Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova—Onye Nlereanya Kasịnụ nke Ịdị Mma

Jehova—Onye Nlereanya Kasịnụ nke Ịdị Mma

Jehova—Onye Nlereanya Kasịnụ nke Ịdị Mma

“Keleenụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, n’ihi na Jehova dị mma.”—JEREMAỊA 33:11.

1. N’ihi gịnị ka e ji akpali anyị ito Chineke maka ịdị mma ya?

JEHOVA CHINEKE dị mma n’ụzọ zuru okè. “Lee ka ịdị mma Ya si dị ukwuu!” ka Zekaraịa onye amụma kwupụtara. (Zekaraịa 9:17) N’ezie, a na-ahụ ịdị mma n’ihe nile Chineke mere iji kwadebe ụwa ka anyị wee nụ ụtọ ya. (Jenesis 1:31) Anyị agatụghị enwe ike ịghọtacha iwu ndị dị mgbagwoju anya Chineke ji mee ihe mgbe o kere eluigwe na ala. (Eklisiastis 3:11; 8:17) Ma obere nke anyị maara na-akpali anyị ito Chineke maka ịdị mma ya.

2. Ị̀ ga-esi aṅaa kọwaa ịdị mma?

2 Gịnị bụ ịdị mma? Ọ bụ omume magburu onwe ya, ma ọ bụ omume ọma. Ma, ọ pụtara ihe karịrị izere ime ihe nile dị njọ. Ịdị mma, nke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, bụ àgwà na-akpali mmadụ ime ihe ọma. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Anyị na-egosipụta ịdị mma mgbe anyị na-arụrụ ndị ọzọ ọrụ ọma na nke bara uru. N’usoro ihe a, ihe e weere dị ka ihe dị mma n’ebe ụfọdụ pụrụ ịbụ ihe a na-ele anya dị ka ihe ọjọọ n’ebe ndị ọzọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị gaje inweta udo na obi ụtọ, a ghaghị inwe otu ụkpụrụ nke ịdị mma. Ònye pụrụ isetịpụ ụkpụrụ a n’ụzọ ziri ezi?

3. Gịnị ka Jenesis 2:16, 17 na-egosi banyere ụkpụrụ nke ịdị mma?

3 Ọ bụ Chineke na-esetịpụ ụkpụrụ nke ịdị mma. Ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, Jehova bụ onye nyere nwoke mbụ ahụ iwu, sị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Ee, ọ dị ụmụ mmadụ mkpa ilegara Onye Okike ha anya maka ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.

Igosipụta Ịdị Mma nke Na-erughịrị Mmadụ

4. Gịnị ka Chineke mewooro ihe a kpọrọ mmadụ kemgbe Adam mehiere?

4 E tinyere obi ụtọ ebighị ebi n’izu okè bụ́ nke ihe a kpọrọ mmadụ na-atụ anya ya n’ihe ize ndụ mgbe Adam mehiere ma jụ ikweta na ọ bụ Chineke ka o ruuru isetịpụ ụkpụrụ nke ịdị mma. (Jenesis 3:1-6) Otú ọ dị, tupu a mụọ ụmụ Adam dị ka ndị ketara mmehie na ọnwụ, Chineke buru amụma banyere ọbịbịa nke otu Mkpụrụ zuru okè. N’ịgwa “agwọ ochie ahụ,” bụ́ Setan Ekwensu, okwu n’ezie, Jehova kwupụtara, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Mkpughe 12:9; Jenesis 3:15) Ọ bụ nzube Jehova ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. N’igosipụta ịdị mma nke na-erughịrị mmadụ, Jehova emewo ndokwa dị otú ahụ n’ezie maka ịzọpụta ndị gosipụtara okwukwe n’àjà mgbapụta nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya.—Matiu 20:28; Ndị Rom 5:8, 12.

5. Ọ bụ ezie na anyị eketawo nchepụta ọjọọ nke obi, gịnị mere anyị ji nwee ike igosipụta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị mma?

5 N’ezie, n’ihi mmehie Adam, anyị eketawo nchepụta ọjọọ nke obi. (Jenesis 8:21) Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, Jehova na-enyere anyị aka igosipụta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị mma. Ịnọgide n’ihe ndị anyị mụtara n’ihe odide ya dị nsọ ma dị oké ọnụ ahịa abụghị nanị na ọ ‘na-eme ka anyị mara ihe maka nzọpụta,’ ma bụrụ ‘ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla’ kama ọ na-emekwa ka anyị nwee ike ime ihe dị mma n’anya ya. (2 Timoti 3:14-17) Otú ọ dị, iji rite uru ná ntụziaka Akwụkwọ Nsọ na iji na-egosipụta ịdị mma, anyị aghaghị inwe àgwà ọbụ abụ ahụ nwere bụ́ onye bụrụ, sị: “Onye dị mma ka Ị [Jehova] bụ, na Onye na-eme mma; zi m ụkpụrụ gị nile.”—Abụ Ọma 119:68.

A Na-eto Ịdị Mma Jehova

6. Mgbe Eze Devid mesịrị ka e bubata igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jeruselem, ndị Livaị bụrụ abụ okwu dị aṅaa dị na ya?

6 Eze Devid nke Izrel oge ochie kwetara ịdị mma Chineke ma chọọ nduzi Ya. “Onye dị mma na onye ziri ezi ka Jehova bụ,” ka Devid kwuru. “N’ihi nke a ka Ọ na-ezi ndị mmehie ihe n’ụzọ.” (Abụ Ọma 25:8) Ntụziaka Chineke nyere ụmụ Izrel gụnyere iwu iri dị mkpa—Iwu Iri ahụ—e dere ná mbadamba nkume abụọ ma tinye n’ime igbe nsọ a kpọrọ igbe ọgbụgba ndụ. Mgbe Devid mesịrị ka e bubata Igbe ahụ n’isi obodo Izrel, bụ́ Jeruselem, ndị Livaị bụrụ abụ nke gụnyere okwu ndị a: “Keleenụ Jehova; n’ihi na Ọ dị mma: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka [ebere ịhụnanya, NW] Ya dị.” (1 Ihe E Mere 16:34, 37-41) Lee ka ọ na-aghaghị isiwo bụrụ ihe dị ụtọ ná ntị ịnụ okwu ndị ahụ n’ọnụ ndị ọbụ abụ bụ́ ndị Livaị!

7. Gịnị mere mgbe e bubasịrị Igbe ahụ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nakwa mgbe Solomọn kpesịrị ekpere nraranye?

7 E mere ka otu okwu otuto ahụ pụta ìhè n’oge nraranye nke ụlọ nsọ Jehova nke nwa Devid bụ́ Solomọn wuru. Mgbe e bubasịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọ nsọ ahụ e wuru ọhụrụ, ndị Livaị malitere ito Jehova, “n’ihi na Ọ dị mma: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka [ebere ịhụnanya, NW] Ya dị.” N’oge ahụ, igwe ojii jupụtara n’ụlọ nsọ ahụ n’ụzọ ọrụ ebube na-egosi ọnụnọ dị ebube nke Jehova. (2 Ihe E Mere 5:13, 14) Mgbe Solomọn kpesịrị ekpere nraranye, “ọkụ siri n’eluigwe rịdata, wee ripịa àjà nsure ọkụ na àjà nile.” Mgbe ha hụrụ ya, “ụmụ Izrel nile . . . wee huru ala, kpuchie ihu ha n’ala n’elu pavement, kpọọ isiala, wee kelee Jehova, sị, N’ihi na Ọ dị mma: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka [ebere ịhụnanya, NW] Ya dị.” (2 Ihe E Mere 7:1-3) Mgbe otu ememe were ụbọchị 14 gasịrị, ụmụ Izrel laghachiri n’ebe obibi ha, “na-aṅụrị ọṅụ, obi dịkwa ha mma, n’ihi ezi ihe nke Jehova meere Devid, mekwaara Solomọn, mekwaara Izrel, bụ́ ndị Ya.”—2 Ihe E Mere 7:10.

8, 9. (a) Ọ bụ ezie na ụmụ Izrel toro Jehova maka ịdị mma ya, olee ụzọ ha mesịrị gbasoo? (b) Gịnị ka e si n’ọnụ Jeremaịa buo n’amụma banyere Jeruselem, è sikwa aṅaa mezuo amụma ahụ?

8 N’ụzọ dị mwute, ụmụ Izrel anọgideghị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’abụ otuto ndị ha bụkuru Chineke. Ka oge na-aga, ndị Juda ‘weere nanị egbugbere ọnụ ha sọpụrụ Jehova.’ (Aịsaịa 29:13) Kama ikwekọ n’ụkpụrụ ịdị mma nke Chineke setịpụrụ, ha malitere ime ihe dị njọ. Gịnịkwa ka ajọ omume ha gụnyere? Leenụ, ikpe ikpere arụsị, omume rụrụ arụ, imegbu ụmụ ogbenye, na mmehie ndị ọzọ jọgburu onwe ha, mara ha! N’ihi ya, e bibiri Jeruselem ma dọrọ ndị bi na Juda n’agha laa Babilọn na 607 T.O.A.

9 Chineke si otú a dọọ ndị ya aka ná ntị. Otú ọ dị, site n’ọnụ Jeremaịa onye amụma, o buru amụma na, na Jeruselem, a ka ga-anụ olu ndị na-asị: “Keleenụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, n’ihi na Jehova dị mma, n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka [ebere ịhụnanya, NW] Ya dị.” (Jeremaịa 33:10, 11) Otú ahụ ka o mekwara. Mgbe ala ahụ tọgbọsịrị n’efu ruo afọ 70, na 537 T.O.A., ndị Juu fọdụrụnụ lọghachiri Jeruselem. (Jeremaịa 25:11; Daniel 9:1, 2) Ha wughachiri ebe ịchụàjà dị n’ebe ụlọ nsọ ahụ dị n’Ugwu Moraịa ma malite ịchụ àjà n’ebe ahụ. A tọrọ ntọala ụlọ nsọ ahụ n’afọ nke abụọ ha lọghachiri. Lee oge na-akpali akpali ọ bụ! “Ma mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọukwu Jehova,” ka Ezra kwuru, “ha wee guzo ndị nchụàjà n’uwe ha chịrị opì, na ndị Livaị, bụ́ ụmụ Esaf, chịrị ájà, ito Jehova, dị ka ụkpụrụ Devid, bụ́ eze Izrel, si dị. Ha wee zarịta onwe ha n’ito na n’ikele Jehova, sị, N’ihi na Ọ dị mma, n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka [ebere ịhụnanya, NW] Ya dị n’ebe Izrel nọ.”—Ezra 3:1-11.

10. Okwu dị aṅaa dị ịrịba ama ka Abụ Ọma nke 118 ji malite ma mechie?

10 E kwuru okwu otuto yiri nke ahụ banyere ịdị mma Jehova n’ọtụtụ abụ ọma. Otu n’ime ha bụ Abụ Ọma nke 118, bụ́ nke ezinụlọ ụmụ Izrel na-abụ iji mechie Ememe Ngabiga. Abụ ọma ahụ ji okwu ndị bụ́: “Keleenụ Jehova; n’ihi na Ọ dị mma: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka [ebere ịhụnanya, NW] Ya dị,” malite ma mechie. (Abụ Ọma 118:1, 29) Ikekwe ha bụ abụ otuto ikpeazụ Jizọs Kraịst so ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi bụọ n’abalị ahụ tupu ọnwụ ya na 33 O.A.—Matiu 26:30.

“Biko, Mee Ka M Hụ Ebube Gị”

11, 12. Mgbe Mozis hụpeere ebube Chineke, nkwupụta dị aṅaa ka ọ nụrụ?

11 Oge mbụ e jikọrọ ịdị mma Jehova na ebere ịhụnanya ya bụ ọtụtụ narị afọ tupu oge Ezra. N’oge na-adịghị anya mgbe ụmụ Izrel fesịrị nwa ehi ọlaedo ofufe n’ọzara, e gbuokwa ndị mere ihe ọjọọ ahụ, Mozis rịọrọ Jehova, sị: “Biko, mee ka m hụ ebube Gị.” N’ịmata na Mozis apụghị ịhụ ihu Ya ma dị ndụ, Jehova kwuru, sị: “Mụ onwe m ga-eme ka ịdị mma m nile gabiga n’ihu gị.”—Ọpụpụ 33:13-20.

12 Ịdị mma Jehova gabigara n’ihu Mozis n’echi ya n’Ugwu Saịnaị. N’oge ahụ, Mozis hụpeere ebube Chineke ma nụ nkwupụta a: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba [n’ebere ịhụnanya, NW] na eziokwu; Onye na-edebere [ọtụtụ puku mmadụ ebere ịhụnanya, NW], Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị; Ọ na-ewere ajọ omume nke ndị bụ́ nna leta ụmụ ha, letakwa ụmụ ụmụ, leta ụmụ ụmụ nke atọ, letakwa nke anọ.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Okwu ndị a na-egosi na e jikọrọ ịdị mma Jehova na ebere ịhụnanya ya nakwa àgwà ya ndị ọzọ. Ịtụle ha ga-enyere anyị aka igosipụta ịdị mma. Ka anyị burugodị ụzọ tụlee àgwà a kpọtụrụ aha ugboro abụọ ná nkwupụta a magburu onwe ya nke ịdị mma Chineke.

Chineke nke Na-aba Ụba n’Ebere Ịhụnanya’

13. Ná nkwupụta e mere banyere ịdị mma Chineke, olee àgwà a kpọtụrụ aha ugboro abụọ, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji daba adaba?

13 ‘Jehova bụ Chineke nke na-aba ụba n’ebere ịhụnanya; Onye na-edebere ọtụtụ puku mmadụ ebere ịhụnanya.’ Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ebere ịhụnanya” pụtakwara “ezi ịhụnanya.” Ọ bụ nanị àgwà e depụtara ugboro abụọ n’okwu Chineke gwara Mozis. Lee ka o si daba adaba, ebe àgwà bụ́ isi nke Jehova bụ ịhụnanya! (1 Jọn 4:8) Okwu ahụ a ma ama e ji enye Jehova otuto bụ́ “n’ihi na Ọ dị mma: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka [ebere ịhụnanya, NW] Ya dị,” na-eme ka àgwà a pụta ìhè.

14. Olee ndị karịsịa na-enweta ịdị mma na ebere ịhụnanya Chineke?

14 Otu ụzọ Jehova si egosipụta ịdị mma ya bụ na ọ “na-aba ụba n’ebere ịhụnanya.” Nke a na-apụta ìhè karịsịa n’ụzọ ọma o si elekọta ndị ohu ya bụ́ mmadụ ndị raara onwe ha nye ya ma na-ekwesị ntụkwasị obi. (1 Pita 5:6, 7) Dị ka Ndịàmà Jehova pụrụ ịgba akaebe ya, ọ ‘na-edebere ndị hụrụ ya na-anya ma na-ejere ya ozi ebere ịhụnanya.’ (Ọpụpụ 20:6) Mba Izrel anụ ahụ́ kwụsịrị inweta ebere ịhụnanya, ma ọ bụ ezi ịhụnanya, Jehova n’ihi na ha jụrụ Ọkpara ya. Ma ịdị mma na ezi ịhụnanya Chineke n’ebe Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi ná mba nile nọ ga-adịru mgbe ebighị ebi.—Jọn 3:36.

Jehova—Onye Nwere Obi Ebere Ma Na-eme Amara

15. (a) Okwu dị aṅaa ka nkwupụta ahụ Mozis nụrụ n’Ugwu Saịnaị ji meghee? (b) Gịnị ka ebere na-agụnye?

15 Nkwupụta ahụ Mozis nụrụ n’Ugwu Saịnaị ji okwu a malite: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara.” Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ebere” pụrụ izo aka ‘n’eriri afọ,’ e jikọkwara ya na okwu e ji eme ihe maka “akpa nwa,” n’ụzọ chiri anya. Ya mere, ebere na-agụnye mmetụta ọmịiko nke si n’ala ala obi mmadụ. Ma ebere na-agụnye ihe karịrị ezigbo ọmịiko. O kwesịrị ịkwali anyị ime ihe iji belata nhụjuanya nke ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ahụ n’anya na-ahụ mkpa ọ dị inwe obi ebere n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha nọ, ‘na-eji obi ụtọ eme ebere’ mgbe nke a kwesịrị ekwesị.—Ndị Rom 12:8; Jems 2:13; Jud 22, 23.

16. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jehova na-eme amara?

16 Chineke na-egosipụtakwa ịdị mma ya site n’ime amara. Onye na-eme amara bụ “onye a maara nke ọma dị ka onye na-echebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche” ma na-egosipụta ‘obiọma na-adọrọ adọrọ karịsịa n’ebe ndị ọ ka elu nọ.’ Jehova setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma n’ime amara n’otú o si emeso ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi ihe. Dị ka ihe atụ, site n’aka ndị mmụọ ozi, Chineke ji amara wusikwuo agadi nwoke bụ́ Daniel onye amụma ike, meekwa ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Meri mara banyere ihe ùgwù ọ gaje inwe nke bụ́ ịmụ Jizọs. (Daniel 10:19; Luk 1:26-38) Dị ka ndị Jehova, anyị na-enwe ekele n’ezie banyere ụzọ amara o si arịọ anyị arịrịọ site n’ihe ndị e dere na Bible. Anyị na-eto ya maka ụzọ a o si egosipụta ịdị mma ya ma na-achọ igosipụta amara n’otú anyị si emeso ndị ọzọ ihe. Mgbe ndị mmụọ nsọ na-achị na-eme ka onye kwere ekwe ibe ha guzozie “na mmụọ nke ịdị nwayọọ,” ha na-agbalị ịbụ ndị dị nwayọọ na ndị na-eme amara.—Ndị Galeshia 6:1.

Chineke nke Na-adịghị Ewe Iwe Ọsọ Ọsọ

17. N’ihi gịnị ka anyị ji enwe ekele na Jehova ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ’?

17 “Chineke . . . na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.” Okwu ndị ahụ na-emesi ike ụzọ ọzọ Jehova si egosipụta ịdị mma ya. Jehova ji ndidi anagide mmehie anyị ma na-enye anyị oge iji merie adịghị ike ndị dị oké njọ ma nwee ọganihu ime mmụọ. (Ndị Hibru 5:12–6:3; Jems 5:14, 15) Ndidi Chineke na-abakwara ndị na-aghọbeghị ndị na-efe ya ofufe uru. Ha ka nwere oge ịnabata ozi Alaeze ahụ ma chegharịa. (Ndị Rom 2:4) Otú ọ dị, ọ bụ ezie na Jehova na-enwe ndidi, ịdị mma ya na-akpali ya mgbe ụfọdụ igosipụta iwe ya, dị ka o mere mgbe ụmụ Izrel fere nwa ehi ọlaedo ofufe n’Ugwu Saịnaị. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-egosipụta iwe ya ọbụna n’ụzọ ka ukwuu mgbe ọ ga-eweta ajọ usoro ihe Setan ná njedebe.—Ezikiel 38:19, 21-23.

18. A bịa n’ihe banyere eziokwu, olee ọdịiche e nwere n’etiti Jehova na ndị ndú bụ́ mmadụ?

18 ‘Jehova bụ Chineke nke na-aba ụba n’eziokwu.’ Lee ka Jehova si dị iche n’ebe ndị ndú bụ́ mmadụ nọ, bụ́ ndị na-ekwe nkwa dị ukwuu ma hapụzie imezu ha! N’ụzọ dị iche, ndị na-efe Jehova ofufe pụrụ ịdabere n’ihe nile e kwuru n’Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ. Ebe ọ bụ na Chineke na-aba ụba n’eziokwu, anyị pụrụ ịtụkwasị obi ná nkwa ya mgbe nile. N’ịdị mma ya, Nna anyị nke eluigwe adịghị ada ada n’ịza ekpere anyị na-ekpe maka eziokwu ime mmụọ site n’inye anyị ya n’ụba.—Abụ Ọma 43:3; 65:2.

19. Olee ụzọ pụtara ìhè Jehova siworo gosipụta ịdị mma ya n’ebe ndị mmehie nwere nchegharị nọ?

19 “Jehova [bụ] Chineke . . . na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie.” N’ịdị mma ya, Jehova dị njikere ịgbaghara ndị mmehie nwere nchegharị. N’ezie, anyị na-enwe ekele na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya emewo ndokwa maka mgbaghara site n’àjà Jizọs. (1 Jọn 2:1, 2) N’ezie, obi dị anyị ụtọ na ndị nile na-egosipụta okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ nwere ike iso Jehova na-enwe mmekọrịta dị mma, na-enwe olileanya nke ndụ na-enweghị ọgwụgwụ n’ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa. Lee ka ha si bụrụ ihe ndị pụtara ìhè mere a ga-eji na-eto Jehova maka igosipụta ịdị mma ya n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ!—2 Pita 3:13.

20. Ihe àmà dị aṅaa ka anyị nwere na Chineke adịghị akwado ihe ọjọọ?

20 “Ọ dịghị ụzọ ọ bụla [Jehova] ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” N’ezie nke a bụ ihe ọzọ mere a ga-eji na-eto Jehova maka ịdị mma ya. N’ihi gịnị? N’ihi na otu akụkụ dị oké mkpa nke ịdị mma bụ na ọ dịghị akwado ihe ọjọọ n’ụzọ ọ bụla. Ọzọkwa, “ná mkpughe nke Onyenwe anyị Jizọs site n’eluigwe ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike,” a ga-abọ ọbọ “n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma” ahụ. Ha “ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke mbibi ebighị ebi.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9) Ndị na-efe Jehova ga-alanarịnụ ga-enwezi ike ịnụ ụtọ ndụ n’ụzọ zuru ezu n’abụghị ndị mmadụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, bụ́ “ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe,” na-enye nsogbu.—2 Timoti 3:1-3.

Ṅomie Ịdị Mma Jehova

21. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-egosipụta ịdị mma?

21 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-eto ma na-ekele Jehova maka ịdị mma ya. Dị ka ndị ohu ya, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime ike anyị nile n’igosipụta àgwà a? Ee, n’ihi na Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) Nna anyị nke eluigwe na-egosipụta ịdị mma mgbe nile, otú ahụ ka anyị kwesịkwara ime.

22. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

22 Ọ bụrụ na anyị ji obi anyị dum rara onwe anyị nye Jehova, ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị ga-achọsi ike iṅomi ịdị mma ya. Ebe ọ bụ na anyị bụ ụmụ Adam nke mehierenụ, ọ naghị adịrị anyị mfe ime ihe ziri ezi. Otú ọ dị, n’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ ihe mere o ji ekwe anyị omume igosipụta ịdị mma. Anyị ga-atụlekwa ụzọ dị iche iche anyị pụrụ ma kwesị isi na-eṅomi Jehova—onye nlereanya kasịnụ nke ịdị mma.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị bụ ịdị mma?

• Okwu dị aṅaa dị n’Akwụkwọ Nsọ na-eme ka ịdị mma Chineke pụta ìhè?

• Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si egosipụta ịdị mma ya?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iṅomi ihe nlereanya nke ịdị mma Jehova setịpụrụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 12]

Jehova dọrọ ndị ya nke oge ochie aka ná ntị n’ihi na ha ebighị ndụ kwekọrọ n’okwu otuto ha kwuru

[Foto dị na peeji nke 12]

Ihe fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi laghachiri Jeruselem

[Foto dị na peeji nke 13]

Mozis nụrụ nkwupụta magburu onwe ya nke ịdị mma Chineke

[Foto dị na peeji nke 15]

A na-ahụ ịdị mma Jehova n’ụzọ o si arịọ anyị arịrịọ site n’ihe ndị e dere na Bible