Ebube Jehova Na-awakwasị Ndị Ya
Ebube Jehova Na-awakwasị Ndị Ya
“Jehova ga-aghọrọ gị ìhè ebighị ebi.”—AỊSAỊA 60:20.
1. Olee otú Jehova si agọzi ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi?
“IHE ndị Ya na-atọ Jehova ụtọ: Ọ ga-eji nzọpụta chọọ ndị dị umeala n’obi mma.” (Abụ Ọma 149:4) Ihe a ka ọbụ abụ oge ochie kwuru, akụkọ ihe mere eme anwapụtawokwa ịbụ eziokwu nke okwu ya. Mgbe ndị Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ na-elekọta ha, na-eme ka ha na-amị mkpụrụ, ma na-echebe ha. N’oge ochie, o mere ka ha merie ndị iro ha. Taa, ọ na-eme ka ha gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ ma na-emesi ha obi ike na a ga-azọpụta ha ná ndabere nke àjà Jizọs. (Ndị Rom 5:9) Ọ na-eme nke a n’ihi na ha mara mma n’anya ya.
2. Ọ bụ ezie na ndị Chineke na-enweta mmegide, olee obi ike ha na-enwe?
2 N’ezie, n’ụwa nke nọ n’oké ọchịchịrị, ndị ‘na-ebi ndụ ná nsọpụrụ Chineke’ ga-enweta mmegide. (2 Timoti 3:12) Otú o sina dị, Jehova na-ahụ ndị mmegide ahụ, ọ na-adọkwa ha aka ná ntị, sị: “Mba ahụ na alaeze ahụ nke na-agaghị efe gị ga-ala n’iyi; ee, a ghaghị ime ka mba ahụ nile tọgbọrọ n’efu.” (Aịsaịa 60:12) Taa, mmegide na-abịa n’ọtụtụ ụzọ. N’ala ụfọdụ, ndị mmegide na-agbalị igbochi ma ọ bụ ịmachibido ofufe ezi Ndị Kraịst na-efe Jehova iwu. N’ala ndị ọzọ, ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè na-awakpo ndị na-efe Jehova ofufe n’ụzọ nkịtị ma na-esu ihe onwunwe ha ọkụ. Otú ọ dị, cheta na Jehova ekpebiworị ihe ga-esi ná mmegide ọ bụla a ga-emegide mmezu nke uche ya pụta. Ndị mmegide ga-ada. Ndị na-ebuso Zaịọn agha, bụ́ nke ụmụ ya nọ na-elu ala na-anọchite anya ya, agaghị enwe ihe ịga nke ọma. Nke ahụ ọ́ bụghị mmesi obi ike na-agba ume sitere n’aka Chineke ukwu anyị, bụ́ Jehova?
Ndị A Gọziri n’Ụzọ Karịrị Ihe A Tụrụ Anya Ya
3. Olee otú e si mee ihe atụ nke ịma mma na ịmị mkpụrụ nke ndị na-efe Jehova ofufe?
3 Nke bụ́ eziokwu bụ na n’ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe a, Jehova agọziwo ndị ya karịa ka ha tụrụ anya ya. Karịsịa, ọ nọgidewo na-achọ ebe ofufe ya na ndị nọ na ya, bụ́ ndị na-aza aha ya, mma. Dị ka amụma Aịzaịa si kwuo, ọ na-agwa Zaịọn, sị: “Ebube Lebanọn ga-abịakwute gị, osisi fir na osisi pine na osisi cypress n’otu; ime ka ọnọdụ ebe nsọ m maa mma, M ga-emekwa ka ọnọdụ ụkwụ m abụọ nwee nsọpụrụ.” (Aịsaịa 60:13) Ugwu ndị ọhịa gbachiri agbachi kpuchiri na-ama nnọọ mma n’ile anya. N’ihi ya, nnukwu osisi ndị akwụkwọ ndụ juru na ha bụ ihe atụ dabara adaba nke ịma mma na ịmị mkpụrụ nke ndị na-efe Jehova ofufe.—Aịsaịa 41:19; 55:13.
4. Gịnị bụ “ebe nsọ” na “ọnọdụ ụkwụ [Jehova],” oleekwa otú e siworo chọọ ha mma?
4 Gịnị bụ “ebe nsọ” na “ọnọdụ ụkwụ [Jehova]” nke a kpọtụrụ uche n’Aịsaịa 60:13? Okwu ndị a na-ezo aka n’ogige nke oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova, nke bụ́ ndokwa nke isi n’aka Jizọs Kraịst na-abịakwute ya n’ofufe. (Ndị Hibru 8:1-5; 9:2-10, 23) Jehova ekwupụtawo nzube ya ime ka ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ dị ebube site n’isi ná mba nile kpọta ndị mmadụ ịbịa nọrọ n’ebe ahụ na-efe ofufe. (Hagaị 2:7) Tupu mgbe ahụ, Aịzaịa n’onwe ya hụrụ oké ìgwè mmadụ sitere ná mba nile ka ha na-enuga n’ùgwù ofufe dị elu nke Jehova. (Aịsaịa 2:1-4) Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, Jọn onyeozi hụrụ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta,” n’ọhụụ. Ha guzo “n’ihu ocheeze Chineke . . . , na-ejekwara ya ozi dị nsọ ehihie na abalị n’ụlọ nsọ ya.” (Mkpughe 7:9, 15) Ebe ọ bụ na e mezuwo amụma a n’oge anyị, a chọwo ụlọ Jehova mma n’ihu anyị.
5. Ọganihu dị aṅaa ka ụmụ Zaịọn nwere?
5 Lee ọganihu nke ihe a nile bụụrụ Zaịọn! Jehova na-ekwu, sị: “N’ọnọdụ ịbụ onye a hapụrụ ahapụ na onye a na-akpọ asị nke ị bụworo, nke ọ na-adịghị onye na-agabiga n’etiti gị, M ga-eme gị ka ị ghọọ [ihe e ji eme ọnụ ruo mgbe ebighị ebi, NW], na ihe obi ụtọ nke ọtụtụ ọgbọ.” (Aịsaịa 60:15) Ka ọ na-erule ngwụsị nke agha ụwa mbụ, “Izrel nke Chineke” nwere n’ezie oge ọ tọgbọrọ n’efu. (Ndị Galeshia 6:16) Ọ dị ya ka “a hapụrụ [ya] ahapụ” kpam kpam n’ihi na ụmụ ya ndị nọ n’ụwa aghọtaghị uche Chineke maka ha nke ọma. Ma, na 1919, Jehova tụtere ndị ohu ya e tere mmanụ, kemgbe ahụkwa, o jiriwo ọganihu ime mmụọ dị ebube gọzie ha. Ọzọkwa, ọ̀ bụ na nkwa e kwere n’amaokwu a adịghị akpali akpali? Jehova ga-ele Zaịọn anya dị ka “ihe e ji eme ọnụ.” Ee, ụmụ Zaịọn, na Jehova n’onwe ya, ga-eji Zaịọn mee ọnụ. Ọ ga-abụ “ihe obi ụtọ,” ihe na-akpata oké ọṅụ. Nke ahụ agaghịkwa abụ nanị ruo nwa oge. Ọnọdụ ihu ọma nke Zaịọn, bụ́ onye ụmụ ya ndị nọ n’elu ala na-anọchite anya ya, ga-adịru “ọtụtụ ọgbọ.” Ọ gaghị abịa ná njedebe ma ọlị.
6. Olee otú ezi Ndị Kraịst si eji ihe onwunwe ndị sitere ná mba dị iche iche eme ihe?
6 Ugbu a, gee ntị ná nkwa ọzọ Chineke Aịsaịa 60:16) Olee otú Zaịọn si na-aṅụ “mmiri ara nke mba dị iche iche” ma na-amị “ara ndị eze”? Ọ bụ n’ụdị na Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị ibe ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ na-eji ihe onwunwe ndị bara uru sitere ná mba dị iche iche eme ihe iji kwalite ofufe dị ọcha. (Jọn 10:16) Onyinye ego ndị a na-enye n’afọ ofufo na-enye aka eme ka nnukwu ọrụ nkwusa na nke izi ihe zuru ụwa ọnụ kwe omume. Iji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ eme ihe n’ụzọ amamihe na-eme ka ọ dị mfe ibipụta Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ọtụtụ narị asụsụ. Taa, ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu karịa otú e nwetụrụla n’akụkọ ihe mere eme na-enweta eziokwu Bible. Ụmụ amaala nke ọtụtụ mba na-amụta na Jehova, bụ́ onye gbapụtara ndị ohu ya e tere mmanụ site ná ndọrọ n’agha ime mmụọ, bụ n’ezie Onye Nzọpụta.
kwere. N’ịgwa Zaịọn okwu, Jehova na-asị: “Ị ga-aṅụkwa mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka ị ga-amị: i wee mara na Mụ onwe m, Jehova, bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, bụ́ Onye dị ike nke Jekọb.” (Ọganihu n’Ime Nhazi
7. Ọganihu dị aṅaa dị ịrịba ama ka ụmụ Zaịọn nweworo?
7 Jehova achọwo ndị ya mma n’ụzọ ọzọ. O jiwo inwe ọganihu n’ime nhazi gọzie ha. Anyị na-agụ n’Aịsaịa 60:17, sị: “N’ọnọdụ ọla M ga-eweta ọlaedo, n’ọnọdụ ígwè M ga-eweta ọlaọcha, n’ọnọdụ osisi M ga-eweta ọla, n’ọnọdụ nkume M ga-eweta ígwè: M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka ndị na-achị gị n’ihe ike ghọọ ezi omume.” Iji ọlaedo edochi anya ọla bụ mmeziwanye ihe, otú ahụ ka ọ dịkwa ihe ndị ọzọ a kpọtụrụ aha. N’ikwekọ na nke a, Izrel nke Chineke ahụwo mmeziwanye ihe na-aga n’ihu n’ihu n’ime nhazi kemgbe ụbọchị ikpeazụ ndị a. Tụlee ihe atụ ole na ole.
8-10. Kọwaa ụfọdụ mmeziwanye ihe n’ime nhazi bụ́ ndị werewooro ọnọdụ kemgbe 1919.
8 Tupu 1919, ọ bụ ndị okenye na ndị dikọn, bụ́ ndị ọgbakọ họpụtara site ná ntụli aka, na-elekọta ọgbakọ dị iche iche nke ndị Chineke. Malite n’afọ ahụ, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ahọpụta onye nduzi ije ozi n’ọgbakọ ọ bụla ka ọ na-elekọta ọrụ ozi ubi. (Matiu 24:45-47) Otú ọ dị, n’ọtụtụ ọgbakọ, ndokwa ahụ enwechaghị ihe ịga nke ọma n’ihi na ụfọdụ ndị okenye a họpụtara site ná ntụli aka akwadoghị ọrụ izisa ozi ọma ahụ n’ụzọ zuru ezu. Ya mere, na 1932, e nyere ọgbakọ dị iche iche ntụziaka ka ha kwụsị ịhọpụta ndị okenye na ndị dikọn site ná ntụli aka. Kama nke ahụ, ha ga-ahọpụta ndị ikom ụfọdụ ije ozi na kọmitii ije ozi site ná ntụli aka ka ha na onye nduzi ije ozi na-arụkọ ọrụ. Nke ahụ yiri “ọla” n’ọnọdụ “osisi”—nnukwu mmeziwanye ihe!
9 Na 1938, ọgbakọ dị iche iche n’ụwa nile kpebiri ịnakwere ndokwa e meziwanyere emeziwanye, bụ́ nke ka kwekọọ n’usoro e depụtara n’Akwụkwọ Nsọ. E nyefere nlekọta nke ọgbakọ n’aka ohu kọmpịnị na ndị ohu ndị ọzọ, ha nile bụ ndị a họpụtara ná nlekọta nke ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche. A dịghịzi enwe ntụli aka! N’ụzọ dị otú a, a na-ahọpụta ndị na-eje ozi n’ọgbakọ n’ụzọ ọchịchị Chineke. Nke ahụ yiri “ígwè” n’ọnọdụ “nkume” ma ọ bụ “ọlaedo” n’ọnọdụ “ọla.”
10 Kemgbe ahụ, a nọgidewo na-enwe ọganihu. Dị ka ihe atụ, na 1972, a hụrụ na ime ka òtù ndị okenye bụ́ ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ a họpụtara n’ụzọ ọchịchị Chineke bụ́ ndị na-enweghị onye na-achị ibe ya, na-elekọta ọgbakọ, kasị kwekọọ n’ụzọ e si lekọta ọgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst na narị afọ mbụ. Ọzọ, ihe dị ka afọ abụọ gara aga, e nwekwuru ọganihu. E nwere mgbanwe n’ihe banyere nduzi nke ụlọ ọrụ ụfọdụ iwu kwadoro, na-eme ka o kwe Òtù Na-achị Isi omume itinye uche n’ụzọ zuru ezu karị n’ọdịmma ime mmụọ nke ndị Chineke kama ịbụ ndị okwu iwu ndị a na-enwe site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị na-adọpụ uche ha.
11. Ònye kpataworo mgbanwe ndị a na-enwe n’ime nhazi n’etiti ndị Jehova, gịnịkwa ka mgbanwe ndị a rụpụtaworo?
11 Ònye na-eme ka e nwee mgbanwe ndị a na-eweta ọganihu? Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Jehova Chineke. Ọ bụ ya na-ekwu, sị: “M ga-eweta ọlaedo.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọ bụkwa ya gara n’ihu ikwu sị: “M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka ndị na-achị gị n’ihe ike ghọọ ezi omume.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ee, ọ bụ Jehova na-elekọta ndị ya. Ọganihu n’ime nhazi nke e buru n’amụma bụ ụzọ ọzọ o si na-achọ ndị ya mma. A gọziwokwa Ndịàmà Jehova n’ọtụtụ ụzọ n’ihi ya. N’Aịsaịa 60:18, anyị na-agụ, sị: “A gaghị anụkwa ihe ike ọzọ n’ala gị, a gaghị anụ mbibi na ntipịa n’ókèala gị nile; ma ị ga-akpọ mgbidi gị nile Nzọpụta, kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị nile Otuto.” Lee ka okwu ndị ahụ si maa mma! Ma, olee otú e siworo mezuo ha?
12. Olee otú udo siworo bịa dịrị n’etiti ezi Ndị Kraịst?
12 Ezi Ndị Kraịst na-elegara nnọọ Jehova anya maka ntụziaka na nduzi, ihe na-esikwa na ya apụta bụ dị ka Aịzaịa buru n’amụma, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” (Aịsaịa 54:13) Ọzọ, mmụọ Jehova na-arụ ọrụ n’ahụ́ ndị ya, udo sokwa ná mkpụrụ nke mmụọ ahụ. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Udo nke ndị Jehova na-enwe n’ihi ya na-eme ka ha bụrụ ebe a pụrụ inweta ume ọhụrụ n’ụwa nke na-eme ihe ike. Ọnọdụ udo ha, bụ́ nke dabeere n’ịhụnanya ezi Ndị Kraịst nwere n’ebe ibe ha nọ, bụ ihe atụ nke ndụ a ga-ebi n’ụwa ọhụrụ. (Jọn 15:17; Ndị Kọlọsi 3:14) N’ezie, onye ọ bụla n’ime anyị na-enwe obi ụtọ inwe udo ahụ na ịkwalite ya, bụ́ nke na-ewetara Chineke anyị otuto na nsọpụrụ, nke bụ́kwa akụkụ bụ́ isi nke paradaịs ime mmụọ anyị!—Aịsaịa 11:9.
Ìhè Jehova Ga-anọgide Na-enwu
13. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ìhè Jehova agaghị akwụsị ịmụkwasị ndị ya?
13 Ìhè Jehova ọ̀ ga-anọgide na-amụkwasị ndị ya? Ee! N’Aịsaịa 60:19, 20, anyị na-agụ, sị: “Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè ọzọ n’ehihie; ma n’onwu maramara ọnwa agaghị enye gị ìhè: ma Jehova ga-aghọrọ gị ìhè ebighị ebi, Chineke gị ga-aghọkwara gị ịma mma gị. Anyanwụ gị agaghị adakwa ọzọ, ọnwa gị agaghị ewepụkwa onwe ya: n’ihi na Jehova ga-aghọrọ gị ìhè ebighị ebi, ụbọchị nile nke iru újú gị ewee zuo ezuo.” Ozugbo “iru újú” nke ndọrọ n’agha ime mmụọ bịara ná njedebe na 1919, ìhè Jehova malitere ịmụkwasị ha. Ihe karịrị afọ 80 ka e mesịrị, ha ka nọ na-enwe ihu ọma Jehova ka ìhè ya nọgidere na-enwu. Ọ gaghịkwa akwụsị. A bịa n’ihe banyere ndị na-efe ya ofufe, Chineke anyị agaghị ‘ada’ dị ka anyanwụ ma ọ bụ ‘wepụ’ onwe ya dị ka ọnwa. Kama nke ahụ, ọ ga na-amụkwasị ha ìhè ruo mgbe ebighị ebi. Lee mmesi obi ike magburu onwe ya nke ahụ bụụrụ anyị bụ́ ndị na-ebi n’ime ụbọchị ikpeazụ nke ụwa a gbara ọchịchịrị!
14, 15. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Chineke nile bụ “ndị ezi omume”? (b) N’ihe banyere Aịsaịa 60:21, mmezu dị aṅaa dị mkpa ka atụrụ ọzọ ahụ na-atụ anya ya?
14 Nụrụzie nkwa ọzọ Jehova na-ekwe banyere ndị na-anọchite anya Zaịọn n’elu ala, bụ́ Izrel nke Chineke. Aịsaịa 60:21 na-asị: “Ndị gị kwa, ha nile ga-abụ ndị ezi omume, ruo mgbe ebighị ebi ka ha ga-enweta ala; alaka nke ọkụkụ m, ọrụ aka m, ime ka M maa mma.” Na 1919, bụ́ mgbe e mere ka Ndị Kraịst e tere mmanụ maliteghachi ọrụ, ha bụ ìgwè nke ndị dị iche. N’ime ụwa nke e ji ime mmehie mara, a ‘kpọwo ha ndị ezi omume’ ná ndabere nke okwukwe siri ike ha nwere n’àjà mgbapụta nke Kraịst Jizọs. (Ndị Rom 3:24; 5:1) Mgbe ahụ, dị ka ụmụ Izrel a tọhapụrụ ná ndọrọ n’agha na Babilọn, ha nwetara “ala,” bụ́ ala ime mmụọ, ma ọ bụ ógbè ịrụ ọrụ, bụ́ ebe ha ga na-anụ ụtọ paradaịs ime mmụọ. (Aịsaịa 66:8) Ọ dịghị mgbe mma yiri nke paradaịs nke ala ahụ mara ga-ebelata n’ihi na, n’adịghị ka Izrel oge ochie, dị ka otu mba, Izrel nke Chineke agaghị aghọ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Okwukwe ha, ntachi obi ha, na ịnụ ọkụ n’obi ha adịghị mgbe ọ ga-akwụsị iwetara aha Chineke nsọpụrụ.
15 Ndị nile so ná mba ime mmụọ ahụ abatawo n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. E dewo iwu Jehova n’obi ha nile, Jehova agbagharawokwa ha mmehie ha ná ndabere nke àjà mgbapụta Jizọs. (Jeremaịa 31:31-34) Ọ na-akpọ ha ndị ezi omume dị ka “ụmụ” ma na-emeso ha ihe dị ka a ga-asị na ha zuru okè. (Ndị Rom 8:15, 16, 29, 30) A gbagharawokwa ndị ibe ha bụ́ atụrụ ọzọ ahụ mmehie ha ná ndabere nke àjà Jizọs, dịkwa ka Ebreham, a kpọwo ha ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke site n’okwukwe. “Ha asawokwa uwe mwụda ha ma mee ka ha na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.” Atụrụ ọzọ a bụ́ ndị ibe ha na-atụkwa anya ngọzi ọzọ dị ịrịba ama. Mgbe ha lanahụsịrị “oké mkpagbu ahụ” ma ọ bụ mgbe a kpọlitesịrị ha n’ọnwụ, ha ga-ahụ mmezu nkịtị nke okwu ndị dị n’Aịsaịa 60:21 mgbe ụwa nile ga-aghọ paradaịs. (Mkpughe 7:14; Ndị Rom 4:1-3) N’oge ahụ, “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11, 29.
A Nọgidere Na-enwe Mmụba
16. Nkwa dị aṅaa dị ịrịba ama ka Jehova kwere, oleekwa otú e siworo mezuo ya?
16 N’amaokwu ikpeazụ nke Aịsaịa isi 60, anyị na-agụ banyere nkwa ikpeazụ Jehova kwere n’isiakwụkwọ a. Ọ na-agwa Zaịọn, sị: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” (Aịsaịa 60:22) N’oge anyị, Jehova emezuwo okwu ya. Mgbe e mere ka Ndị Kraịst e tere mmanụ maliteghachi ọrụ na 1919, ha dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ—n’ezie, “onye nta.” Ọnụ ọgụgụ ha mụbara ka a kpọbatakwuru ndị Izrel ime mmụọ. E mesịakwa, atụrụ ọzọ ahụ malitere inute n’ebe ha nọ n’ọnụ ọgụgụ nọgidere na-ebuwanye ibu. Ọnọdụ udo nke ndị Chineke, bụ́ paradaịs ime mmụọ nke dị ‘n’ala’ ha, adọtawo nnọọ ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu nke na “onye nta” aghọwo n’ezie “mba nwere ume.” Ka ọ dị ugbu a “mba” a—Izrel nke Chineke na ihe karịrị nde “ndị ala ọzọ” isii raara onwe ha nye—bara ụba karịa ọtụtụ mba ndị kwụụrụ onwe ha n’ụwa. (Aịsaịa 60:10) Ụmụ amaala ya nile na-ekere òkè n’igbukepụ ìhè Jehova, nke ahụ na-emekwa ka ha nile bụrụ ndị mara mma n’anya ya.
17. Olee otú ntụle a a tụlere Aịsaịa isi 60 siworo metụta gị?
17 Ee, ọ bụ ihe na-ewusi okwukwe ike ịtụle isi ihe ndị dị n’Aịsaịa isi 60. Ọ bụ ihe na-akasi obi ịhụ na ogologo oge tupu ya emee, Jehova maara na ndị ya ga-abanye ná ndọrọ n’agha ime mmụọ ma mesịa bụrụ ndị e weghachiri. Ọ na-atụ anyị n’anya na ogologo oge tupu ya emee, Jehova hụrụ mmụba dị ukwuu a ga-enwe n’ọnụ ọgụgụ ndị na-efe ezi ofufe n’oge anyị. Ọzọkwa, lee ihe nkasi obi ọ bụ icheta na Jehova agaghị ahapụ anyị! Lee ka mmesi obi ike ahụ bụ́ na ọnụ ụzọ ámá nke “obodo” ahụ ga-anọgide na-eghe oghe iji nabata “ndị nile nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi” nke ọma si na-egosipụta ịhụnanya! (Ọrụ 13:48) Jehova ga-anọgide na-amụkwasị ndị ya ìhè. Zaịọn ga-anọgide bụrụ ihe e ji eme ọnụ ka ụmụ ya na-ekwe ka ìhè ha na-enwusikwu ike. (Matiu 5:16) N’ezie, anyị na-ekpebisikwu ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịnọ Izrel nke Chineke nso na iji ihe ùgwù nke igbukepụ ìhè nke Jehova kpọrọ ihe!
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• N’ihe banyere mmegide, obi ike dị aṅaa ka anyị nwere?
• Olee otú ụmụ Zaịọn siworo ‘ṅụọ mmiri ara nke mba dị iche iche’?
• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova siworo ‘weta ọla n’ọnọdụ osisi’?
• Àgwà abụọ dị aṅaa ka a kọwapụtara n’Aịsaịa 60:17, 21?
• Olee otú “onye nta” siworo ghọọ “mba nwere ume”?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18]
AMỤMA AỊSAỊA—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ
A kọwapụtara isi ihe ndị dị n’isiokwu a n’okwu e kwuru ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” nke 2001/2002. Ná ngwụsị nke okwu ahụ, n’ọtụtụ ebe, ọkà okwu kwuru ya wepụtara akwụkwọ ọhụrụ nke isiokwu ya bụ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke Abụọ. E wepụtawo Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke Mbụ n’afọ bu ya ụzọ. Site ná mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ a, e nwere ntụle kwesịrị oge ya nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ amaokwu nile nke akwụkwọ Aịsaịa ugbu a. Mpịakọta ndị a bụ ezigbo ihe enyemaka n’ime ka anyị ghọtakwuo ma nwekwuo ekele maka akwụkwọ amụma Aịsaịa nke na-ewusi okwukwe ike.
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
N’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ, ‘Jehova ji nzọpụta na-achọ ndị ya mma’
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Ndị Chineke na-eji ihe onwunwe ndị bara uru sitere ná mba dị iche iche eme ihe n’ịkwalite ofufe dị ọcha
[Foto dị na peeji nke 17]
Jehova ejiriwo inwe ọganihu n’ime nhazi na udo gọzie ndị ya