‘Ikwusa Okwu ahụ’ Na-eweta Ume Ọhụrụ
“Bịakwutenụ M, . . . M Ga-emekwa Ka Unu Nwee Ume Ọhụrụ”
‘Ikwusa Okwu ahụ’ Na-eweta Ume Ọhụrụ
Ọ BỤ nwoke zuru okè nke bịara ịrụ ọrụ dị mkpa. Ụzọ ndị o si ezi ihe dị nnọọ irè nke na “ụzọ o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya.” (Matiu 7:28) Ọ bụkwa onye nkwusa ike na-adịghị agwụ. O tinyere oge, ike, na ihe ndị o nwere n’ụzọ bụ́ isi n’ikwusa banyere Alaeze Chineke. N’ezie, Jizọs Kraịst jegharịrị n’obodo ya nile dị ka onye nkwusa na onye ozizi na-enweghị atụ.—Matiu 9:35.
Ọrụ dị ngwa Jizọs bịara ịrụ bụ ikwusara ndị ya na ha dịkọrọ ndụ “ozi ọma alaeze ahụ” na ịzụ ndị na-eso ụzọ ya maka ịrụ otu ọrụ ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ. (Matiu 4:23; 24:14; 28:19, 20) Ịdị arọ na ịdị ngwa nke ọrụ nkwusa ha, tinyere ịdị ukwuu nke ọrụ dị otú ahụ ọ̀ ga-eme ka ike gwụ ndị na-eso ụzọ ya na-ezughị okè bụ́ ndị nwekwara erughị eru?
Ọ dịghị ma ọlị! Mgbe o nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka ikpegara “Nna Nwe owuwe ihe ubi ahụ,” bụ́ Jehova Chineke, ekpere izitekwu ndị ọrụ, Jizọs zipụrụ ha izi ndị mmadụ ihe. (Matiu 9:38; 10:1) O mesiziri ha obi ike na ibu ọrụ nke ịbụ onye na-eso ụzọ ya—gụnyere ọrụ ime nkwusa—ga-eweta ezi ahụ efe na nkasi obi. Jizọs sịrị: “Bịakwutenụ m, . . . m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ.”—Matiu 11:28.
Isi Iyi nke Ọṅụ
Lee ka ọkpụkpọ òkù ahụ si bụrụ nke na-egosipụta ọmịiko, ịhụnanya, na obiọma! Ọ na-egosipụta nchegbu miri emi Jizọs nwere n’ebe ụmụazụ ya nọ. Ndị na-eso ụzọ ya nwetara ume ọhụrụ n’ezie n’ịrụzu ọrụ ha nke ikwusa “ozi ọma” nke Alaeze Chineke. Nke a wetaara ha ezi ọṅụ na afọ ojuju.—Jọn 4:36.
Ogologo oge tupu Jizọs abịa n’ụwa, Akwụkwọ Nsọ mesiri ya ike na ọṅụ aghaghị ịbụ otu akụkụ nke ozi dị nsọ a na-ejere Chineke. E mere ka nke a doo anya mgbe ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Tikusienụ Jehova mkpu ọṅụ ike, ụwa nile. Werenụ ọṅụ fee Jehova ofufe: werenụ iti mkpu ọṅụ bịa n’ihu ya.” (Abụ Ọma 100:1, 2) Taa, ndị nke mba nile na-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, otuto ha na-enye ya dịkwa ka abụ mmeri nke ndị agha nwere mmeri. Ndị raara onwe ha nye Chineke n’ezie ‘na-ewere iti mkpu ọṅụ’ abịa n’ihu ya. N’ezie, nke ahụ dabakwara adaba n’ihi na Jehova bụ “Chineke onye obi ụtọ,” onye na-achọ ka ndị ohu ya na-enwe ọṅụ n’imezu ihe kwekọrọ ná nrara ha raara onwe ha nye ya.—1 Timoti 1:11.
Ndị Ozi Nwetara Ume Ọhụrụ
Olee otú o si ekwe omume na ịrụsi ọrụ ike n’ozi ubi adịghị eme ka ike gwụ anyị kama ọ na-eme ka anyị nwee ume ọhụrụ n’ezie? Ịrụ ọrụ Jehova dị ka nri na-enyeghachi ume nye Jizọs. O kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka M mee uche nke onye ahụ zitere m nakwa ka m rụchaa ọrụ Ya.”—Jọn 4:34.
N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme nkwusa taa na-enweta ọṅụ ka ha ‘na-ekwusa okwu ya.’ (2 Timoti 4:2) Connie, bụ́ nwanyị bụ́ Onye Kraịst nke katatụrụla ahụ, bụ́ onye na-etinye ihe karịrị awa 70 n’ọrụ nkwusa kwa ọnwa, na-ekwu, sị: “Mgbe m keresịịrị òkè n’ozi, m na-enwe afọ ojuju na obi ụtọ, ọbụna ma a sị na ike gwụrụ m ná ngwụsị ụbọchị.”
Gịnị ma ọ bụrụ na a nabataghị ozi Alaeze ahụ nke ọma? Connie gara n’ihu sị: “N’agbanyeghị ihe bụ́ mmeghachi omume ndị mmadụ, ọ dịbeghị mgbe m kwara ụta n’ihi ikere òkè n’ozi. E wezụga ịmara na m na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ, m na-agụ ya dị ka ihe na-enye ọṅụ ikwu banyere eziokwu ahụ n’ihi na ka m na-eme otú
ahụ, olileanya ahụ dị ebube nke e kwuru banyere ya na Bible na-esikwu ike n’obi m.”Ndị ọzọ na-achọpụta na inyere ndị mmadụ aka inweta ezi ihe ọmụma nke Chineke na-eme ka ndụ nke ha nwee nzube. Meloney, bụ́ nwa agbọghọ nke na-etinye ihe karịrị awa 50 kwa ọnwa n’ọrụ nkwusa ahụ, na-ekwu, sị: “Ozi ahụ na-eme ka m nwee ume ọhụrụ n’ihi na ọ na-eme ka ndụ m nwee ebe o chere ihu na nzube. Ana m echefutụ nsogbu onwe onye na nrụgide ndị a na-enwe kwa ụbọchị mgbe m keere òkè n’ozi.”
Millicent, bụ́ onye ozi ọzọ na-anụ ọkụ n’obi nke Ndịàmà Jehova, na-ekwu, sị: “Ozi a na-eme ka ụbọchị ọ bụla m ji gwa ndị ọzọ banyere nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ ma kọwaa otú a ga-esi weghachi Paradaịs n’elu ala, baa uru. Ọ na-eme ka Jehova dị adị nye m kwa ụbọchị, na-emekwa ka m nwee udo na ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke obi ụtọ bụ́ nke a na-apụghị isi n’ụzọ ọ bụla ọzọ nweta.”
Ndị Na-anabata Ya Bụ́ Ndị Na-enweta Ume Ọhụrụ
N’ezie, ozi Ndị Kraịst na-eme ka ndị nkwusa Alaeze na-enweta ume ọhụrụ, ozi ahụ na-enye ndụ na-akasikwa ndị na-anabata ya obi. Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị nọn na ndị ụkọchukwu zụrụ otu onye nkụzi nọ na Portugal, ọ dị ya ka chọọchị ya adịghị egbo mkpa ime mmụọ ya. A zabeghị ajụjụ ya ndị dabeere na Bible. Ọmụmụ Bible nke otu n’ime Ndịàmà Jehova duziiri ya n’ụzọ chiri anya mere ka o jiri nwayọọ nwayọọ na-aghọta Akwụkwọ Nsọ. Onye nkụzi ahụ nwere obi ụtọ. “Ana m adị atụsi anya ọmụmụ ihe m kwa Wednesday ike,” ka o kwuru, “ebe ọ bụ na e ji ihe àmà ndị doro anya dị na Bible na-aza ajụjụ m otu otu.” Taa, nwanyị a bụ ohu Jehova raara onwe ya nye, ya onwe ya na-ejikwa eziokwu Bible eme ka ndị ọzọ nwee ume ọhụrụ.
Mgbe ahụ, o doro anya na ịdị oké mkpa nke ọrụ nkwusa ha na otú ókèala ha bụ́ ụwa bururu n’ibu adịghị agwụ Ndịàmà Jehova ike. Ma enweghị mmasị ma mmegide adịghị akụda ha mmụọ. Ha etinyewo mgbalị siri ike iji rụzuo ọrụ nkwusa Alaeze ahụ e nyere ha. Ha na-eso ndị mmadụ ekerịta ozi ọma ahụ n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ha—n’ebe gwongworo na-akwụsị na United States (1), n’ọdụ ụgbọelu dị na Korea (2), n’Andes (3), ma ọ bụ n’ahịa dị na London (4). Ụmụazụ Jizọs nke oge a ji ọṅụ na-arụ ọrụ ha nke na-enye ụgwọ ọrụ n’ụwa nile. Dịkwa ka o kwere ná nkwa, o mewo ka ha nwee ume ọhụrụ, o jiriwokwa ha mee ka ọtụtụ ndị ọzọ nwee ume ọhụrụ.—Mkpughe 22:17.