Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị ka okwu ahụ dị ná Ndị Hibru 12:4 bụ́: “Unu anọgidebeghị na ya ruo n’ọbara,” pụtara?
Nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ ‘nọgidere na ya ruo n’ọbara’ pụtara ịnọgide na mgba gị ruo n’ókè nke ịnwụ, ịnwụ n’ụzọ nkịtị.
Pọl onyeozi maara na ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ‘atachiwo obi n’oké ịgba mgba n’ime ahụhụ’ n’ihi okwukwe ha. (Ndị Hibru 10:32, 33) Mgbe Pọl na-ekwu nke ahụ, o yiri ka o ji okwu ya na ndọga a na-adọga n’asọmpi egwuregwu Gris yiri mee ihe, bụ́ nke pụrụ ịgụnye ịgba ọsọ, ịgba mgba, iti ọkpọ, na ịtụ discus na ubè. N’ihi ya, ná Ndị Hibru 12:1, ọ gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ka anyị yipụkwa ihe ọ bụla dị arọ na mmehie ahụ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe, ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ nke e setịpụrụ n’ihu anyị.”
A gafechaa amaokwu atọ, ná Ndị Hibru 12:4, ọ pụrụ ịbụwo na Pọl hapụrụ ihe atụ nke ịgba ọsọ ma na-ekwuzi banyere nke asọmpi iti ọkpọ. (A kpọtụrụ egwuregwu abụọ ahụ aha ná 1 Ndị Kọrint 9:26.) Ndị na-eti ọkpọ n’oge ochie na-eji eriri e ji akpụkpọ anụ mee ekechi aka. Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na e ji “opu, ígwè, ma ọ bụ ọla kpaa eriri ndị ahụ, bụ́ nke na-emerụ ndị ahụ na-eti ọkpọ ahụ́ nke ukwuu.” Asọmpi ndị dị otú ahụ jọgburu onwe ha na-akpata ọbara ịgba mmadụ, ọbụna ọnwụ mgbe ụfọdụ.
Ka o sina dị, Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nwere ihe nlereanya zuru ezu nke ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi a kpagburu ma mekpọọ ọnụ, ọbụna ruo n’ókè nke ha ịnwụ, “ruo n’ọbara.” Rịba ama ihe Pọl na-ekwu n’ebe ọ nọ dọrọ uche gaa n’ahụhụ ndị oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi tara:
“A tụrụ ha nkume, a nwara ha ọnwụnwa, a kwọbiri ha akwọbi, ha nwụrụ site n’ịbụ ndị e ji mma agha gbuo, ha yi akpụkpọ atụrụ na akpụkpọ ewu gagharịa, ka ha nọ n’ụkọ, ná mkpagbu, n’ọnọdụ mmeso ọjọọ.” Mgbe e mesịrị, Pọl dọọrọ uche gaa n’ebe Onye Mmezu nke okwukwe anyị, bụ́ Jizọs, nọ, sị: “O diri osisi ịta ahụhụ, na-eleda ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.”—Ndị Hibru 11:37; 12:2.
Ee, ọtụtụ ndị ‘anọgidewo na ya ruo n’ọbara,’ ya bụ, ruo n’ókè nke ịnwụ. Nke ha karịrị ọgụ a na-alụso mmehie na enweghị okwukwe. Ha guzosiri ike n’ihe mgbe e merụrụ ha ahụ́ n’ụzọ nkịtị, na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.
Ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ dị na Jeruselem, ikekwe n’ihi ịghọ Ndị Kraịst mgbe mkpagbu obi ọjọọ ahụ gasịrị, enwetaghị ule ndị dị otú ahụ jọgburu onwe ha ma ọlị. (Ọrụ 7:54-60; 12:1, 2; Ndị Hibru 13:7) N’agbanyeghị nke ahụ, ọbụna ọnwụnwa ndị na-esichaghị ike na-eme ka ụfọdụ n’ime ha daa mbà ịga n’ihu n’ọgụ ahụ; ‘ike na-agwụ ha, ha na-adakwa mbà ná mkpụrụ obi ha.’ (Ndị Hibru 12:3) Ọ dị ha mkpa inwe ọganihu ruo ntozu okè. Nke ahụ ga-ewulite ikike ha nwere ịtachi obi n’ihe ọ bụla pụrụ ịdapụta, ọbụna ma a sị na nke ahụ gụnyere mmerụ ahụ́ nkịtị ruo n’ókè nke ịnwụ.—Ndị Hibru 6:1; 12:7-11.
Ọtụtụ Ndị Kraịst n’oge a ‘anọgidewo na ya ruo n’ọbara,’ na-abụ ndị a gbagburu n’ihi na ha agaghị ahapụ Iso Ụzọ Kraịst. Kama ikwe ka ihe ndị Pọl kwuru ná Ndị Hibru 12:4 bụrụ ihe na-akpatara anyị ụjọ, anyị pụrụ iwere ha dị ka ihe na-egosi ókè anyị kpebiri iru iji nọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke. Ka e mesịrị n’otu akwụkwọ ozi ahụ o degaara ndị Hibru, Pọl dere, sị: “Ka anyị nọgide na-enwe obiọma na-erughịrị mmadụ, bụ́ nke anyị ga-esite na ya wee na-ejere Chineke ozi dị nsọ n’ụzọ ọ na-anara nke ọma, site n’egwu Chineke na ụjọ.”—Ndị Hibru 12:28.