Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tụkwasị Obi na Jehova Chi nke Bụ́ Ezigbo Ya

Tụkwasị Obi na Jehova Chi nke Bụ́ Ezigbo Ya

Tụkwasị Obi na Jehova Chi nke Bụ́ Ezigbo Ya

Ì letụwo anya n’ihu igwe nke gbachapụrụ agbachapụ n’abalị ma hụ ọtụtụ narị kpakpando? Ị̀ ga-esi aṅaa akọwa otú ha si bịa dịrị?

N’OTU abalị dara jụụ, kpakpando ndị a gwara Eze Devid nke Israel oge ochie okwu, na-akpali ya ide, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi.” (Abụ Ọma 19:1) Ee, ọ bụ Onye Okike ọ bụghị ihe e kere eke kwesịrị “ịnata otuto na nsọpụrụ na ike.”—Mkpughe 4:11; Ndị Rom 1:25.

“Onye wuru ihe nile bụ Chineke,” ka Bible na-ekwu. (Ndị Hibru 3:4) N’ezie, ezi Chineke ahụ, ‘Onye aha ya bụ Jehova, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.’ (Abụ Ọma 83:18) Ọ bụghịkwa echiche efu—onyinyo. Jizọs Kraịst kwuru banyere Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, sị: “Onye zitere m dị adị n’ezie.”—Jọn 7:28.

Jehova—Onye Na-emezu Nzube Ya

Aha pụrụ iche nke Chineke, bụ́ Jehova, pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nanị. Aha ahụ kpọmkwem na-ezo aka n’eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ ezigbo Chi. Aha Chineke pụtara n’ụzọ nkịtị “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Jehova Chineke si otú a na-akọwa onwe ya dị ka Onye Na-emezu nzube ya. Mgbe Mozis jụrụ Chineke aha ya, Jehova si otú a kọwaa ihe ọ pụtara n’ụzọ sara mbara, sị: “Aga m aghọ ihe m ga-aghọ.” (Ọpụpụ 3:14, NW) Nsụgharị nke Rotherham kapịrị ya ọnụ, sị: “Aga m Aghọ ihe ọ bụla masịrị m.” Jehova na-aghọ, ma ọ bụ na-ahọrọ ịghọ, ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nzube na nkwa ya ziri ezi. N’ihi ya, o nwere ọtụtụ ọmarịcha utu aha ndị dị ka, Onye Okike, Nna, Eze Onyenwe Anyị, Onye Ọzụzụ Atụrụ, Jehova nke usuu nile nke ndị agha, Onye Na-anụ ekpere, Onyeikpe, Onye Nkụzi Ukwu, Onye Mgbapụta.—Ndị Ikpe 11:27; Abụ Ọma 23:1; 65:2; 73:28; 89:26; Aịsaịa 8:13; 30:20, NW; 40:28; 41:14.

Ọ bụ nanị ezi Chineke pụrụ izi ezi ịza aha ahụ bụ́ Jehova, n’ihi na ụmụ mmadụ apụghị ijide n’aka ma ọlị na atụmatụ ha ga-aga nke ọma. (Jems 4:13, 14) Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ịsị: “Dị ka oké mmiri ozuzo na snow si esi n’eluigwe ezo, ma ọ bụghị n’ebe ahụ ka ọ na-alaghachi, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ desịa ala, wee mee ka o mee ihe omume, ka o puokwa ihe opupu; o wee were mkpụrụ nye ọgha mkpụrụ, werekwa nri nye onye na-eri ihe; otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:10, 11.

Jehova na-emezu nzube ya n’ụzọ na-adịghị agha agha nke na ọbụna ihe pụrụ iyi ka ọ dịghị adị n’anya mmadụ dị adị n’anya ya. Ogologo oge ka Ebreham, Aịzik, na Jekọb nwụsịrị, Jizọs kpọtụrụ ha aha ma sị: “Ọ [Jehova] bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama Ọ bụ nke ndị dị ndụ: n’ihi na ọ bụ n’ebe Ọ nọ ka mmadụ nile dị ndụ.” (Luk 20:37, 38) Ndị nna ochie atọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi anwụọla, ma nzube Chineke ịkpọlite ha n’ọnwụ bụ nnọọ ihe e ji n’aka na ọ ga-emezu nke na nye ya, ọ dị nnọọ ka ha dị ndụ. Ime ka ndị ohu ya a kwesịrị ntụkwasị obi dịghachi ndụ agaghị esiri Jehova ike dị ka ọ na-esighịrị ya ike isi n’ájá nke ala kee nwoke mbụ ahụ.—Jenesis 2:7.

Pọl onyeozi na-enye ihe atụ ọzọ nke eziokwu ahụ bụ́ na Chineke na-eme ka nzube ya mezuo. N’Akwụkwọ Nsọ, a kpọrọ Ebreham “nna nke ọtụtụ mba.” (Ndị Rom 4:16, 17) Mgbe Ebram aka-amụbeghị nwa, Jehova gbanwere aha ya ịbụ Ebreham, nke pụtara “Nna nke Ìgwè Mmadụ.” Jehova mere ka ihe aha ahụ pụtara mezuo site n’iji ụzọ ọrụ ebube weghachi ikike ịmụ nwa nke Ebreham kaworo nká na nwunye ya meworo agadi bụ́ Sera.—Ndị Hibru 11:11, 12.

N’ịbụ onye e nyere ike na ikike dị ukwuu, Jizọs Kraịst kwuru ihe ndị ga-eme eme dị ka onye ka mmadụ elu si ele ihe anya. Ọ bụ ezie na ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs anwụwo, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lazarọs enyi anyị agawo izu ike, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya n’ụra.” (Jọn 11:11) N’ihi gịnị ka Jizọs ji kwuo na onye nwụrụ anwụ na-ehi nanị ụra?

Mgbe Jizọs ruru n’obodo Lazarọs bụ́ Betani, ọ gara n’ili ya ma nye ntụziaka ka e bupụ nkume e ji mechie ọnụ ya. Mgbe o kpesịrị ekpere n’olu dara ụda, o nyere iwu sị: “Lazarọs, pụta!” Ka ndị nọ n’ebe ahụ legidekwara anya n’ili ahụ, “nwoke ahụ nwụworo anwụ pụtara buru ákwà e kere ya n’ụkwụ na n’aka, e kekwara ya ákwà n’ihu.” Jizọs kwuziri, sị: “Tọpụnụ ya ma hapụ ya ka ọ laa.” (Jọn 11:43, 44) Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ—na-eme ka nwoke nwụworo anwụ ruo ụbọchị anọ dịghachi ndụ! Kraịst ekwughị ihe na-abụghị eziokwu mgbe ọ sịrị na enyi ya na-ehi ụra. N’anya Jehova na Jizọs, Lazarọs nwụworo anwụ dị ka ọ bụ nanị ụra ka ọ na-ehi. Ee, Jizọs na Nna ya nke eluigwe na-etinye uche ha n’ihe ndị ga-eme eme.

Jehova Pụrụ Imezu Olileanya Anyị

Lee ọdịiche dị n’etiti arụsị ndị na-eduhie eduhie na Chi ahụ nke bụ́ ezigbo ya! Ndị na-efe arụsị na-ekwu n’ụzọ na-ezighị ezi na ihe ndị ha na-efe ofufe nwere ike karịrị nke mmadụ. Otú ọ dị, nsọpụrụ ofufe a apụghị ime ka arụsị ndị a nwee ikike nke ịrụ ọrụ ebube. N’aka nke ọzọ, Jehova Chineke pụrụ izi ezi n’ikwu banyere ndị ohu ya nwụworo eri oge dị anya dị ka a ga-asị na ha dị ndụ n’ihi na o nwere ike ime ka ha dịghachi ndụ. “Jehova bụ Chineke n’eziokwu,” ọ naghịkwa eduhie ndị ya ma ọlị.—Jeremaịa 10:10.

Lee ihe na-akasi obi ọ bụ ịmara na n’oge nke Jehova, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ nọ ná ncheta ya n’ọnwụ—mee ka ha dịghachi ndụ! (Ọrụ 24:15) Ee, mbilite n’ọnwụ na-agụnye ime ka onye ahụ nweghachi ụdị ndụ o biburu. Icheta ụdị ndụ ndị ahụ nwụrụ anwụ biburu na inyeghachi ha ya abụghịrị Onye Okike nsogbu, bụ́ onye amamihe na ike ya na-enweghị nsọtụ. (Job 12:13; Aịsaịa 40:26) Ebe ọ bụ na Jehova nwere ịhụnanya dị ukwuu, ọ ga-eji ikike ncheta ya zuru okè mee ihe iji mee ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ n’elu ala paradaịs, na-abụ ụdị mmadụ ha bụ tupu ha anwụọ.—1 Jọn 4:8.

Ka ọgwụgwụ nke ụwa Setan na-eru nso, ndị na-atụkwasị ezi Chineke ahụ obi nwere ọdịnihu dị mma n’ezie. (Ilu 2:21, 22; Daniel 2:44; 1 Jọn 5:19) Ọbụ abụ ahụ na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: . . . ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:10, 11) Mpụ na ime ihe ike ga-abụ ihe mgbe ochie. Ikpe ziri ezi ga-adị ebe nile, ihe isi ike akụ̀ na ụba ga-agabiga. (Abụ Ọma 37:6; 72:12, 13; Aịsaịa 65:21-23) A ga-ekpochapụ ịkpa ókè nile nke ọkwá, agbụrụ, na nke ebo, kpam kpam. (Ọrụ 10:34, 35) Agha na ngwá agha agaghị adịkwa ọzọ. (Abụ Ọma 46:9) N’oge ahụ, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Mmadụ nile ga-enwe ezi ahụ ike zuru okè. (Mkpughe 21:3, 4) Paradaịs elu ala ga-abụ ihe dị adị n’isi nso. Jehova ezubewo na ọ ga-adị!

Ee, a gaje imezu olileanya nile dabeere na Bible n’isi nso. Gịnị mere anyị ga-eji kwere ka e jiri ihe ndị a na-efe ka chi n’ụwa a duhie anyị mgbe anyị pụrụ inwe obi ike n’ebe Jehova nọ? Ọ na-achọ ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:3, 4) Kama itinye oge na ike anyị n’echiche efu, ma ọ bụ onyinyo dị iche iche, nke usoro ihe a na chi ya dị iche iche, ka anyị na-eto eto n’ihe ọmụma nke Chi ahụ nke dị adị ma na-atụkwasị ya obi anyị nile.—Ilu 3:1-6; Jọn 17:3.

[Foto dị na peeji nke 6]

N’anya Jehova na Jizọs, Lazarọs na-ehi nanị ụra

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Paradaịs elu ala ga-abụ ihe dị adị n’isi nso