“Ana M Arịọ Ka Siza Kpegharịa Ikpe M!”
“Ana M Arịọ Ka Siza Kpegharịa Ikpe M!”
ÌGWÈ ndị na-eme ihe ike ejide otu nwoke na-apụghị ịzọ onwe ya ma malite iti ya ihe. Ha echee na o kwesịrị ọnwụ. Kpọmkwem mgbe o yiri nnọọ ka ha na-aga igbu ya, ndị soja abịa ma jisie ike napụta ya n’aka ìgwè ndị ahụ na-eme ihe ike. Nwoke ahụ bụ Pọl onyeozi. Ndị tiri ya ihe bụ ndị Juu ji ịgba isi akwara jụ nkwusa Pọl ma boo ya ebubo na ọ na-emerụ ụlọ nsọ ahụ. Ndị napụtara ya bụ ndị Rom ọchịagha ha, bụ́ Klọdiọs Lisias, du bịa. N’ọgba aghara ahụ, e jidere Pọl dị ka onye a na-enyo enyo na ọ bụ omempụ.
Isiakwụkwọ asaa ndị ikpeazụ nke akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi depụtara okwu ikpe malitere mgbe e jidesịrị ya. Ịghọta nzụlite Pọl dị ka ọkàiwu, ebubo ndị e boro ya, otú o si zara ọnụ ya, na ihe ụfọdụ banyere ụzọ ndị Rom si enye ntaramahụhụ, na-eme ka a ghọtakwuo isiakwụkwọ ndị a.
Ka Klọdiọs Lisias Kpọchiri Ya
Ọrụ Klọdiọs Lisias gụnyere ịhụ na ọgba aghara adịghị na Jerusalem. Onye ka ya n’ọkwá, bụ́ onye Rom na-achị Judia, bi na Sisaria. A pụrụ iwere ihe Lisias mere n’ọnọdụ Pọl dị ka ichebe mmadụ pụọ n’ihe ike na ịkpọchi onye na-akpaghasị udo. Otú ndị Juu si meghachi omume mere ka Lisias kpọga onye mkpọrọ ya n’ogige ndị agha dị n’Ụlọ Elu Antonia.—Ọrụ 21:27–22:24.
Lisias aghaghị ịchọpụta ihe Pọl mere. Ọ dịghị ihe ọ chọpụtara mgbe ahụ a na-eme mkpọtụ. Ya mere, n’egbukwughị oge, o nyere iwu ka ‘e were ịpịa ihe chọpụta isi okwu n’ọnụ Pọl, ka ya wee mara ihe mere ha ji tie mkpu megide Pọl.’ (Ọrụ 22:24) Nke a bụ usoro a na-agbasokarị iji jụpụta ndị omekome, ndị ohu, na ndị ọzọ nọ n’ọkwá dị ala okwu n’ọnụ. Ụtarị ahụ (flagrum) pụrụ ịdịwo irè iji mezuo nke ahụ, ma, ọ bụ ihe na-eyi egwu. Ụfọdụ n’ime ụtarị ndị a na-ebu mkpụrụ ọla e ji chen kenye na ha. Ndị ọzọ na-ebu akpụkpọ anụ ndị e kekọtara ha na ọkpụkpụ ndị pịrị ọnụ na iberibe ọla. Ha na-emerụ ahụ nke ukwuu, na-adọkasị anụ ahụ.
Mgbe e mere nke ahụ, Pọl kwupụtara na ya bụ onye Rom. A pụghị ịpịa onye Rom a na-amaghị ikpe ihe, n’ihi ya, e mere ihe ozugbo banyere nkwupụta Pọl kwupụtara ihe ndị ruuru ya. Imetọ ma ọ bụ ịta nwa amaala Rom ahụhụ pụrụ ime ka a napụ onye ọrụ Rom ọkwá ya. N’ụzọ kwere nghọta, site mgbe ahụ gawa, e mesoro Pọl ihe dị ka onye mkpọrọ pụrụ iche, onye pụrụ inwe ndị ọbịa.—Ọrụ 22:25-29; 23:16, 17.
N’ịbụ onye na-ejighị ihe ndị e boro Pọl n’ebubo n’aka, Lisias duuru ya gaa n’ihu Sanhedrin iji mata ihe kpatara ọgba aghara ahụ. Ma Pọl kpaliri esemokwu mgbe o kwuru na a na-ekpe ya ikpe n’okwu banyere mbilite n’ọnwụ. Esemokwu ahụ kpụ nnọọ ọkụ n’ọnụ nke na Lisias tụrụ egwu na a ga-adọkasị Pọl, Lisias aghaghị ịnapụtakwa Pọl ọzọ n’aka ndị Juu iwe ji.—Ọrụ 22:30–23:10.
Lisias achọghị ka onye Rom e gburu egbu nọrọ ya n’isi. Ka ọ nụrụ banyere nkata a na-akpa igbu onye mkpọrọ ya, o mere ngwa ngwa kpọrọ ya gbadaa Sisaria. Usoro ikpe chọrọ na mgbe a na-akpọga ndị mkpọrọ n’ihu ndị ikpe ka elu, akụkọ ndị na-akọwa okwu ikpe ha ga-eso ha. Akụkọ ndị ahụ ga-agụnye ihe ndị mbụ a chọpụtara, ihe ndị mere e ji mee ihe e mere, na ihe onye nyochara okwu ikpe ahụ chere banyere ya. Lisias kọrọ na ‘a na-ebo Pọl ebubo banyere ajụjụ dị iche iche nke iwu ndị Juu, e boghị ya ihe kwesịrị ọnwụ ma ọ bụ agbụ,’ o nyekwara ndị na-ebo Pọl ebubo iwu ka ha mee mkpesa ha n’ihu onye ọchịchị, bụ́ Filiks.—Ọrụ 23:29, 30.
Onye Ọchịchị Bụ́ Filiks Ajụ Ibi Ikpe
Ike ọchịchị nke ógbè ahụ dabeere n’ike ọchịchị Filiks. Ọ pụrụ ịgbaso omenala obodo ma ọ chọọ ma ọ bụ gbasoo iwu ọchịchị tiri banyere mpụ—nke e ji ekpe ndị a ma ama n’obodo na ndị ọrụ ọchịchị ikpe. A maara nke ahụ dị ka ordo, ma ọ bụ usoro. Ọ pụkwara iji ikike extra ordinem mee ihe, bụ́ nke a pụrụ iji kpee ikpe metụtara ụdị mpụ ọ bụla. A na-atụ anya n’aka onye ọchịchị ógbè ‘ịtụle ọ bụghị ihe e mere na Rom, kama ihe e kwesịrị ime n’ozuzu.’ N’ihi ya, e nwere ọtụtụ ihe dị ya n’aka ikpebi.
A maghị nkọwa nile banyere iwu Rom oge ochie, ma e weere okwu ikpe Pọl dị ka “ihe ndekọ na-enye ihe atụ nke usoro ọchịchị ógbè na-agbaso n’inye ntaramahụhụ bụ́ extra ordinem.” Onye ọchịchị, bụ́ onye ndị ndụmọdụ na-enyere aka, na-anụrụ ebubo nke ndị mmadụ n’otu n’otu. A na-akpọbata onye e boro ebubo ka ọ bịa gbaghaa ya, ọ pụkwara ịzara ọnụ ya, ma, ọ bụ onye gbara akwụkwọ ka ọ dị n’aka ịnwapụta ebubo ọ bụla. Onye majie na-enye ntaramahụhụ ọ bụla masịrị ya. Ọ pụrụ ibi ikpe ahụ ozugbo ma ọ bụ yigharịa ya gaa n’oge a na-akaghị aka, n’ọnọdụ dị otú ahụ, a ga-ejichi onye ahụ na-azara ọnụ ya. “Ihe ịrụ ụka adịghị ya,” ka ọkà mmụta bụ́ Henry Cadbury na-ekwu, “na n’ịbụ onye pụrụ iji ike mee ihe otú o si masị ya otú ahụ, onye ọchịchị Rom nọ n’ọnọdụ nke ikwenyere ‘mmetụta na-enweghị isi’ na ịnara aka azụ—ma ọ́ bụghị iji tọhapụ, ọ bụrụ iji maa ikpe, ma ọ bụkwanụ iji yigharịa ikpe.”
Onyeisi Nchụàjà bụ́ Ananaịas, ndị okenye ndị Juu, na Tatọlọs boro Pọl ebubo n’ihu Filiks ịbụ ‘onye na-eme ka ihe ọjọọ baa ụba, onye na-akpalikwa mmadụ n’etiti ndị Juu ibili megide ndị isi.’ Ha zọọrọ na ọ bụ onyeisi nke “ịrọ òtù ndị Nazaret” nakwa na ọ nwara imerụ ụlọ nsọ ahụ.—Ọrụ 24:1-6.
Ndị mbụ wakporo Pọl chere na o dubatara onye Jentaịl aha ya bụ Trọfimọs n’ogige e debere maka nanị ndị Juu. * (Ọrụ 21:28, 29) N’ikwu ya hoo haa, onye e kwuru na ọ bụ ya batara n’ogige ahụ bụ Trọfimọs. Ma ọ bụrụ na ndị Juu ghọtara ihe e weere na Pọl mere dị ka idubata mmadụ n’ebe a machibidoro ya iwu, a pụkwara ịkọwa ya dị ka mmehie na-eweta ọnwụ. O yikwara ka Rom o kwerewo ịkwado ikpe ọnwụ a na-ama maka mpụ a. N’ihi ya, a sị na ndị jidere Pọl bụ ndị uwe ojii nke ụlọ nsọ ahụ, kama ịbụ Lisias, ndị Sanhedrin pụrụ ikpewo ya ikpe ma maa ya ikpe n’enweghị nsogbu.
Ndị Juu chere n’echiche na ihe Pọl kụziri abụghị okpukpe ndị Juu, ma ọ bụ okpukpe iwu kwadoro (religio licita). Kama nke ahụ, na e kwesịrị iwere ya dị ka nke iwu na-akwadoghị, ọbụna nke na-agba ọchịchị mgba okpuru.
Ha zọkwaara na Pọl nọ ‘na-akpali mmadụ n’etiti ndị Juu nile n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ha bilie megide ndị isi.’ (Ọrụ 24:5) N’oge na-adịbeghị anya, Eze Ukwu Klọdiọs katọrọ ndị Juu nọ n’Aleksandria maka “ịkpali ihe otiti zuru ụwa ọnụ n’ụwa nile.” Myirịta dị n’etiti ha dị ịrịba ama. “Ebubo ahụ bụ kpọmkwem nke a ga-ebo onye Juu n’oge Ọchịchị Klọdiọs ma ọ bụ n’afọ ndị mbụ nke ọchịchị Nero,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ A. N. Sherwin-White na-ekwu. “Ndị Juu nọ na-anwa ịkpali onye ọchịchị ahụ ịkọwa nkwusa Pọl dị ka nke ya na ịkpasu ọgba aghara n’ebe nile ndị Juu bi n’Alaeze Ukwu ahụ bụ otu ihe. Ha maara na ndị ọchịchị adịghị njikere ịma mmadụ ikpe nanị n’ihi ebubo ndị metụtara okpukpe, n’ihi ya, ha gbalịrị iji ihe ndị metụtara ọchịchị kwadoo ebubo ha ndị metụtara okpukpe.”
Pọl zaara ọnụ ya n’ebubo ha n’otu n’otu. ‘Ọ dịghị ọgba aghara m kpasuru. N’eziokwu, anọ m n’ihe ha kpọrọ “ịrọ òtù,” ma nke a na-agụnye ịgbaso iwu ndị Juu. Ọ bụ ndị Juu ụfọdụ si Esia kpasuru ọgba aghara ahụ. Ọ bụrụ na ọ dị mkpesa ha nwere ime, ha kwesịrị ịnọ ebe a iji mee ya.’ N’ụzọ bụ́ isi, Pọl chịkọtara ebubo ahụ ịbụ nke metụtara esemokwu okpukpe dị n’etiti ndị Juu, bụ́ nke ọ na-adịchaghị ihe ndị Rom pụrụ ime maka ya. N’ịkpachapụ anya ka ọ ghara ịkpasu ndị Juu kpọrọrị ekwo nkụ iwe, Filiks yigharịrị ikpe ahụ, na-afọ nke nta ka o mee ka ikpe ahụ ghara ịga aga. E nyefeghị Pọl n’aka ndị Juu, bụ́ ndị zọọrọ na ọ bụ ha ruru eru ikpe ikpe ahụ, e jighịkwanụ iwu ndị Rom kpee ya ikpe, a tọhapụghịkwanụ ya. A pụghị ịmanye Filiks ikpebi ikpe, tụkwasịkwa n’ịchọ inweta ihu ọma ndị Juu, ọ dị ihe ọzọ o bu n’obi na-egbu oge—o nwere olileanya na Pọl ga-enye ya aka azụ.—Ọrụ 24:10-19, 26. *
Oké Mgbanwe n’Okpuru Ọchịchị Pọsiọs Festọs
Afọ abụọ mgbe e mesịrị na Jerusalem, ndị Juu maliteghachiri ebubo ha mgbe Pọsiọs Festọs, bụ́ onye ọchịchị ọhụrụ, bịarutere, na-arịọ ya ka ọ kpụnye ha Pọl. Ma Festọs ji isi ọnwụ zaghachi, sị: “Ọ bụghị omenala nke ndị Rom iwere amara rara mmadụ ọ bụla nye, ma ọ bụrụ na onye a na-ebo ebubo ebughị ụzọ nwee ndị na-ebo ya n’ihu ya, hụkwa ụzọ ịgọpụ onwe ya n’ihe e boro ya.” Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Harry W. Tajra na-ekwu, sị: “Festọs chọpụtara ozugbo na a na-akpa nkata igbu nwa amaala Rom n’ekpeghị ya ikpe.” Ya mere, a gwara ndị Juu ka ha weta okwu ikpe ha na Sisaria.—Ọrụ 25:1-6, 16.
N’ebe ahụ, ndị Juu kwuru na Pọl ‘ekwesịghị ịdị ndụ ọzọ,’ ma ha enyeghị ihe akaebe ọ bụla, Festọs chọpụtakwara na Pọl emeghị ihe kwesịrị ọnwụ. “Ha ji ajụjụ ụfọdụ megide ya banyere nsọpụrụ chi nke aka ha, na ajụjụ banyere otu Jisọs, Onye nwụrụrị anwụ, Onye Pọl na-asị na Ọ dị ndụ,” ka Festọs kọwaara onye ọchịchị ọzọ.—Ọrụ 25:7, 18, 19, 24, 25.
O doro nnọọ anya na ikpe ebubo metụtara ọchịchị amaghị Pọl, ma n’esemokwu metụtara okpukpe, ikekwe ndị Juu rụrụ ụka na ọ bụ nanị ụlọikpe ha ruru eru ikpe ya Pọl ọ̀ ga-aga Jerusalem ka e kpee ya ikpe n’okwu a? Festọs jụrụ Pọl ma ọ̀ ga-eme otú ahụ, ma n’ezie, nke Ọrụ 25:10, 11, 20.
ahụ bụ aro na-ekwesịghị ekwesị. Ịga ikpe na Jerusalem bụ́ ebe ndị boro ebubo ga-abụ ndị ikpe pụtara na a ga-arara Pọl nye n’aka ndị Juu. “Ana m eguzo n’ihu oche ikpe nke Siza, ebe a ghaghị ikpe m,” ka Pọl kwuru. “Emegideghị m ndị Juu ajọ omume ọ bụla . . . Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ iwere m nye ha n’amara. [Ana m arịọ ka Siza kpegharịa ikpe m! NW].”—Nwa amaala Rom ikwu ihe a ga-eme ka ọchịchị ógbè nile kwụsị ikpe ya ikpe. Ikike o nwere itinye akwụkwọ mkpegharị ikpe (provocatio) bụ nke “ziri ezi, saa mbara ma dị irè.” Ya mere mgbe ya na ndị ndụmọdụ ya kwurịtasịrị banyere ya, Festọs kwupụtara, sị: “Siza ka ị rịọworo ka o kpegharịa ikpe gị; Siza ka ị ga-agakwuru.”—Ọrụ 25:12, NW.
Obi dị Festọs ụtọ na Pọl apụọla ya n’aka. Dị ka o kwetara n’ihu Herọd Agripa nke Abụọ ụbọchị ole na ole nke a gasịrị, ikpe ahụ gbagwojuru ya anya. Festọs aghaghịzi ide banyere okwu ikpe ahụ nye eze ukwu ahụ, ma nye Festọs, ebubo ndị ahụ gụnyere ihe ndị dị mgbagwoju anya nke iwu ndị Juu. Otú ọ dị, Agripa bụ aka ochie n’okwu ndị dị otú ahụ, n’ihi ya, mgbe o gosipụtara mmasị, a rịọrọ ya ozugbo ka o nye aka dee akwụkwọ ozi ahụ. N’ịbụ onye na-aghọtaghị okwu Pọl mesịrị kwuo n’ihu Agripa, Festọs tipụrụ mkpu, sị: “Pọl, anya adịghị gị mma; oké mmụta akwụkwọ gị na-eme gị ka ị ghọọ onye anya na-adịghị mma.” Ma Agripa ghọtara ya nnọọ nke ọma. “Ị na-eji okwu nta eme ka m kwenye ịbụ Kristian,” ka o kwuru. Ihe ọ sọrọ Festọs na Agripa ha chee banyere arụmụka Pọl, ha ekwerela na aka Pọl dị ọcha nakwa na ha gaara atọhapụwo ya ma a sị ka ọ rịọghị ka Siza kpegharịa ikpe ya.—Ọrụ 25:13-27; 26:24-32.
Ọgwụgwụ nke Ikpe E Kpetere Aka
Mgbe Pọl rutere Rom, ọ kpọrọ ndị ikom bụ́ isi nke ndị Juu, ọ bụghị nanị iji kwusaara ha ozi ọma kamakwa, iji chọpụta ihe ha maara banyere ya. Nke ahụ pụrụ ikpughewo ihe ụfọdụ banyere ebumnobi nke ndị boro ya ebubo. Ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkebe bụ́ ndị isi nọ na Jerusalem ịchọ enyemaka nke ndị Juu nọ na Rom n’okwu ikpe, ma Pọl nụrụ na e nyeghị ha iwu banyere ya onwe ya. Ka Pọl nọ na-eche ka e kpee ya ikpe, e kwere ka o nweta ụlọ ma mee nkwusa n’enweghị ihe mgbochi. Ikwe ka Pọl mesara ahụ otú ahụ pụrụ ịpụtawo na, n’anya ndị Rom, ọ bụ onye aka ya dị ọcha.—Ọrụ 28:17-31.
E ji Pọl eji ruo afọ abụọ ọzọ. N’ihi gịnị? Bible enyeghị nkọwa ọ bụla. A na-ejichikarị onye tinyere akwụkwọ mkpegharị ikpe ruo mgbe ndị boro ya ebubo ga-abịa iji gaa n’ihu n’ebubo ha, ma ikekwe ndị Juu nọ na Jerusalem, n’ịmata na ebubo ha agbanyeghị mkpọrọgwụ, abịaghị ma ọlị. Ikekwe ụzọ kasị irè isi kpuchie Pọl ọnụ ruo ókè o kwere mee bụ ịghara ịbịa. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya, o yiri ka Pọl o guzoro n’ihu Nero, e kwuo na aka ya dị ọcha, ma mee ka o nwere onwe ya n’ikpeazụ iji maliteghachi ọrụ ozi ala ọzọ ya—ihe dị ka afọ ise e jidesịrị ya.—Ọrụ 27:24.
Ọ dịla anya ndị na-emegide eziokwu jiwere ‘iwu na-akpụzi mmegbu’ iji gbochie ọrụ nkwusa ndị Kraịst. Nke a ekwesịghị iju anyị anya. Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu.” (Abụ Ọma 94:20, King James Version; Jọn 15:20) Ma, Jisọs mesiri anyị obi ike na anyị ga-enwere onwe anyị izi ụwa nile ozi ọma. (Matiu 24:14) N’ihi ya, dị nnọọ ka Pọl onyeozi guzogidere mkpagbu na mmegide, Ndịàmà Jehova taa ‘na-agọpụrụ ozi ọma ma na-eme ka o guzosie ike n’ụzọ iwu.’—Ndị Filipaị 1:7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 14 Nnukwu mgbidi e ji nkume wuo, nke dị kubit atọ n’ịdị elu, kewapụrụ Ogige Ndị Jentaịl pụọ n’ogige dị n’ime nke ụlọ nsọ ahụ. E degasịrị okwu ịdọ aka ná ntị n’ahụ mgbidi ahụ, ụfọdụ n’asụsụ Grik, ụfọdụkwa n’asụsụ Latin: “Ka onye ọ bụla bụ́ onye ala ọzọ ghara ịbanye n’ime ihe mgbochi a na mgbidi gbachibidoro ebe nsọ a. Ọnwụ onye ọ bụla e jidere bụ́ nke ga-esochi, ga-adị ya n’isi.”
^ par. 17 N’ezie, iwu megidere nke a. Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “A bịa n’iwu metụtara ịpụnara ihe, bụ́ Lex Repetundarum, a machibidoro onye ọ bụla nọ n’ọkwá ọchịchị ma ọ bụ nke nlekọta iwu ịrịọ ma ọ bụ ịnara aka azụ iji jichie ma ọ bụ tọhapụ mmadụ, iji bie ikpe ma ọ bụ ghara ibi ya ma ọ bụkwanụ iji tọhapụ onye mkpọrọ.”