Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ụwa Oge Ochie ahụ Ji Laa n’Iyi?

Gịnị Mere Ụwa Oge Ochie ahụ Ji Laa n’Iyi?

Gịnị Mere Ụwa Oge Ochie ahụ Ji Laa n’Iyi?

IJU Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ abụghị ọdachi meere onwe ya. Ọ bụ ikpe sitere n’aka Chineke. E nyere ịdọ aka ná ntị, ma ihe ka ọtụtụ leghaara ya anya. N’ihi gịnị? Jizọs kọwara, sị: “N’ụbọchị ndị bu iju mmiri ahụ ụzọ, [ndị mmadụ nọ] na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.”—Matiu 24:38, 39.

Ụwa nke Mepere Anya

N’akụkụ ụfọdụ, ụwa ahụ dịrị tupu Iju Mmiri ahụ ritere uru ndị anyị na-adịghị erite taa. Dị ka ihe atụ, ihe nile a kpọrọ mmadụ sụrụ otu asụsụ. (Jenesis 11:1) Nke a gaara emewo ka a rụpụta ihe dị ukwuu na nkà nakwa na sayensị bụ́ ndị chọrọ mgbalị ọtụtụ ndị nwere nkà dịgasị iche iche gbakọrọ aka mee. Ọzọkwa, ogologo ndụ ihe ka ọtụtụ biri n’oge ahụ pụtara na ha pụrụ ịnọgide na-amụta ihe ruo ọtụtụ narị afọ.

Ụfọdụ na-azọrọ na afọ ndụ ụmụ mmadụ adịghị nnọọ ogologo n’ezie n’oge ahụ nakwa na afọ ndị ahụ e kwuru okwu ha n’ihe ndekọ Bible bụ ọnwa n’ezie. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Ọ dị mma, tụlee ihe banyere Mahalalel. Bible na-ekwu, sị: “Mahalalel dị ndụ [afọ iri isii na ise], ọ mụọ Jered: . . . ụbọchị nile nke Mahalalel wee bụrụ [narị afọ asatọ na iri itoolu na ise]: o wee nwụọ.” (Jenesis 5:15-17) Ọ bụrụ na otu afọ pụtara otu ọnwa, Mahalalel mụrụ nwa ya nwoke mgbe ọ dị nanị afọ ise! Ee e, ndị mmadụ n’oge ahụ nwetụrụ ike ndụ zuru okè nke nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam. Ha biri ndụ n’ezie ruo ọtụtụ narị afọ. Gịnị ka ha rụpụtara?

Ọtụtụ narị afọ tupu Iju Mmiri ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa mụbara ruo n’ókè nke na diọkpara Adam bụ́ Ken wuru otu obodo, bụ́ nke ọ kpọrọ Inọk. (Jenesis 4:17) N’oge bu Iju Mmiri ahụ ụzọ, e mepere ọtụtụ ụlọ ọrụ. E nwere ụlọ ọrụ maka “ihe ọrụ nile ọ bụla nke ọla na nke ígwè.” (Jenesis 4:22) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na e ji ngwá ọrụ ndị a mee ihe n’iwu ihe, ịkwa nkà, ịkwa ákwà, nakwa n’ọrụ ubi. E zoro aka n’ọrụ ndị a n’ihe ndekọ nke mmadụ ndị mbụ biri ndụ n’ụwa.

Ihe ọmụma hiri nne ga-emewo ka ọgbọ ndị sochirinụ nwee ike ịzụlite nkà ndị dị ka ịkpụ ụzụ́, nkà mmụta mkpụrụ akụkụ na ala, ịzụ atụrụ na ehi, ide ihe, na ịkụ egwú. Dị ka ihe atụ, Jubal bụ “nna ndị nile na-akpọ ụbọ akwara, na-egbu ọ̀jà.” (Jenesis 4:21) Ụwa mepere nnọọ anya. Ma, ihe nile bịara ná njedebe na mberede. Gịnị mere?

Gịnị Gahiere?

N’ihe nile dị mma o nwere, ọha mmadụ nke dịrị ndụ tupu Iju Mmiri ahụ nwere mmalite dị njọ. Onye malitere ya, bụ́ Adam, bụ onye nupụụrụ Chineke isi. Ken, bụ́ onye wuru obodo mbụ e dekọrọ edekọ, gburu nwanne ya nwoke. Ka a sịkwa ihe mere ihe ọjọọ ji mụbaa ngwa ngwa! Ihe ndị si ná ntụpọ Adam hapụụrụ ụmụ ya pụta nọgidere na-amụba.—Ndị Rom 5:12.

Ihe àmà na-egosi na ọnọdụ ihe nọ na-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu mgbe Jehova kpebiri na ya ga-ahapụ ọnọdụ ahụ ka ọ dịgide ruo nanị afọ 120 ọzọ. (Jenesis 6:3) Bible na-ekwu, sị: “Ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, . . . nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile. . . . Ụwa jupụtakwara n’ihe ike.”—Jenesis 6:5, 11.

Ka oge na-aga, a gwara Noa hoo haa na Chineke ga-eji iju mmiri bibie anụ ahụ́ nile. (Jenesis 6:13, 17) Ọ bụ ezie na Noa ghọrọ “onye na-ekwusa ezi omume,” ihe àmà na-egosi na o siiri ndị mmadụ ike ikweta na ihe nile gbara ha gburugburu na-aga ịgwụsị. (2 Pita 2:5) Ọ bụ nanị mmadụ asatọ ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ ma bụrụ ndị a zọpụtara. (1 Pita 3:20) N’ihi gịnị ka nke a ji dị anyị mkpa taa?

Uru Dị Aṅaa Ka Ọ Baara Anyị?

Anyị bi n’oge yiri nke Noa. Anyị na-anụkarị banyere ihe ndị na-akpata nkụja nke ndị na-eyi ọha egwu mere, mgbukpọ nke agbụrụ, ịgbagbu ìgwè mmadụ n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya, na ime ihe ike n’ebe obibi, n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Ụwa ejupụtakwala ọzọ n’ihe ike, dịkwa ka ọ dị n’oge mbụ, e meela ka ụwa mara banyere ikpe na-abịanụ. Jizọs n’onwe ya kwuru na ya ga-abịa, dị ka Onyeikpe Chineke họpụtara, kewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ dị ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ. Jizọs kwuru na ndị a chọpụtara na ha ekwesịghị ekwesị “ga-apụkwa gaa ná mbipụ ebighị ebi.” (Matiu 25:31-33, 46) Otú ọ dị, Bible na-ekwu na, na nke ugbu a, a ga-enwe ọtụtụ nde ndị ga-alanahụ—oké ìgwè mmadụ bụ́ ndị na-efe nanị ezi Chineke ofufe. N’ụwa nke na-abịanụ, ha ga-ebi ndụ n’udo na nchebe na-adịgide adịgide dị ka a na-enwetụbeghị mbụ.—Maịka 4:3, 4; Mkpughe 7:9-17.

Ọtụtụ mmadụ ji okwu ndị dị otú ahụ dị na Bible na ịdọ aka ná ntị ndị a na-enye banyere mmezu ikpe ahụ bụ́ nke ga-egosi na okwu ndị dị otú ahụ bụ eziokwu, eme ihe ọchị. Ma Pita onyeozi kọwara na ndị oké nkatọ dị otú ahụ na-eleghara ihe ndị bụ́ eziokwu anya. O dere, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa, . . . na-asị: ‘Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị?’ . . . N’ihi na, dị ka ọchịchọ ha si dị, ha na-echezọ eziokwu a, na e nwere eluigwe nke sitere n’oge ochie na ụwa nke na-eguzopụta na mmiri nakwa n’etiti mmiri n’ụzọ kpụkọrọ ọnụ site n’okwu nke Chineke; sitekwa n’ihe ndị ahụ ka ụwa nke oge ahụ bịara ná mbibi mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya. Ma site n’otu okwu ahụ a na-akwakọba eluigwe na ụwa dị ugbu a maka ọkụ, a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe na mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 3:3-7.

Taa, n’irube isi n’iwu amụma Jizọs nyere, e ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ịdọ aka ná ntị zuru ụwa ọnụ banyere ụbọchị ikpe a na-abịanụ na ozi ọma banyere udo nke ga-esochi ya. (Matiu 24:14) E kwesịghị iji ịdọ aka ná ntị a gwurie egwu. Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile na-emezu okwu ya.

Ụwa nke Na-abịanụ

N’iburu n’uche mgbanwe dị ịrịba ama nke na-abịanụ, gịnị ga-abụ ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ? N’okwu mmeghe nke Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jizọs kwere nkwa, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, ebe ọ bụ na ha ga-eketa ụwa.” Mgbe ahụ, ọ gara n’ihu ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya ikpeku Chineke ekpere, sị: “Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 5:5; 6:10) Ee, Jizọs n’onwe ya kụziri na ọdịnihu dị ebube na-echere ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi n’ụwa ebe a. Ọ kpọrọ ya ‘oge ime ka ihe dị ọhụrụ.’—Matiu 19:28.

Ya mere, ka ị na-atụgharị uche banyere ọdịnihu, ekwela ka ndị na-akwa emo mee ka i nwewe obi abụọ banyere ịdọ aka ná ntị Chineke. N’ezie, gburugburu ebe obibi anyị pụrụ iyi ihe kwụ chịm, ụwa nke dị ugbu a etewokwa aka ọ malitere. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ekwesịghị ịtụkwasị ya obi. A mawo ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ ikpe. Ya mere, nweta obi ike site n’okwu mmechi nke akwụkwọ ozi Pita onyeozi:

“Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a nile, lee ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche . . . Ebe unu na-echere ihe ndị a, meenụ ike unu nile ka o wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-agbaghị ọrụ na ndị nọ n’udo. . . . Nọgidenụ na-eto eto n’obiọma na-erughịrị mmadụ na ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.” (2 Pita 3:11, 12, 14, 18) Ya mere, jiri ihe mere laa azụ n’oge Noa mụrụ ihe. Bịaruo Chineke nso. Na-eto eto n’ihe ọmụma banyere Jizọs Kraịst. Zụlite nsọpụrụ Chineke, ma sonye n’ime ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị họọrọ ịlanahụ ọgwụgwụ nke ụwa a ma banye n’ụwa udo nke na-abịanụ.

[Foto dị na peeji nke 5]

A maara banyere ọrụ ịkpụ ụzụ́ tupu iju mmiri ahụ

[Foto dị na peeji nke 7]

A ga-enwe ọdịnihu dị ebube