Nkasi Obi E Si n’Ezi Ihe Ọmụma Banyere Chineke Enweta
Nkasi Obi E Si n’Ezi Ihe Ọmụma Banyere Chineke Enweta
NYE ụfọdụ ndị, ihe Bible na-ekwu banyere ịhụnanya na ebere Chineke na-ewelite ajụjụ ndị na-enye nsogbu n’obi. Ha na-ajụ, sị: Ọ bụrụ na Chineke chọrọ iwepụ ihe ọjọọ, mara otú e si ewepụ ya, ma nwee ike ime ya, gịnị mere ihe ọjọọ ji nọgide na-aba ụba? Nye ha, ihe bụ́ nsogbu bụ ime ka ihe atọ yiri ka ha na-emegiderịta onwe ha kwekọọ: (1) Chineke kasị ike; (2) Chineke na-ahụ n’anya ma dị mma; nakwa (3) ihe ndị na-akpata ọdachi anọgide na-eme. Ha na-eche na ebe ọ bụ na nke ikpeazụ a bụ eziokwu a na-apụghị ịgbagha agbagha, mgbe ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, otu n’ime abụọ ndị nke ọzọ apụghị ịbụ eziokwu. Nye ha, ma ọ́ bụghị na Chineke enweghị ike ịkwụsị ihe ọjọọ, ya abụrụ na ọ naghị emetụ ya n’ahụ́.
Ka ọtụtụ ụbọchị gasịrị ka e bibisịrị Ebe Azụmahịa Ụwa dị na New York, otu onye ndú okpukpe a ma ama na United States kwuru, sị: “Ajụọla m ọtụtụ narị ugboro ná ndụ m ihe mere Chineke ji ekwe ka a na-enwe ọdachi na nhụjuanya. Aghaghị m ikweta na n’ezie amaghị m azịza ya n’ụzọ zuru ezu, ọbụna n’ụzọ ga-eju mụ onwe m afọ.”
N’imeghachi omume n’okwu a, otu prọfesọ nkà mmụta okpukpe dere na “ozizi bụ́ ịgba” nke onye ndú okpukpe a kụziri metụrụ ya n’ahụ́. Ọ kwadokwara echiche nke otu ọkà mmụta bụ́ onye dere, sị: “Nhụjuanya ịbụ nke na-ekweghị nghọta bụ akụkụ nke Chineke ịbụ onye na-ekweghị nghọta.” Ma ọ̀ bụ ihe na-apụghị ikwe omume n’ezie ịghọta ihe mere Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ dịrị?
Ebe Ihe Ọjọọ Si Malite
N’ụzọ dị iche n’ihe ndị ndú okpukpe pụrụ ikwu, Bible adịghị egosi na nkwere Chineke kweere ka ihe ọjọọ dịrị bụ ihe a na-apụghị ịghọta aghọta. Isi ihe ga-enye aka n’ịghọta okwu metụtara ihe ọjọọ bụ ịmata na Jehova ekeghị ụwa ọjọọ. O kere di na nwunye mbụ dị ka ndị zuru okè, ndị na-enweghị mmehie. Jehova lere ihe o kere eke ma hụ na ọ “dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:26, 31) Ọ bụ nzube ya ka Adam na Iv gbasaa Paradaịs nke Iden ahụ ruo ụwa nile ma jiri ndị mmadụ nwere obi ụtọ nọ n’okpuru nchebe nke ọbụbụeze ịhụnanya ya mejupụta ya.—Aịsaịa 45:18.
Ihe ọjọọ si n’aka otu mmụọ e kere eke malite bụ́ onye, ọ bụ ezie na o kwesịburu ntụkwasị obi nye Chineke, bịara zụlite ọchịchọ nke ịbụ onye a ga-efe ofufe. (Jems 1:14, 15) Nnupụisi ya pụtara ìhè n’ụwa mgbe ọ kpaliri di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ isonyere ya n’imegide Chineke. Kama ido onwe ha n’okpuru ntụziaka doro anya Chineke nyere bụ́ ịghara iri ma ọ bụ imetụ mkpụrụ nke osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ aka, Adam na Iv weere ụfọdụ ya ma rie. (Jenesis 3:1-6) Site n’ime otú ahụ, ọ bụghị nanị na ha nupụụrụ Chineke isi, kamakwa, ha gosiri na ha chọrọ inwere onwe ha pụọ n’ebe ọ nọ.
E Welitere Ihe Iseokwu Metụtara Omume
Nnupụisi ahụ nke weere ọnọdụ n’Iden welitere otu ihe iseokwu metụtara omume, ihe ịma aka nke dị mkpa n’eluigwe na ala. Ụmụ mmadụ ahụ nupụrụ isi mere ka e nwee obi abụọ ma Jehova ọ̀ na-achị ihe o kere eke n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Onye Okike ò nwere ikike ịchọ ka ihe a kpọrọ mmadụ rubere ya isi n’ụzọ zuru ezu? Ndị mmadụ hà ga-eme nke ọma karị ma ọ bụrụ na ha emee ihe n’adabereghị n’ebe ọ nọ?
Jehova mere ihe banyere aka a a mara ịchịisi ya n’ụzọ gosipụtara ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe, na ike ya n’ụzọ zuru okè. Ọ pụrụ ijiwo ike ya kpochapụ nnupụisi ahụ ozugbo. Nke ahụ pụrụ iyiwo ikpe ziri ezi, ebe ọ bụ na o nwere ikike ime otú ahụ. Ma ime otú ahụ agaraghị aza ajụjụ ndị metụtara omume bụ́ ndị e weliteworo. N’aka nke ọzọ, Chineke pụrụ ileghaworo nnọọ mmehie ahụ anya. Ime otú ahụ pụrụ iyi ụfọdụ ndị taa ka ihe na-egosi ịhụnanya. Ma, nke a kwa agaraghị agbagha nzọrọ Setan zọọrọ na ụmụ mmadụ ga-eme nke ọma ma ọ bụrụ na ha na-achị onwe ha. Ọzọkwa, ime otú ahụ ọ́ gaghị akpali ndị ọzọ isikwa n’ụzọ Jehova wezụga onwe ha? Ihe ga-esi n’ime ya pụta ga-abụ nhụjuanya na-enweghị njedebe.
N’amamihe ya, Jehova ekwewo ka ụmụ mmadụ na-eme otú masịrị ha ruo oge ụfọdụ. Ọ bụ ezie na nke a apụtawo ịhapụ ihe ọjọọ ka ọ nọgide ruo nwa oge, ụmụ mmadụ esiwo otú a nwee ohere igosipụta ma hà ga-achịli onwe ha nke ọma n’adabereghị na Chineke, na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ nke onwe ha banyere ezi ihe na ihe ọjọọ. Gịnị siworo n’ime ya pụta? Agha, ikpe na-ezighị ezi, mmegbu, na nhụjuanya anọgidewo bụrụ ihe jupụtara n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ọdịda isi ahụ e nupụrụ megide Jehova ga-ada n’ikpeazụ ga-edozi ihe iseokwu ndị ahụ e welitere n’Iden n’ụzọ na-adịgide adịgide.
Ka ọ dịgodị, Chineke egosipụtawo ịhụnanya ya site n’inye Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ́ onye nyere ndụ mmadụ ya dị ka àjà mgbapụta. Nke a na-enyere ụmụ mmadụ na-erube isi aka ịbụ ndị a tọhapụrụ n’amamikpe nke mmehie Jọn 3:16.
na ọnwụ bụ́ nke nnupụisi Adam kpataworo. Ihe mgbapụta ahụ emeghewo ụzọ maka ndụ ebighị ebi nye ndị nile ga-egosipụta okwukwe na Jizọs.—Anyị nwere mmesi obi ike na-akasi obi sitere n’aka Jehova, na nhụjuanya nke ụmụ mmadụ agaghị adịte aka. “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa,” ka ode abụ ahụ dere. “Ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:10, 11.
Ọdịnihu nke Nchebe na Obi Ụtọ
Mmezu nke amụma ndị dị na Bible na-egosi na oge Chineke ga-eweta ọrịa, iru újú, na ọnwụ ná njedebe dị nso. Rịba ama ihe ndị magburu onwe ha gaje ịbịa bụ́ ndị e gositụrụ Jọn onyeozi n’ọhụụ. O dere, sị: “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ; n’ihi na eluigwe mbụ na ụwa mbụ agabigawo, oké osimiri adịkwaghị. . . . Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara [ihe a kpọrọ mmadụ]. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” N’okwu e ji mesie ya ike na a pụrụ ịtụkwasị nkwa ndị a obi, a gwara Jọn, sị: “Dee ha, n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ma bụrụ eziokwu.”—Mkpughe 21:1-5.
Gịnị banyere ọtụtụ ijeri ndị aka ha dị ọcha bụ́ ndị nwụworonụ kemgbe ahụ e nupụchara isi n’Iden? Jehova kwere nkwa na ya ga-eme ka ndị nọ n’ụra ọnwụ ugbu a dịghachi ndụ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Enwekwara m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Ndị a ga-enwe atụmanya nke ibi n’ụwa nke “ezi omume gajekwa ibi n’ime [ya].”—2 Pita 3:13.
Dị nnọọ ka nna na-ahụ n’anya ga-ekwe ka nwa ya gabiga ịwa ahụ́ na-egbu mgbu ma ọ bụrụ na ọ maara na ọ ga-eweta abamuru ndị na-adịgide adịgide, n’otu aka ahụ, Jehova ekwewo ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ ruo nwa oge n’ụwa. Ma, ngọzi ndị na-adịru ebighị ebi na-echere ndị nile na-achọ ime uche Chineke. Pọl kọwara, sị: “E doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu, ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ya kama site n’aka onye ahụ nke doro ya, na-adabere n’olileanya bụ́ na a ga-emekwa ka ihe e kere eke n’onwe ya nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:20, 21.
Nke a bụ nnọọ ezi akụkọ—ọ bụghị ụdị nke anyị na-ekiri na telivishọn ma ọ bụ gụta n’akwụkwọ akụkọ, kama ọ bụ akụkọ ọma. Ọ bụ akụkọ kasị mma nke sitere n’aka “Chineke nke nkasi obi nile,” bụ́ onye na-eche banyere anyị n’ezie.—2 Ndị Kọrint 1:3.
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
Oge gaferenụ egosipụtawo na ihe a kpọrọ mmadụ apụghị ịchị onwe ha nke ọma n’adabereghị na Chineke
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Ezinụlọ si Somalia: FOTO UN 159849/M. GRANT; bọmbụ atọm: foto USAF; ogige ịta ahụhụ: foto U.S. National Archives