Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nyere Nwa “Mmefu” Aka?
Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nyere Nwa “Mmefu” Aka?
‘Ṅụrịa ọṅụ n’ihi na o furu efu, e wee hụ ya.’—LUK 15:32.
1, 2. (a) Olee otú ụfọdụ ndị na-eto eto siworo meghachi omume n’ebe eziokwu ndị Kraịst dị? (b) Olee otú ọ pụrụ ịdị ndị nne na nna na ụmụaka nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ?
“ACHỌRỌ m ịpụ n’ọgbakọ!” Lee ihe oké mwute ọ na-abụrụ ndị nne na nna, bụ́ ndị gbalịsiworo ike ịzụlite ụmụ ha n’ụzọ nke ndị Kraịst, ịnụ okwu ndị ahụ site n’ọnụ nwa ha! Ndị ntorobịa ndị ọzọ ‘na-akpafu’ nnọọ na-ekwughịdị ihe bụ́ ebumnobi ha. (Ndị Hibru 2:1, NW) Ọtụtụ n’ime ha yiri nwa mmefu ahụ nọ n’ilu Jisọs bụ́ onye hapụrụ ụlọ nna ya ma gaa rikpọọ ihe nketa ya n’ala dị anya.—Luk 15:11-16.
2 Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná Ndịàmà Jehova enweghị nsogbu a, nye ndị nwere ya, ọ dịghị okwu nkasi obi ọ bụla pụrụ ime ka ihe mgbu ha kwụsị kpam kpam. Ihe a na-agaghịkwa eleghara anya bụ enweghị obi ụtọ nke onye ntorobịa ahụ nupụrụ isi. N’ime obi ya, akọ na uche ya pụrụ ịdị na-enye ya nsogbu. N’ilu Jisọs, nwa mmefu ahụ mesịrị ‘mara onwe ya,’ bụ́ nke wetaara nna ya ọṅụ. Olee otú ndị nne na nna na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ pụrụ isi nyere ụmụ mmefu aka ‘ịmara onwe ha’?—Luk 15:17.
Ihe Mere Ụfọdụ Ji Ekpebi Ịpụ
3. Gịnị bụ ihe ụfọdụ na-eme ndị na-eto eto ji ekpebi ịhapụ ọgbakọ ndị Kraịst?
3 E nwere ọtụtụ narị puku ndị na-eto eto bụ́ ndị ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi n’ọgbakọ ndị 2 Timoti 4:10) Ma ọ bụkwanụ ha pụrụ ile ogige atụrụ na-enye nchebe nke Jehova anya dị ka nke na-ejikpagide mmadụ. Obi amamikpe, inwe oké mmasị n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nọ, ma ọ bụ ọchịchọ nke ịbụ onye ndị ọgbọ ya nabatara, pụkwara ime ka onye na-eto eto si n’ìgwè atụrụ Jehova kpafuo. Onye ntorobịa pụrụ ịkwụsị ijere Chineke ozi n’ihi ihe yiri ya ka ọ bụ omume ihu abụọ n’akụkụ ndị mụrụ ya ma ọ bụ ụfọdụ ndị Kraịst ndị ọzọ.
Kraịst. Gịnịzi mere ndị ọzọ na-eto eto ji apụ? Ọ pụrụ ịdị ha ka ọ dị ihe a na-enweta n’ụwa nke na-efunahụ ha. (4. Gịnị bụ isi ihe na-emekarị ndị na-eto eto ji akpafu?
4 Àgwà nnupụisi nke nwatakịrị na-abụkarị ihe àmà nke adịghị ike ime mmụọ, bụ́ ihe na-egosipụta ihe dị ya n’obi. (Ilu 15:13; Matiu 12:34) N’agbanyeghị ihe ọ bụla mere onye ntorobịa ji kpafuo, isi ihe na-akpata nsogbu ahụ na-abụkarị n’ihi na o nweghị “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (2 Timoti 3:7, NW) Kama ịdị na-efe Jehova nanị iji mezuo iwu, ọ dị mkpa ka ndị na-eto eto soro ya na-enwe mmekọrịta onwe onye chiri anya. Gịnị ga-enyere ha aka ime otú ahụ?
Bịaruo Chineke Nso
5. Gịnị dị oké mkpa ka onye na-eto eto wee nwee ike iso Chineke na-enwe mmekọrịta onwe onye?
5 “Bịaruonụ Chineke nso,” ka Jemes onye na-eso ụzọ dere, “Ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jemes 4:8) Iji mee nke ahụ, a ghaghị inyere onye na-eto eto aka ịzụlite mmasị maka Okwu Chineke. (Abụ Ọma 34:8) Na mbụ “mmiri ara”—ozizi ndị bụ́ isi nke Bible—ga-adị ya mkpa. Ma, ka Okwu Chineke na-atọ ya ụtọ, ya ana-enwekwa mmasị ná “nri siri ike”—ihe ọmụma ime mmụọ miri emi—ọ gaghị ara ahụ ya etozuo okè n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Hibru 5:11-14; Abụ Ọma 1:2) Otu onye ntorobịa nke kwetara na ụzọ ndụ nke ụwa erikpuwo ya kpam kpam malitere iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Gịnị nyeere ya aka ichigharị? N’itinye aro a tụụrụ ya ịgụcha Bible dum n’ọrụ, ọ gbasoro usoro ọgụgụ Bible chiri anya. Ee, ịgụchi Okwu Chineke anya dị oké mkpa maka iso Jehova na-enwe nkekọ chiri anya.
6, 7. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịzụlite mmasị maka Okwu Chineke?
6 Lee ka o si dị oké mkpa ka ndị nne na nna nyere ụmụ ha aka ịzụlite mmasị maka Okwu Chineke! N’agbanyeghị na ezinụlọ otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ụma na-enwechi ọmụmụ ihe anya, o sooro ndị isi ike na-akpakọrịta. Banyere ọmụmụ ihe ezinụlọ ha, ọ na-echeta, sị: “Mgbe papa m jụrụ ajụjụ ndị dị n’ihe anyị na-amụ, m na-agụpụta azịza ha n’eledịghị papa m anya n’ihu.” Kama nanị ịmụcha ihe ha chọrọ ịmụ n’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ, ndị nne na nna maara ihe na-eji nkà izi ihe eme ihe. (2 Timoti 4:2) Ka onye ntorobịa wee nụ ụtọ ọmụmụ ihe ahụ, ọ ghaghị inwe mmetụta na ọmụmụ ihe ahụ gbasara ya. Gịnị ma ị jụọ ya ajụjụ mmata echiche ma hapụ ya ka ọ zaa ihe dị ya n’obi? Gbaa onye ahụ na-eto eto ume ka ọ na-etinye ihe ahụ a na-amụ n’ọrụ n’ụzọ bara uru. *
7 Ọzọkwa, mee ka nkwurịta okwu ahụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na-ekpo ọkụ. Mgbe o kwesịrị ekwesị, mee ka ndị ahụ na-eto eto mee ihe ngosi nke ihe omume na ihe nkiri ndị e dekọrọ na Bible. Nyere ha aka iji anya nke uche hụ ala ahụ a na-atụle ihe mere na ya, na ihe ndị dị n’ala ahụ. Iji map na chaatị eme ihe pụrụ inye aka. Ee, a pụrụ ime ka ọmụmụ ihe ezinụlọ kpoo ọkụ ma gwaa ọgwa site n’iji anya nke uche na-ahụtụ ihe ndị ahụ a na-amụ. Ndị nne na nna ga-emekwa nke ọma inyocha mmekọrịta nke ha na Jehova. Ka ha na-abịarukwu Jehova nso, ha pụrụ inyere ụmụ ha aka ime otú ahụ.—Deuterọnọmi 6:5-7.
8. Olee otú ekpere si enyere mmadụ aka ịbịaru Chineke nso?
8 Ekpere na-enyekwara mmadụ aka ịbịaru Chineke nso. Otu nwa agbọghọ nọ ná mmalite afọ iri na ụma ya amaghị ma ọ̀ ga-ahọrọ ụzọ ndụ ndị Kraịst ka ọ bụ mkpakọrịta nke ya na ndị enyi ya na ha na-anọghị n’otu okwukwe. (Jemes 4:4) Gịnị ka o mere banyere ya? “Na nke mbụ ya,” ka o kwupụtara, “agwara m nnọọ Jehova n’ekpere otú ọ dị m.” O kwubiri na a zara ekpere ya mgbe o mesịrị hụ n’ọgbakọ ndị Kraịst, otu enyi ọ pụrụ ịkọrọ izu nzuzo ya. N’inwe mmetụta na Jehova na-eduzi ya, ọ malitere iso Chineke na-enwe mmekọrịta onwe onye. Ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụ ha aka site n’ime ka ekpere nke ha kakwuo mma. Mgbe ndị nne na nna na-edu ezinụlọ ha n’ekpere, ha pụrụ ikwupụta ihe otú ọ dị ha n’obi ka ụmụ ha wee hụ nkekọ onwe onye dị n’etiti nne na nna ha na Jehova.
Na-enwe Ndidi Ma Na-akwụsi Ike
9, 10. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jehova setịpụrụ n’inwe ogologo ntachi obi n’ebe ndị Israel na-enupụ isi nọ?
9 Mgbe onye ntorobịa malitere ịkpafu, ọ pụrụ ịnwa ịnọpụrụ onwe ya iche ma jụ mgbalị ọ bụla nne na nna ya na-eme isoro ya kwurịta ihe ime mmụọ. Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime n’ọnọdụ siri ike otú ahụ? Tụlee ihe Jehova mere banyere ndị Israel oge ochie. Ọ nagidere ndị Israel ahụ ‘na-ekwesị olu ike’ ruo ihe karịrị afọ 900 tupu ọ gbahapụ ha n’ụzọ nnupụisi ha. (Ọpụpụ 34:9; 2 Ihe E Mere 36:17-21; Ndị Rom 10:21) N’agbanyeghị na ha ‘nwara ya’ ugboro ugboro, Jehova “nwere obi ebere” n’ahụ ha. “Ọtụtụ mgbe ka O mere iwe Ya ka ọ laghachi azụ, ọ dịghị akpọtekwa ọnụma Ya nile.” (Abụ Ọma 78:38-42) Ụta adịghịrị Chineke n’otú o si mesoo ha ihe. Ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-eṅomi Jehova, ha na-enwekwa ndidi mgbe nwa ha na-anabataghị mgbalị ha ozugbo, bụ́ ndị ha na-eme iji nyere ya aka.
10 Inwe ogologo ntachi obi, ma ọ bụ ndidi pụtakwara ịghara ịkwụsị inwe olileanya na a pụrụ imezi mmekọrịta mebiri emebi. Jehova setịpụrụ ihe nlereanya nke ụzọ e si enwe ogologo ntachi obi. O butere ụzọ n’ime ihe site n’izigara ndị Israel ndị ozi ya “ugboro ugboro.” Jehova “nwere ọmịiko n’ahụ ndị Ya,” n’agbanyeghị na “ha na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu Ya anya.” (2 Ihe E Mere 36:15, 16) Ọ rịọrọ ndị Israel, sị: “Biko, lọtanụ, onye ọ bụla ya si n’ụzọ ọjọọ ya . . . lọta.” (Jeremaịa 25:4, 5) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova emebighị ụkpụrụ ezi omume ya. E nyere ndị Israel ntụziaka ‘ịlọghachikwute’ Chineke na ụzọ ya.
11. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nwee ogologo ntachi obi ma kwụsie ike ka ha na-emeso nwata na-ehie ụzọ ihe?
11 Ndị nne na nna pụrụ iṅomi Jehova n’inwe ogologo ntachi obi site n’ịghara ịdị ngwa n’ịkwụsị inwe olileanya na nwa ha na-ehie ụzọ
ga-alọghachi. Ọ bụrụ na ha akwụsịghị inwe olileanya, ha pụrụ ibute ụzọ n’ime ihe iji mee ka ụzọ nkwurịta okwu ghere oghe ma ọ bụ maliteghachi nkwurịta okwu. Ka ha na-arapagidesi ike n’ụkpụrụ ezi omume, ha pụrụ ịrịọ nwata ahụ “ugboro ugboro” ka ọ lọghachi n’ụzọ nke eziokwu.Mgbe A Chụpụrụ Nwatakịrị n’Ọgbakọ
12. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị nne na nna nwere n’ebe nwatakịrị ha na ya bi, bụ́ onye a chụpụrụ n’ọgbakọ nọ?
12 Gịnị ma ọ bụrụ na nwatakịrị ya na nne na nna ya bi emee mmehie dị oké njọ, a chụpụkwa ya n’ọgbakọ n’ihi àgwà enweghị nchegharị ya? Ebe ọ bụ na nwa ahụ na nne na nna ya bi, ọ ka bụ ibu ọrụ dịịrị ha inye ya ntụziaka na ịdọ aka ná ntị n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Chineke. Olee otú a pụrụ isi mee nke a?—Ilu 6:20-22; 29:17.
13. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi gbalịa iru n’obi nke nwa ha hiere ụzọ?
13 Ọ pụrụ ikwe omume—n’ezie, ọ ga-akasị mma—inye ntụziaka na ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ n’oge a na-amụrụ nanị ya Bible. Nne ma ọ bụ nna aghaghị ile anya gabiga àgwà ịkpọ ekwe nkụ nke nwa ahụ ma gbalịa ịhụ ihe dị ya n’obi. Olee ihe nile na-arịa ya n’ụzọ ime mmụọ? (Ilu 20:5) À pụrụ ikwu ihe ga-eru ya n’obi nke ọ ga-anabata? Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a pụrụ iji mee ihe n’ụzọ dị irè? Pọl onyeozi na-emesi anyị obi ike, sị: “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu nile nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) Ee, ndị nne na nna pụrụ ime ihe karịrị nanị ịgwa ụmụ ha ka ha ghara itinye aka n’ihe ọjọọ ọzọ. Ha pụrụ ịgbalị ịmalite usoro ọgwụgwọ nke ọrịa ime mmụọ ahụ ma mee ka ọ gaa nke ọma.
14. Olee nzọụkwụ mbụ onye ntorobịa hiere ụzọ kwesịrị iwere iji mee ka mmekọrịta ya na Jehova dịghachi mma, oleekwa otú nne na nna pụrụ isi nyere nwata ahụ aka iwere nzọụkwụ ahụ?
14 Ọ dị onye ntorobịa hiere ụzọ mkpa imezighachi mmekọrịta ya na Jehova. Nzọụkwụ mbụ ọ na-aghaghị iwere bụ ‘ichegharị na ichigharị.’ (Ọrụ 3:19; Aịsaịa 55:6, 7) Mgbe ndị nne na nna na-enyere onye ntorobịa ha na ya bi aka ichegharị, ha aghaghị ịbụ ndị ‘na-achịkwa onwe ha n’ọnọdụ ọjọọ, jiri ịdị nwayọọ na-ezi nwata na-adịghị ekwenye ekwenye ihe.’ (2 Timoti 2:24-26, NW) Ọ dị mkpa ka ha ‘na-atụ ya mmehie ya n’anya’ n’echiche nke Bible. A pụkwara ịsụgharị okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “tụọ mmadụ mmehie ya n’anya” ịbụ “nye ihe àmà ga-eme ka e kweta.” (Mkpughe 3:19; Jọn 16:8) N’ihi ya, ịtụ nwata ahụ mmehie ya n’anya na-agụnye inye ya ihe àmà zuru ezu iji mee ka o kweta na ya mere mmehie. N’eziokwu, ime otú ahụ adịghị mfe. N’ebe o kwere omume, ndị nne na nna pụrụ iru ya n’obi, na-eji ụzọ ọ bụla kwesịrị ekwesị nke kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ eme ihe iji mee ka o kweta ihe ọjọọ o mere. Ha kwesịrị ịgbalị inyere ya aka ịghọta mkpa ọ dị ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị, na ịhụ ezi ihe n’anya.’ (Emọs 5:15) Ọ pụrụ ‘iteta n’ụra mmanya pụọ n’ọnyà Ekwensu.’
15. Òkè dị aṅaa ka ekpere na-ekere n’ime ka mmekọrịta nke onye hiere ụzọ na Jehova dịghachi mma?
15 Ka mmekọrịta mmadụ na Jehova dịghachi mma, a ghaghị iji ekpere mee ihe. N’ezie, ọ dịghị onye kwesịrị ‘ịrịọ arịrịọ’ banyere mmehie dị oké njọ, nke o doro anya na onye sobu ọgbakọ ndị Kraịst na-akpakọrịta na-eme n’enweghị nchegharị. (1 Jọn 5:16, 17; Jeremaịa 7:16-20; Ndị Hibru 10:26, 27) Ma, ndị nne na nna pụrụ ịrịọ Jehova ka o nye ha amamihe iji dozie ọnọdụ ahụ. (Jemes 1:5) Ọ bụrụ na onye ntorobịa a chụpụrụ n’ọgbakọ egosi ihe àmà nke nchegharị ma ghara inwe “nkwuwa okwu n’ebe Chineke nọ,” nne na nna ya pụrụ ikpeku Chineke ekpere ka ihe bụ uche Ya mee ma ọ bụrụ na ọ chọpụta ihe mere ọ ga-eji gbaghara mmehie nwata ahụ. (1 Jọn 3:21) Ịnụ ekpere a kwesịrị inyere onye ntorobịa ahụ aka ịhụ Jehova dị ka Chineke nwere obi ebere. *—Ọpụpụ 34:6, 7; Jemes 5:16.
16. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị òtù ezinụlọ bụ́ ndị nwere ụmụaka a chụpụrụ n’ọgbakọ aka?
16 Ọ bụrụ na a chụpụrụ onye ntorobịa e mere baptism n’ọgbakọ, a na-atụ anya ka ya na ndị nọ n’ọgbakọ “ghara imekọ ihe.” (1 Ndị Kọrint 5:11; 2 Jọn 10, 11) Nke a pụrụ ime ka ‘ọ mara onwe ya’ n’ikpeazụ ma lọghachi n’ogige atụrụ na-enye nchebe nke Chineke. (Luk 15:17) Otú ọ dị, ma onye ntorobịa ahụ a chụpụrụ n’ọgbakọ ọ lọghachiri ma ọ bụ na ọ laghachighị, ndị nọ n’ọgbakọ pụrụ ịdị na-agba ezinụlọ ya ume. Anyị nile pụrụ ịchọ ohere ndị anyị ga-eji gosipụta “mmetụta” na “obi ọmịiko” n’ebe ha nọ.—1 Pita 3:8, 9, NW.
Otú Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka
17. Gịnị ka ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị iburu n’uche mgbe ha na-agbalị inyere nwata na-akpafu akpafu aka?
17 Gịnị banyere onye ntorobịa nke a na-achụpụghị n’ọgbakọ ndị Kraịst ma ọ ghọwo onye na-adịghị ike n’okwukwe? “Ọ bụrụkwa na otu ihe nke dị n’ahụ na-ahụ ahụhụ,” ka Pọl onyeozi dere, “ihe nile dị n’ahụ ahụ sooro ya na-ahụkọ ahụhụ.” (1 Ndị Kọrint 12:26) Ndị ọzọ pụrụ igosi mmasị miri emi n’ebe onye ntorobịa ahụ nọ. N’ezie, ọ dị mkpa ịkpacharatụ anya, ebe ọ bụ na onye ntorobịa na-arịa ọrịa ime mmụọ pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ebe ndị ọzọ na-eto eto nọ. (Ndị Galetia 5:7-9) N’otu ọgbakọ, ndị toworo eto bu ezi ihe n’obi, bụ́ ndị chọrọ inyere ụfọdụ ndị ntorobịa ghọworo ndị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ aka, kpọrọ ha òkù isoro ha nọkọọ ma kpọkọọ otu egwú na-ewu ewu. Ọ bụ ezie na ndị ntorobịa ahụ nakweere ya ngwa ngwa ma nwee ọṅụ ná nnọkọ dị otú ahụ, mmetụta ha nwere n’ebe ibe ha nọ mesịrị n’ikpeazụ duga ha n’ịpụ n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 15:33; Jud 22, 23) Ihe ga-enye aka n’ịgwọta nwata na-arịa ọrịa ime mmụọ abụghị nnọkọ ntụrụndụ nke a na-eduzighị n’ụzọ ime mmụọ, kama ọ bụ mkpakọrịta nke ga-enyere ya aka ịzụlite mmasị maka ihe ime mmụọ. *
18. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta àgwà nna nwa mmefu nke ilu Jisọs gosiri?
18 Mgbe onye ntorobịa nke hapụworo ọgbakọ bịaghachiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ gaa mgbakọ, chee banyere otú ọ pụrụ ịdị ya. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị igosipụta àgwà nnabata nke nna nwa mmefu nke ilu Jisọs gosiri? (Luk 15:18-20, 25-32) Otu onye nọ n’afọ iri na ụma nke hapụrụ ọgbakọ ndị Kraịst ma mesịa gaa otu mgbakọ distrikti kwuru, sị: “Echere m na mmadụ nile ga-eleghara onye dị ka mụ anya, ma ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bịakwutere m ma nabata m. Nke a metụrụ m n’ahụ nke ukwuu.” Ọ malitere ịmụ Bible ọzọ, e mesịakwa mee ya baptism.
Ike Agwụla Gị
19, 20. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nọgide na-enwe àgwà ziri ezi banyere nwa mmefu?
19 Inyere nwa “mmefu” aka ‘ịmara onwe ya’ chọrọ ndidi, ọ pụkwara ịbụrụ ndị nne na nna na ndị ọzọ ihe ịma aka. Ma ike agwụla gị. “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Anyị nwere mmesi obi ike dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na Jehova chọrọ ka ndị mmadụ chegharịa ma dị ndụ. N’ezie, o butewo ụzọ n’ime ndokwa ka ya na ụmụ mmadụ dịghachi n’otu. (2 Ndị Kọrint 5:18, 19) Ndidi ya emewo ka o kwe ọtụtụ nde mmadụ omume ịmara onwe ha.—Aịsaịa 2:2, 3.
20 Ọ̀ bụ na ndị nne na nna ekwesịghịzi iji ụzọ ọ bụla Akwụkwọ Nsọ kwadoro nke kwere omume mee ihe iji nyere nwa ha bụ́ nwa mmefu aka ịmara onwe ya? N’iṅomi Jehova, nwee ogologo ntachi obi ka ị na-ewere nzọụkwụ ndị dị irè iji nyere nwa gị aka ịlọghachikwute Jehova. Kwụdesie ike n’ụkpụrụ Bible, gbalịakwa igosipụta àgwà Jehova nke ịhụnanya, ikpe ziri ezi, na amamihe ka ị na-ekpegara ya ekpere maka enyemaka. Dị nnọọ ka ọtụtụ ndị nnupụisi kpọrọ ekwo nkụ zaworo òkù Jehova ji ịhụnanya na-akpọ ha ịlọghachikwute ya, nwa gị nwoke ma ọ bụ nwanyị bụ́ nwa mmefu pụkwara ịlọghachi n’ìgwè atụrụ na-enye nchebe nke Chineke.—Luk 15:6, 7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Iji nwetakwuo aro banyere otú a pụrụ isi kụziere ndị na-eto eto ihe n’ụzọ dị irè, lee Ụlọ Nche, July 1, 1999, peeji nke 13-17.
^ par. 15 E kwesịghị ịnọ ná nzukọ ọgbakọ kpee ekpere dị otú ahụ n’isi nwatakịrị a chụpụrụ n’ọgbakọ, ebe ọ bụ na ndị ọzọ nwere ike ghara ịma banyere ọnọdụ nke onye ahụ a chụpụrụ n’ọgbakọ.—Lee Ụlọ Nche (Bekee), October 15, 1979, peeji nke 31.
^ par. 17 Maka aro ndị a kapịrị ọnụ, lee Teta! (Bekee), June 22, 1972, peeji nke 13-16; October 8, 1996, peeji nke 28-30.
Ị̀ Na-echeta?
• Gịnị pụrụ ịbụ isi ihe na-akpata nsogbu ndị ntorobịa na-enwe ha ji ahapụ ọgbakọ?
• Olee otú a pụrụ isi nyere ndị na-eto eto aka isoro Jehova na-enwe mmekọrịta onwe onye?
• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị nne na nna na-enwe ogologo ntachi obi ma kwụsie ike mgbe ha na-enyere nwa mmefu aka?
• Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ pụrụ isi nyere onye ntorobịa bụ́ nwa mmefu aka ịlọghachi?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 15]
Ekpere sitere n’ala ala obi nke ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụ ha aka ịhụ nkekọ onwe onye dị n’etiti nne na nna ha na Jehova
[Foto dị na peeji nke 15]
Ịgụ Okwu Chineke dị oké mkpa maka iso Jehova na-enwe nkekọ chiri anya
[Foto dị na peeji nke 17]
Nabata nwa mmefu mgbe ọ bịara ‘mara onwe ya’
[Foto dị na peeji nke 18]
Were nzọụkwụ ndị dị irè iji nyere nwa gị aka ịlọghachikwute Jehova