Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ka Anyị Na-eme Ihe Ọma n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”

“Ka Anyị Na-eme Ihe Ọma n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”

“Bịakwutenụ m, . . . M Ga-emekwa Ka Unu Nwee Ume Ọhụrụ”

“Ka Anyị Na-eme Ihe Ọma n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”

IKWUSA na izi ozi ọma nke Alaeze Chineke bụ ọrụ bụ́ isi Jizọs rụrụ. (Mak 1:14; Luk 8:1) Ebe ọ bụ na ụmụazụ Kraịst na-achọ iṅomi ya, ha na-ele ọrụ ịkụzi ozi Bible banyere Alaeze Chineke anya dị ka ọrụ bụ́ isi ná ndụ ha. (Luk 6:40) N’ezie, ọ na-enye Ndịàmà Jehova obi ụtọ ịhụ otú ozi Alaeze ahụ si ewetara ndị nabatara ya ume ọhụrụ na-adịgide adịgide—dị nnọọ ka o mere mgbe Jizọs nọ n’ụwa.—Matiu 11:28-30.

E wezụga ịkụzi Okwu Chineke, Jizọs rụkwara ọrụ ọma ndị ọzọ, dị ka ịgwọ ndị ọrịa na inye ndị agụụ na-agụ nri. (Matiu 14:14-21) N’ụzọ yiri nke ahụ, tụkwasị n’ọrụ nkụzi Bible ha, Ndịàmà Jehova na-emekwa ihe ndị ọzọ iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. E kwuwerị, Akwụkwọ Nsọ na-akwadebe Ndị Kraịst “maka ezi ọrụ ọ bụla” ma na-agba ha ume ịdị “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ.”—2 Timoti 3:16, 17; Ndị Galeshia 6:10.

“Ụmụnna Anyị Nọ Ya”

Na September 1999, ala ọma jijiji na-emebi ihe kpara Taiwan aka. Ọnwa ole na ole ka e mesịrị, oké mmiri ozuzo na snow kpatara otu n’ime ọdachi ndị na-emere onwe ha kasị njọ e nwetụrụla na Venezuela. N’oge na-adịbeghị nnọọ anya, oké idei mmiri kpara mba Mozambique aka ọjọọ. N’ihe atụ atọ a nile, Ndịàmà Jehova bu nri, mmiri, ọgwụ, uwe, ụlọ ntu, na ihe ndị e ji esi nri gaa ngwa ngwa n’ebe ndị ahụ ihe mere maka ndị ọdachi ndị ahụ metụtara. Ndị ọrụ afọ ofufo nwere nkà ịgwọ ọrịa guzobere ihe yiri ebe a na-elekọta ndị ahụ na-adịghị ike iji gwọọ ndị merụrụ ahụ́, ndị ọrụ afọ ofufo na-ewukwa ihe owuwu wuru ụlọ ọhụrụ dị iche iche maka ndị na-enweghịzi ụlọ.

Enyemaka ndị a ihe metụtara nwetara n’oge ya metụrụ ha n’ahụ́. “Mgbe anyị nọ nnọọ n’enwetụghị olileanya, ụmụnna anyị nọ ya,” ka Malyori, bụ́ onye nnukwu snow dara na Venezuela bibiri ụlọ ya, na-ekwu. Mgbe ndị ọrụ afọ ofufo wusịịrị ezinụlọ Malyori ebe obibi dị nnọọ ọhụrụ, o ji oké olu kwuo, sị: “Anyị apụghị ma ọlị ikele Jehova n’ụzọ zuru ezu maka ihe nile o mewooro anyị!” Mgbe ndị idei mmiri metụtara na Mozambique natasịrị mkpịsị ugodi nke ebe obibi ha e wuru ọhụrụ, ha dum malitere ịbụ abụ Alaeze bụ́ “Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị” ná mberede. *

Inyere ndị nọ ná mkpa aka mekwara ka ndị ọrụ afọ ofufo ahụ nwee ume ọhụrụ. “Obi dị m ụtọ inwe ike inyere ụmụnna ndị a tara ahụhụ nke ukwuu aka,” ka Marcelo, bụ́ onye jere ozi dị ka onye nọọsụ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị na Mozambique, kwuru. Huang, bụ́ onye ọrụ afọ ofufo na Taiwan, kwuru, sị: “Ọ bụ ihe oké ọṅụ ikere òkè n’ibugara ụmụnna nọ ná mkpa nri na ụlọ ntu. Ọ na-ewusi okwukwe ike.”

Ọrụ Afọ Ofufo nke Rụpụtara Ihe

Ọrụ afọ ofufo ewetawokwara ọtụtụ iri puku ndị mkpọrọ n’ụwa nile ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. N’ụzọ dị aṅaa? N’afọ ndị na-adịbeghị anya, Ndịàmà Jehova enyewo ndị e ji eji n’ihe dị ka ụlọ mkpọrọ 4,000 na United States nanị akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị dị 30,000. Tụkwasị na nke ahụ, n’ebe o kwere mee, Ndịàmà na-aga n’ụlọ mkpọrọ n’onwe ha iji soro ndị mkpọrọ mụọ Bible na iji duzie nzukọ Ndị Kraịst. Ndị mkpọrọ hà na-erite uru na ya?

Ụfọdụ ndị mkpọrọ na-amụ Bible na-amalite isoro ndị mkpọrọ ibe ha na-ekerịta ozizi na-enye ume ọhụrụ nke Okwu Chineke. N’ihi ya, n’ọtụtụ ụlọ mkpọrọ gburugburu ụwa, e nwere ìgwè dị iche iche nke ndị mkpọrọ na-efekọ Jehova ọnụ ugbu a. “Ìgwè anyị na-eme nke ọma,” ka otu onye mkpọrọ nọ n’Oregon U.S.A., kọrọ na 2001. “Anyị nwere ndị nkwusa Alaeze 7 ma na-eduzi ọmụmụ Bible 38. Ihe karịrị mmadụ 25 na-abịa maka okwu ihu ọha na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, mmadụ 39 bịakwara Ememe Ncheta [nke ọnwụ Kraịst]. A ga-eme mmadụ atọ ọzọ baptizim n’oge na-adịghị anya!”

Abamuru na Ọṅụ

Ndị na-arụ n’ụlọ mkpọrọ achọpụtawo na ọrụ afọ ofufo a na-arụpụta ihe. Ihe kasị amasị ndị ọrụ a bụ abamuru na-adịgide adịgide nke ọrụ afọ ofufo a. Otu akụkọ na-ekwu, sị: “N’ime afọ iri a nọworo na-arụ ọrụ a, ọ dịbeghị onye ọ bụla e mere baptizim n’ụlọ mkpọrọ dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova nke bịaghachiworo n’ụlọ mkpọrọ—n’ụzọ dị iche na ọ̀tụ̀tụ̀ dị pasent 50-60 nke ndị ìgwè ndị ọzọ na-alọghachi.” N’ịbụ onye ihe Ndịàmà bụ́ ndị ọrụ afọ ofufo rụpụtara kpaliri, otu ụkọchukwu nke otu ụlọ mkpọrọ dị n’Idaho kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, sị: “Ọ bụ ezie na ekweghị m ná nkwenkwe okpukpe unu, òtù unu masịrị m nke ukwuu.”

Inyere ndị mkpọrọ aka abụwokwara ndị ọrụ afọ ofufo ahụ ihe na-enye ụgwọ ọrụ. Mgbe otu onye ọrụ afọ ofufo duzisịịrị otu ìgwè ndị mkpọrọ bụ́ ndị bụrụ abụ Alaeze na nke mbụ ya nzukọ, o dere, sị: “Ọ bụ ihe na-agba ume ịhụ ndị ikom 28 ka ha na-esonye n’ịbụku Jehova abụ otuto. Ha bụkwara ya n’olu dara ụda! Lee ihe ùgwù ọ bụ ịnọ n’ihe omume dị otú ahụ!” Otu onye ọrụ afọ ofufo nke na-eleta ụlọ mkpọrọ dị iche iche n’Arizona kwuru, sị: “Lee ngọzi ọ bụworo ikere òkè n’ọrụ a pụrụ iche!”

Ndịàmà bụ́ ndị ọrụ afọ ofufo gbaa gburugburu ụwa na-ekwere ngwa ngwa n’okwu Jizọs, bụ́ onye kwuru, sị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ha na-anwapụtakwa na ịgbaso ndụmọdụ Bible nke imere mmadụ nile ihe ọma, na-enye ume ọhụrụ n’ezie.—Ilu 11:25.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Lee abụ nke 85 n’akwụkwọ bụ́ Sing Praises to Jehovah, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 8]

Venezuela

[Foto dị na peeji nke 8]

Taiwan

[Foto dị na peeji nke 8]

Mozambique