Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụmụnne Ndị Zụlitere Àgwà Dịrịtara Iche

Ụmụnne Ndị Zụlitere Àgwà Dịrịtara Iche

Ụmụnne Ndị Zụlitere Àgwà Dịrịtara Iche

MKPEBI ndị nne na nna mere na-emetụtarịrị ụmụ ha. Ọ dị otú ahụ taa dịkwa ka ọ dị laa azụ n’ogige Iden. Ụzọ nnupụisi nke Adam na Iv nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Jenesis 2:15, 16; 3:1-6; Ndị Rom 5:12) Ma, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ohere nke iso Onye Okike anyị na-enwe mmekọrịta dị mma ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ ime otú ahụ. A na-ahụ nke a n’ihe ndekọ banyere Ken na Ebel, bụ́ ụmụnne mbụ a kọrọ n’akụkọ ihe mere eme.

Ọ dịghị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ gosiri na Chineke gwara Adam na Iv okwu mgbe a chụpụsịrị ha n’Iden. Otú o sina dị, Jehova ezochighị onwe ya n’ebe ụmụ ha nọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Ken na Ebel si n’ọnụ ndị mụrụ ha nụ ihe merenụ. Ha pụrụ ịhụ ‘Cherubim na ire ọkụ nke mma agha nke na-echigharị onwe ya, idebe ụzọ osisi ahụ nke ndụ.’ (Jenesis 3:24) Ndị ikom a hụkwara mmezu nke okwu Chineke bụ́ na ọsụsọ na ihe mgbu ga-aghọ ihe ndị a na-ahụ ná ndụ.—Jenesis 3:16, 19.

Ken na Ebel aghaghị ịmawo banyere ihe Jehova gwara agwọ ahụ: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Ihe Ken na Ebel maara banyere Jehova ga-eme ka ha nwee ike iso ya na-enwe ezi mmekọrịta.

Ịtụgharị uche n’amụma Jehova nakwa n’àgwà ya dị ka Onye na-enye ihe n’ịhụnanya aghaghị ịkpaliwo Ken na Ebel inwe ọchịchọ inweta ihu ọma Chineke. Ma ruo n’ókè ha aṅaa ka ha ga-azụlite ọchịchọ ahụ? Hà ga-eme ihe banyere ọchịchọ ebumpụta ụwa ha nke ife Chineke ofufe na ịzụlite ọnọdụ ime mmụọ ha ruo n’ókè nke igosipụta okwukwe n’ebe ọ nọ?—Matiu 5:3.

Ụmụnne ahụ Eweta Onyinye

Ka oge na-aga, Ken na Ebel wetaara Chineke onyinye. Ken wetara mkpụrụ ala, Ebel wetakwara ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ìgwè ewu na atụrụ ya. (Jenesis 4:3, 4) Ọ pụrụ ịbụwo na ndị ikom a dị ihe dị ka 100 afọ n’oge ahụ, n’ihi na Adam dị afọ 130 mgbe ọ mụrụ nwa nwoke bụ́ Set.—Jenesis 4:25; 5:3.

Onyinye ha na-egosi na Ken na Ebel ghọtara ọnọdụ mmehie ha ma chọọ ihu ọma Chineke. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ha aghaghị ichebatụwo echiche ná nkwa Jehova kwere metụta agwọ ahụ na Mkpụrụ nke nwanyị ahụ. E kwughị kpọmkwem otú oge na mgbalị Ken na Ebel tinyere n’ịzụlite mmekọrịta dị mma n’ebe Jehova nọ haruru. Ma otú Chineke si meghachi omume n’onyinye ha na-eme ka a ghọta echiche kasị mie emie nke onye nke ọ bụla n’ime ha.

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-enye echiche na Iv lere Ken anya dị ka “mkpụrụ” ahụ nke ga-ebibi agwọ ahụ, n’ihi na mgbe a mụrụ Ken, Iv kwuru, sị: “Enwetawo m nwoke site n’inyeaka Jehova.” (Jenesis 4:1) Ọ bụrụ na Ken nwere nkwenkwe a, ọ kụrụ afọ n’ala. N’aka nke ọzọ, Ebel ji okwukwe kwadoo àjà ya. N’ihi ya, “site n’okwukwe, Ebel chụụrụ Chineke àjà dị oké ọnụ ahịa karịa nke Ken.”—Ndị Hibru 11:4.

Ọ bụghị nanị nghọta ime mmụọ Ebel nwere na enweghị nghọta ime mmụọ nke Ken bụ ihe dị iche n’etiti ụmụnne a. Àgwà ha dịkwa iche. N’ihi ya, “Jehova [lere] Ebel, leekwa onyinye ịnata ihu ọma ya, anya ọma: ma Ken na onyinye ịnata ihu ọma ya, O leghị ha anya ọma.” O yikarịrị ka Ken echebaraghị onyinye ya echiche nke ọma ma nye ya nanị iji mezuo iwu. Ma Chineke adịghị anakwere ofufe a na-efe nanị iji mezuo iwu. Ken azụlitewo obi ọjọọ, Jehova chọpụtakwara na o bu ihe ọjọọ n’obi. Otú Ken si meghachi omume n’ọjụjụ a jụrụ àjà ya gosipụtara otú àgwà ya dị n’ezie. Kama ịchọ ime mgbanwe, “Ken [were] iwe dị ọkụ nke ukwuu, ihu ya wee gbarụọ.” (Jenesis 4:5) Akparamàgwà ya gosipụtara echiche na ebumnobi ọjọọ ya.

Ịdọ Aka ná Ntị na Mmeghachi Omume

N’ịmara àgwà Ken, Chineke dụrụ ya ọdụ, na-asị: “N’ihi gịnị ka ị na-ewe iwe dị ọkụ? ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihu gị gbarụrụ? Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọma, ọ́ bụghị mgbasa ihu ka ị ga-enwe? ọ bụrụkwa na i meghị nke ọma, n’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa: ọ bụkwa n’ebe ị nọ ka ọchịchọ ya dị, ma o kwesịrị ka gị onwe gị chịa ya.”—Jenesis 4:6, 7.

Ọ dị ihe anyị ga-amụta na nke a. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, mmehie nọ n’ọnụ ụzọ dịrị njikere irikpu anyị. Ma, Chineke enyewo anyị ikike ime nhọrọ, anyị pụkwara ịhọrọ ime ihe ziri ezi. Jehova gbara Ken ume ‘ime ihe ọma,’ ma Ọ manyeghị ya ịgbanwe. Ken ji aka ya họrọ ụzọ ọ gbasoro.

Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ gara n’ihu, sị: “Ken wee sị Ebel, bụ́ nwanne ya, Ka anyị jee n’ọhịa. O ruo, mgbe ha nọ n’ọhịa, na Ken biliri imegide Ebel, bụ́ nwanne ya, wee gbuo ya.” (Jenesis 4:8) Ken si otú a ghọọ ogbu ọchụ na-enupụ isi nke obi fere azụ. Ọ kwatụghịdị ụta ọ bụla mgbe Jehova jụrụ ya, sị: “Olee ebe Ebel, bụ́ nwanne gị, nọ?” Kama nke ahụ, Ken ji mkparị na obi ịta mmiri zaghachi, sị: “Amaghị m: ọ̀ bụ onye nche nwanne m ka m bụ?” (Jenesis 4:9) Ụgha ọcha ahụ na ngọnahụ ahụ ọ gọnahụrụ ibu ọrụ ya kpughere obi ịta mmiri nke Ken.

Jehova bụrụ Ken ọnụ ma chụpụ ya na gburugburu Iden. O doro anya na ọnụ ahụ a bụwororịị ala ga-aka apụta ìhè n’ọnọdụ Ken, ala agaghịkwa emere ya nri ma ọ kọọ ya. Ọ gaje ịbụ onye mwagharị na onye na-agba ọsọ ndụ n’ụwa. Mkpesa Ken mere na ikpe a mara ya karịrị akarị gosipụtara nchegbu o nwere na a ga-abọ ọbọ n’isi ya maka igbu nwanne ya, ma o gosipụtaghị ezi nchegharị. Jehova dooro Ken “ihe ịrịba ama”—ikekwe iwu siri ike nke ndị ọzọ maara ma debe bụ́kwa nke e bu n’obi iji gbochie ya ịbụ onye a ga-emegwara ihe o mere.—Jenesis 4:10-15.

“Ken wee si n’ihu Jehova pụọ, biri n’ala Nod, n’Ihu anyanwụ Iden.” (Jenesis 4:16) N’ịbụ onye kpọwooro nwunye n’etiti ụmụnne ya ndị nwanyị ma ọ bụ ụmụ ụmụnne ya, o wuru obodo ọ gụrụ aha Inọk, bụ́ diọkpara ya. Nwa Ken bụ́ Lemek ghọrọ onye na-eme ihe ike dị ka nna nna ya na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ma e kpochapụrụ agbụrụ Ken n’Iju Mmiri nke oge Noa.—Jenesis 4:17-24.

Ihe Mmụta Dịịrị Anyị

Anyị pụrụ ịmụta ihe n’ihe ndekọ banyere Ken na Ebel. Jọn onyeozi na-agba Ndị Kraịst ume ịhụ ibe ha n’anya, “ọ bụghị dị ka Ken, onye sitere n’ajọ onye ahụ ma gbuo nwanne ya.” “Ọrụ [Ken] dị njọ, ma ndị nke nwanne ya ziri ezi.” Jọn na-ekwukwa, sị: “Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu makwaara na ọ dịghị ogbu mmadụ nke ndụ ebighị ebi na-adịgide n’ime ya.” Ee, otú anyị si emeso Ndị Kraịst ibe anyị ihe na-emetụta mmekọrịta anyị na Chineke na ihe ndị anyị na-atụ anya ha n’ọdịnihu. Anyị apụghị ịnọ na-akpọ onye ọ bụla n’ime ndị kwere ekwe ibe anyị asị ma na-enwetakwa ihu ọma Chineke.—1 Jọn 3:11-15; 4:20.

Ken na Ebel aghaghị ịbụwo ndị a zụlitere n’otu ụzọ, ma Ken enweghị okwukwe n’ebe Chineke nọ. N’ezie, o gosipụtara mmụọ nke Ekwensu, bụ́ onye mbụ bụ́ ‘ogbu mmadụ na nna nke ụgha.’ (Jọn 8:44) Ụzọ Ken gbasoro na-egosi na anyị nile nwere nhọrọ, na ndị họọrọ ime mmehie na-ekewapụ onwe ha n’ebe Chineke nọ, nakwa na Jehova na-eme ihe o kpere n’ikpe n’isi ndị na-enweghị nchegharị.

N’aka nke ọzọ, Ebel gosipụtara okwukwe n’ebe Jehova nọ. N’ezie, “site n’okwukwe, Ebel chụụrụ Chineke àjà dị oké ọnụ ahịa karịa nke Ken, bụ́ okwukwe nke e sitere na ya gbaa àmà banyere ya na ọ bụ onye ezi omume, ebe Chineke na-agba àmà banyere onyinye ya.” Ọ bụ ezie na ọ dịghị otu okwu Ebel kwuru nke e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, site n’okwukwe ya kwesịrị nṅomi, ọ “na-ekwu okwu.”—Ndị Hibru 11:4.

Ebel bụ onye mbụ n’ime imerime ndị guzosiri ike n’ezi ihe. E chefubeghị ọbara ya, bụ́ nke ‘tikuru Jehova site n’ala.’ (Jenesis 4:10; Luk 11:48-51) Ọ bụrụ na anyị egosipụta okwukwe dị ka Ebel mere, anyị onwe anyị pụkwara iso Jehova na-enwe mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa ma na-adịgide adịgide.

[Igbe dị na peeji nke 22]

ONYE ỌRỤ UBI NA ONYE ỌZỤZỤ ATỤRỤ

Ịkọ ala na ilekọta ụmụ anụmanụ bụ ụfọdụ n’ime ọrụ mbụ Chineke nyere Adam. (Jenesis 1:28; 2:15; 3:23) Diọkpara ya bụ́ Ken rụrụ ọrụ ubi, Ebel ghọkwara onye ọzụzụ atụrụ. (Jenesis 4:2) Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ihe oriri nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ nanị mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ruo mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, gịnị mere e ji na-azụ atụrụ?—Jenesis 1:29; 9:3, 4.

Ka atụrụ wee too nke ọma, ọ dị ya mkpa ịbụ nke mmadụ na-elekọta. Ọrụ Ebel na-agba akaebe na ụmụ mmadụ zụwara anụ ụlọ ndị a site ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ. Akwụkwọ Nsọ ekwughị ma ndị mbụ biri ndụ hà si ná mmiri ara ụmụ anụmanụ nweta nri, ma ọbụna onye na-eri nanị ihe akụ́kụ́ pụrụ iji ajị atụrụ mee ihe. Mgbe atụrụ nwụkwara, akpụkpọ ha na-aba uru. Dị ka ihe atụ, iji kpuchie ọtọ Adam na Iv, Jehova nyere ha ‘uwe ime nke e ji akpụkpọ anụ mee.’—Jenesis 3:21.

Otú o sina dị, o yiri ihe ezi uche dị na ya iwere ya na Ken na Ebel dị ná mma ná mmalite. Ha mepụtara ihe dị ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ha mkpa iji kpuchie ọtọ ha na iji rijuo afọ.

[Foto dị na peeji nke 23]

“Ọrụ Ken dị njọ, ma ndị nke nwanne ya ziri ezi”