Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akọ na Uche A Zụrụ Azụ Dị Gị Mkpa

Akọ na Uche A Zụrụ Azụ Dị Gị Mkpa

Akọ na Uche A Zụrụ Azụ Dị Gị Mkpa

O yiri nnọọ ụbọchị a na-agaghị echefu echefu nye mmadụ nile nọ n’Ụgbọelu 901 nke Air New Zealand na-aga Antarctica. Ha edozichaala kamera ha, o yikwara ka ọ̀ bụ n’oriri ka a nọ ka ụgbọelu DC-10 ahụ rutewere kọntinent ọcha ahụ, na-efe n’ebe na-adịghị oké elu ka e wee nwee ike ịnọ n’elu na-ahụ ya nke ọma.

ỌKWỌ ụgbọelu ahụ, bụ́ onye kwọworo ụgbọelu ruo afọ 15, ejiriwo ihe karịrị awa 11,000 kwọọ ụgbọelu ná ndụ ya. Tupu ha efelie, o ji nlezianya debanye atụmatụ njem ha n’ime kọmputa dị n’ụgbọelu ahụ, n’amaghị na atụmatụ ndị ahụ e nyere ya ezighị ezi. Ka ụgbọelu DC-10 ahụ na-efe n’ime urukpuru n’ebe ịdị elu ya dị nanị mita 600, ọ kụrụ n’ebe dịtụ ala nke Ugwu Erebus, na-egbu mmadụ 257 nile nọ n’ime ya.

Dị nnọọ ka ụgbọelu na-adabere taa na kọmputa iduzi ha na mbara igwe, e nyewo ụmụ mmadụ akọ na uche iduzi ha n’ụzọ nke ndụ. Ọdachi ahụ dị egwu mere Ụgbọelu 901 pụkwara ịkụziri anyị ụfọdụ ezigbo ihe banyere akọ na uche anyị. Dị ka ihe atụ, n’otu ụzọ ahụ nchebe nke ụgbọelu si adabere n’usoro nduzi nke na-arụ ọrụ nke ọma na ihe nduzi ziri nnọọ ezi, ọdịmma ime mmụọ, nke omume, na ọbụna nke anụ ahụ anyị na-adabere n’akọ na uche na-arụ ọrụ bụ́ nke ihe nduzi ziri ezi nke omume na-eduzi.

N’ụzọ dị mwute, n’ụwa taa, ihe nduzi dị otú ahụ na-apụ n’anya ngwa ngwa ma ọ bụ bụrụ nke a na-eleghara anya. “Anyị na-anụ ọtụtụ ihe taa banyere otú nwata akwụkwọ matụ ihe na United States si bụrụ onye na-amaghị ka e si agụ na ka e si ede ihe, na otú o si esiri ya ike ịchọta France na map,” ka otu onye nkụzi bụ́ onye America kwuru. “Ọ bụkwa eziokwu na ọ na-esiri nwata akwụkwọ matụ ihe ike ịmata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Ihe anyị na-aghaghị ịgụnyekọta ya na ịbụ iti na amaghị eme mgbakọ na mwepụ dị ka nsogbu ndị metụtara agụmakwụkwọ bụ oké mgbagwoju anya a na-enwe banyere omume ọma.” O kwukwara na “omume ọma na-agbagwoju ndị na-eto eto n’oge a anya. Jụọ otu n’ime ha ma e nwere ihe ndị dị ka ‘ezi ihe na ihe ọjọọ,’ na mberede, ọ na-aghọ onye ihe gbagwojuru anya, onye ihe riri ọnụ, na onye ahụ na-erughị ala. . . . Mgbagwoju anya a na-aka njọ kama ịka mma ozugbo ha banyere kọleji.”

Otu ihe na-akpata mgbagwoju anya a bụ onye na uche ya n’ihe banyere omume, bụ́ echiche e nwere ebe nile na ụkpụrụ na-adị iche na-adabere ná nhọrọ onwe onye ma ọ bụ nke ọdịbendị. Cheedị ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọkwọ ụgbọelu adịghị adabere n’ụkpụrụ nduzi ndị a kapịrị ọnụ wee na-eme njem kama na-adabere n’ozi redio ndị a na-apụghị ịma ebe ikuku ga-ebuga ha, ndị a na-adịghịkwa anụ mgbe ụfọdụ! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọdachi ndị dị ka nke ahụ mere n’Ugwu Erebus ga-adị ọtụtụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, n’ịbụ ndị gbahapụworo ụkpụrụ omume ndị a kapịrị ọnụ, ụwa na-ewe nhụsianya na ọnwụ dị ka ajọ ihe ubi na-abawanye ụba ka ezinụlọ na-ekewasị n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi, ọtụtụ nde mmadụ ana-atakwa ahụhụ n’ihi ọrịa AIDS ma ọ bụ ụfọdụ ọrịa ndị ọzọ a na-ebute site ná mmekọahụ.

Onye na uche ya n’ihe banyere omume pụrụ ịda ka okwu ndị ma nke a na-akọ, ma n’eziokwu, ndị na-agbaso ya yiri ndị Nineve oge ochie bụ́ ndị na-amaghị “nke bụ́ aka nri ha na aka ekpe ha.” Ndị na-agbaso echiche onye na uche ya n’ihe banyere omume yiri ụmụ Israel si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị kpọrọ “ihe ọjọọ ezi ihe, ndị [kpọkwara] ezi ihe ihe ọjọọ.”—Jona 4:11; Aịsaịa 5:20.

Ya mere, ebee ka anyị pụrụ iche ihu maka iwu na ụkpụrụ ndị doro anya, ndị na-adịghịkwa mgbagwoju anya bụ́ ndị anyị ga-eji zụọ akọ na uche anyị ịbụ ihe nduzi na-enye nchebe? Ọtụtụ nde mmadụ achọpụtawo na Bible na-egbo mkpa ahụ n’ụzọ zuru nnọọ ezu. Site n’omume ọma ruo n’ụkpụrụ ọma nke ọrụ, sitekwa n’ịzụ ụmụ ruo n’ofufe Chineke, ọ dịghị ihe dị mkpa Bible hapụrụ. (2 Timoti 3:16) Ọ nwapụtawo ịbụ ihe a pụrụ ịdabere na ya n’ime narị afọ ndị gafeworonụ. Ebe onye guzobere ụkpụrụ omume ndị dị na Bible bụ onye nwere ikike kasịnụ, bụ́ Onye Okike anyị, ha baara ihe nile a kpọrọ mmadụ uru. N’ihi ya, ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji na-ebi ndụ nke amaghị ebe a kwụ akwụ n’ihe banyere omume.

Otú ọ dị, n’oge ndị a, a na-awakpo akọ na uche gị dị ka a na-emetụbeghị mbụ. Olee otú nke ahụ si kwe omume? Oleekwa otú ị pụrụ isi chebe akọ na uche gị? Ụzọ dị mma isi malite bụ ịmara onye na-eme mwakpo ahụ na usoro o ji eme ihe. A ga-atụle ha n’isiokwu na-esonụ.