Ngọzi Jehova Na-eme Anyị Ọgaranya
Ngọzi Jehova Na-eme Anyị Ọgaranya
“Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—ILU 10:22.
1, 2. Gịnị mere na ọ dịghị ihe jikọrọ obi ụtọ na ihe onwunwe?
NCHỤSO ihe onwunwe na-achịkwa ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ taa. Ma ihe onwunwe ọ̀ na-eme ka ha na-enwe obi ụtọ? “Apụghị m icheta oge ndị mmadụ nweworo oké obi ịda mbà banyere ọnọdụ ha ná ndụ karịa ka ha nwere taa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Australian Women’s Weekly na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụ eziokwu yiri ụgha. A gwara anyị na Australia nọ n’ọnọdụ magburu onwe ya n’ụzọ akụ̀ na ụba, na ọ dịtụbeghị mgbe ndụ dị mma karịa ka ọ dị ugbu a. . . . N’agbanyeghị nke ahụ, enweghị nchekwube jupụtara ebe nile ná mba ahụ. Ma ndị ikom ma ndị inyom na-eche na ọ dị ihe na-efunahụ ha ná ndụ ma ha apụghị ịkọwa ihe ọ bụ.” Lee ka Akwụkwọ Nsọ si zie ezie n’ime ka ọ pụta ìhè na ma obi ụtọ ma ndụ adịghị nke na-esite n’ihe ndị anyị nwere!—Eklisiastis 5:10; Luk 12:15.
2 Bible na-akụzi na ọ bụ ngọzi Chineke na-enye obi ụtọ kasịnụ. Banyere nke a, Ilu 10:22 na-ekwu, sị: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” Iji anyaukwu na-akpakọba ihe onwunwe na-ewetakarị ihe mwute. N’ụzọ dabara adaba, Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpuo n’ime mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:9, 10.
3. N’ihi gịnị ka ọnwụnwa ji abịara ndị ohu Chineke?
3 N’aka nke ọzọ, ngọzi ihe mwute na-adịghị na ya na-eru ndị nile ‘na-anọgide na-ege ntị olu Jehova,’ ahụ. (Deuterọnọmi 28:2) Ma, ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe mwute a na-atụkwasị ná ngọzi Jehova, n’ihi gịnị ka ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke ji ata ahụhụ?’ Bible na-ekpughe na Chineke kwere ka ọnwụnwa na-abịara anyị ma, n’ezie, ọ bụ Setan, ajọ usoro ihe ya, na ọdịdị na-ezughị okè anyị, na-akpata ha. (Jenesis 6:5; Deuterọnọmi 32:4, 5; Jọn 15:19; Jemes 1:14, 15) Jehova bụ onye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye” si n’aka ya abịa. (Jemes 1:17) N’ihi ya, ngọzi ya adịghị atụkwasị ihe mwute ma ọlị. Ya mere, ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị zuru okè Chineke nyere.
Okwu Chineke—Onyinye Na-enweghị Atụ
4. Olee ngọzi na onyinye dị oké ọnụ ahịa ndị Jehova na-enweta na “mgbe ọgwụgwụ” a?
4 Amụma Daniel na-ekwu banyere “mgbe ọgwụgwụ,” sị: “Ihe ọmụma ga-abakwa ụba.” Otú ọ dị, a gbakwụnyere ya okwu ndị a: “Ndị nile nke na-emebi iwu agaghị aghọtakwa ihe: ma ndị ahụ ndị nwere uche ga-aghọta.” (Daniel 12:4, 10) Cheedị banyere nke ahụ! E ji ụdị amamihe Chineke nke ndị na-emebi iwu na-apụghị ịghọta nke ọma dee Okwu Chineke—karịsịa amụma—ebe ndị Jehova na-aghọta ya. “Ekelee m Gị, Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa,” ka Ọkpara Chineke kpere n’ekpere, “na I zonahụrụ ndị amamihe na ndị nwere nghọta ihe ndị a, I werekwa ha kpugheere ụmụ ọhụrụ.” (Luk 10:21) Lee ngọzi ọ bụ inweta onyinye ahụ na-enweghị atụ bụ́ Okwu Chineke e dere ede, bụ́ Bible, na iso ná ndị Jehova nyeworo nghọta ime mmụọ!—1 Ndị Kọrint 1:21, 27, 28; 2:14, 15.
5. Gịnị bụ amamihe, oleekwa otú anyị pụrụ isi nweta ya?
5 Anyị agaraghị enwe nghọta ime mmụọ ma ọlị ma e wezụga “amamihe ahụ nke si n’elu bịa.” (Jemes 3:17) Amamihe bụ ikike nke iji ihe ọmụma na nghọta na-edozi nsogbu, na-ezere ihe ize ndụ, na-eru ihe mgbaru ọsọ, ma ọ bụ na-enye ndụmọdụ dị mma. Olee otú anyị si enweta amamihe Chineke? Ilu 2:6 na-ekwu, sị: “Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.” Ee, Jehova ga-eji amamihe gọzie anyị ma ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike na-ekpe ekpere maka ya, ọbụna dị ka o nyere Eze Solomọn “obi maara ihe na nke na-aghọta ihe.” (1 Ndị Eze 3:11, 12; Jemes 1:5-8) Iji nweta amamihe, anyị aghaghịkwa ịnọgide na-ege Jehova ntị site n’ịmụchi Okwu ya anya na itinye ya n’ọrụ.
6. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya itinye iwu na ụkpụrụ Chineke n’ọrụ ná ndụ anyị?
6 A na-achọta ihe atụ ndị bụ́ isi nke amamihe Chineke n’iwu na n’ụkpụrụ ndị dị na Bible. Ha na-abara anyị uru n’ụzọ nile—n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ uche, n’ụzọ mmetụta uche, na n’ụzọ ime mmụọ. N’ụzọ dabara adaba, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachi mkpụrụ obi; ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Ụkpụrụ nile Jehova tọrọ ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa Abụ Ọma 19:7-10; 119:72.
ọṅụ: ihe Jehova nyere n’iwu na-enwu enwu, na-enye anya ìhè. Egwu Jehova dị ọcha, na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi: ikpe nile nke Jehova bụ eziokwu, ha nile ziri ezi n’otu. Ihe a na-achọsi ike ka ha bụ, karịa ọlaedo, ee, karịa ọtụtụ ọlaedo a nụchara anụcha.”—7. Gịnị na-esi n’ileghara ụkpụrụ ezi omume nke Chineke anya apụta?
7 N’aka nke ọzọ, ndị na-eleghara ụkpụrụ ezi omume Chineke anya adịghị achọta obi ụtọ na nnwere onwe ha na-achọ. N’oge na-adịghị anya, ha na-achọpụta na Chineke abụghị onye a na-elelị, n’ihi na mmadụ ga-aghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ. (Ndị Galetia 6:7) Ọtụtụ nde ndị na-eleghara ụkpụrụ Bible anya na-enweta ihe ndị dị mwute na-esi na ya apụta dị ka ịtụrụ ime ọkwà, ọrịa ndị na-asọ oyi, ma ọ bụ ịbụ ndị ihe riri ahụ. Ọ gwụla ma ha ji nchegharị gbanwee ụzọ ndụ ha, ụzọ ha ga-edugarịrị ha n’ọnwụ nakwa ma eleghị anya mbibi n’aka Chineke.—Matiu 7:13, 14.
8. N’ihi gịnị ka ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya ji enwe obi ụtọ?
8 Otú ọ dị, ngọzi ndị bara ụba ga-eru ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya ma na-etinye ya n’ọrụ ahụ ugbu a nakwa n’ọdịnihu. N’ụzọ ziri ezi, ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị iwu Chineke napụtara, na-enwe obi ụtọ n’ezie, ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-echere oge a ga-eme ka ha nwere onwe ha pụọ ná mmehie na mmetụta ya ndị na-egbu egbu. (Ndị Rom 8:20, 21; Jemes 1:25) Olileanya a bụ ihe e ji n’aka n’ihi na ọ dabeere n’onyinye kasịnụ Chineke ji ịhụnanya nye ihe a kpọrọ mmadụ—àjà mgbapụta nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst. (Matiu 20:28; Jọn 3:16; Ndị Rom 6:23) Onyinye dị otú ahụ na-enweghị atụ na-egosi otú ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ miruru emi ma na-emesi ndị nile nọgidere na-ege Jehova ntị obi ike na ha ga-enweta ngọzi na-adịghị agwụ agwụ.—Ndị Rom 8:32.
Anyị Na-enwe Ekele Maka Onyinye nke Mmụọ Nsọ
9, 10. Olee otú anyị si erite uru n’onyinye Jehova bụ́ mmụọ nsọ? Nye otu ihe atụ.
9 Onyinye ọzọ Chineke ji ịhụnanya nye anyị nke anyị kwesịrị inwe ekele maka ya bụ mmụọ nsọ ya. N’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., Pita onyeozi gbara ìgwè mmadụ nọ na Jerusalem ume, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa unu nile baptism n’otu n’otu n’aha Jisọs Kraịst ka e wee gbaghara mmehie nile unu; unu ga-anatakwa onyinye a, bụ́ Mmụọ Nsọ.” (Ọrụ 2:38) Taa, Jehova na-ewere mmụọ nsọ enye ndị ohu ya raara onwe ha nye bụ́ ndị na-ekpe ekpere maka ya, ndị chọkwara ime uche ya. (Luk 11:9-13) N’oge ochie, ike a kasị ike nile n’eluigwe na ala—mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike nọ n’ọrụ nke Chineke—nyere ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe ike, gụnyere ndị Kraịst oge mbụ. (Zekaraịa 4:6; Ọrụ 4:31) Ọ pụrụ imere anyị otu ihe ahụ, n’agbanyeghị na anyị pụrụ iche ihe mgbochi ma ọ bụ ihe ịma aka ndị tara akpụ ihu dị ka ndị Jehova.—Joel 2:28, 29.
10 Tụlee ihe atụ Laurel, bụ́ onye dara ọrịa polio nke a kwụnyere ihe na-enye aka iku ume n’ahụ ya ruo afọ 37. * N’agbanyeghị ọnọdụ ya tabigara akpụ ókè, o ji ịnụ ọkụ n’obi jeere Chineke ozi ruo ọnwụ ya. N’afọ ndị ahụ nile, ngọzi bara ụba nke Jehova ruru Laurel ahụ. Dị ka ihe atụ, o nyeere ihe dị ka mmadụ 17 aka inweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu Bible, n’agbanyeghị na ọ na-anọ n’ígwè ọrụ na-enyere ya aka iku ume ehihie na abalị! Ọnọdụ ya na-echetara anyị okwu Pọl onyeozi, bụ́: “Mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:10) Ee, ihe ịga nke ọma ọ bụla anyị pụrụ inwe n’ikwusa ozi ọma ahụ na-esite, ọ bụghị n’ike nke aka anyị, kama n’enyemaka Chineke ji mmụọ nsọ ya enye, bụ́ nke ọ na-enye ndị na-anọgide na-ege ntị n’olu ya.—Aịsaịa 40:29-31.
11. Àgwà ndị dị aṅaa ka mmụọ Chineke na-arụpụta n’ahụ ndị yikwasịrị “mmadụ ọhụrụ ahụ”?
11 Ọ bụrụ na anyị ejiri nrubeisi na-ege Chineke ntị, mmụọ nsọ ya ga-eme ka anyị nwee àgwà nke ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè. (Ndị Galetia 5:22, 23) “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ” a so na “mmadụ ọhụrụ ahụ” bụ́ nke ndị Kraịst na-eyikwasị n’ọnọdụ àgwà oké ọchịchọ na nke anụ ọhịa bụ́ ndị ha pụrụ inwewo na mbụ. (Ndị Efesọs 4:20-24; Aịsaịa 11:6-9) Nke dị oké mkpa ná mkpụrụ a bụ ịhụnanya, “ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:14.
Ịhụnanya Ndị Kraịst —Onyinye A Ga-eji Kpọrọ Ihe
12. Olee otú Tabita na ndị Kraịst ndị ọzọ na narị afọ mbụ si gosipụta ịhụnanya?
12 Ịhụnanya ndị Kraịst bụ onyinye ọzọ a gọziri agọzi na-esi n’aka Jehova abịa—nke anyị ji akpọrọ ihe n’ụzọ ziri ezi. Ọ bụ nke ụkpụrụ na-achịkwa, ma ọ bara nnọọ ụba ná mmetụta ịhụnanya nke na ọ na-ejikọ ndị kwere ekwe ọnụ karịa ka nkekọ anụ ahụ pụrụ ime. (Jọn 15:12, 13; 1 Pita 1:22) Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Tabita, bụ́ otu ọmarịcha nwanyị bụ́ onye Kraịst na narị afọ mbụ. “Nwanyị a jupụtara n’ezi ọrụ na ọrụ ebere nke ọ na-eme,” karịsịa maka ndị inyom di ha nwụrụ nọ n’ọgbakọ. (Ọrụ 9:36) Ndị inyom a pụrụ inwewo ndị ikwu, ma Tabita chọrọ ime ihe nile ọ pụrụ ime iji nyere ha aka ma gbaa ha ume. (1 Jọn 3:18) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya Tabita setịpụrụ! Ịhụnanya ụmụnna kpaliri Priska na Akwila ‘ịtọgbọ olu nke aka ha’ n’ihi Pọl. Ịhụnanya kwalikwara Epafras, Luk, Onisifọrọs, na ndị ọzọ inyere onyeozi ahụ aka mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom. (Ndị Rom 16:3, 4; 2 Timoti 1:16; 4:11; Faịlimọn 23, 24) Ee, ndị Kraịst dị otú ahụ taa ‘nwerịtara ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ,’ onyinye a gọziri agọzi nke si n’aka Chineke bụ́ nke na-eme ka a mara ha dị ka ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs.—Jọn 13:34, 35.
13. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-enwe ekele miri emi maka òtù ụmụnna ndị Kraịst anyị?
13 Ì ji ịhụnanya a na-egosipụta n’ọgbakọ ndị Kraịst akpọrọ ihe? Ị̀ na-enwe ekele maka òtù Ndị Filipaị 1:9; Ndị Hibru 10:24, 25.
ụmụnna ime mmụọ anyị, bụ́ nke zuru ụwa ọnụ? Ha bụkwa onyinye a gọziri agọzi na ndị na-eme mmadụ ọgaranya bụ́ ndị si n’elu bịa. Ànyị pụrụ isi aṅaa gosi na anyị ji ha kpọrọ ihe? Ọ bụ site n’ijere Chineke ozi dị nsọ, site n’ikere òkè ná nzukọ ndị Kraịst, nakwa site n’igosipụta ịhụnanya na mkpụrụ ndị ọzọ nke mmụọ Chineke.—“Onyinye n’Ụdị Mmadụ”
14. Gịnị ka a chọrọ n’aka onye Kraịst ma ọ bụrụ na ọ ga-eje ozi dị ka okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi?
14 Ndị ikom bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị chọrọ ijere ndị ha na ha na-efekọ ofufe ozi dị ka ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi nwere ihe mgbaru ọsọ dị mma. (1 Timoti 3:1, 8) Iji ruo eruo maka ihe ùgwù ndị a, nwanna nwoke aghaghị ịbụ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, onye maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma na onye na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ubi. (Ọrụ 18:24; 1 Timoti 4:15; 2 Timoti 4:5) Ọ ghaghị igosipụta ịdị umeala n’obi, na ndidi, n’ihi na ngọzi Chineke adịghị eru ndị mpako, nganga, na oké ọchịchọ, ahụ. (Ilu 11:2; Ndị Hibru 6:15; 3 Jọn 9, 10) Ọ bụrụ na ọ lụrụ nwunye, ọ ghaghị ịbụ onyeisi ezinụlọ na-ahụ n’anya nke nwere ike ilekọta ezinụlọ ya dum nke ọma. (1 Timoti 3:4, 5, 12) Ebe ọ bụ na nwoke dị otú ahụ ji akụ̀ ime mmụọ kpọrọ ihe, ọ ga-enweta ngọzi Jehova.—Matiu 6:19-21.
15, 16. Olee ndị na-egosi na ha bụ “onyinye n’ụdị mmadụ”? Nye ihe atụ.
15 Mgbe ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye n’ọgbakọ na-arụsi ọrụ ike dị ka ndị na-ezisa ozi ọma, ndị ọzụzụ atụrụ, na ndị ozizi, ha na-enye anyị ezi ihe mere anyị ga-eji na-enwe ekele maka “onyinye n’ụdị mmadụ” dị otú ahụ. (Ndị Efesọs 4:8, 11, NW) Ndị na-erite uru n’ozi ha ji ịhụnanya na-eje nwere ike ghara ịdị na-egosipụtakarị ekele ha, ma Jehova na-ahụ ihe nile ndị okenye na-ekwesị ntụkwasị obi na-eme. Ọ gaghị echezọ ịhụnanya ha na-egosi n’ebe aha ya dị site n’ijere ndị ya ozi.—1 Timoti 5:17; Ndị Hibru 6:10.
16 Tụlee ihe banyere otu okenye na-arụsi ọrụ ike bụ́ onye letara otu nwatakịrị nwanyị bụ́ onye Kraịst nke a na-achọ ịwa ahụ n’ụbụrụ. “Ọ dị nnọọ obiọma, na-enye nnọọ nkwado, na-echekwa nnọọ banyere ndị ọzọ,” ka otu enyi ezinụlọ ya dere. “Ọ naara ikike isoro anyị kpekuo Jehova ekpere. Ka ọ na-ekpe ekpere, nna nwatakịrị nwanyị ahụ [onye na-abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova] bere ákwá, anya mmiri gbakwara mmadụ nile nọ n’ọnụ ụlọ ụlọ ụgwọ ahụ. Lee ka ekpere onye okenye ahụ sị bụrụ ihe na-emetụ n’ahụ, leekwa ka Jehova si bụrụ onye na-ahụ n’anya izite ya kpọmkwem n’oge dị otú ahụ!” Onyeàmà ọzọ na-arịa ọrịa kwuru banyere ndị okenye letara ya, sị: “Mgbe ha bịara n’ebe m nọ ná ngalaba a na-enye nlekọta kpụ ọkụ n’ọnụ, amatara m na ihe ọ sọrọ ya mewe site mgbe ahụ gawa, aga m anagideli ya. Enwetara m ike, nweekwa obi iru ala.” Ọ̀ dị onye pụrụ ịzụta nlekọta ịhụnanya dị otú ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụ onyinye sitere n’aka Chineke, bụ́ nke ọ na-enye site n’ọgbakọ ndị Kraịst.—Aịsaịa 32:1, 2.
Onyinye nke Ozi Ubi
17, 18. (a) Olee onyinye ije ozi nke Jehova meworo ka o ruo ndị ya nile aka? (b) Enyemaka dị aṅaa ka Chineke wetaworo ka anyị wee nwee ike ijezu ozi anyị?
17 Ọ dịghị ihe ùgwù a pụrụ inye mmadụ ọ bụla ga-akarị nke ijere Jehova, bụ́ Onye Kasị Ihe Nile Elu, ozi. (Aịsaịa 43:10; 2 Ndị Kọrint 4:7; 1 Pita 2:9) Otú o sina dị, ihe ùgwù nke ikere òkè n’ozi ahụ a na-eje maka ọha dịịrị onye ọ bụla—onye na-eto eto na onye agadi, nwoke na nwanyị—nke nwere ezi ọchịchọ ijere Chineke ozi. Ị̀ na-eji onyinye a dị oké ọnụ ahịa eme ihe? Ụfọdụ pụrụ ịla azụ n’ime nkwusa n’ihi na ọ dị ha ka ha erughị eru, ma cheta na Jehova na-enye ndị na-ejere ya ozi mmụọ nsọ, ọ na-akwalitekwa anyị n’ebe ọ bụla anyị dị ala.—Jeremaịa 1:6-8; 20:11.
18 Jehova enyefewo ndị ohu ya dị umeala n’obi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, ọ bụghị mmadụ ndị nwere ọchịchọ ịdị mpako na ịdabere n’ike nke aka ha. (1 Ndị Kọrint 1:20, 26-29) Ndị dị umeala n’obi na-ekweta erughị eru ha ma na-adabere n’enyemaka Chineke ka ha na-eje ozi ubi. Ha na-enwekwa ekele maka enyemaka ime mmụọ ọ na-eweta site n’aka “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi.”—Luk 12:42-44; Ilu 22:4.
Ndụ Ezinụlọ Obi Ụtọ—Ezi Onyinye
19. Olee ihe ndị na-eduga n’inwe ihe ịga nke ọma n’ịzụ ụmụ?
19 Alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ obi ụtọ bụ onyinye sitere n’aka Chineke. (Rut 1:9; Ndị Efesọs 3:14, 15) Ụmụaka bụkwa “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa,” nke na-ewetara ndị nne na nna nwere ihe ịga nke ọma n’ịkụnye àgwà nsọpụrụ Chineke n’ime ha, ọṅụ. (Abụ Ọma 127:3) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nọgide na-ege ntị n’olu Jehova site n’ịzụ ụmụ gị n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu ya. Ndị na-eme otú ahụ ji n’aka na ha ga-enweta nkwado na ngọzi bara ụba nke Jehova.—Ilu 3:5, 6; 22:6; Ndị Efesọs 6:1-4.
20. Gịnị pụrụ ịbara ndị nne na nna ụmụ ha si n’ezi ofufe pụọ uru?
20 N’agbanyeghị mgbalị siri ike ndị nne na nna na-asọpụrụ Chineke mere, ikekwe ụfọdụ n’ime ụmụ ha ga-ahọrọ isi n’ezi ofufe pụọ mgbe ha tolitere. (Jenesis 26:34, 35) Nke a pụrụ ịbụrụ ndị nne na nna ihe nkụda mmụọ. (Ilu 17:21, 25) Otú ọ dị, kama ịkwụsị kpam kpam inwe olileanya, ọ pụrụ ịbara ha uru icheta ilu Jisọs tụrụ banyere nwa mmefu. Ọ bụ ezie na nwa ahụ hapụrụ ụlọ ha ma bie ndụ ịla n’iyi, o mesịrị lọghachi n’ụlọ nna ya, bụ́ onye nabatara ya n’ụzọ ịhụnanya na ọṅụ. (Luk 15:11-32) N’agbanyeghị ihe pụrụ imenụ, ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ ijide n’aka inweta nghọta, nchebara echiche ịhụnanya, na nkwado na-adịghị agha agha nke Jehova.—Abụ Ọma 145:14.
21. Ònye ka anyị kwesịrị ige ntị, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
21 Ya mere, ka onye ọ bụla n’ime anyị kpebie ihe dị anyị mkpa n’ezie ná ndụ. Ànyị ji ịdị uchu na-achụso ihe onwunwe, bụ́ nke pụrụ iwetara anyị na ezinụlọ anyị ihe mwute? Ka ànyị na-achụso ‘ezi onyinye na ihe zuru okè nke e nyere enye’ bụ́ nke si n’aka “Nna nke ìhè” abịa? (Jemes 1:17) Setan, bụ́ ‘nna ụgha,’ chọrọ ka anyị dọgbuo onwe anyị n’ọrụ maka ihe onwunwe ma ghara inweta ma obi ụtọ ma ndụ. (Jọn 8:44; Luk 12:15) Otú ọ dị, Jehova bu ọdịmma anyị kasị mma n’obi. (Aịsaịa 48:17, 18) Ya mere, ka anyị nọgidezie na-ege Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya ntị ma na-abụ ndị ‘ihe ya na-atọ ụtọ’ mgbe nile. (Abụ Ọma 37:4) Ọ bụrụ na anyị agbasoo ụzọ dị otú ahụ, onyinye na-enweghị atụ na ngọzi bara ụba nke Jehova ga-eme anyị ọgaranya—ọ gaghịkwa atụkwasị ihe mwute ọ bụla.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Lee Teta! (Bekee), January 22, 1993, peeji nke 18-21.
Ị̀ Na-echeta?
• Ebee ka a pụrụ ịchọta obi ụtọ kasịnụ?
• Olee ụfọdụ n’ime onyinye ndị Jehova na-enye ndị ya?
• Gịnị mere ozi ubi ji bụrụ onyinye?
• Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime iji nweta ngọzi Chineke ka ha na-azụlite ụmụ ha?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 16]
Ị̀ na-egosipụta ekele maka onyinye Chineke bụ́ Okwu ya e dere ede?
[Foto dị na peeji nke 17]
N’agbanyeghị ọnọdụ ndị tara nnọọ akpụ, Laurel Nisbet ji ịnụ ọkụ n’obi jeere Chineke ozi
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Dị ka Tabita, a maara ndị Kraịst nke oge a nke ọma maka omume ịhụnanya ha
[Foto dị na peeji nke 19]
Ndị okenye bụ́ ndị Kraịst na-enwe nchegbu ịhụnanya maka ndị kwere ekwe ibe ha