Ọ̀ Dị Ihe Pụrụ Ime Ka Ndị Mmadụ Dị n’Otu n’Ezie?
Ọ̀ Dị Ihe Pụrụ Ime Ka Ndị Mmadụ Dị n’Otu n’Ezie?
N’AGBANYEGHỊ ihe bụ nkwenkwe gị, eleghị anya i kweere na a ghaghị inwe ndị hụrụ eziokwu n’anya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile. A bịa n’okpukpe Hindu, Katọlik, okpukpe ndị Juu, na n’okpukpe ndị ọzọ, a pụrụ ịchọta ndị nwere mmasị miri emi n’ihe bụ́ eziokwu ma dị njikere ịchọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, o yiri ka okpukpe ọ na-ekewasị ihe a kpọrọ mmadụ. Ọbụna ụfọdụ na-eji okpukpe eme arụ. Ọ̀ dị mgbe ọ ga-ekwe omume ndị nwere obi eziokwu sitere n’okpukpe nile bụ́ ndị hụrụ ezi ihe na eziokwu n’anya, ịdị n’otu? À pụrụ ijikọta ha ọnụ maka otu nzube?
Lee ka o si agbawa obi ịhụ na okpukpe nọgidere bụrụ ihe na-akpata nkewa! Tụlee ụfọdụ n’ime ọgba aghara ndị a. Ndị Hindu na-ebuso ndị Buddha agha na Sri Lanka. Ndị Protestant, ndị Katọlik, na ndị Juu akwafuwo ọbara n’ọtụtụ ọgba aghara. “Ndị Kraịst” na-ebuso ndị Alakụba agha na Bosnia, Chechnya, Indonesia, nakwa na Kosovo. Na March 2000 kwa, ọgba aghara were ụbọchị abụọ nke metụtara okpukpe gburu ndị Nigeria dị 300. N’ezie, ịkpọasị okpukpe emewo ka ọgba aghara ndị a ka njọ.
Arụ ndị a na-akpa n’aha okpukpe na-ejukarị ndị nwere obi eziokwu anya. Dị ka ihe atụ, ọ na-awụ ọtụtụ ndị na-aga chọọchị akpata oyi n’ahụ na chọọchị ụfọdụ agbachiwo ndị ụkọchukwu bụ́ ndị metọworo ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ, nkịtị. Nkewa dị n’etiti ọtụtụ òtù sịrị na ha bụ ndị Kraịst n’ihi okwu ndị dị ka idina ụdị onwe na isikwopụ afọ ime na-emenye ndị ọzọ kwere ekwe ihere nke ukwuu. N’ụzọ doro anya, okpukpe emebeghị ka ihe a kpọrọ mmadụ dị n’otu. Ma, n’ọtụtụ okpukpe, e nwere ndị hụrụ eziokwu n’anya n’ezie, dị ka ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi.
Eziokwu ahụ Gụsiri Ha Agụụ Ike
Fidelia bụ onye ji ezi obi fechie ofufe anya na Chọọchị Katọlik nke San Francisco dị na La Paz, Bolivia. Ọ na-akpọ isiala n’ihu ihe oyiyi Meri ma na-edebe kandụl ndị kasị mma ọ pụrụ ịzụta n’ihu obe. Kwa izu, ọ na-ebunye ụkọchukwu ihe oriri buru ibu ka o kesaara ndị ogbenye. Otú ọ dị, mmadụ ise n’ime ụmụ Fidelia nwụrụ tupu e nwee ike ime ha baptism. Mgbe ụkọchukwu gwara ya na ha na-ata ahụhụ n’ọchịchịrị nke Limbo, Fidelia chere sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke dị mma, olee otú nke ahụ ga-esi mee?’
A zụlitere Tara, bụ́ onye dọkịta dị ka onye Hindu na Kathmandu, Nepal. N’ịgbaso omenala ndị nna nna ya hà ndị dịwara eri ọtụtụ narị afọ, o fere chi ya dị iche iche ofufe n’ụlọ nsọ ndị Hindu nweekwa arụsị dị iche iche n’ụlọ ya. Ma ajụjụ ndị dị ka ndị a gbagwojuru Tara anya: N’ihi gịnị ka e ji nwee oké nhụjuanya? N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji anwụ anwụ? O siiri ya ike ịchọta azịza na-eju afọ n’okpukpe ya.
N’aka nke ọzọ, Panya tolitere dị ka onye Buddha n’otu ụlọ dị n’akụkụ ọwà mmiri dị na Bangkok, Thailand. A kụziiri ya na ahụhụ mmadụ na-ata bụ n’ihi
ihe o metere ná ndụ mbụ ọ dịrị nakwa na mmadụ pụrụ inwere onwe ya pụọ na ya site n’ịghara ịdị na-enwe ọchịchọ maka ihe ọ bụla. Dị ka ndị Buddha ndị ọzọ nwere obi eziokwu, a kụziiri ya inwe nkwanye ùgwù miri emi maka amamihe nke ndị mọnk na-eyi uwe odo odo bụ́ ndị na-abịa n’ụlọ ndị mmadụ kwa isi ụtụtụ ịrịọ maka ihe enyemaka. Ọ tụgharịrị uche site n’oge ruo n’oge ma nweta ihe oyiyi dị iche iche nke Buddha, na-ekwere na ha na-eweta nchebe. Mgbe o nwesịrị oké ihe mberede nke kwarụrụ ya site n’úkwù gbadaa, Panya gara n’ebe obibi ndị mọnk nke Buddha, jiri ezi obi na-atụ anya na a ga-agwọ ya n’ụzọ ọrụ ebube. O nwetaghị ọgwụgwọ ma ọ bụ odido nsọ. Kama nke ahụ, e kpughepụrụ ya nye ime mgbaasị, ọ malitekwara ịwagharị n’ime ya.A mụrụ Virgil na United States, o sonyekwaara òtù Ndị Isii Ojii Bụ́ Ndị Alakụba na mahadum. O ji ịnụ ọkụ n’obi kesaa akwụkwọ ha, bụ́ nke na-ekwu na ọ bụ ndị ọcha bụ Ekwensu. Ha chere na ọ bụ nke ahụ mere ndị ọcha ji kpaa ọtụtụ arụ ha kpara megide ndị isi ojii. Ọ bụ ezie na Virgil ji ezi obi kwere n’ihe o kweere, o nwere nchegbu banyere ajụjụ ndị bụ́: Olee otú ndị ọcha nile pụrụ isi bụrụ ndị ọjọọ? Gịnịkwa mere ọtụtụ nkwusa a na-eme ji bụrụ maka ego?
Ọ bụ ezie na Charo tolitere n’Ebe Ndịda America bụ́ ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ bụ ndị Katọlik, ọ bụ onye Protestant na-anụ ọkụ n’obi. Obi dị ya ụtọ na ya ekereghị òkè n’ikpere arụsị bụ́ nke gbara ya gburugburu. Charo nwere mmasị ịga chọọchị kwa Sunday maka okwuchukwu na-akpali akpali a na-ekwu, bụ́ ebe ọ na-eti “Halleluya!” ma na-esonye n’ịbụ abụ na n’ịgba egwú na-eso ya. Charo ji ezi obi kwere na a zọpụtawo ya nakwa na a mụwo ya ọzọ. Ọ kwụrụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe nnweta ya na chọọchị, mgbe otu onye ji TV ezisa ozi ọma bụ́ onye okwu ya na-amasị ya kwuru ka e nye onyinye, o zigaara ya ego maka ụmụaka nọ n’Africa. Otú ọ dị, mgbe ọ jụrụ pastọ ya ihe mere Chineke ji ata mkpụrụ obi ahụhụ na hel, ọ chọpụtara na o nweghị azịza na-eju afọ. Ka e mesịrị, ọ chọpụtakwara na e jighị onyinye ya nyere ụmụaka nọ n’Africa aka.
Ọ bụ ezie na nzụlite mmadụ ise a dịrịtara iche, ọ dị ihe ha nwekọrọ ọnụ. Ha hụrụ eziokwu n’anya ma jiri ezi obi chọọ azịza ndị bụ́ eziokwu nye ajụjụ ha. Ma, à pụrụ ime ka ha dị n’otu n’ezi ofufe n’ezie? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ahụ.
[Foto dị na peeji nke 4]
Ò kwere omume ndị sitere ná nzụlite dịrịtara iche ịdị n’otu n’ezie?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
G.P.O., Jerusalem