Nwee Okwukwe Dị Ka Nke Abraham!
Nwee Okwukwe Dị Ka Nke Abraham!
“Ndị sitere n’okwukwe, ndị ahụ bụ ụmụ Abraham.”—NDỊ GALETIA 3:7.
1. Olee otú Abram si nagide ọnwụnwa ọhụrụ o nwetara na Kenean?
ABRAM ahapụla ndụ okomoko na Ua n’irube isi n’iwu Jehova. Ihe isi ike ndị o nwegasịrị n’afọ ndị sochirinụ bụ nanị mmalite nke ule nke okwukwe o nwetara n’Ijipt. Ihe ndekọ Bible na-ekwu, sị: “Oké ụnwụ wee dị n’ala ahụ.” Lee ka ọ gaara esiwo dịrị Abram mfe inwe obi ilu banyere ọnọdụ ya! Kama nke ahụ, o weere nzọụkwụ ndị dị irè iji gboo mkpa ezinụlọ ya. “Abram wee rịdaruo Ijipt ịnọ n’ebe ahụ dị ka ọbịa; n’ihi na oké ụnwụ ahụ dị ike n’ala.” Ọ ga-esi nnọọ ike ka a ghara ịma na nnukwu ezinụlọ Abram bịara Ijipt. Jehova ọ̀ ga-emezu nkwa ya ma chebe Abram pụọ ná mmerụ ahụ?—Jenesis 12:10; Ọpụpụ 16:2, 3.
2, 3. (a) N’ihi gịnị ka Abram ji zochie ihe bụ́ ọnọdụ nwunye ya n’ezie? (b) N’ime ihe banyere ọnọdụ ahụ, olee otú Abram si mesoo nwunye ya ihe?
2 Anyị na-agụ na Jenesis 12:11-13, sị: “O ruo, mgbe ọ bịaruru nso ịba n’Ijipt, na ọ sịrị Seraị, bụ́ nwunye ya, Biko, lee, amaara m na nwanyị mara mma ile anya ka ị bụ: ọ ga-erukwa, mgbe ndị Ijipt ga-ahụ gị, na ha ga-asị, Nwunye ya ka nwanyị a bụ: ha ewee gbuo m, ma gị ka ha ga-edebe ndụ. Biko, sị na ọ bụ nwanne m nwanyị ka ị bụ: ka o wee dịrị m mma n’ihi gị, ka mkpụrụ obi m wee dịkwa ndụ n’ihi gị.” Ọ bụ ezie na Seraị agafewo afọ 65, ọ ka mara mma dị egwu. Nke ahụ tinyere ndụ Abram n’ihe ize ndụ. * (Jenesis 12:4, 5; 17:17) Nke kasị mkpa, ihe ndị metụtara nzube Jehova nọ n’ihe ize ndụ, n’ihi na o kwuwo na mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha site ná mkpụrụ Abram. (Jenesis 12:2, 3, 7) Ebe ọ bụ na Abram amụtabeghị nwa, ọ dị oké mkpa na ọ ga-anọgide na-adị ndụ.
3 Abram gwara nwunye ya banyere iji ụzọ ha kwekọrịtaworo tupu mgbe ahụ mee ihe, ya bụ, ịsị na ọ bụ nwanne ya nwanyị. Rịba ama na ọ bụ ezie na o nwere ikike dị ka nna ochie, o jighị ọnọdụ ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi kama ọ rịọrọ nwunye ya maka nkwado na nkwenye. (Jenesis 12:11-13; 20:13) Na nke a, Abram setịpụụrụ ndị bụ́ di ezi ihe nlereanya n’iji ịhụnanya na-abụ isi, Seraị kwa, site n’ido onwe ya n’okpuru, bụụrụ ndị bụ́ nwunye taa ihe nlereanya.—Ndị Efesọs 5:23-28; Ndị Kọlọsi 4:6.
4. Olee otú ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi taa kwesịrị isi na-akpa àgwà mgbe ndụ ụmụnna ha nọ n’ihe ize ndụ?
4 Seraị pụrụ ikwu na ya bụ nwanne Abram n’ihi na otu nna ji ha abụọ n’ezie. (Jenesis 20:12) Ọzọkwa, iwu ejighị ya ikpughe ihe ọmụma nye ndị na-ekwesịghị ịma ya. (Matiu 7:6) Ndị ohu Chineke n’oge a na-erube isi n’iwu Bible nke ime ihe n’eziokwu. (Ndị Hibru 13:18) Dị ka ihe atụ, ha agaghị anwa anwa ghaa ụgha mgbe ha ṅụrụ iyi n’ụlọikpe. Otú ọ dị, mgbe ndụ ụmụnna ha nọ n’ihe ize ndụ n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ, dị ka n’oge mkpagbu ma ọ bụ ọgba aghara obodo, ha na-erube isi na ndụmọdụ Jisọs bụ́ ịbụ “ndị nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru.”—Matiu 10:16; lee Ụlọ . Nche, November 1, 1996, peeji nke 18, paragraf nke 19
5. Gịnị mere Seraị ji dị njikere ime ihe Abram rịọrọ ya?
5 Olee otú Seraị si meghachi omume n’ihe Abram rịọrọ ya? Pita onyeozi na-akọwa ndị inyom dị ka ya dị ka ndị “na-ele anya Chineke.” Ya mere, Serai pụrụ ịghọta ihe iseokwu ime mmụọ nke a metụtara. E wezụga nke ahụ, ọ hụrụ di ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. N’ihi ya, Seraị họọrọ ‘ido onwe ya n’okpuru di ya’ ma zochie ọnọdụ ya dị ka onye lụrụ di. (1 Pita 3:5) N’ezie, ime otú ahụ kpughere ya nye ihe ize ndụ. “O ruo, mgbe Abram batara n’Ijipt, na ndị Ijipt hụrụ nwanyị ahụ na nwanyị mara mma nke ukwuu ka ọ bụ. Ndị isi Fero wee hụ ya, too ya n’ihu Fero: e wee kubata nwanyị ahụ n’ụlọ Fero.”—Jenesis 12:14, 15.
Nnapụta nke Jehova
6, 7. N’ọnọdụ dị aṅaa na-akpata obi erughị ala ka Abram na Seraị hụrụ onwe ha, oleekwa otú Jehova si napụta Seraị?
6 Lee ka nke a na-aghaghị isiwo mee ka obi ghara iru Abram na Seraị ala! O yiri ka a na-aga ịkwaso Seraị iko. Ọzọkwa, ebe Fero na-amaghị na Seraị lụrụ di, o nyere Abram ọtụtụ onyinye, nke mere na “[ọ bịara nwee] ìgwè ewu na atụrụ, na ìgwè ehi, na oké ịnyịnya ibu, na ndị ohu ndị ikom, na ndị inyom na-eje ozi, na nne ịnyịnya ibu, na camel.” * (Jenesis 12:16) Lee ka ọ na-aghaghị isiwo dị Abram ka e lelịrị ya anya n’ihi onyinye ndị a! N’agbanyeghị otú ọnọdụ pụrụ isiwo yie ihe dị njọ, Jehova agbahapụbeghị Abram.
7 “Ma Jehova weere ihe otiti ukwu dị iche iche tie Fero na ụlọ ya n’ihi okwu banyere Seraị, bụ́ nwunye Abram.” (Jenesis 12:17) N’ụzọ ụfọdụ a na-emeghị ka anyị mara, e mere ka Fero mara ihe kpatara “ihe otiti” ndị a n’ezie. O mere ihe ozugbo: “Fero wee kpọọ Abram, sị, Gịnị bụ nke a i meworo m? n’ihi gịnị ka ị na-egosighị m na nwunye gị ka ọ bụ? N’ihi gịnị ka ị sịrị, Nwanne m nwanyị ka ọ bụ? M wee lụta ya n’onwe m na nwunye: ma ugbu a, lee nwunye gị, kuru ya, laa. Fero wee nye ndị ikom ụfọdụ iwu banyere ya: ha wee zilaga ya na nwunye ya na ihe nile nke o nwere.”—Jenesis 12:18-20; Abụ Ọma 105:14, 15.
8. Nchebe dị aṅaa ka Jehova kwere ndị Kraịst ná nkwa taa?
8 Taa, Jehova adịghị ekwe anyị nkwa nchebe pụọ n’ihe ọnwụ, mpụ, ụnwụ nri, ma ọ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha na-akpata. E kwere anyị nkwa na Jehova ga-echebe anyị mgbe nile pụọ n’ihe ndị pụrụ itinye ọnọdụ ime mmụọ anyị n’ihe ize ndụ. (Abụ Ọma 91:1-4) Ụzọ bụ́ isi o si eme nke ahụ bụ site n’inye anyị ịdọ aka ná ntị ndị na-abịa n’oge ha site n’Okwu ya nakwa n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) Gịnị banyere iyi egwu nke ịbụ onye e gburu ná mkpagbu? Ọ bụ ezie na Chineke pụrụ ikwe ka ndị mmadụ n’otu n’otu nwụọ, ọ gaghị ekwe ma ọlị ka e kpochapụ ndị ya n’ozuzu ha. (Abụ Ọma 116:15) Ọ bụrụkwa na ọnwụ egbuo ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, anyị pụrụ inwe obi ike na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.
Ịchụ Àjà Iji Chekwaa Udo
9. Gịnị na-egosi na Abram nọgidere na-agagharị agagharị na Kenean?
9 Ebe ọ bụ na o doro anya na ụnwụ adịghịzi na Kenean, “Abram wee si n’Ijipt rịgoo, ya onwe ya, na nwunye ya, na ihe nile o nwere, na Lọt tinyere ya, ruo Negeb [ógbè a na-enwe ntakịrị mmiri ozuzo na ya n’ebe ndịda nke ugwu Juda]. Abram bụkwa ọgaranya nke ukwuu n’anụ ụlọ na n’ọlaọcha, na n’ọlaedo.” (Jenesis 13:1, 2) N’ihi ya, ndị bi n’ógbè ahụ ga-ahụ ya dị ka onye dị ike na onye a na-akwanyere ùgwù, onyeisi bụ́ dike. (Jenesis 23:6) Abram enweghị ọchịchọ ibiwezi ebe ahụ ma tinyewe aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị Kenean. Kama nke ahụ, “o si na Negeb jee ná mbuli ije ya wee ruo Betel, ruo ebe ahụ ebe ụlọikwuu ya dịrị site ná mmalite, n’etiti Betel na Ai.” Dị ka ọ na-eme mgbe nile, Abram na-ebute ofufe Jehova ụzọ n’ebe ọ bụla ọ gara.—Jenesis 13:3, 4.
10. Nsogbu dị aṅaa bilitere n’etiti ndị na-azụrụ Abram na Lọt anụ ụlọ, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa ka e dozie ya n’egbughị oge?
10 “Ọzọkwa, Lọt, onye ya na Abram na-ayịkọ jee, o nwere ìgwè ewu na atụrụ, na ìgwè ehi, na ọtụtụ ụlọikwuu. Ala ahụ anagideghị ha, ibikọ n’otu: n’ihi na akụ̀ ha hiri nne, ha apụghịkwa ibikọ n’otu. Iseokwu wee dị n’etiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ Abram na ndị ọzụzụ anụ ụlọ Lọt: ndị Kenean na ndị Perizaịt na-ebikwa n’ala ahụ mgbe ahụ.” (Jenesis 13:5-7) Ala ahụ enweghị mmiri na ahịhịa na-ezuru ma anụ ụlọ Abram ma nke Lọt. N’ihi ya, ndị na-azụrụ ha anụ ụlọ malitere iserịta okwu na iwesorịta ibe ha iwe. Esemokwu dị otú ahụ ekwesịtụghị ndị na-efe ezi Chineke. Ọ bụrụ na esemokwu ahụ agaa n’ihu, ọ pụrụ ịkpata nkewa na-adịgide adịgide. Ya mere, olee otú Abram ga-esi edozi ọnọdụ a? Ọ kpọgharawo Lọt mgbe nna Lọt nwụsịrị, ikekwe ọ zụlitere ya dị ka nwa nke ya. Dị ka onye tọrọnụ, ọ̀ bụ na o rughịrị Abram iwere ebe kasị mma?
11, 12. Gịnị ka Abram ji mmesapụ aka gwa Lọt ka ọ họrọ, n’ihi gịnịkwa ka nhọrọ Lọt mere ji bụrụ nke amamihe na-adịghị na ya?
11 Ma “Abram [sịrị] Lọt, Biko, ka iseokwu ghara ịdị n’etiti mụ na gị, na n’etiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ nke m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ nke gị; n’ihi na nwanne ka anyị bụ. Ala nke a nile, ọ́ dịghị n’ihu gị? biko, kewapụ onwe gị n’ahụ m: ọ bụrụ aka ekpe, m ga-ejekwa n’aka nri: ma ọ bụrụ aka nri, m ga-ejekwa n’aka ekpe.” Na nso Betel, e nwere ebe a kpọrọla “otu n’ime ebe ndị kasị elu a nọ elepụ anya na Palestine.” Ikekwe site n’ebe ahụ, “Lọt [weliri] anya ya abụọ, hụ Gburugburu ala nile nke Jọdan, na ala ahụ nile bụ ala mmiri na-ede nke ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dị ka ubi Jehova a gbara ogige, dị ka ala Ijipt, mgbe ị na-eje Zoa.”—Jenesis 13:8-10.
12 Ọ bụ ezie na Bible kọwara Lọt dị ka “onye ezi omume,” n’ihi ihe ụfọdụ, o doghị onwe ya n’okpuru Abram n’okwu a, o yighịkwa ka ọ chọrọ ndụmọdụ nke onye ka okenye. (2 Pita 2:7) “Lọt wee họpụtara onwe ya Gburugburu ala nile nke Jọdan; Lọt wee bulie ije jee n’Ihu anyanwụ: ha wee kewapụ onwe ha otu n’ahụ nwanne ya. Abram biri n’ala Kenean, ma Lọt biri n’obodo nke Gburugburu ala ahụ, fopụ ụlọikwuu ya jee ruo Sọdọm.” (Jenesis 13:11, 12) Sọdọm bara ọgaranya, a na-enwetakwa ọtụtụ uru ihe onwunwe na ya. (Ezikiel 16:49, 50) Ọ bụ ezie na nhọrọ Lọt mere pụrụ iyiwo ihe amamihe dị na ya ma e lee ya anya n’ụzọ ihe onwunwe, ọ bụ nke amamihe na-adịghị na ya ma e lee ya anya n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi gịnị? N’ihi na “ndị Sọdọm bụ ndị ọjọọ na ndị mmehie megide Jehova nke ukwuu,” ka Jenesis 13:13 na-ekwu. Mkpebi Lọt mere ịkwaga ebe ahụ ga-emesị wetara ezinụlọ ya oké iru újú.
13. Olee otú ihe nlereanya Abram si enyere ndị Kraịst bụ́ ndị pụrụ ise okwu n’ihi ego aka?
13 Otú ọ dị, Abram gosipụtara okwukwe ná nkwa Jehova bụ́ na mkpụrụ ya ga-emesị nweta ala ahụ dum; ọ bịaghị zọwa akụkụ dị nta nke ala ahụ. O ji mmesapụ aka mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ahụ e mesịrị kwupụta ná 1 Ndị Kọrint 10:24: “Ka onye ọ bụla ghara ịchọ ọdịmma nke aka ya, kama ọdịmma nke mmadụ ibe ya.” Nke a bụ ihe ncheta dị mma nye ndị pụrụ iso ndị kwere ekwe ibe ha sewe okwu n’ihi ego. Kama ịgbaso ndụmọdụ dị na Matiu 18:15-17, ụfọdụ akpụpụwo ụmụnna ha n’ụlọikpe. (1 Ndị Kọrint 6:1, 7) Ihe nlereanya Abram na-egosi na ọ ka mma ego ifunahụ anyị kama iwetara aha Jehova nkọcha ma ọ bụ ịkpasasị udo nke ọgbakọ ndị Kraịst.—Jemes 3:18.
14. Olee otú a gaje isi gọzie Abram n’ihi mmesapụ aka ya?
14 A gaje ịgọzi Abram n’ihi mmesapụ aka ya. Chineke kwupụtara, sị: “M ga-emekwa ka mkpụrụ gị dị ka ájá nke ala: ya bụ na, ọ bụrụ na mmadụ pụrụ ịgụta ájá nke ala, a ga-agụtakwa mkpụrụ gị.” Lee ka ihe a e kpugheere Abram na-amụbeghị nwa na-aghaghị isiwo bụrụ ihe agbamume nye ya! Ọzọkwa, Chineke nyere ya iwu, sị: “Bilie, jegharịa n’ala nke a n’ogologo ya na n’obosara ya; n’ihi na gị ka M ga-enye ya.” (Jenesis 13:16, 17) Ee e, a gaghị ekwe ka Abram biri ná ntụsara ahụ n’obodo ukwu. Ọ gaje ịnọpụ iche n’ebe ndị Kenean nọ. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Kraịst taa aghaghị ịnọpụ iche n’ụwa. Ha adịghị ewere onwe ha dị ka ndị ka ndị ọzọ elu, ma ha adịghị eso onye ọ bụla pụrụ ịraba ha n’omume Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, akpakọrịta.—1 Pita 4:3, 4.
15. (a) Gịnị ka njegharị Abram pụrụ ịpụtawo? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Abram setịpụụrụ ezinụlọ ndị Kraịst taa?
15 N’oge Bible, tupu mmadụ azụọ ala, ọ ga-ebu ụzọ nyochaa ya. N’ihi ya, ijegharị n’ala ahụ pụrụ ịbụwo ihe na-echetara Abram mgbe nile na otu ụbọchị, ala a ga-abụ nke ụmụ ya. Ná nrubeisi, “Abram wee fopụ ụlọikwuu ya, bịa biri n’etiti osisi terebinth nke Mamre, nke dị n’ime Hebrọn, o wuoro Jehova ebe ịchụàjà n’ebe ahụ.” (Jenesis 13:18) Ọzọkwa, Abram gosipụtara mbute ọ na-ebute ofufe ụzọ nke ukwuu. Ị̀ na-ebute ọmụmụ ihe ezinụlọ, ekpere ezinụlọ, na ịga nzukọ ụzọ n’ezinụlọ gị?
Onye Iro Emee Mwakpo
16. (a) N’ihi gịnị ka okwu mmeghe nke Jenesis 14:1 ji ada ka ihe na-eyi egwu? (b) Gịnị kpatara mwakpo ndị eze anọ ahụ si ọwụwa anyanwụ mere?
16 “O ruo, n’ụbọchị nke Amrafel, bụ́ eze Shaịna, na nke Ariọk, bụ́ eze Elasa, na nke Kedoalaoma, bụ́ eze Ilam, * na nke Taịdal, bụ́ eze Goyim, na ha buru agha.” Na Hibru mbụ, okwu mmeghe ahụ bụ́ (“O ruo, n’ụbọchị nke . . . ”) na-egosi ihe na-eyi egwu, na-arụtụ aka “n’oge ọnwụnwa bụ́ nke ọgwụgwụ ya bụ ngọzi.” (Jenesis 14:1, 2, ihe odide ala ala peeji nke NW) Ọnwụnwa ahụ malitere ka ndị eze anọ a si ọwụwa anyanwụ na usuu ndị agha ha wakporo Kenean n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Gịnị bụ ebumnobi ha? Ọ bụ ịbịanyụ nnupụisi nke mba ise bụ́ Sọdọm, Gọmọra, Adma, Zeboyim, na Bila. N’imeri nguzogide ha nile, ha “jikọtara onwe ha n’otu na ndagwurugwu Sidim (nke ahụ bụ Oké Osimiri Nnú).” Lọt na ezinụlọ ya bi n’ebe dị nso.— Jenesis 14:3-7.
17. Gịnị mere ndọrọ a dọọrọ Lọt n’agha ji bụrụ ule nke okwukwe nye Abram?
17 Ndị eze Kenean ahụ guzogidesiri ndị wakporo ha ike, ma e meriri ha n’ụzọ dị njọ. “Ha wee chịrị akụ̀ nile nke Sọdọm na Gọmọra, na ihe oriri ha nile, laa. Ha chịrịkwa Lọt na akụ̀ ya laa, bụ́ nwa nwanne Abram, n’ihi na ya onwe ya bi na Sọdọm.” Jenesis 14:8-14) Lee ule nke okwukwe nke ahụ bụ! Abram ọ̀ ga-enwewa mmetụta dị njọ n’ebe nwa nwanne ya nọ n’ihi iwere akụkụ kasị mma nke ala ahụ? Chetakwa na ndị mwakpo a si n’ala nna ya, bụ́ Shaịna, bịa. Ịga lụso ha ọgụ ga-abụ imebi ihe ọ bụla ga-eme ka o kwe ya omume ịlaghachi n’obodo ya. Ọzọkwa, gịnị ka Abram pụrụ ime usuu ndị agha nke njikọ nke ndị agha nile nke Kenean na-emerilighị?
N’oge na-adịghị anya, a kọọrọ Abram banyere ihe omume a dị mwute: “Onye gbapụrụ agbapụ wee bịa gosi Abram, bụ́ onye Hibru: ma ya onwe ya bi n’etiti osisi terebinth nke Mamre, bụ́ onye Amọraịt, nwanne Eshkol, na nwanne Ana; ndị ahụ bụkwa ndị ha na Abram dị n’ọgbụgba ndụ. . . . Abram nụrụ na a dọtara nwanne ya n’agha.” (18, 19. (a) Olee otú Abram si nwee ike ịnapụta Lọt? (b) Ònye ka e nyere otuto maka mmeri a?
18 Ọzọkwa, Abram nwere ntụkwasị obi siri ike n’ebe Jehova nọ. “Ọ chịpụta ndị ya e ziri ibu agha, bụ́ ndị a mụrụ n’ụlọ ya, [narị atọ na iri na asatọ], o wee na-achụ ha ruo Dan. O wee kesaa onwe ya imegide ha n’abalị, ya onwe ya na ndị ohu ya, o tigbuo ha, chụọ ha ruo Hoba, nke dị n’aka ekpe Damaskọs. O wee chịlata akụ̀ nile, ọzọkwa, Lọt, bụ́ nwanne ya, na akụ̀ ya ka ọ chịlatara, ndị inyom kwa, na ndị ahụ.” (Jenesis 14:14-16) N’igosipụta okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ, Abram meriri usuu ndị agha karịrị nnọọ nke ya, na-anapụta Lọt na ezinụlọ ya. Abram zuteziri Melkizedek, bụ́ eze na onye nchụàjà Selem. “Melkizedek, bụ́ eze Selem, wee bupụta achịcha na mmanya vine: onye ahụ bụkwa onye nchụàjà dịịrị Chineke Nke kachasị ihe nile elu. O wee gọzie ya, sị, Onye a gọziri agọzi ka Abram bụ site n’aka Chineke Nke kachasị ihe nile elu, bụ́ Onye nwe eluigwe na ụwa: ọ bụkwa Onye a gọziri agọzi ka Chineke Nke kachasị ihe nile elu bụ, Onye rawooro ndị na-akpagbu gị nye n’aka gị. O wee nye ya otu ụzọ n’ụzọ iri n’ime ihe nile.”—Jenesis 14:18-20.
19 Ee, ọ bụ Jehova nwe mmeri ahụ. N’ihi okwukwe Abram, Jehova napụtara ya ọzọ. Ndị Chineke taa adịghị alụ agha nkịtị, ma ha na-eche ọtụtụ ule na ihe ịma aka ihu. Isiokwu anyị na-esonụ ga-egosi otú ihe nlereanya Abram pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide ha n’ụzọ na-aga nke ọma.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Dị ka Insight on the Scriptures (nke Ndịàmà Jehova bipụtara) si kwuo, “ihe e dere n’otu papyrus oge ochie na-ekwu banyere Fero nke nyere ndị agha iwu ijide nwanyị mara mma ma gbuo di ya.” N’ihi ya, e tinyeghị ụjọ Abram nnu na ose.
^ par. 6 Hega, bụ́ onye mesịrị ghọọ iko nwanyị Abram, pụrụ isowo ná ndị ohu e nyere Abram n’oge a.—Jenesis 16:1.
^ par. 16 N’otu oge, ndị nkatọ zọọrọ na ọ dịtụbeghị mgbe Ilam nwere mmetụta dị otú ahụ n’ebe Shaịna dị nakwa na ihe ndekọ banyere mwakpo ahụ Kedoalaoma mere bụ ihe e chepụtara echepụta. Iji nweta ihe akaebe nkà mmụta ihe ochie bụ́ nke na-akwado ihe ndekọ Bible ahụ, lee Ụlọ Nche, July 1, 1989, peeji nke 4-7.
Ị̀ Rịbara Ama?
• Olee otú ụnwụ nri ahụ dara n’ala Kenean si bụrụ ule nke okwukwe nye Abram?
• Olee otú ma Abram ma Seraị si setịpụ ezi ihe nlereanya nye ndị bụ́ di na nwunye taa?
• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’otú Abram si dozie esemokwu dị n’etiti ndị ohu ya na ndị nke Lọt?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 22]
Abram azọwaghị ihe ruuru ya kama o butere ọdịmma Lọt ụzọ
[Foto dị na peeji nke 24]
N’ịgbapụta nwa nwanne ya bụ́ Lọt, Abram gosipụtara ndabere ọ dabeere n’ebe Jehova nọ