Ekwensu Ọ̀ Dị Adị?
Ekwensu Ọ̀ Dị Adị?
“N’akụkọ ihe mere eme nke Chọọchị ndị Kraịst, e nwere oge ekwensu, Beelzebul ma ọ bụ Setan, eze ihe ọjọọ, bụ onye dị adị nke nwere ikike, dị nnọọ ka ‘Chineke’ ka bụ onye dị adị ma nwee ikike taa nye ọnụ ọgụgụ na-ebelata ebelata nke ụmụ mmadụ; ọ bụ onye ndị Juu na ndị Kraịst oge mbụ chepụtara iji nwee ike ịkọwa ihe ọjọọ nke gbara ha gburugburu n’ụdị ọkara mmadụ, ọkara anụ ọhịa. Mgbe e mesịrị, ndị Kraịst bịara ghọta na ọ bụ onye e chepụtara echepụta nke a na-enweghị ihe ndabere na ọ dịrị adị, ha jikwa nnọọ nwayọọ jụ ya.”—“All in the Mind—A Farewell to God,” nke Ludovic Kennedy dere.
DỊ KA onye edemede na onye mgbasa ozi bụ́ Ludovic Kennedy si kwuo, ruo ọtụtụ narị afọ, ọ dịghị onye nọ na Krisendọm nke nwere obi abụọ ma Ekwensu ọ dịkwa adị. Kama nke ahụ, dị ka Prọfesọ Norman Cohn si kwuo ya, “ike Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-akpa nyere [ndị Kraịst] nsogbu n’obi” mgbe ụfọdụ. (Europe’s Inner Demons) Ọ bụghị nanị ndị nkịtị na-agụghị akwụkwọ ka nke a nyere nsogbu n’obi. Dị ka ihe atụ, nkwenkwe ahụ bụ́ na Ekwensu na-enwogha onwe ya ghọọ anụmanụ iji nọrọ n’isi ihe ọjọọ nakwa n’ememe ndị rụrụ arụ, “abụghị akụkọ ọdịnala sitere n’aka ndị iti bụ́ ndị ka n’ọnụ ọgụgụ, kama, n’ụzọ dị iche, ọ bụ echiche ndị nọ n’ọkwá dị elu ụbụrụ na-aghọ nkọ nwere banyere ụwa,” ka Prọfesọ Cohn na-ekwu. Ọ bụ ‘ndị a nọ n’ọkwá dị elu ụbụrụ na-aghọ nkọ’—gụnyere ndị ụkọchukwu gụrụ oké akwụkwọ—hụrụ maka nchọgharị na njide nke ndị amoosu na Europe dum site na narị afọ nke 15 ruo nke 17, bụ́ mgbe e kwuru na chọọchị na ndị ọchịchị obodo tara ihe dị ka mmadụ 50,000 e boro ebubo na ha bụ amoosu ahụhụ ma gbuo ha.
Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị ajụwo ikwere ihe ha weere dị ka nkwenkwe ụgha na-enweghị isi banyere Ekwensu. Ọbụna laa azụ na 1726, Daniel Defoe mere ndị mmadụ akaje maka nkwenkwe ha bụ́ na Ekwensu bụ ajọ anụ na-atụ ụjọ nke “nwere nku ụsụ, mpi, ụkwụ wara njakpa, ọdụ ogologo, ire gbara mkpị, na ihe ndị yiri ha.” O kwuru na echiche dị otú ahụ bụ “ihe a na-echepụtaghị nke ọma,” nke “ndị na-eme ka e kwere n’ekwensu na ndị na-echepụta ekwensu” chepụtara, bụ́ ndị “ji ekwensu ha chepụtara n’onwe ha ghọgbuo ndị na-amaghị nke a na-akọ.”
Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si hụ ya? Ì kweere na “ekwensu bụ n’ezie ihe mmadụ chepụtara iji nye ihe ngọpụ maka mmehie ya”? E dere ihe a n’akwụkwọ bụ́ The Zondervan Pictorial Encyclopedia of the Bible, ọtụtụ ndị sị na ha bụ ndị Kraịst nwekwara echiche dị otú ahụ. Jeffrey Burton Russell na-ekwu na, n’ụzọ dị ukwuu, ndị ọkà mmụta okpukpe Krisendọm “elegharala ịdị adị nke Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ anya dị ka nkwenkwe ụgha ndị mgbe ochie.”
Ma, nye ụfọdụ ndị, Ekwensu dị nnọọ adị n’ezie. Echiche ha bụ na a ghaghị inwe ajọ ikike karịrị nke mmadụ nke na-akpata ihe ọjọọ na-eme mgbe nile bụ́ ndị jupụtara n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. “Ihe ọjọọ ndị meworo na narị afọ nke iri abụọ,” ka Russell na-ekwu, na-akọwa otu ihe mere “e ji na-ekwereghachi ngwa ngwa na Ekwensu dị adị, ka a kwụsịchara ikwere na ọ dị ruo ogologo oge.” Dị ka onye edemede bụ́ Don Lewis si kwuo, ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ n’oge a bụ́ ndị “ji nlelị achị ọchị” maka nkwenkwe ụgha na ịtụ egwu nile nke “ndị nna nna ha na-agụghị akwụkwọ,” “na-aghọzi ndị ihe ọjọọ sitere n’ebe karịrị ike mmadụ na-adọrọ mmasị ha.”—Religious Superstition Through the Ages.
Oleezi ihe bụ́ eziokwu banyere okwu a? Ekwensu ọ̀ bụ nanị nkwenkwe ụgha na-enweghị isi? Ka ọ̀ bụ onye e kwesịrị ikwere na ọ dị adị ọbụna na narị afọ nke 21 a?
[Foto dị na peeji nke 4]
Dị ka e gosiri n’ihe a Gustave Doré tụrụ, nkwenkwe ụgha mgbe ochie kọwara Ekwensu dị ka ọkara mmadụ, ọkara anụ ọhịa
[Ebe E Si Nweta Foto]
The Judecca—Lucifer/The Doré Illustrations For Dante’s Divine Comedy/Dover Publications Inc.