E Bibie Otu Ụwa!
E Bibie Otu Ụwa!
Legharịa anya n’ụwa gbara gị gburugburu, tinyere obodo ukwu ya, ọdịbendị ya, ihe ndị ọ rụpụtara na nkà mmụta sayensị, na ọtụtụ ijeri mmadụ bi na ya. Ọ dị mfe ịbụ onye ọdịdị ya yiri nke na-adịgide adịgide masịrị, ọ́ bụghị ya? Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche na otu ụbọchị ụwa a nwere ike ịpụ n’anya kpam kpam? Ọ pụrụ isi ike ichetụ nke ahụ n’echiche. Otú ọ dị, ị̀ maara na, dị ka otu akwụkwọ a pụrụ ịtụkwasị nnọọ obi si kwuo, ọ dị ụwa dịrị tupu nke a nakwa na e bibiri ya kpam kpam?
ANYỊ adịghị ekwu banyere ụwa nke agbụrụ ndị ime ọhịa mejupụtara. Ụwa nke lara n’iyi mepere anya, nwee obodo ukwu, rụpụta ihe n’ọrụ nkà, nweekwa ihe ọmụma sayensị. Ma, ihe ndekọ Bible na-agwa anyị na, na mberede, n’ụbọchị 17 n’ọnwa nke abụọ, n’afọ 352 tupu a mụọ nna ochie bụ́ Ebreham, oké iju mmiri malitere bụ́ nke kpochapụrụ otu ụwa. *
Ihe ndekọ ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Ihe dị otú ahụ ò mere n’ezie? È nwere n’ezie ụwa oge ochie nke dịrị tupu nke a dị ugbu a, nke mepere anya, e mesịakwa bibie ya? Ọ bụrụ na e nwere, gịnị mere e ji bibie ya? Olee nsogbu o nwere? Ọ̀ dị ihe ọ bụla anyị pụrụ ịmụta site ná mbibi e bibiri ya?
È Bibiri Ụwa Oge Ochie n’Ezie?
Ọ bụrụ na ọdachi dị otú ahụ dị egwu mere eme n’ezie, a gatụghị echefuwo ya kpam kpam. Ọ bụ ya mere na, n’ọtụtụ mba, e nwere ihe ndị na-echetara anyị mbibi ahụ. Dị ka ihe atụ, tụlee akara ụbọchị a kapịrị ọnụ e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. Ọnwa nke abụọ nke kalenda oge ochie na-amalite n’ihe anyị na-akpọzi etiti October ruo etiti November. Ya mere, ụbọchị nke 17 na-amanye n’ihe dị ka ụbọchị mbụ nke November. Mgbe ahụ, ọ pụghị ịbụ ihe ndabakọ na n’ọtụtụ ala, a na-eme ememe e ji echeta ndị nwụrụ anwụ n’oge dị otú ahụ n’afọ.
A na-ahụ ihe ndị ọzọ na-agba akaebe nye Iju Mmiri ahụ n’ọdịnala dị iche iche nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile biri ndụ n’oge ochie nwere akụkọ mgbe ochie na-akọ na ndị nna nna ha lanahụrụ iju mmiri zuru ụwa ọnụ. Ndị Akakpọ nke Africa, ndị Celt nke Europe, ndị Inca nke Ebe Ndịda America—nwechara akụkọ mgbe ochie ndị yiri nke ahụ, dịkwa ka ndị Alaska, Australia, China, India, Lithuania, Mexico, Micronesia, New Zealand, na akụkụ ụfọdụ nke Ebe Ugwu America nwere, iji hota nanị mba ole na ole.
N’ezie, ka oge na-aga, e tinyere nnu na ose n’akụkọ mgbe ochie ndị ahụ, ma ha nile na-enye ọtụtụ nkọwa na-egosi na ha na-akọ otu ihe: Ajọ omume nke ihe a kpọrọ mmadụ kpasuru Chineke iwe. O wetara oké iju mmiri. E bibiri ihe nile a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, e chebere mmadụ ole na ole bụ́ ndị ezi omume. Ha wuru ụgbọ e ji chebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ. Ka oge na-aga, e zipụrụ ụmụ nnụnụ ịga chọọ ala akọrọ. N’ikpeazụ, ụgbọ ahụ bịara tọgbọrọ n’elu otu ugwu. Mgbe ndị ahụ lanahụrụnụ si n’ụgbọ ahụ pụta, ha chụrụ àjà.
Gịnị ka nke a na-egosi? O kweghị omume na myirịta ahụ ga-abụ ihe ndabakọ. Akaebe nile akụkọ mgbe ochie ndị a na-agba na-akwado ihe àmà oge ochie ahụ Bible nyere bụ́ na mmadụ nile sitere n’eriri nke ndị ahụ lanahụrụ iju mmiri nke bibiri ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ihi ya, ọ dịghị anyị mkpa ịdabere n’akụkọ mgbe ochie iji mara ihe merenụ. Anyị nwere ihe ndekọ e chekwara nke ọma banyere ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke Bible.—Jenesis, isi 6 ruo 8.
Bible nwere ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ banyere akụkọ ihe mere eme bụ́ nke malitere laa azụ n’oge ndụ malitere. Otú ọ dị, ihe àmà na-egosi na ihe dị na ya karịrị akụkọ ihe mere eme nkịtị. Amụma ya ndị na-adịghị agha agha na amamihe ya dị omimi na-egosi na ọ bụ ihe ọ na-azọrọ na ọ bụ—ihe ọmụma Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ. N’adịghị ka akụkọ ifo, n’ụzọ zuru ezu, Bible na-ekwu aha na akara ụbọchị nakwa usoro ọmụmụ na ebe ihe nọ mee. Ọ na-egosi anyị ihe ndụ dị ka ya tupu Iju Mmiri ahụ ma na-ekpughe ihe mere otu ụwa ji bịa ná njedebe na mberede.
Olee nsogbu ọha mmadụ ahụ biri ndụ tupu Iju Mmiri ahụ nwere? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ahụ. Ọ bụ ajụjụ dị mkpa nye ndị pụrụ iche n’echiche otú ọdịnihu nke ụwa anyị nọ na ya ugbu a dịruru ná nchebe.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
[Chaatị dị na peeji nke 4]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Akụkọ Mgbe Ochie Ndị A Na-akọ Banyere Iju Mmiri Gburugburu Ụwa
Mba Nkwekọ 1 2 3 4 5 6 7 8 9 10
Gris 7 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
Rom 6 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
Lithuania 6 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
Asiria 9 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
Tanzania 7 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
India - Hindu 6 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
New Zealand - Maori 5 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
Micronesia 7 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
Washington U.S.A. - Yakima 7 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
Mississippi U.S.A. - Choctaw 7 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
Mexico - Michoacan 5 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
Ebe Ndịda America - Quechua 4 ◆ ◆ ◆ ◆
Bolivia - Chiriguano 5 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
Guyana - Arawak 6 ◆ ◆ ◆ ◆ ◆ ◆
1: Ajọ omume kpasuru Chineke iwe
2: Mbibi site n’Iju Mmiri
3: Nke Chineke nyere n’iwu
4: E nyere ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke
5: Mmadụ ole na ole n’ime ihe a kpọrọ mmadụ lanahụrụ
6: E ji ụgbọ chebe ha
7: E chebere ụmụ anụmanụ
8: E zipụrụ nnụnụ ma ọ bụ ihe ọzọ e kere eke
9: O mesịrị tọgbọrọ n’elu otu ugwu
10: A chụrụ àjà