Kraịst Na-edu Ọgbakọ Ya
Kraịst Na-edu Ọgbakọ Ya
“Lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.”—Matiu 28:20.
1, 2. (a) Mgbe ọ na-enye iwu nke ime ndị na-eso ụzọ, gịnị ka Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite kwere ụmụazụ ya ná nkwa? (b) Olee otú Jizọs si duo ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ?
TUPU ọ rịgoo eluigwe, Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Ndú anyị e si n’ọnwụ kpọlite, mere ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya, o wee kwuo, sị: “E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa. Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu. Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.”—Matiu 23:10; 28:18-20.
2 Ọ bụghị nanị na Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ahụ na-azọpụta ndụ nke imekwu ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya kamakwa o kwere nkwa ịnọnyere ha. Akụkọ banyere mmalite nke Iso Ụzọ Kraịst, dị ka e si dekọọ ya n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọrụ Ndịozi, na-egosi n’ụzọ a na-apụghị ịgbagha agbagha na Kraịst ji ikike ahụ e nyere ya duzie ọgbakọ ahụ a ka guzobere ọhụrụ. O zitere “ihe inyeaka”—mmụọ nsọ ahụ—o kwere ná nkwa iji wusikwuo ụmụazụ ya ike na iji duzie mgbalị ha. (Jọn 16:7; Ọrụ 2:4, 33; 13:2-4; 16:6-10) Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite ji ndị mmụọ ozi mee ihe iji kwadoo ndị na-eso ụzọ ya. (Ọrụ 5:19; 8:26; 10:3-8, 22; 12:7-11; 27:23, 24; 1 Pita 3:22) Ọzọkwa, Onye Ndú anyị nyere ọgbakọ ahụ ntụziaka site n’ime ndokwa ka ndị ikom ruru eru na-eje ozi dị ka òtù na-achị isi.—Ọrụ 1:20, 24-26; 6:1-6; 8:5, 14-17.
3. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a ga-atụle n’isiokwu a?
3 Gịnịkwanụ banyere oge anyị, bụ́ “ọgwụgwụ nke usoro ihe”? Olee otú Jizọs Kraịst si edu ọgbakọ Ndị Kraịst taa? Oleekwa otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-anakwere idu ndú ya?
Nna Ukwu ahụ Nwere Ohu Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
4. (a) Olee ndị mejupụtara “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche”? (b) Gịnị ka Nna Ukwu ahụ nyefere ohu ahụ n’aka ilekọta?
4 Mgbe Jizọs na-ebu amụma banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya, ọ sịrị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke Matiu 24:45-47) ‘Nna ukwu’ ahụ bụ Onye Ndú anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, o mewokwa “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche”—ìgwè nke Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa—onye na-elekọta ihe ndị o nwere n’ụwa.
nwekwara uche, bụ́ onye nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, inye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị? Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ! N’ezie asị m unu, Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe nile o nwere.” (5, 6. (a) N’ọhụụ e mere ka Jọn onyeozi hụ, gịnị ka “ihe ndọba oriọna ọlaedo asaa ahụ” na “kpakpando asaa ahụ” na-ese onyinyo ha? (b) Gịnị ka eziokwu ahụ bụ́ na “kpakpando asaa ahụ” dị n’aka nri Jizọs na-egosi?
5 Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-egosi na ọ bụ Jizọs Kraịst kpọmkwem na-achịkwa ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche. N’ọhụụ e nyere ya banyere ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ Jọn onyeozi hụrụ “ihe ndọba oriọna ọlaedo asaa, nakwa onye yiri nwa nke mmadụ n’etiti ihe ndọba oriọna ndị ahụ” bụ́ onye “chịkwa kpakpando asaa n’aka nri ya.” N’ịkọwara Jọn ọhụụ ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Banyere ihe nzuzo dị nsọ nke kpakpando asaa ahụ ị hụrụ n’aka nri m, nakwa banyere ihe ndọba oriọna ọlaedo asaa ahụ: Kpakpando asaa ahụ pụtara ndị mmụọ ozi nke ọgbakọ asaa ahụ, ihe ndọba oriọna asaa ahụ pụtakwara ọgbakọ asaa.”—Mkpughe 1:1, 10-20.
6 “Ihe ndọba oriọna ọlaedo asaa ahụ” na-ese onyinyo ezi ọgbakọ Ndị Kraịst nile e nwere “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” bụ́ nke malitere na 1914. Gịnịkwanụ banyere “kpakpando asaa ahụ”? Na mbụ, ha nọchiri anya ndị nlekọta nile e ji mmụọ nsọ mụta ma tee mmanụ bụ́ ndị na-elekọta ọgbakọ ndị e nwere na narị afọ mbụ. * Ndị nlekọta ahụ nọ n’aka nri Jizọs—n’okpuru nchịkwa na nduzi ya. Ee, ọ bụ Kraịst Jizọs duziri òtù ohu ahụ ọtụtụ ndị mejupụtara. Otú ọ dị, ugbu a, ndị nlekọta ahụ e tere mmanụ dị ole na ole. Olee otú idu ndú Kraịst si erute ihe karịrị ọgbakọ 93,000 nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa?
7. (a) Olee otú Jizọs si eji Òtù Na-achị Isi edu ọgbakọ dị iche iche n’ụwa nile? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọ bụ mmụọ nsọ na-ahọpụta Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta?
7 Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, obere ìgwè nke ndị ikom ruru eru bụ́ ndị si n’etiti ndị nlekọta ahụ e tere mmanụ, na-eje ozi ugbu a dị ka Òtù Na-achị Isi, na-anọchite anya ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche bụ́ nke ọtụtụ ndị mejupụtara. Onye Ndú anyị na-eji Òtù Na-achị Isi a eme ihe iji họpụta ndị ikom ruru eru—ma hà bụ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ma ọ bụ na ha abụghị—dị ka ndị okenye n’ọgbakọ dị iche iche. Mmụọ nsọ, bụ́ nke Jehova nyeworo Jizọs ikike iji mee ihe, na-ekere òkè dị oké mkpa n’akụkụ a. (Ọrụ 2:32, 33) Nke mbụ, ndị nlekọta a aghaghị iru ihe ndị a chọrọ dị ka e depụtara ha n’Okwu Chineke, bụ́ nke e ji ike mmụọ nsọ dee. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9; 2 Pita 1:20, 21) A na-atụ aro nhọpụta ma na-eme nhọpụta mgbe e kpesịrị ekpere nakwa n’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ. Ọzọkwa, ndị ahụ a họpụtara na-enye ihe àmà nke ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ ahụ. (Ndị Galeshia 5:22, 23) N’ihi ya, ndụmọdụ Pọl metụtara ndị okenye nile n’ụzọ ha nhata, ma hà bụ ndị e tere mmanụ ma ha abụghị: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, bụ́ nke mmụọ nsọ họpụtaworo unu ịbụ ndị nlekọta n’etiti ya.” (Ọrụ 20:28) Ndị ikom a a họpụtara ahọpụta na-enweta nduzi site n’aka Òtù Na-achị Isi ma jiri ọchịchọ obi ha na-azụ ọgbakọ dị ka atụrụ. N’ụzọ dị otú a, Kraịst nọnyeere anyị ugbu a ma na-edu nnọọ ọgbakọ ya.
8. Olee otú Kraịst si eji ndị mmụọ ozi edu ụmụazụ ya?
8 Jizọs na-ejikwa ndị mmụọ ozi nkịtị edu ụmụazụ ya taa. Dị ka ihe atụ nke ọka wit na ata ahụ si gosi, oge owuwe ihe ubi ga-eru ná Matiu 13:37-41) Ọzọkwa, dị nnọọ ka mmụọ ozi si duzie Filip ịchọta ọnaozi Etiopia ahụ, n’otu aka ahụ, e nwere ihe àmà hiri nne na-egosi taa na Kraịst na-eji ndị mmụọ ozi eduzi ọrụ nke ezi Ndị Kraịst n’ịchọta ndị nwere obi eziokwu.—Ọrụ 8:26, 27; Mkpughe 14:6.
“ngwụsị nke usoro ihe.” Olee ndị Nna Ukwu ahụ ga-eji mee ihe n’iwe ihe ubi ahụ? “Ndị ahụ na-ewe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi,” ka Kraịst kwuru. Ọ gbakwụnyere, sị: “Nwa nke mmadụ ga-eziga ndị mmụọ ozi ya, ha ga-achịpụta ihe nile na-eme ka a sụọ ngọngọ n’alaeze ya nakwa ụmụ mmadụ ndị na-emebi iwu.” (9. (a) Olee ụzọ Kraịst si edu ọgbakọ Ndị Kraịst taa? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịtụle ma ọ bụrụ na anyị chọrọ irite uru site n’idu ndú Kraịst?
9 Lee ihe na-emesighachi obi ike ọ bụ ịmara na Jizọs Kraịst ji Òtù Na-achị Isi, mmụọ nsọ, na ndị mmụọ ozi na-edu ndị na-eso ụzọ ya taa! Ọ bụrụgodị na a gaje ikewapụ ụfọdụ ndị na-efe Jehova ofufe pụọ n’ebe Òtù Na-achị Isi nọ ruo nwa oge n’ihi mkpagbu ma ọ bụ ihe ndị yiri ya, Kraịst ka ga na-eji mmụọ nsọ na nkwado nke ndị mmụọ ozi na-edu ha. Otú ọ dị, anyị na-erite uru n’idu ndú ya nanị mgbe anyị na-anakwere ya. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-anakwere idu ndú Kraịst?
‘Na-erubenụ Isi, Na-anọkwanụ n’Okpuru’
10. Olee otú anyị pụrụ isi gosi nkwanye ùgwù n’ebe ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ nọ?
10 Onye Ndú anyị enyewo ọgbakọ dị iche iche “onyinye n’ụdị mmadụ”—“ụfọdụ dị ka ndị na-ezisa ozi ọma, ụfọdụ dị ka ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ozizi.” (Ndị Efesọs 4:8, 11, 12) Àgwà na omume anyị n’ebe ha nọ na-egosipụta nke ọma ma ànyị na-anakwere idu ndú Kraịst. Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị ka anyị ‘gosi onwe anyị ịbụ ndị nwere ekele’ maka ndị ikom ruru eru n’ụzọ ime mmụọ bụ́ ndị Kraịst nyeworo anyị. (Ndị Kọlọsi 3:15) Anyị kwesịkwara ịdị na-akwanyere ha ùgwù. “Ka a gụọ ndị okenye bụ́ ndị na-arụ ọrụ nlekọta n’ụzọ dị mma ná ndị ruru eru inweta nsọpụrụ okpukpu abụọ,” ka Pọl onyeozi dere. (1 Timoti 5:17) Olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta ekele na ùgwù anyị na-enwe maka ndị okenye—ndị nlekọta—nọ n’ọgbakọ? Pọl na-aza, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndu n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru.” (Ndị Hibru 13:17) Ee, anyị gaje irubere ha isi na ịnọ n’okpuru ha.
11. Gịnị mere inwe nkwanye ùgwù n’ebe ndokwa maka ndị okenye dị ji bụrụ ihe metụtara ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na baptizim anyị?
11 Onye Ndú anyị zuru okè. Ndị ikom o nyere dị ka onyinye ezughị okè. N’ihi ya, ha pụrụ ihie ụzọ mgbe ụfọdụ. Ma, ọ dị oké mkpa ka anyị nọgide na-eguzosi ike n’ihe nye ndokwa Kraịst. N’ezie, ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nraranye na baptizim anyị na-apụta na anyị ga-aghọta na ikike mmụọ nsọ nyere ha n’ọgbakọ bụ nke ezigbo ya, ma jiri ọchịchọ obi anyị na-anọ n’okpuru ha. Baptizim e mere anyị ‘n’aha nke mmụọ nsọ’ bụ ngosipụta ihu ọha na anyị maara ihe mmụọ nsọ bụ ma ghọta òkè ọ na-ekere ná nzube Jehova. (Matiu 28:19) Baptizim dị otú ahụ na-egosi na anyị na-ekwenyere mmụọ nsọ ma na-ezere ime ihe ọ bụla iji gbochie ọrụ ọ na-arụ n’etiti ụmụazụ Kraịst. Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ na-ekere òkè dị oké mkpa n’ịtụ aro nhọpụta nakwa ná nhọpụta nke ndị okenye, ànyị pụrụ n’ezie ịbụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye nraranye anyị ma ọ bụrụ na anyị ajụ ikwenyere ndokwa maka ndị okenye bụ́ nke e mere n’ọgbakọ?
12. Ihe atụ ndị dị aṅaa metụtara enweghị nkwanye ùgwù maka ịbụisi ka Jud hotara, gịnịkwa ka ha na-akụziri anyị?
12 Akwụkwọ Nsọ nwere ihe atụ ndị na-akụziri anyị uru nrubeisi na ịnọ n’okpuru bara. N’izo aka n’ebe ndị kwutọrọ ndị ikom a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ nọ, Jud onye na-eso ụzọ rụtụrụ aka n’ihe atụ ịdọ aka ná ntị atọ, na-asị: “Ahụhụ dịịrị ha, n’ihi na ha ejewo ije n’ụzọ nke Ken, jirikwa ọsọ gbaga n’ụzọ na-ezighị ezi nke Belam maka ụgwọ ọrụ, laakwa n’iyi n’okwu nnupụisi nke Kora!” (Jud 11) Ken leghaara ndụmọdụ Jehova ji ịhụnanya nye ya anya ma jiri ọchịchọ obi ya gbasoo ụzọ nke ịkpọasị bụ́ nke dugara ya n’igbu ọchụ. (Jenesis 4:4-8) N’agbanyeghị na Chineke dọrọ Belam aka ná ntị ugboro ugboro, ọ gbalịrị ịkọcha ndị Chineke n’ihi ego a ga-akwụ ya. (Ọnụ Ọgụgụ 22:5-28, 32-34; Deuterọnọmi 23:5) Kora nwere ọmarịcha ibu ọrụ e nyere ya n’Izrel, ma o zughịrị ya. Ọ kpaliri nnupụisi megide ohu Chineke bụ́ Mozis, bụ́ nwoke kasị dịrị umeala n’obi n’ụwa. (Ọnụ Ọgụgụ 12:3; 16:1-3, 32, 33) Ọdachi dakwasịrị Ken, Belam na Kora. Lee ka ihe atụ ndị a si akụziri anyị nke ọma ige ntị na ndụmọdụ nke ndị Jehova ji na-eme ihe n’ọnọdụ ibu ọrụ ma kwanyere ha ùgwù!
13. Ngọzi ndị dị aṅaa ka Aịzaịa onye amụma buru n’amụma na ndị na-anọ n’okpuru ndokwa maka ndị okenye ga-enweta?
13 Olee onye na-agaghị achọ irite uru ná ndokwa dị ebube nke nlekọta bụ́ nke Onye Ndú anyị guzobeworo n’ọgbakọ Ndị Kraịst? Aịzaịa onye amụma buru amụma banyere ngọzi ndị ga-esi na ya pụta, na-asị: “Lee, n’ezi omume ka otu eze ga-abụ eze, ndị isi kwa, n’ikpe ziri ezi ka ha ga-abụ ndị isi. Otu onye ga-adịkwa ka ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké Aịsaịa 32:1, 2) Onye nke ọ bụla n’ime ndị okenye gaje ịbụ “ebe” dị otú ahụ a na-enweta nchebe. Ọ bụrụgodị na ido onwe anyị n’okpuru ndị na-achị achị na-esiri anyị ike, ka anyị jiri ekpere na-arụsi ọrụ ike iji na-erubere ndị Chineke họpụtara ịchị isi n’ọgbakọ isi ma na-anọ n’okpuru ha.
mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Otú Ndị Okenye Si Anọ n’Okpuru Idu Ndú Kraịst
14, 15. Olee otú ndị na-edu ndú n’ọgbakọ si egosi na ha na-anọ n’okpuru idu ndú Kraịst?
14 Onye Kraịst ọ bụla—karịsịa ndị okenye—aghaghị ịgbaso idu ndú Kraịst. Ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye, nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ikike n’ọgbakọ. Ma ha adịghị achọ ịbụ ‘ndị nna ukwu n’ebe okwukwe nke ndị kwere ekwe ibe ha dị’ site n’ịnwa ịchịkwa ndụ ha. (2 Ndị Kọrint 1:24) Ndị okenye na-eburu okwu Jizọs n’uche, bụ́: “Unu maara na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ha bụ ndị nwe ha, ndị ukwu na-achịkwa ha n’aka ike. Ọ gaghị adị otú a n’etiti unu.” (Matiu 20:25-27) Ka ndị okenye na-arụzu ibu ọrụ ha, ha na-eji ezi obi agbalị ijere ndị ọzọ ozi.
15 A gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Na-echetanụ ndị na-edu ndú n’etiti unu, . . . ka unu na-ahụkwa ihe na-esi n’omume ha apụta, na-eṅominụ okwukwe ha.” (Ndị Hibru 13:7) Ihe mere e ji chọọ nke a abụghị n’ihi na ndị okenye bụ ndị ndú. Jizọs kwuru, sị: “Onye Ndú unu bụ otu onye, bụ́ Kraịst ahụ.” (Matiu 23:10) Ọ bụ okwukwe nke ndị okenye ka a ga-eṅomi n’ihi na ha na-eṅomi ezi Onye Ndú anyị, bụ́ Kraịst. (1 Ndị Kọrint 11:1) Tụlee ụzọ ụfọdụ ndị okenye si agbalịsi ike ịdị ka Kraịst ná mmekọrịta nke ha na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ.
16. N’agbanyeghị ikike o nwere, olee otú Jizọs si mesoo ụmụazụ ya ihe?
16 N’agbanyeghị na Jizọs ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè elu n’ụzọ nile ma nweta ikike na-enweghị atụ site n’aka Nna ya, ọ dị umeala n’obi n’otú o si mesoo ndị na-eso ụzọ ya ihe. O jighị oké ihe ọmụma kọjuo ndị na-ege ya ntị isi. Jizọs gosipụtara ezi uche na ọmịiko n’ebe ụmụazụ ya nọ, na-echebara mkpa ndị ha nwere dị ka ụmụ mmadụ echiche. (Matiu 15:32; 26:40, 41; Mak 6:31) Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ chọrọ n’aka ndị na-eso ụzọ ya inye ihe ha na-agaghị enyeli, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla o bokwasịrị ha ihe ha na-agaghị ebuli. (Jọn 16:12) Jizọs ‘nwere obi dị nwayọọ ma dị umeala n’obi.’ N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ mmadụ hụtara ya dị ka onye na-enye ume ọhụrụ.—Matiu 11:28-30.
17. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-egosipụta obi umeala yiri nke Kraịst ná mmekọrịta ha na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ?
17 Ọ bụrụ na Onye Ndú bụ́ Kraịst gosipụtara obi umeala, lee ka ndị na-edu ndú n’ọgbakọ kwesịrị isi gosipụta ya karị! Ee, ha na-akpachara anya ka ha ghara iji ikike ọ bụla e nyere ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ha adịghịkwa ‘eji oké okwu bịa,’ na-anwa ime ka ndị ọzọ jawa ha. (1 Ndị Kọrint 2:1, 2) Kama nke ahụ, ha na-agbalịsi ike iji ụzọ dị mfe na ezi obi na-ekwu okwu nke eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ. Ọzọkwa, ndị okenye na-agbalịsi ike iji ezi uche na-eme ihe banyere ihe ha na-atụ anya ya n’aka ndị ọzọ ma na-echebara mkpa ha echiche. (Ndị Filipaị 4:5) N’ịmara na onye ọ bụla nwere erughị eru, ha na-eji ịhụnanya eburu ya n’uche mgbe ha na-emeso ụmụnna ha ihe. (1 Pita 4:8) Ọ̀ bụ na ndị okenye dị umeala n’obi ma dị nwayọọ abụghị ndị na-enye ume ọhụrụ n’ezie? N’ezie ha bụ.
18. Gịnị ka ndị okenye pụrụ ịmụta site n’ụzọ Jizọs si mesoo ụmụaka?
Mak 10:13-16) Jizọs nwere omume enyi na obiọma, a dọtakwara ndị ọzọ n’ebe ọ nọ. Ndị mmadụ adịghị atụ Jizọs ụjọ. Ọbụna ụmụaka nwere ahụ́ iru ala mgbe ha na ya nọ. Ndị okenye bụkwa ndị a pụrụ ịbịaru nso, ka ha na-egosipụtakwa ezi ịhụnanya na obiọma, ndị ọzọ—ọbụna ụmụaka—na-enwe ahụ́ iru ala ma ha na ha nọrọ.
18 Jizọs bụ onye ndị mmadụ, ọbụna ndị dị ala, pụrụ ịbịaru nso. Tụlee ihe o mere mgbe ndị na-eso ụzọ ya baara ndị mmadụ mba maka “ịkpọtara ya ụmụntakịrị.” “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m,” ka Jizọs kwuru, “unu anwala igbochi ha.” Mgbe ahụ, “o kukwaara ụmụaka ahụ n’aka ya wee malite ịgọzi ha, na-ebikwasị ha aka n’isi.” (19. Gịnị ka inwe “uche nke Kraịst” na-agụnye, mgbalị dịkwa aṅaa ka nke a na-achọ?
19 Ókè ndị okenye pụrụ iṅomiru Kraịst Jizọs na-adabere n’otú ha maruuru ya nke ọma. “Ònye mataworo uche Jehova, ka o wee kụziere ya ihe?” ka Pọl jụrụ. Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Ma anyị nwere uche nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 2:16) Inwe uche nke Kraịst na-agụnye ịmara ụzọ o si eche echiche na akụkụ nile nke àgwà ya ka anyị wee mara ihe ọ pụrụ ime n’ọnọdụ ụfọdụ. Cheedị echiche ịbịa mara Onye Ndú anyị nke ọma otú ahụ! Ee, nke a na-achọ ịṅa ntị nke ọma n’ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ na iji nghọta banyere ndụ na ihe nlereanya Jizọs na-emeju obi anyị mgbe nile. Mgbe ndị okenye tinyere mgbalị ịgbaso idu ndú Kraịst ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ, ndị nọ n’ọgbakọ na-abụ ndị a kpalikwuru iṅomi okwukwe ha. Ndị okenye na-enwekwa afọ ojuju nke ịhụ ka ndị ọzọ ji ọṅụ na-agbaso nzọụkwụ nke Onye Ndú ahụ.
Nọgide Na-aga n’Ihu n’Okpuru Idu Ndú Kraịst
20, 21. Ka anyị na-elepụ anya n’ihu maka ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa, gịnị ka anyị kwesịrị inwe mkpebisi ike ime?
20 Ọ dị oké mkpa ka anyị nile nọgide n’okpuru idu ndú Kraịst. Ka anyị na-eru ọgwụgwụ nke usoro ihe a, ọnọdụ anyị yiri nke ụmụ Izrel ahụ nọ n’Ọzara Moab na 1473 T.O.A. Ha nọ n’ọnụ ọnụ Ala Nkwa ahụ, Chineke sikwa n’ọnụ Mozis onye amụma kwupụta, sị: “Gị onwe gị [Joshua] ga-esoro ndị nke a baa n’ala ahụ nke Jehova ṅụụrụ ndị bụ́ nna ha iyi inye ha.” (Deuterọnọmi 31:7, 8) Joshua bụ onye ndú nke a họpụtara. Iji banye n’Ala Nkwa ahụ, ụmụ Izrel aghaghị ịnọ n’okpuru idu ndú Joshua.
21 Bible na-agwa anyị, sị: “Onye Ndú unu bụ otu onye, bụ́ Kraịst ahụ.” Ọ bụ nanị Kraịst ga-eduru anyị banye n’ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa nke ezi omume gaje ibi n’ime ya. (2 Pita 3:13) Ya mere, ka anyị nwee mkpebisi ike ido onwe anyị n’okpuru idu ndú ya n’akụkụ nile nke ndụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 “Kpakpando” ndị a na-ekwu okwu ha n’ebe a adịghị anọchi anya ndị mmụọ ozi nkịtị. Jizọs agatụghị eji mmadụ dekọọrọ ndị mmụọ e kere eke a na-adịghị ahụ anya ihe ọmụma. Ya mere, “kpakpando” ndị ahụ aghaghị ịnọchi anya ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye bụ́ mmadụ, nọ n’ọgbakọ dị iche iche, bụ́ ndị a na-ele anya dị ka ndị ozi Jizọs. Ọnụ ọgụgụ ha ịdị asaa na-egosi izu ezu dị ka ụkpụrụ Chineke si dị.
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
Ị̀ Na-echeta?
• Olee otú Kraịst si duo ọgbakọ oge mbụ?
• Olee otú Kraịst si edu ọgbakọ ya taa?
• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnọ n’okpuru ndị na-edu ndú n’ọgbakọ?
• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị okenye pụrụ isi gosipụta na Kraịst bụ Onye Ndú ha?
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Kraịst na-edu ọgbakọ ya ma na-ejide ndị nlekọta n’aka nri ya
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
“Na-eruberenụ ndị na-edu ndu n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru”
[Foto dị na peeji nke 18]
Jizọs nwere omume enyi ma bụrụ onye a pụrụ ịbịaru nso. Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-agbalịsi ike ịdị ka ya