Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Òtù Ụmụnna Anyị Zuru Ụwa Ọnụ Wusikwuru M Ike

Òtù Ụmụnna Anyị Zuru Ụwa Ọnụ Wusikwuru M Ike

Akụkọ Ndụ

Òtù Ụmụnna Anyị Zuru Ụwa Ọnụ Wusikwuru M Ike

DỊ KA THOMSON KANGALE SI KỌỌ

N’April 24, 1993, a kpọrọ m òkù ịga nraranye nke alaka ụlọ ọrụ e wuru ọhụrụ, bụ́ nke gụnyere ụlọ 13, na Lusaka, Zambia. Ebe ọ bụ na ịga ije na-esiri m ike, nwanna nwanyị bụ́ Onye Kraịst nke dugharịrị anyị n’ihe owuwu ahụ ji obiọma jụọ m, sị, “Ọ̀ ga-amasị gị ka m buru oche n’ihi gị ka i wee nwee ike izurutụ ike mgbe ụfọdụ?” Abụ m onye isi ojii, ya onwe ya bụ onye ọcha, ma nke ahụ adịghị ihe ọ bụ nye ya. N’ịbụ onye nke ahụ metụrụ n’ahụ́ nke ukwuu, ekelere m ya, ebe ọ bụ na obiọma ya mere ka o kwe m omume ịgagharị ma hụ ihe owuwu nile nke alaka ahụ.

N’IME afọ ndị gafeworonụ, ahụmahụ ndị dị ka nke a emewo ka obi dị m ụtọ, na-eme ka m kwenyesikwuo ike na n’ime nzukọ Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova, e nwere ịhụnanya ahụ Kraịst sịrị na ọ bụ ya ka a ga-eji mara ezi ụmụazụ ya. (Jọn 13:35; 1 Pita 2:17) Ka m kọọrọ gị otú m si mata Ndị Kraịst a laa azụ na 1931, bụ́ afọ ha kwupụtara n’ihu ọha na ha chọrọ ka e jiri aha ahụ dabeere na Bible bụ́ Ndịàmà Jehova mara ha.—Aịsaịa 43:12.

Ije Ozi n’Oge Mbụ n’Africa

Na November 1931, adị m afọ 22 ma biri na Kitwe, nke dị n’ógbè Copperbelt nke Northern Rhodesia (nke bụzi Zambia). Otu enyi m nke mụ na ya na-agbakọ bọl mere ka m mata Ndịàmà. Agara m ụfọdụ n’ime nzukọ ha ma degara alaka ụlọ ọrụ dị na Cape Town, South Africa, akwụkwọ, na-arịọ maka akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ The Harp of God. * Akwụkwọ ahụ dị n’asụsụ Bekee, o sikwaara m ike nghọta, ebe ọ bụ na amaghị m asụsụ ahụ nke ọma.

E were ọtụtụ ndị si n’ógbè ndị ọzọ n’ọrụ ịrụ n’ebe a na-egwupụta ọla kọpa n’ógbè Copperbelt, bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 240 n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke Ọdọ Mmiri Bangweulu, bụ́ nke dị nso n’ebe m nọ tolite. Ọtụtụ ìgwè Ndịàmà na-ezukọ ebe ahụ mgbe nile maka ọmụmụ Bible. Mgbe obere oge gasịrị, esi m Kitwe kwaga n’obodo dị ya nso bụ́ Ndola ma malite iso otu ìgwè nke Ndịàmà nọ n’ebe ahụ na-akpakọrịta. N’oge ahụ, abụ m kaptịn nke otu òtù bọl ụkwụ a na-akpọ Prince of Wales. Arụkwara m ọrụ dị ka odibo na-elekọta ụlọ nke otu onye ọcha bụ́ onyeisi African Lakes Corporation, bụ́ ụlọ ọrụ nwere ọtụtụ ụlọ ahịa n’ebe etiti Africa.

Agụghị m oké akwụkwọ, amụtakwara m ntakịrị Bekee site n’ọnụ ndị ọcha m na-arụrụ ọrụ. Otú o sina dị, ọ gụsiri m agụụ ike ịgakwu akwụkwọ, etinyekwara m akwụkwọ ịmụ ihe n’otu ụlọ akwụkwọ dị na Plumtree, Southern Rhodesia (nke bụzi Zimbabwe). Otú ọ dị, ka ọ dị mgbe ahụ, edegaara m alaka ụlọ ọrụ dị na Cape Town akwụkwọ nke ugboro abụọ ya. Emere m ka ha mara na m nwetara The Harp of God ahụ ma chọọ ijere Jehova ozi oge nile.

Ọ tụrụ m n’anya inweta azịza ha, bụ́ nke sịrị: “Anyị nwere ekele maka ọchịchọ gị ijere Jehova ozi. Ọ ga-amasị anyị ịgba gị ume ka i tinye ya n’ekpere, Jehova ga-enyekwara gị aka ịghọta eziokwu ahụ n’ụzọ ka mma, ọ ga-enyekwa gị ọnọdụ ị ga-anọ jeere ya ozi.” Mgbe m gụsịrị akwụkwọ ozi ahụ ọtụtụ ugboro, ajụrụ m ụfọdụ Ndịàmà ihe m ga-eme. Ha sịrị: “Ọ bụrụ n’ezie na ị chọrọ ijere Jehova ozi, gaa n’ihu mewe ya ozugbo.”

Ekpere m ekpere banyere ya ruo otu izu, n’ikpeazụkwa, ekpebiri m ịkwụsị ịga akwụkwọ ma nọgide na-aga n’ihu n’ọmụmụ Bible mụ na Ndịàmà. N’afọ na-esonụ, na January 1932, egosipụtara m, nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke site na baptizim ime mmiri. Mgbe m sisịrị Ndola kwaga n’obodo ukwu dị nso bụ́ Luanshya, ezutere m Jeanette, bụ́ onye kwere ekwe ibe m, anyị lụkwara na September 1934. Mgbe anyị lụrụ, Jeanette amụọlarị otu nwa nwoke na otu nwa nwanyị.

Nke nta nke nta, enwere m ọganihu ime mmụọ, na 1937 kwa, abanyere m n’ozi oge nile. N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, a họpụtara m ije ozi dị ka onye ozi na-ejegharị ejegharị, bụ́ nke a na-akpọzi onye nlekọta sekit. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eleta ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova iji na-ewusikwu ha ike n’ụzọ ime mmụọ.

Ime Nkwusa n’Afọ Ndị Mbụ

Na January 1938, e nyere m ntụziaka ileta otu onyeisi obodo n’Africa nke aha ya bụ Sokontwe, bụ́ onye rịọrọ ka Ndịàmà Jehova kpọtụrụ ya. O were m ụbọchị atọ iji jiri ịnyịnya ígwè garuo n’ógbè ya. Mgbe m gwara ya na e zitere m n’ihi akwụkwọ ozi o degaara ụlọ ọrụ anyị dị na Cape Town, o nwere ekele nke ukwuu.

Esi m n’otu ụlọ akịrịka gaa n’ọzọ na-akpọ ndị obodo ya òkù ka ha gbakọta n’insaka (ụlọ ntu ọha na eze na-ezukọta na ya). Mgbe ha gbakọtara, agwara m ìgwè mmadụ ahụ okwu. N’ihi ya, a malitere ọtụtụ ọmụmụ Bible. Onyeisi obodo nta ahụ na odeakwụkwọ ya so ná ndị mbụ ghọrọ ndị nlekọta nke ọgbakọ ndị e nwere n’ebe ahụ. Taa, e nwere ihe karịrị ọgbakọ 50 n’ógbè ahụ, bụ́ nke a maara ugbu a dị ka ógbè Samfya.

Site na 1942 ruo 1947, ejere m ozi n’ógbè dị gburugburu Ọdọ Mmiri Bangweulu. Ana m eso ọgbakọ nke ọ bụla anọkọ ruo ụbọchị iri. Ebe ọ bụ na ndị ọrụ owuwe ihe ubi ime mmụọ dị ole na ole n’oge ahụ, ọ dị anyị nnọọ otú ọ dị Onyenwe anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, mgbe o kwuru, sị: “Ee, ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Nna Nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Matiu 9:36-38) N’oge mbụ ahụ, ime njem na-esi ike, n’ihi ya, Jeanette na ụmụ anyị na-anọkarị na Luanshya ka m na-eleta ọgbakọ dị iche iche. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, mụ na Jeanette nwere ụmụ abụọ ọzọ, ma otu n’ime ha nwụrụ mgbe ọ dị ọnwa iri.

N’ezie, ụgbọala dị ole na ole n’oge ahụ, otú ahụ ka ụzọ dịkwa. Otu ụbọchị, eji m ịnyịnya ígwè Jeanette malite njem ruru ihe karịrị kilomita 200. Mgbe ụfọdụ, mgbe m na-aghaghị ịgafe obere osimiri, ana m ebu ịnyịnya ígwè ahụ n’ubu m, were otu aka jide ya, ma jiri aka nke ọzọ gwuru mmiri gafee. Ọ bịara daba na ọnụ ọgụgụ Ndịàmà rịrị elu n’ụzọ dị egwu na Luanshya, na 1946 kwa, mmadụ 1,850 bịara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst.

Iche Mmegide nke Ọrụ Anyị Ihu

N’otu oge mgbe Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-akpọtụ, onye na-elekọta Kawambwa kpọrọ m ma kwuo, sị: “Achọrọ m ka ị kwụsị iji akwụkwọ Watch Tower Society na-eme ihe n’ihi na a machibidola ha iwu ugbu a. Ma apụrụ m inye gị ngwá ọrụ ndị ị pụrụ iji na-ede akwụkwọ ndị ọzọ ị ga-eji na-arụ ọrụ gị.”

“Akwụkwọ ndị anyị nwere zuoro m,” ka m zaghachiri. “Ọ dịghị ihe ọzọ m chọrọ.”

“Ị maghị ndị America,” ka o kwuru (n’oge ahụ a na-ebipụta akwụkwọ anyị na United States). “Ha ga-eduhie gị.”

“Mba, ndị mụ na ha na-emekọ ihe agaghị eduhie m,” ka m zaghachiri.

Ọ jụziri, sị: “Ọ̀ bụ na i nweghị ike ịgba ndị ọgbakọ gị ume ka ha na-enye onyinye ego iji nye aka n’agha dị ka okpukpe ndị ọzọ na-eme?”

“Nke ahụ bụ ọrụ dịịrị ndị ozi gọọmenti,” ka m zara.

“Gịnị ma ị laa n’ebe obibi gị ma chee ya echee?” ka o kwuru.

N’Ọpụpụ 20:13 nakwa na 2 Timoti 2:24, Bible nyere anyị iwu ka anyị ghara igbu mmadụ nakwa ka anyị ghara ịlụ ọgụ,” ka m zaghachiri.

Ọ bụ ezie na e kwere ka m laa, mgbe e mesịrị, onye na-elekọta ógbè Fort Rosebery, bụ́ obodo a na-akpọzi Mansa, kpọrọ m. “Akpọrọ m gị ebe a ime ka ị mara na gọọmenti amachibidola akwụkwọ unu iwu,” ka o kwuru.

“Ee. Anụla m banyere ya,” ka m kwuru.

“Ya mere, ị ga-aga n’ọgbakọ unu nile ma gwa ndị gị na ha na-efekọ ofufe ka ha weta akwụkwọ nile ahụ n’ebe a. Ị̀ ghọtara ihe m kwuru?”

“Nke ahụ abụghị ọrụ m,” ka m zaghachiri. “Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị ozi gọọmenti.”

Otu Nzute Amịa Mkpụrụ

Mgbe agha ahụ bisịrị, anyị nọgidere na-eme nkwusa. Na 1947, aka m letasịrị nnọọ otu ọgbakọ dị n’obodo nta bụ́ Mwanza mgbe m jụrụ ebe m pụrụ ịzụta tii. A gwara m ka m gaa n’ụlọ otu Maazị Nkonde, bụ́ ebe a na-ere tii. Maazị Nkonde na nwunye ya ji obi ụtọ nabata m. Ajụrụ m Maazị Nkonde ma, ka m na-aṅụ tii m, ọ̀ ga-agụ isiokwu bụ́ “Hell (Ili), Ebe Inọdu Zuru Ike We Nwe Olile-anya” n’akwụkwọ bụ́ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu.”

“Gịnị ka ị ghọtara banyere hel?” ka m jụrụ ya mgbe m ṅụchara tii m. N’ịbụ onye ihe ọ gụtara tụrụ n’anya, ọ malitere iso Ndịàmà na-amụ Bible, mgbe e mesịkwara, e mere ya na nwunye ya baptizim. Ọ bụ ezie na ọ nọgideghị bụrụ Onyeàmà, nwunye ya na ụfọdụ n’ime ụmụ ya nọgidere. N’ezie, otu n’ime ụmụ ya, bụ́ Pilney, ka na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Zambia. N’agbanyeghịkwa na nne Pilney bụzi nnọọ agadi, ọ ka bụ Onyeàmà na-ekwesị ntụkwasị obi.

Idetụ Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa Ire

Alaka ụlọ ọrụ anyị nke dị na Northern Rhodesia, bụ́ nke e guzobere ná mmalite 1948 na Lusaka, kenyere m ọrụ na Tanganyika (nke bụzi Tanzania). Onyeàmà ọzọ sonyeere mụ na nwunye m na njem anyị ji ụkwụ si n’ebe bụ́ ugwu ugwu gaa. Njem ahụ were anyị ụbọchị atọ, ọ gwụkwara anyị nnọọ ike. Ka m butere ùkwù akwụkwọ anyị, nwunye m butere ákwà anyị, Onyeàmà nke ọzọ ahụ ebutezie ihe ndị anyị ji ehi ụra.

Mgbe anyị rutere na Mbeya na March 1948, e nwere ọtụtụ ihe ime iji nyere ụmụnna ahụ aka ime mgbanwe iji kwekọkwuo nke ọma n’ozizi Bible. Nke mbụ, a maara anyị n’ógbè ahụ dị ka ndị Ụlọ Nche. Ọ bụ ezie na ụmụnna anakwerewo aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova, ọha na eze amabeghị banyere ya. Tụkwasị na nke ahụ, ọ dị ụfọdụ Ndịàmà mkpa ịgbahapụ omenala ụfọdụ e jikọrọ ha na ịkwanyere ndị nwụrụ anwụ ùgwù. Ma ikekwe, mgbanwe kasị siere ọtụtụ ndị ike ime bụ idebanye alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ n’ụzọ iwu, na-eme ka ha bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’ebe mmadụ nile nọ.—Ndị Hibru 13:4.

Mgbe e mesịrị, enwetara m ihe ùgwù nke ileta ógbè ndị ọzọ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, gụnyere Uganda. Anọrọ m ihe dị ka izu isii n’Entebbe nakwa na Kampala, bụ́ ebe m nyeere ọtụtụ ndị aka inweta ihe ọmụma nke eziokwu Bible.

A Kpọọ M Òkù Ịbịa New York City

Mgbe m jesịrị ozi na Uganda ruo oge ụfọdụ, ná mmalite 1956, erutere m na Dar es Salaam, bụ́ isi obodo Tanganyika. N’ebe ahụ, otu akwụkwọ ozi sitere n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova nọ anọ na-eche m. Ihe e dere na ya bụ ntụziaka e nyere m ka m jikere ịbịa New York maka mgbakọ mba nile a ga-enwe malite na July 27 ruo August 3, 1958. N’ụzọ doro anya, atụmanya ahụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.

Mgbe oge ruru, mụ na onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ọzọ, bụ́ Luka Mwango, ji ụgbọelu si Ndola fega Salisbury (nke bụzi Harare), Southern Rhodesia, mgbe e mesịziri, anyị efega Nairobi, Kenya. Anyị sizi ebe ahụ fega London, England, bụ́ ebe a nabatara anyị n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Mgbe anyị lakpuru ụra n’abalị ahụ anyị rutere England, anyị nwere nnọọ obi ụtọ ma nọgide na-akọ banyere otú ndị ọcha si nabata anyị bụ́ ndị Africa nke ọma. Ahụmahụ ahụ gbara anyị ume nke ukwuu.

N’ikpeazụ, anyị rutere New York, bụ́ ebe e nwere mgbakọ ahụ. Otu ụbọchị ná mgbakọ ahụ, akọrọ m banyere ọrụ Ndịàmà Jehova na Northern Rhodesia. N’ụbọchị ahụ, ndị na-ege ntị fọrọ nke nta ka ha ruo mmadụ 200,000 gbakọtara na Polo Grounds nakwa n’Ámá Egwuregwu Yankee, bụ́ ndị dị na New York City. Ehilighị m ụra n’abalị ahụ n’ihi iche banyere ihe ùgwù dị ebube m nwetaworo.

N’oge na-adịghị nnọọ anya, e mechiri mgbakọ ahụ, anyị lọtara. Mgbe anyị nọ na njem ụla, anyị nụkwara ụtọ nnabata ịhụnanya nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’England ọzọ. E gosiri anyị ịdị n’otu nke ndị Jehova, n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ mba, n’ụzọ anyị na-apụghị ichefu echefu na njem ahụ!

Ịga n’Ihu n’Ozi Nakwa Ọnwụnwa

Na 1967, a họpụtara m ịbụ ohu distrikti—onye ozi na-ejegharị site na sekit ruo na sekit. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà nọ na Zambia amụbawo ruo ihe karịrị 35,000. Mgbe e mesịrị, n’ihi ọrịa, e kenyeghachiri m ọrụ dị ka onye nlekọta sekit na Copperbelt. Mgbe e mesịrị, Jeanette malitere ịrịa ọrịa, na December 1984 kwa, ọ nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova.

Mgbe ọ nwụsịrị, o wutere m nke ukwuu mgbe ndị ọgọ m na-ekweghị ekwe boro m ebubo na m ji amoosu gbuo ya. Ma ụfọdụ ndị maara banyere ọrịa Jeanette ma soro dọkịta ya kwurịta okwu kọwaara ndị ikwu a nke bụ́ eziokwu. Mgbe e mesịrị, ọnwụnwa ọzọ bịara. Ụfọdụ ndị ikwu chọrọ ka m mee omenala ọdịnala a na-akpọ ukupyanika. N’ógbè m si, omenala a na-achọ na mgbe di ma ọ bụ nwunye mmadụ nwụrụ, onye nke dị ndụ ga-eso onye ahụ́ nke onye ahụ nwụrụ anwụ nwee mmekọahụ. N’ezie, ajụrụ m.

N’ikpeazụ, ndị ikwu m kwụsịrị nrụgide ha. Enwere m ekele na Jehova nyeere m aka iguzosi ike. Otu ọnwa mgbe e lisịrị nwunye m, otu nwanna nwoke bịakwutere m ma kwuo, sị: “Nwanna Kangale, n’ezie ị bụụrụ anyị ihe agbamume n’ọnwụ nwunye gị n’ihi na ọ dịghị otu mkpụrụ omenala na-adịghị enye Chineke nsọpụrụ i mere. Anyị na-ekele gị nke ukwuu.”

Owuwe Ihe Ubi Dị Ebube

Ihe a bụ afọ 65 kemgbe m malitere ozi oge nile m dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Lee ihe ọṅụ ọ bụwooro m n’ime afọ ndị a ịhụ ka e guzobere ọtụtụ narị ọgbakọ nakwa ka e wuru ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ógbè ndị m jeburu ozi na ha dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị! Malite n’ihe dị ka Ndịàmà 2,800 e nwere na 1943, anyị amụbawo ugbu a ruo ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze 122,000 na Zambia. N’ezie, n’afọ gara aga, ihe karịrị mmadụ 514,000 bịara Ememe Ncheta ná mba a, bụ́ nke ọnụ ọgụgụ ndị bi na ya na-erughị nde 11.

Ka ọ dị ugbu a, Jehova na-elekọta m nke ọma. Mgbe ọ dị mkpa ka dọkịta lebara m anya, otu nwanna bụ́ Onye Kraịst na-akpọrọ m gaa ụlọ ọgwụ. Ọgbakọ ka na-akpọ m ikwu okwu ihu ọha, nke a na-enyekwa m ọtụtụ ohere ndị na-ewuli elu. Ọgbakọ m nọ na ya na-eme ndokwa ka ụmụnna nwanyị bụ́ Ndị Kraịst na-abịa edebe ụlọ m ọcha, na-eme ya onye mepụ ibe ya emee, ụmụnna nwoke na-ewepụtakwa onwe ha n’afọ ofufo iduru m gaa nzukọ kwa izu. Amaara m na agaaraghị m enweta nlekọta ịhụnanya dị otú ahụ ma ọlị ma ọ bụrụ na adịghị m ejere Jehova ozi. Ana m ekele ya maka ịnọgide na-eji m eme ihe n’ozi oge nile nakwa maka ọtụtụ ibu ọrụ ndị m buworo ruo ugbu a.

Adịghịzi m ahụ ụzọ nke ọma, mgbe m ji ụkwụ na-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ana m ezu ike ọtụtụ ugboro n’ụzọ. Akpa ozi ọma m yiri ka ọ na-anyịzi arọ karị, n’ihi ya, ana m eme ka ọ ghara ịdị arọ site n’iwepụ akwụkwọ ọ bụla na-agaghị adị m mkpa ná nzukọ. Ozi ọma m bụ n’ụzọ bụ́ isi iduziri ndị na-abịa n’ụlọ m ọmụmụ Bible. Ma, lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụụrụ m ileghachi anya azụ n’afọ ndị gafeworonụ na inwe ike ịtụgharị uche n’uto ndị dị ebube e nweworo! Ejewo m ozi n’ubi ebe okwu Jehova e dekọrọ n’Aịsaịa 60:22 mezuworo n’ụzọ dị ịrịba ama. Ebe ahụ na-ekwu, sị: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ otu puku, onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” N’ezie, anọwo m ndụ hụ ka nke ahụ mere nnọọ, ọ bụghị nanị na Zambia, kama n’ụwa nile. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.

^ par. 50 N’ụzọ dị mwute, ume mesịrị gwụ Nwanna Kangale, ọ nwụkwara n’ikwesị ntụkwasị obi ka a ka na-akwadebe ibipụta isiokwu a.

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Thomson ka alaka ụlọ ọrụ Zambia nọ n’azụ ya

[Foto dị na peeji nke 26]

Alaka ụlọ ọrụ Zambia taa