamunye okwu na-arata mmadụ ná ntị nwa okorobịa nọ nanị ya nke na-enweghị uche. (Ilu 7:12) “N’elu ebe nile dị elu n’akụkụ ụzọ, n’agbata ụzọ nile, ka O guzoworo onwe ya; n’akụkụ ọnụ ụzọ ama nile, n’ọnụ ámá obodo, ná mbata ọnụ ụzọ nile, ka ọ na-etisi mkpu ike.” (Ilu 8:1-3) A na-anụ olu siri ike ma na-ada ụda nke amamihe n’ámá—n’ọnụ ụzọ ámá, n’agbata ụzọ dị iche iche, n’ebe ndị e si abanye obodo. Ndị mmadụ pụrụ ịnụ olu ahụ n’ụzọ dị mfe ma zaghachi.
Ònye pụrụ ịgọpụ na amamihe ahụ e dekọrọ n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, dị n’ebe fọrọ nke nta ka o ruo onye ọ bụla nọ n’ụwa nke na-achọ inweta ya, aka? “Bible bụ akwụkwọ a kasị agụ n’akụkọ ihe mere eme,” ka The World Book Encyclopedia na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye, sị: “E kesawo ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke Bible karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ. A sụgharịwokwa Bible ọtụtụ ugboro, nakwa n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ.” Ebe ọ bụ na Bible dum ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ dị n’ihe karịrị asụsụ na olumba 2,100, ihe karịrị pasent 90 nke ezinụlọ mmadụ pụrụ inweta ma ọ dịghị ihe ọzọ akụkụ ụfọdụ nke Okwu Chineke n’asụsụ nke ha.
Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi Bible n’ebe nile n’ihu ọha. N’ala 235, ha ji ịrụsi ọrụ ike ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke ma na-akụziri ndị mmadụ eziokwu ndị a na-achọta n’Okwu Chineke. A na-ekesa ihe karịrị nde 20 na nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ha ndị dabeere na Bible bụ́ Ụlọ Nche, nke a na-ebipụta n’asụsụ 140, nakwa Teta!, nke a na-ebipụta n’asụsụ 83. N’ezie, amamihe na-etisi mkpu ike n’ámá dị iche iche!
“Olu M Na-adakukwa Ụmụ Mmadụ”
Amamihe a kọwara dị ka mmadụ amalite ikwu okwu, na-asị: “Ọ bụ unu, mmadụ, ka m na-akpọku; olu m na-adakukwa ụmụ mmadụ. Unu ndị na-enweghị uche, ghọtanụ ezi uche; unu ndị nzuzu kwa, meenụ ka obi unu ghọta ihe.”—Ilu 8:4, 5.
Òkù amamihe na-akpọ bụ maka mmadụ nile. Ọ na-akpọ ihe nile a kpọrọ mmadụ òkù. A na-akpọ ọbụna ndị na-enweghị uche ịbịa nweta amamihe, ma ọ bụ akọ, na-akpọkwa ndị nzuzu ịbịa nweta nghọta. N’ezie, Ndịàmà Jehova kweere na Bible bụ akwụkwọ dịịrị mmadụ nile ma jiri eleghị mmadụ anya n’ihu na-agbalị ịgba onye ọ bụla ha zutere ume ileba ya anya iji chọta okwu amamihe ndị dị na ya.
“Eziokwu Ka Okpo Ọnụ M Na-ekwu”
Ka ọ na-agbasapụ arịrịọ ya, amamihe gara n’ihu ikwu, sị: “Nụrụnụ, n’ihi na isi ihe dị iche iche ka m na-ekwu; nsaghe egbugbere ọnụ m ga-abụkwa ihe dị iche iche ziri ezi. N’ihi na eziokwu ka okpo ọnụ m na-ekwu dị ka onye na-atụgharị uche; ọzọ, ihe arụ nke egbugbere ọnụ m ka mmebi iwu bụ. N’ezi omume ka okwu nile nke ọnụ m dị; ọ dịghị ihe na-ezighị ezi ma ọ bụ ihe gbagọrọ agbagọ dị n’ime ha.” Ee, ihe amamihe na-ezi bụ ịgba ma zie ezi, bụrụ eziokwu na nke ezi omume. Ọ dịghị ihe aghụghọ ọ bụla ma ọ bụ nke gbagọrọ agbagọ dị n’ime ha. “Ha nile pụtara ìhè n’ebe onye nghọta nọ, ha zikwara ezi n’ebe ndị na-achọta ihe ọmụma nọ.”—Ilu 8:6-9.
N’ụzọ dabara adaba, amamihe na-agba ume, sị: “Nara ịdọ aka ná ntị m, anarakwala ọlaọcha; narakwa ihe ọmụma karịa ọlaedo ọma a họpụtara ahọpụta.” Ezi uche dị n’arịrịọ a, “n’ihi na amamihe dị mma karịa ruby; ihe nile kwa nke na-atọ mmadụ ụtọ, ha agaghị aha ka ya.” (Ilu 8:10, 11) Ma, ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Gịnị mere amamihe ji dị oké ọnụ ahịa karịa akụ̀ na ụba?
“Mkpụrụ M Dị Mma Karịa Ọlaedo Ọma”
Onyinye amamihe na-enye onye na-ege ya ntị dị oké ọnụ ahịa karịa ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ ruby. N’ikwu ihe onyinye ndị a bụ, amamihe na-ekwu, sị: “Mụ onwe m, bụ́ amamihe, emewo ezi uche ebe obibi m, ọ bụkwa ọmụma ihe ìzùzù dị iche iche ka m na-achọpụta. Egwu Jehova bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị: mpako, na nganga, na ụzọ ọjọọ, na ọnụ na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ, ka m kpọworo asị.”—Ilu 8:12, 13.
Amamihe na-enye onye nwere ya ezi uche na ikike iche echiche. Onye nwere amamihe Chineke nwekwara nsọpụrụ ofufe na ụjọ Ilu 9:10) N’ihi ya, ọ na-akpọ ihe Jehova kpọrọ asị asị. A dịtụghị ahụ ịfụli onwe onye elu, mpako, omume rụrụ arụ, na okwu rụrụ arụ n’ebe ọ nọ. Asị ọ kpọrọ ihe ọjọọ na-echebe ya pụọ ná mmetụta na-emerụ emerụ nke ike. Lee ka o si dị mkpa ka ndị nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst, nakwa ndị isi ezinụlọ, chọọ amamihe!
n’ebe Chineke nọ, ebe ọ bụ na “mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.” (“Mụ nwe ndụmọdụ na nzube ihe,” ka amamihe gara n’ihu ikwu. “Mụ onwe m bụ nghọta; mụ nwe ịdị ike. Mụ ka ndị eze ji abụ eze, ọ bụkwa mụ ka ndị na-achị achị ji enye ụkpụrụ, bụ́ ezi omume. Mụ ka ndị isi ji abụ ndị isi, ha na ndị a maara aha ha, bụ́ ndị ikpe nile nke ụwa.” (Ilu 8:14-16) Mkpụrụ amamihe na-amịpụta na-agụnye nghọta, na ịdị ike—isi ihe ndị dị ndị ọchịchị, ndị isi, na ndị a ma ama mkpa nke ukwuu. Amamihe dị oké mkpa nye ndị nọ n’ọkwá ọchịchị na ndị na-enye ndị ọzọ ndụmọdụ.
Ezi amamihe dị n’ebe mmadụ nile ga-enweta ya, ma ọ bụghị mmadụ nile na-achọta ya. Ụfọdụ ndị na-ajụ ya ma ọ bụ na-ezere ya, ọbụna mgbe ọ dị n’ebe aka ha ga-eru. “Mụ onwe m na-ahụ ndị ahụ n’anya, bụ́ ndị na-ahụ m n’anya,” ka amamihe na-ekwu, “ọ bụkwa ndị na-achọsi m ike ga-achọta m.” (Ilu 8:17) Ọ bụ nanị ndị na-achọsi amamihe ike na-achọta ya.
Ụzọ nile nke amamihe ziri ezi ma bụrụ nke ezi omume. Ọ na-akwụghachi ndị na-achọ ya ụgwọ. Amamihe na-ekwu, sị: “Akụ̀ na nsọpụrụ dị n’aka m; ee, akụ̀ nke na-adịgide adịgide na ezi omume. Mkpụrụ m dị mma karịa ọlaedo ọma, ee, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ihe omume m dịkwa mma karịa ọlaọcha a họpụtara ahọpụta. N’ụzọ ezi omume ka m na-eje ije, n’etiti okporo ụzọ nile nke ikpe: ime ka ndị na-ahụ m n’anya keta ihe dị adị, ka m wee mejuokwa ụlọ akụ̀ nile ha.”—Ilu 8:18-21.
Tinyere àgwà ndị dị otú ahụ magburu onwe ha dị ka ịdị akọ, ikike iche echiche, ịdị umeala n’obi, ezi amamihe, na nghọta, onyinye amamihe na-enye gụnyere akụ̀ na ụba na nsọpụrụ. Onye maara ihe pụrụ nnọọ ịkpata akụ̀ na ụba n’ụzọ ezi omume, ihe ga-agakwara ya nke ọma n’ụzọ ime mmụọ. (3 Jọn 2) Amamihe na-ewetakwara mmadụ nsọpụrụ. Ọzọkwa, ọ na-enweta afọ ojuju site n’ihe ndị o nwere, o nwekwara obi iru ala na akọ na uche dị ọcha n’ebe Chineke nọ. Ee, onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ. Mkpụrụ amamihe na-amịpụta dị mma n’ezie karịa ọlaedo a nụchara anụcha na ọlaọcha a họpụtara ahọpụta.
Lee ihe bịara n’ezi oge ndụmọdụ a bụ nye anyị, ebe ọ bụ na anyị na-ebi n’ụwa hụrụ ihe onwunwe n’anya bụ́ ebe a na-emesi ịkpata akụ̀ na ụba n’ụzọ ọ bụla nakwa n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ ga-efu, ike! Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla ókè amamihe baruru n’uru ma ọ bụ gbasoo ụzọ na-ezighị ezi iji nweta akụ̀ na ụba. Ka anyị ghara ileghara kpọmkwem ndokwa ndị na-enye amamihe anya ma ọlị—nzukọ ndị Kraịst anyị, ọmụmụ Bible na mbipụta ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke Matiu 24:45-47.
nwekwara uche” na-ewepụta—nanị iji kpata akụ̀ na ụba.—“Site na Mgbe Ebighị Ebi Ka E Mere M Ka M Guzosie Ike”
Nkọwa a kọwara amamihe dị ka mmadụ bụ́ nke a na-achọta n’isi nke 8 nke Ilu abụghị nanị ụzọ isi kọwaa njimara nke otu àgwà. N’ụzọ ihe atụ, ọ na-ezokwa aka n’ihe kasị mkpa Jehova kere. Amamihe gara n’ihu ikwu, sị: “Jehova nwere m ná mmalite ụzọ Ya, tupu ọrụ Ya nile site na mgbe ahụ. Site na mgbe ebighị ebi ka e mere m ka m guzosie ike, site n’isi mbụ, tupu ụwa adị. Mgbe ọ dịghị ogbu mmiri ọ bụla dị, a mụpụtara m; mgbe ọ dịghị isi iyi ọ bụla dị nke jupụtara na mmiri. Tupu e mee ka ntọala ugwu nile bamie n’ala, tupu ugwu nta nile adị ka a mụpụtara m: mgbe Ọ ka-emeghị ụwa, ma ọ bụ azụ obodo, ma ọ bụ mmalite ájá nke elu ụwa dum mmadụ bi.”—Ilu 8:22-26.
Lee ka nkọwa ahụ a kọwara amamihe n’elu dị ka mmadụ si nnọọ kwekọọ n’ihe e kwuru banyere “Okwu ahụ” n’Akwụkwọ Nsọ! “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrị,” ka Jọn onyeozi dere, “Okwu ahụ na Chineke dịkwara, Okwu ahụ bụrụkwa [chi, NW].” (Jọn 1:1) N’ụzọ ihe atụ, amamihe a kọwara dị ka mmadụ na-anọchite anya Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, n’oge ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ. *
Jisọs Kraịst bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke; n’ihi na n’ime Ya ka e kere ihe nile, nke dị n’ime eluigwe na nke dị n’elu ụwa, ihe a pụrụ ịhụ anya na ihe a na-apụghị ịhụ anya.” (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) “Mgbe O [Jehova] doziri eluigwe, n’ebe ahụ ka m nọ,” ka amamihe a kọwara dị ka mmadụ gara n’ihu ikwu, “mgbe O nyere ụkpụrụ, sị, Ka ihe gbara gburugburu dịkwasị n’ihu ogbu mmiri: mgbe O mere ka mbara igwe sie ike n’elu: mgbe e mere ka isi iyi nile nke ogbu mmiri dị ike: mgbe O ji kpaara oké osimiri ókè ya, ka mmiri wee ghara ịgabiga okwu ọnụ Ya: mgbe O ji kpụọrọ ntọala ụwa ụkpụrụ: anọkwa m n’akụkụ Ya, dị ka onye ọkà: M wee bụrụ ihe na-atọ Ya ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwú n’ihu Ya mgbe nile; na-egwuri egwú n’elu ụwa dum mmadụ bi n’ụwa Ya; ihe na-atọ m ụtọ dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” (Ilu 8:27-31) Ọkpara Jehova nọ n’akụkụ Nna ya, soro ya—Onye Okike na-enweghị atụ nke eluigwe na ala—na-arụsi ọrụ ike. Mgbe Jehova Chineke kere mmadụ mbụ ahụ, Ọkpara Ya so ya rụọ ọrụ ahụ dị ka Onye Ọkà. (Jenesis 1:26) Ka a sịkwa ihe mere Ọkpara Chineke ji enwe nnọọ mmasị n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ, ọbụna ihe na-atọ ya ụtọ adịkwa n’ebe ha nọ!
“Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Na-ege M Ntị Bụ”
Dị ka amamihe a kọwara dị ka mmadụ, Ọkpara Chineke na-ekwu, sị: “Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị: n’ihi na ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị na-edebe ụzọ m nile bụ. Nụrụnụ ịdọ aka ná ntị, wee mara ihe, unu ezekwala ya ndụ. Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ nke na-ege m ntị bụ, n’ịmụ anya n’akụkụ ibo ọnụ ụzọ m nile kwa ụbọchị, n’iche nche n’akụkụ ọnụ ụzọ nke ọnụ ụzọ m nile. N’ihi na onye na-achọta m achọtawo ndụ, ọ ga-enwepụtakwa n’aka Jehova na ihe ya ga-atọ Ya ụtọ. Ma onye na-emehie megide m na-eme mkpụrụ obi ya ihe ike: ndị nile nke na-akpọ m asị na-ahụ ọnwụ n’anya.”—Ilu 8:32-36.
Jisọs Kraịst bụ kpọmkwem amamihe Chineke. “Onye akụ̀ nile nke amamihe na ihe ọmụma dị n’ime Ya, bụ́ ihe zoro ezo n’ime Ya.” (Ndị Kọlọsi 2:3) Ka anyị gezie ya ntị nke ọma ma soo ijeụkwụ ya nile. (1 Pita 2:21) Ịjụ ya bụ ime mkpụrụ obi anyị ihe ike na ịhụ ọnwụ n’anya, n’ihi na “nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ.” (Ọrụ 4:12) N’ezie, ka anyị nakwere Jisọs dị ka onye Chineke wepụtaworo maka nzọpụta anyị. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) N’ụzọ dị otú a, anyị ga-enweta obi ụtọ nke na-abịa site ‘n’ịchọta ndụ na inwepụta n’aka Jehova na ihe anyị na-atọ Ya ụtọ.’
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Okwu Hibru e ji mee ihe maka “amamihe” dị n’ụdị okwu e ji amata onye bụ́ nwanyị. N’ihi ya, nsụgharị ụfọdụ na-eji nnọchiaha e ji eme ihe maka onye bụ́ nwanyị eme ihe mgbe ha na-ezo aka n’amamihe.
^ par. 25 Eziokwu ahụ bụ́ na okwu Hibru e ji mee ihe maka “amamihe” na-adịkarị n’ụdị okwu na-egosi onye bụ́ nwanyị adịghị emegide ojiji e ji amamihe kọwaa Ọkpara Chineke. Okwu Grik e ji mee ihe maka “ịhụnanya” n’okwu ahụ bụ́ “Chineke bụ ịhụnanya” dịkwa n’ụdị okwu e ji amata onye bụ́ nwanyị. (1 Jọn 4:8) N’agbanyeghị nke ahụ, e ji ya mee ihe iji zoo aka n’ebe Chineke nọ.
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Amamihe dị oké mkpa nye ndị nwere ibu ọrụ
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Elegharala ndokwa ndị na-enye amamihe anya