Nsogbu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ—Ọ̀ Dị Mgbe Ha Ga-akwụsị?
Nsogbu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ—Ọ̀ Dị Mgbe Ha Ga-akwụsị?
“OTU ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi n’ụwa dara ogbenye, ijeri 1.3 na-akpata ihe na-erughị $1 n’ụbọchị, 1 ijeri bụ iti, ijeri 1.3 adịghị enweta ezigbo mmiri ọṅụṅụ, 1 ijeri na-anọkwa agụụ kwa ụbọchị.” Ihe a ka otu akụkọ si Ireland kwuru banyere ọnọdụ ụwa.
Lee ọnọdụ dị mwute ọ bụ nke na-egosi na mmadụ enweghị ike ịchọta ihe ngwọta na-adịgide adịgide nke nsogbu ụwa! Ọbụna nsogbu ndị ahụ na-eyi ka ha ka njọ mgbe ị chọpụtara na ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ahụ a kọrọ banyere ha n’ihe ndekọ ahụ bụ ndị inyom na ụmụaka na-apụghị ịzọ onwe ha. Ọ́ bụghị ihe na-eju anya na ọbụna ugbu a, na narị afọ nke 21, na a nọgidere ‘kwa ụbọchị na-emebi ihe ruuru imerime ndị mmadụ’?—The State of the World’s Children 2000.
“Ụwa Ọhụrụ n’Ime Otu Ọgbọ”
Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu ekwupụtawo obi ike o nwere na ‘a pụrụ iwepụ nsogbu ihe ndị a a na-emebi kpataworo ná ndụ ndị mmadụ gburugburu ụwa.’ Òtù a kwuru na ọnọdụ ndị dị oké njọ ọtụtụ nde ndị a ihe na-esiri ike na-aghaghị ịnagide ugbu a abụghị ndị “a na-apụghị izere ezere ma ọ bụ ndị a na-apụghị ịgbanwe agbanwe.” N’ezie, ọ kpọwo òkù ka “mmadụ nile rụọ ọrụ iji weta ụwa ọhụrụ n’ime otu ọgbọ.” Ọ tụrụ anya na nke a ga-abụ ụwa ebe a ga-eme ka ihe nile a kpọrọ mmadụ “nwere onwe ha pụọ n’ịda ogbenye na ịkpa ókè, nwerekwa onwe ha pụọ n’ime ihe ike na ọrịa.”
Ihe na-emesi ndị na-ekwupụta echiche dị otú ahụ obi ike bụ eziokwu ahụ bụ́ na ọbụna ugbu a, ọtụtụ ndị ọnọdụ a na-emetụ n’ahụ́ na-arụ ọrụ dị ukwuu iji belata ihe ndị dị mwute “esemokwu na ọgba aghara ndị yiri ka ha enweghị ọgwụgwụ” na-akpata. Dị ka ihe atụ, n’ime afọ 15 gara aga, òtù ọrụ ebere bụ́ Chernobyl Children’s Project “enyewo aka ibelata nhụsianya nke ọtụtụ narị ụmụaka ndị nsí nuklia kpatawooro ọrịa cancer.” (The Irish Examiner, April 4, 2000) N’ezie, òtù ọrụ ebere, ma ndị ukwu ma ndị nta, na-eme ihe dị ukwuu ná ndụ imerime mmadụ ndị agha na ọdachi kpara aka ọjọọ.
Ma, ndị na-enye aka n’ụzọ dị otú ahụ n’ịkwalite ọdịmma nke ndị mmadụ bụ ndị na-ele ihe anya otú ha dị. Ha maara na nsogbu ndị a na-eche ihu “zuru ebe nile ma gbanye nnọọ mkpọrọgwụ karịa ka ha dị ọbụna n’afọ iri gara aga.” David Begg, bụ́ onyeisi nke òtù ọrụ ebere ndị Ireland bụ́ Concern, na-ekwu na “ndị ọrụ, ndị nkwado, na ndị na-enye onyinye mere ihe n’ụzọ dị egwu” mgbe idei mmiri kpara Mozambique aka ọjọọ. “Ma,” ka ọ na-agbakwụnye, “nanị anyị apụghị igbo mkpa ahụ n’ihi ịdị ukwuu nke ọdachi ndị dị otú ahụ.” Banyere ọrụ enyemaka ndị a na-arụ n’Africa, o kwetara hoo haa, sị: “Ihe ole na ole anyị ji nwee nchekwube dịzi ka mpanaka na-anyụ anyụ.” Ọtụtụ ndị ga-eche na okwu ya chịkọtakwara ọnọdụ zuru ụwa ọnụ nke ọma.
Ànyị pụrụ ịtụ anya n’ezie ịhụ “ụwa ọhụrụ n’ime otu ọgbọ” bụ́ nke a na-atụ anya ya? Ọ bụ ezie na mgbalị ndị a na-eme ugbu a n’ịkwalite ọdịmma ndị mmadụ kwesịrị ịja mma, n’ezie, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụle atụmanya ọzọ e nwere maka ụwa ezi omume na nke udo. Bible na-ezo aka n’atụmanya dị otú ahụ, dị ka isiokwu na-esonụ ga-atụle.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
Peeji nke 3, ụmụaka: Foto UN/DPI nke James Bu sere