New World Translation Ihe Ọtụtụ Nde Mmadụ Ji Kpọrọ Ihe n’Ụwa Nile
Guzonụ Dị Ka Ndị Zuru Okè, Ndị Kwezuwokwara Ihe Nile
New World Translation Ihe Ọtụtụ Nde Mmadụ Ji Kpọrọ Ihe n’Ụwa Nile
O WERE afọ 12, ọnwa 3, na ụbọchị 11 nke nrụsi ọrụ ike. Otú ọ dị, na March 13, 1960, e dechara akụkụ ihe odide ikpeazụ maka otu nsụgharị Bible ọhụrụ. A kpọrọ ya New World Translation of the Holy Scriptures.
Otu afọ mgbe e mesịrị, Ndịàmà Jehova bipụtara nsụgharị a n’otu mpịakọta. E bipụtara ya otu nde ná mbipụta nke 1961 ahụ. Taa, ọnụ ọgụgụ e bipụtarala ya agafeela otu narị nde ahụ e setịpụrụ dị ka ihe mgbaru ọsọ, na-eme ka New World Translation bụrụ otu n’ime Bible ndị a kasị kesaa. Otú ọ dị, gịnị kpaliri Ndịàmà imepụta nsụgharị a?
Gịnị Mere E Ji Nwee Nsụgharị Bible Ọhụrụ?
Iji ghọta ma kpọsaa ozi nke Akwụkwọ Nsọ, n’ime afọ ndị gafeworonụ, Ndịàmà Jehova ejiriwo ọtụtụ nsụgharị Bible Bekee dị iche iche mee ihe. Ọ bụ ezie na nsụgharị ndị a nwere ihe ndị bara uru n’ime ha, a na-ejikarị ọdịnala okpukpe na ụkpụrụ okwukwe nke Krisendọm agwagbu ha. (Matiu 15:6) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova ghọtara mkpa ọ dị inwe nsụgharị Bible nke ga-ewepụta, n’ụzọ ziri ezi, ihe dị n’ihe odide mbụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ.
E weere nzọụkwụ mbụ n’igbo mkpa a n’October 1946 mgbe Nathan H. Knorr, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, tụrụ aro ka e mepụta otu nsụgharị Bible ọhụrụ. Na December 2, 1947, Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ malitere imepụta nsụgharị nke ga-ekwekọ nnọọ n’ihe odide mbụ ahụ, nke ga-agụnye nchọpụta ndị kasị ọhụrụ ndị ọkà mmụta mere site n’akụkụ ihe odide Bible ndị a chọtara ọhụrụ, na nke a ga-eji asụsụ ndị na-agụ akwụkwọ n’oge a ga-aghọta ngwa ngwa sụgharịa.
Mgbe e bipụtara akụkụ nke mbụ ya—New World Translation of the Christian Greek Scriptures—na 1950, ọ bịara pụta ìhè na ndị nsụgharị ahụ emezuwo ebumnobi ha. Akụkụ ihe odide Bible ndị a na-aghọtachaghị na mbụ bịara doo anya n’ụzọ dị ịrịba ama. Dị ka ihe atụ, tụlee akụkụ ihe odide ahụ dị mgbagwoju anya dị na Matiu 5:3: “Ngọzi na-adịrị ndị bụ́ ogbenye n’ime mmụọ.” (King James Version) A sụgharịrị ya ịbụ: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” Ndụmọdụ Pọl onyeozi nke a sụgharịrị ịbụ “unu akpachapụrụla ihe ọ bụla anya” (King James Version), ka a sụgharịrị ịbụ: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla.” (Ndị Filipaị 4:6) Okwu Jisọs nke a sụgharịrị ịbụ “ọbịbịa” (King James Version), ka a sụgharịrị ịbụ “ọnụnọ.” (Matiu 24:3) N’ezie, New World Translation kpughere nghọta ọhụrụ.
Ọ kpaliri mmasị ndị ọkà mmụta dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ọkà mmụta Bible bụ́ onye Britain bụ́ Alexander Thomson kwuru Ndị Efesọs 5:25 na-agụ, sị, “Ndị bụ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya,” kama nanị ịsị, “Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya.” (King James Version) “Ọ dịghị nsụgharị ọzọ yiri ka o gosipụtawo akụkụ a magburu onwe ya n’ụzọ zuru ezu ma dị ọtụtụ otú a,” ka Thomson kwuru banyere New World Translation.
na New World Translation dị ịrịba ama n’ụzọ ziri ezi o si sụgharịa okwu Grik ndị na-egosi ihe ka na-eme eme. Iji maa atụ:Akụkụ ọzọ dị ịrịba ama nke New World Translation bụ ojiji o ji aha aka Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe ma n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru ma na nke Grik. Ebe ọ bụ na aha Hibru e ji mee ihe maka Chineke pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 n’ihe ahụ a sịrị na ọ bụ Agba Ochie nanị, o doro anya na Onye Okike anyị chọrọ ka ndị na-efe ya ofufe jiri aha ya na-eme ihe ma mara ya dị ka onye. (Ọpụpụ 34:6, 7) New World Translation enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka ime otú ahụ.
E Bipụta New World Translation n’Ọtụtụ Asụsụ
Kemgbe New World Translation pụtara n’asụsụ Bekee, Ndịàmà Jehova nọ gburugburu ụwa atụwo anya inweta ya n’asụsụ obodo ha—e nwekwara ezi ihe kpatara ya. Ná mba ụfọdụ, o siri ike inweta Bible ndị a sụgharịrị gaa n’asụsụ obodo ahụ n’ihi na obi anaghị adị ndị nnọchiteanya nke Òtù Nsụgharị Bible bụ́ ndị na-ekesa ya ụtọ ịhụ ka Bible ha na-ejedebe n’aka Ndịàmà Jehova. Ọzọkwa, Bible ndị dị otú ahụ dị n’asụsụ ógbè na-ezochikarị ozizi ndị dị oké mkpa. Otu ihe atụ pụtara ìhè bụ otu nsụgharị dị n’otu asụsụ e nwere n’ebe ndịda Europe bụ́ nke zochiri aka dị mkpa e zoro n’aha Chineke site n’iji “Ka ndị mmadụ sọpụrụ gị,” dochie okwu Jisọs bụ́ “Ka e doo aha gị nsọ.”—Matiu 6:9.
Na 1961, ndị nsụgharị amalitelarị ịsụgharị ihe odide Bekee nke New World Translation gaa n’asụsụ ndị ọzọ. Nanị afọ abụọ mgbe e mesịrị, a sụgharịchara New World Translation of the Christian Greek Scriptures gaa n’asụsụ isii ọzọ. Ka ọ dị mgbe ahụ, mmadụ 3 n’ime Ndịàmà 4 ọ bụla pụrụ ịgụ Bible a n’asụsụ ha. Ma, a ghaghị ịrụ ọrụ dị nnọọ ukwuu ma ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova gaje inyefe ọtụtụ nde mmadụ Bible a.
Na 1989, e rutụwere ihe mgbaru ọsọ ahụ mgbe e guzobere ngalaba Ije Ozi Maka Nsụgharị n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova. Ngalaba ahụ mepụtara usoro nsụgharị nke jikọtara ihe ọmụmụ okwu Bible na nkà na ụzụ kọmputa. Iji usoro a mee ihe emewo ka o kwe omume ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst gaa n’asụsụ ndị ọzọ n’ime otu afọ, sụgharịakwa Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ime afọ abụọ—akụkụ dị nta nke oge ọrụ nsụgharị Bible na-ewekebe. Kemgbe e mepụtara usoro a, e siwo n’asụsụ Bekee sụgharịa mbipụta 29 nke New World Translation ma wepụta ha n’asụsụ ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ na-asụ. A na-asụgharị ya ugbu a gaa n’asụsụ 12 ọzọ. Ka ọ dị ugbu a, a sụgharịala New World Translation Bekee, n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, gaa n’asụsụ 41 ndị ọzọ.
Ihe karịrị afọ 50 agaala kemgbe e wepụtara akụkụ mbụ nke New World Translation n’August 3, 1950, ná Mgbakọ Ịba Ụba Ọchịchị Chineke nke Ndịàmà Jehova na New York City. N’ihe omume ahụ, Nathan H. Knorr gbara ndị bịara mgbakọ ahụ ume, sị: “Werenụ nsụgharị a. Gụchapụnụ ya, ọ bụ ihe a ga-eji ọṅụ mee. Mụọnụ ya, n’ihi na ọ ga-enyere Ndị Kọlọsi 4:12.
unu aka ime ka unu ghọtakwuo Okwu Chineke nke ọma. Nyefeenụ ya ndị ọzọ.” Anyị na-agba gị ume ịgụ Bible kwa ụbọchị, n’ihi na ozi ya pụrụ inyere gị aka ‘iguzo dị ka onye zuru okè, onye kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ.’—[Ihe e sere ese/Foto ndị dị na peeji 8, 9]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
“Mwepụta New World Translation”
N’ịbụ nke e bu ụzọ wepụta n’asụsụ Bekee, New World Translation dịzi, n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, n’asụsụ 41 ọzọ
Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst Bible n’Ozuzu Ya
1950 1
1960-1969 6 5
1970-1979 4 2
1980-1989 2 2
1990-Ugbu A 29 19