Ihe Na-anọte Aka Karịa Ọlaedo A Na-agwaghị Agwa
Ihe Na-anọte Aka Karịa Ọlaedo A Na-agwaghị Agwa
A NA-ACHỌSIKARỊ ọlaedo ike n’ihi ịma mma na nnọte aka ya. Ihe ndị mere e ji achọsikarị ya ike bụ n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na o yiri ka ọ na-anọgide na-egbuke egbuke ma ghara ịchagharị achagharị ruo mgbe ebighị ebi. Nke a bụ n’ihi na ọlaedo na-eguzogide mmiri, ikuku oxygen, sulfur, na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla ọzọ. Ọtụtụ ihe ndị e ji ọlaedo mee bụ́ ndị a chọtara n’ime ụgbọ ndị dị n’ala mmiri nakwa n’ebe ndị ọzọ nọgidere na-egbuke egbuke ka ọtụtụ narị afọ gasịrịla.
Otú ọ dị, n’ụzọ na-akpali mmasị, Bible na-ekwu na e nwere ihe na-adịte aka ma ‘dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi, ọ bụ ezie na a na-eji ọkụ nwapụta ya.’ (1 Pita 1:7) Ọlaedo e ji ọkụ na ụzọ ndị ọzọ “nwapụta,” ma ọ bụ nụchaa, pụrụ iru pasent 99.9 n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ọcha ya. Ma, ọbụna ọlaedo a nụchara anụcha na-ala n’iyi, ma ọ bụ na-agbari, mgbe e tinyere ya ná mmiri ọgwụ nke ụzọ atọ n’ime ya bụ hydrochloric acid, otu ụzọ n’ime ya abụrụ nitric acid. N’ihi ya, Bible kwekọrọ na nkà mmụta sayensị n’ikwu na ‘ọlaedo na-ala n’iyi.’
N’ụzọ dị iche, ezi okwukwe ndị Kraịst ‘na-echebe mkpụrụ obi.’ (Ndị Hibru 10:39, NW) Ụmụ mmadụ pụrụ igbu onye nwere okwukwe siri ike, dị ka ha mere Jisọs Kraịst. Ma, e kwere ndị nwere ezi okwukwe nkwa a, sị: “Gosi onwe gị onye kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, M ga-enyekwa gị okpueze ahụ, bụ́ ndụ.” (Mkpughe 2:10) Ndị nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi na-anọgide ná ncheta Chineke, ọ ga-akpọlitekwa ha n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Ọ dịghị ọlaedo pụrụ ime nke ahụ. N’echiche a, okwukwe dị oké ọnụ ahịa n’ezie karịa ọlaedo. Otú ọ dị, ka okwukwe wee dị oké ọnụ ahịa otú ahụ, a ghaghịkwa ịnwapụta, ma ọ bụ ịnwale ya. N’ezie, ọ bụ “nnwapụta nke okwukwe” ka Pita kwuru na ọ dị oké ọnụ ahịa karịa ọlaedo. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmụ Bible ka i wee zụlite ma nọgide na-enwe okwukwe siri ike n’ebe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ. Dị ka Jisọs si kwuo, nke a “bụ ndụ ebighị ebi.”—Jọn 17:3.