Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
“Na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—NDỊ EFESỌS 6:4.
1. Gịnị bụbu nzube Chineke maka ezinụlọ, ma kama nke ahụ, gịnị mere?
“MỤỌNỤ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa.” (Jenesis 1:28) Jehova Chineke ji okwu ndị ahụ ọ gwara Adam na Iv guzobe ndokwa ezinụlọ. (Ndị Efesọs 3:14, 15) N’ilepụ anya n’ihu, di na nwunye mbụ ahụ pụrụ iji anya nke uche ha hụ ụwa nke jupụtara n’ụmụ ha mụtara—ezinụlọ gbasapụrụ agbasapụ nke ụmụ mmadụ zuru okè bụ́ ndị ji ọṅụ na-ebi n’ụwa paradaịs ma jiri ịdị n’otu na-efe Onye Okike Ukwu ha. Ma Adam na Iv mehiere, ụwa ejupụtaghịkwa ná ndị ezi omume na-atụ egwu Chineke. (Ndị Rom 5:12) Kama nke ahụ, ndụ ezinụlọ dịrị njọ ngwa ngwa, ịkpọasị, ime ihe ike, na ‘ihe mmadụ ibe mmadụ atọghị ya ụtọ’ ejupụtawo ebe nile, karịsịa na “mgbe ikpeazụ” a.—2 Timoti 3:1-5; Jenesis 4:8, 23; 6:5, 11, 12.
2. Ikike ndị dị aṅaa ka ụmụ Adam nwere, ma gịnị ga-adị mkpa iji zụlite ezinụlọ siri ike n’ụzọ ime mmụọ?
2 E kere Adam na Iv n’onyinyo Chineke. N’agbanyeghị na Adam bụzi onye mmehie, Jehova kwere ka ọ mụọ ụmụ. (Jenesis 1:27; 5:1-4) Dị ka nna ha, ụmụ Adam nwere ikike nke omume, ha pụkwara ịmụta ịma ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. A pụrụ ịkụziri ha otú e si efe Onye Okike ha na mkpa ọ dị iji obi, mkpụrụ obi, uche, na ike ha dum hụ ya n’anya. (Mak 12:30; Jọn 4:24; ) Ọzọkwa, a pụrụ ịzụ ha “ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke . . . na-eje ije.” ( Jemes 1:27Maịka 6:8) Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ha bụ ndị mmehie, ọ ga-adị ha mkpa itinye nnọọ uche iji zụlite ezinụlọ siri ike n’ụzọ ime mmụọ.
Zụchapụta Oge Maka Ya
3. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi ‘zụchapụta oge’ iji zụlite ụmụ bụ́ ndị Kraịst?
3 N’oge a dị mgbagwoju anya ma dị oké egwu, a ghaghị itinye oké mgbalị iji mee ka ụmụaka ghọọ “ndị na-ahụ Jehova n’anya” bụ́ ndị ‘kpọrọ ihe ọjọọ asị’ n’ezie. (Abụ Ọma 97:10) Ndị nne na nna maara ihe ‘ga-azụchapụta oge’ iji merie ihe ịma aka a. (Ndị Efesọs 5:15-17) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú ị pụrụ isi mee nke a? Nke mbụ, setịpụ ihe ndị ka mkpa, na-elebara “ihe ndị ka mkpa” anya, gụnyere izi ụmụ gị ihe na inye ha ọzụzụ. (Ndị Filipaị 1:10, 11) Nke abụọ, mee ka ụzọ ndụ gị dị mfe. Ị pụrụ iwezụga ihe omume ndị na-adịghị mkpa n’ezie. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịdị gị mkpa iwepụgasị ihe onwunwe ndị na-adịghị mkpa bụ́ ndị na-ewe oge ilekọta. Dị ka nne ma ọ bụ nna bụ́ onye Kraịst, ị gaghị akwa ụta ma ọlị na i mere mgbalị dị mkpa iji zụlite ụmụ na-atụ egwu Chineke.—Ilu 29:15, 17.
4. Olee otú a pụrụ isi mee ka ezinụlọ dịrị n’otu?
4 Iwepụta oge iji nọnyere ụmụ gị, karịsịa mgbe e ji ya leba anya n’ihe ime mmụọ, kwesịrị nnọọ mgbalị o were, ọ bụkwa otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi mee ka ezinụlọ dịrị n’otu. Ma ahapụla nke a ruo mgbe ọ bụla oge dapụtara. Dokwaa oge ndị unu ga-eji nọkọrịta. Nke a apụtaghị nanị ịnọ n’otu ụlọ, onye ọ bụla ana-emere ihe nke ya. Ụmụ na-aka eme nke ọma ma ọ bụrụ na a na-elebara ha anya kwa ụbọchị. Ọ dị mkpa igosipụta ịhụnanya na nchebara echiche n’ụba. Di na nwunye kwesịrị iji nlezianya tụlee ibu ọru a dị mkpa ọbụna tupu ha ekpebie ịmụ ụmụ. (Luk 14:28) Mgbe ahụ ha agaghị ele ịzụ ụmụ anya dị ka ọrụ siri ike. Kama nke ahụ, ha ga-ele ya anya dị ka ihe ùgwù a gọziri agọzi.—Jenesis 33:5; Abụ Ọma 127:3.
Jiri Okwu na Ihe Nlereanya Na-ezi Ihe
5. (a) Olee ihe ịkụziri ụmụaka ịhụ Jehova n’anya na-eji amalite? (b) Olee ndụmọdụ e nyere ndị nne na nna na Deuterọnọmi 6:5-7?
5 Izi ụmụ gị ịhụ Jehova n’anya na-amalite site n’ịhụnanya gị onwe gị nwere n’ebe ọ nọ. Ịhụnanya siri ike i nwere n’ebe Chineke nọ ga-akpali gị iji ikwesị ntụkwasị obi na-agbaso ntụziaka ya nile. Nke a na-agụnye ịzụlite ụmụaka “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Chineke na-adụ ndị nne na nna ọdụ isetịpụrụ ụmụ ha ihe nlereanya, isoro ha na-ekwurịta okwu, na izi ha ihe. Deuterọnọmi 6:5-7 na-ekwu, sị: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya. Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” Ị pụrụ ịkụnye ihe ndị Chineke nyere n’iwu n’ime ụmụ gị site n’inye ndụmọdụ mgbe mgbe na ikwughachi ihe ugboro ugboro. Nwa gị ga-esi otú a hụ ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ, n’aka nke ya kwa, ọ ga-enwekwa mkpali ịbịaru ya nso.—Ilu 20:7.
6. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi jiri eziokwu ahụ bụ́ na ụmụaka na-amụta ihe site n’ihe nlereanya mee ihe n’ụzọ bara uru?
6 Ụmụaka na-enwe oké mmasị ịmụta ihe. Ha bụ ndị na-ege ntị nke ọma, ndị na-ekirichi ihe na-emenụ anya, ha na-adịkwa ngwa iṅomi ihe nlereanya gị. Mgbe ha hụrụ na ị hụghị ihe onwunwe n’anya, nke a ga-enyere ha aka ịmụta otú ha ga-esi na-agbaso ndụmọdụ Jisọs. Ị na-akụziri ha ịghara ịdị na-echegbu onwe ha banyere ihe onwunwe kama ka ha ‘buru ụzọ chọọ alaeze Chineke.’ (Matiu 6:25-33) Site n’ikere òkè ná nkwurịta okwu dị mma ma na-ewuli elu banyere eziokwu Bible, ọgbakọ Chineke, na ndị okenye a họpụtara ahọpụta, ị na-akụziri ụmụ gị ịkwanyere Jehova ùgwù na iji ndokwa ime mmụọ ya kpọrọ ihe. Ebe ọ bụ na ụmụaka na-adị ngwa ịhụta ihe ya na ibe ya na-ekwekọghị, ị ghaghị iji omume na àgwà na-egosipụta ekele miri emi gị onwe gị nwere maka ihe ime mmụọ kwadoo ntụziaka ndị i kwuru n’ọnụ. Lee ngọzi ọ bụ mgbe ndị nne na nna na-ahụ na ezi ihe nlereanya ha emewo ka ụmụ ha jiri obi ha dum hụ Jehova n’anya!—Ilu 23:24, 25.
7, 8. Ihe atụ dị aṅaa na-egosi abamuru nke ịzụ ụmụaka site na nwata, ònye ka e kwesịkwara inye otuto maka ihe ịga nke ọma ahụ?
7 A pụrụ ịhụ abamuru nke ịzụ ụmụ site n’oge ha bụ nwata site n’otu ihe atụ si na Venezuela. (2 Timoti 3:15) Ọ bụ banyere otu di na nwunye na-akatabeghị ahụ, bụ́ Félix na Mayerlín. Ha bụ ndị ozi ọsụ ụzọ. Mgbe ha mụrụ nwa ha nwoke bụ́ Felito, ha nwere oké mmasị ime ihe nile ha pụrụ ime n’ịzụlite ya dị ka ezi onye na-efe Jehova. Mayerlín malitere ịgụrụ Felito ihe n’olu dara ụda site n’akwụkwọ bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible, nke Ndịàmà Jehova bipụtara. N’oge ọ ka dị nnọọ ntakịrị, o yiri ka Felito ọ̀ na-amata Mosis na ndị ọzọ e sere n’akwụkwọ a.
8 Mgbe ọ ka dị nnọọ obere, Felito malitere ịgba àmà n’onwe ya. O mezuru ọchịchọ ya ịbụ onye nkwusa Alaeze, e mesịa, e mekwara ya baptism. Ka oge na-aga, Felito ghọrọ onye ọsụ ụzọ oge nile. Nne na nna ya na-ekwu, sị: “Ka anyị na-ahụ ọganihu nwa anyị nwoke na-enwe, anyị na-aghọta na ọ bụ n’ihi enyemaka Jehova na ntụziaka ya.”
Nyere Ụmụaka Aka Ito Eto n’Ụzọ Ime Mmụọ
9. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-enwe ekele maka ntụziaka ime mmụọ anyị na-enweta site n’aka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche?
9 E nwere ọtụtụ magazin, ọtụtụ narị akwụkwọ, na ọtụtụ puku ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Internet ndị na-enye ndụmọdụ n’ụzọ e si azụ ụmụ. Mgbe mgbe, “ihe ọmụma ndị ahụ na-emegiderịta onwe ha,” ka otu mbipụta pụrụ iche nke na-ekwu banyere ụmụaka nke magazin bụ́ Newsweek na-ekwu. “Ọbụna nke na-aka agbagwoju anya bụ mgbe ihe ọmụma i chere na ị pụrụ ịtụkwasị obi mesịrị bụrụ ụgha chara acha.” Lee ka anyị si enwe ekele na Jehova emewo ndokwa n’ụba iji nye ezinụlọ ntụziaka nakwa iji mee ka ha tolite n’ụzọ ime mmụọ! Ị̀ na-eji ihe nile a na-ewepụta site n’aka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche na-eme ihe n’ụzọ bara uru?—Matiu 24:45-47.
10. Olee otú ọmụmụ Bible ezinụlọ dị irè si abara ma nne na nna ma ụmụaka uru?
10 Otu ihe dị nnọọ mkpa bụ ọmụmụ Bible ezinụlọ a na-enwechi anya bụ́ nke a na-enwe n’ebe ahụ ruru mmadụ ala. Iji mee ka ọ bụrụ nke na-akụzi ihe, nke dị ụtọ, ma na-agba ume, ọ dị mkpa ka e mee ezi nkwadebe. Site n’ịjụpụta ụmụ ha ihe bụ́ uche ha, ndị nne na nna pụrụ ịmata ihe dị ha n’obi na n’uche. Otu ụzọ isi mata ma ọmụmụ ihe ezinụlọ ọ̀ dị irè bụ site n’ịrịba ama ma ndị nile nọ n’ezinụlọ ha na-atụsi anya ya ike.
11. (a) Ihe mgbaru ọsọ ndị dị aṅaa ka ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụ ha aka isetịpụ? (b) Gịnị si na ya pụta mgbe otu nwa agbọghọ onye Japan chụsoro ihe mgbaru ọsọ ya?
11 Ihe mgbaru ọsọ ndị dabeere n’Akwụkwo Nsọ na-atụnyekwa ụtụ n’inwe ezinụlọ siri ike n’ụzọ ime mmụọ, ndị nne na nna kwesịkwara inyere ụmụ ha aka isetịpụ ha. Ihe mgbaru ọsọ ndị kwesịrị ekwesị na-agụnye ịgụ Bible kwa ụbọchị, ịghọ onye nkwusa na-ejechi ozi ọma anya, nakwa inwe ọganihu ruo ná nraranye na baptism. Ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ pụrụ ịgụnye ozi oge nile ndị dị ka ọsụ ụzọ, na Betel, ma ọ bụ dị ka onye ozi ala ọzọ. Mgbe otu nwata nwanyị Japan aha ya bụ Ayumi nọ n’ụlọ akwụkwọ elementrị, o mere ka ịgbara onye ọ bụla nọ na klas ya àmà bụrụ ihe mgbaru ọsọ ya. Iji kpalie mmasị onye nkụzi na ụmụ klas ya, ọ natara ikike idebe mbipụta dị iche iche dabeere na Bible n’ọ́bá akwụkwọ klas ha. N’ihi ya, o duziri ọmụmụ Bible 13 n’ime afọ isii ọ nọrọ n’ụlọ akwụkwọ elementrị. Otu n’ime ndị ahụ ọ mụụrụ Bible na ndị ọzọ si n’ezinụlọ onye ahụ ọ mụụrụ ihe ghọrọ ndị Kraịst e mere baptism.
12. Olee otú ụmụaka pụrụ isi rite uru kasịnụ ná nzukọ ndị Kraịst?
12 Ihe ọzọ dị mkpa iji nwee ahụ ike ime Ndị Hibru 10:24, 25; Deuterọnọmi 31:12) E kwesịrị ịkụziri ụmụaka ige ntị nke ọma. Ọ dịkwa oké mkpa ịkwadebe maka nzukọ, n’ihi na a na-erite uru kasịnụ site n’ikere òkè chiri anya site n’ịza ajụjụ. Ọ bụ ezie na nwatakịrị pụrụ ịmalite site n’ikwu okwu ole na ole ma ọ bụ ịgụpụta ntakịrị akụkụ nke paragraf, ọ ga-akasị aba uru ma ọ bụrụ na a zụọ ụmụaka ịchọpụta azịza na ikwu ha n’okwu nke aka ha. Ndị nne na nna, ùnu na-esetịpụ ihe nlereanya n’onwe unu site n’inye azịza ndị bara uru n’ụzọ chiri anya? Ọ dịkwa mma ka onye ọ bụla so n’ezinụlọ nwee Bible nke ya, akwụkwọ abụ, na akwụkwọ e ji amụ ihe ọmụmụ ahụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.
mmụọ bụ ịgachi nzukọ anya. Pọl onyeozi dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ ‘ịghara ịhapụ nzukọ nke onwe ha, dị ka ụfọdụ na-eme.’ Ka nke ahụ ghara ịbụ omenala anyị, n’ihi na ma ndị na-eto eto ma ndị agadi na-erite uru n’ụzọ dị ukwuu site n’ịdị na-anọ ná nzukọ ndị Kraịst mgbe nile. (13, 14. (a) N’ihi gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị iji soro ụmụ ha na-arụ ọrụ n’ozi? (b) Gịnị ga-enye aka n’ime ka ozi ubi baara ụmụaka uru ma na-enye ha ọṅụ?
13 Ndị nne na nna maara ihe ga-eche ike ntorobịa nke ụmụ ha ihu n’ijere Jehova ozi, na-enyere ha aka ime ka ime nkwusa bụrụ akụkụ dị mkpa nke ndụ ha. (Ndị Hibru 13:15) Ọ bụ nanị site n’isoro ụmụ ha na-arụkọ ọrụ n’ozi ka ndị nne na nna pụrụ isi jide n’aka na ụmụ ha ga-enweta ọzụzụ dị mkpa iji ghọọ ndị ozi ‘nke ihere na-apụghị ime, ndị na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.’ (2 Timoti 2:15) Ya mere, gịnịzi banyere gị? Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị̀ na-enyere ụmụ gị aka ịkwadebe ozi ubi? Ime nke a ga-enye aka ime ka ozi bụrụ ihe na-enye ha ọṅụ, ihe nwere nzube nye ha, na ihe ha na-arụpụta ihe na ya.
14 N’ihi gịnị ka o ji baa uru ka ndị nne na nna na ụmụ ha na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ozi? N’ụzọ dị otú a, ụmụaka pụrụ ịrịba ezi ihe nlereanya nke nne na nna ha ama ma na-eṅomi ha. N’otu oge ahụ, ndị nne na nna pụrụ ịhụ omume, akparamàgwà, na ikike nke ụmụ ha. Jide n’aka na ị kpọọrọ ụmụ gị jee akụkụ dị iche iche nke ozi ahụ. Ya kwe mee, ka nwa nke ọ bụla nwee akpa ozi ọma nke ya, kụziekwara ya idebe ya ọcha na ime ka ọ dị mma n’anya. Site n’ọzụzụ na agbamume a na-enye n’esepụghị aka, a ga-azụlite ezi mmasị maka ozi, ụmụaka ga na-elekwa ọrụ nkwusa ahụ anya dị ka ụzọ isi gosipụta ịhụnanya n’ebe Chineke na ndị agbata obi nọ.—Matiu 22:37-39; 28:19, 20.
Nọgide Na-eji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe
15. Ebe ọ bụ na ime ka ezinụlọ nọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe dị nnọọ mkpa, olee ụzọ ụfọdụ a ga-esi eme nke a?
15 Ọ dị oké mkpa ime ka ezinụlọ nọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. (Abụ Ọma ) Otu ụzọ isi mee nke a bụ isoro ezinụlọ gị na-ekwurịta ihe ime mmụọ n’ohere ọ bụla dapụtaranụ. Ị̀ na-eso ha atụle ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị? Ọ̀ bụ omenala gị ịkọrọ ha ahụmahụ ma ọ bụ isi ihe ndị sitere n’Ụlọ Nche na Teta! ndị kasị ọhụrụ “mgbe ị na-eje ije n’ụzọ”? Ị̀ na-echeta ikele Jehova n’ekpere maka ndụ nke ụbọchị ọ bụla nakwa maka onyinye ya bara ụba “mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ”? ( 119:93Deuterọnọmi 6:6-9) Mgbe ụmụ gị na-ahụ ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ ka ọ na-apụta ìhè n’ihe nile ị na-eme, nke a ga-enyere ha aka ime ka eziokwu ahụ bụrụ nke ha.
16. Olee uru ọ bara izi ụmụaka ime nnyocha n’onwe ha?
16 Mgbe ụfọdụ, nduzi ga-adị ụmụaka mkpa iji dozie nsogbu ma ọ bụ ọnọdụ ndị biliterenụ, n’ụzọ ga-aga nke ọma. Kama ịdị na-agwa ha ihe ha ga-eme mgbe nile, gịnị ma i gosi ha otú e si amata ihe bụ́ echiche Chineke n’ihe site n’ịgba ha ume ime nnyocha n’onwe ha? Ịkụziri ụmụaka iji ngwá ọrụ na mbipụta nile a na-ewepụta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” ga-enyere ha aka iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya. (1 Samuel 2:21b) Mgbe ha sokwa ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ na-ekerịta abamuru nke nnyocha Bible ha mere, a na-emekwu ka ọnọdụ ime mmụọ nke ezinụlọ ahụ ka mma.
Dabere Kpam Kpam n’Ebe Jehova Nọ
17. Gịnị mere ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-ejighị kwesị ịda mbà n’obi ma a bịa n’ihe banyere ịzụlite ụmụ ha dị ka ndị Kraịst?
17 Gịnị banyere ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna? Ndị a na-eche ihe ịma aka ndị ọzọ ihu ma a bịa n’ihe banyere ịzụ ụmụ. Ma unu bụ́ ndị nne ma ọ bụ nna nanị unu na-azụ ụmụ, obi adala unu mbà! O kwere omume inwe ihe ịga nke ọma, dị ka ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ gosipụtaworo, bụ́ ndị tụkwasịworo Chineke obi, jiri nrubeisi tinye ndụmọdụ ya n’ọrụ, ma zulitekwa ezi ụmụ gbasiri ike n’ụzọ ime mmụọ. (Ilu 22:6) N’ezie, ọ dị ndị Kraịst bụ́ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ mkpa ịdabere kpam kpam n’ebe Jehova nọ. Ha aghaghị inwe okwukwe na ọ ga-enyere ha aka.—Abụ Ọma 121:1-3.
18. Mkpa dị aṅaa nke uche na nke anụ ahụ nke ụmụ ha ka ndị nne na nna kwesịrị ilebara anya, ma gịnị ka e kwesịrị iwere dị ka ihe ka mkpa?
18 Ndị nne na nna maara ihe na-aghọta na ‘e nwere mgbe ịchị ọchị na mgbe ite egwú.’ (Eklisiastis 3:1, 4) Oge ntụrụndụ dị otú o kwesịrị, bụ́kwa nke na-ewuli elu dị oké mkpa n’iwulite uche na anụ ahụ nwatakịrị. Egwú na-ewuli elu ma karịsịa ịbụ abụ otuto nye Chineke ga-enyere nwatakịrị aka ịzụlite àgwà dị mma bụ́ nke pụrụ ikere òkè dị mkpa n’iwusikwu mmekọrịta ya na Jehova ike. (Ndị Kọlọsi 3:16) Oge ntorobịa bụkwa oge ime njikere iji bụrụ onye tozuru okè nke na-atụ egwu Chineke, ka i wee nwee ike ịnọgide na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa paradaịs.—Ndị Galetia 6:8.
19. N’ihi gịnị ka ndị nne na nna pụrụ iji nwee obi ike na Jehova ga-agọzi mgbalị ha na-eme n’ịzụ ụmụ ha?
19 Jehova chọrọ ka ezinụlọ nile nke ndị Kraịst nọgide na-esi ike ma na-adị n’otu n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya n’ezie ma na-anwa ike anyị irube isi n’Okwu ya, ọ ga-agọzi mgbalị anyị ma nye anyị ikike dị mkpa iji na-agbaso nduzi ya sitere n’ike mmụọ nsọ. (Aịsaịa 48:17; Ndị Filipaị 4:13) Cheta na ohere i nwere ugbu a izi ụmụ gị ihe na ịzụ ha bụ nke a kpaara ókè, a gaghị enwekwa ya ọzọ. Mee nnọọ ihe nile i nwere ike ime iji tinye ndụmọdụ nke Okwu Chineke n’ọrụ, Jehova ga-agọzikwa mgbalị ị na-eme iji zụlite ezinụlọ siri ike n’ụzọ ime mmụọ.
Gịni Ka Anyị Mụtara?
• N’ihi gịnị ka ịzụchapụta oge ji dị nnọọ mkpa mgbe a na-azụ ụmụ?
• N’ihi gịnị ka ezi ihe nlereanya ndị nne na nna ji dị mkpa?
• Olee ụzọ ụfọdụ dị mkpa isi nyere ụmụaka aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ?
• Olee otú ezinụlọ pụrụ isi nọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
Ezinụlọ ndị siri ike n’ụzọ ime mmụọ na-amụchi Okwu Chineke anya, na-agachi nzukọ ndị Kraịst anya, ma na-ekerekọ òkè ọnụ n’ozi