Mgbalị Ndị Na-akwalite Ụkpụrụ Omume Ọma
Mgbalị Ndị Na-akwalite Ụkpụrụ Omume Ọma
Ná ngwụsị afọ 2001, ndị gere akụkọ ụwa na Redio Mozambique nụrụ ịma ọkwà a:
“President Rịpọblik a letara ihe owuwu nke alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Maputo. Ọ gbara òtù okpukpe a ume itinyekwu mgbalị n’ịkwalite ụkpụrụ omume dị mma n’etiti ezinụlọ dị iche iche nakwa n’ịkụziri ndị toworo eto ịgụ na ide. Ihe dị ka mmadụ 10,000 eritelarị uru n’usoro ihe omume ndị a. Dị ka President Chissano si kwuo, e kwesịrị ịja ihe omume ndị dị otú a mma, ebe ọ bụ na ha na-ekere òkè bara uru n’obodo n’idozi nsogbu agụmakwụkwọ nke mba a ka na-eche ihu.”
Ọkwà ahụ ji okwu a e tinyere na teepu nke president ahụ kwuru gaa n’ihu: “Ọ bụ nnọọ ihe agbamume ịhụ mmasị ọtụtụ ndị nwere n’ime ka a mụta ịgụ na ide. Ọ na-egosi anyị na ụmụ amaala nkịtị gaje inyere anyị aka ịmụba ọnụ ọgụgụ ndị maara ịgụ na ide. Ya mere, ọ ga-amasị m nnọọ ịgba Ndịàmà Jehova ume itinyesi mgbalị ike n’usoro ihe omume ha nke ịkụzi ka e si agụ na ka e si ede, n’asụsụ ọ bụla. Ihe dị mkpa n’ezie bụ ka e nwee ndị maara ịgụ na ide nakwa ka ndị mmadụ nwee ike ikwurịta okwu n’ụzọ dị mfe karị ma kere òkè ka ukwuu n’ọdịnihu n’ọrụ ịkụzi ihe.”
Ndịàmà Jehova nọ na Mozambique nwere klas ịgụ na ide n’ebe ndị dị 850 ná mba ahụ dum ka ndị mmadụ wee nwee ike ịgụrụ onwe ha Okwu Chineke. Tụkwasị na nke ahụ, ha na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi dị ihe dị ka 50,000 kwa izu n’efu. Ihe a nile so n’usoro e ji na-akụzi Bible bụ́ nke a na-eme n’ala 235. (Matiu 24:14) Gị onwe gị kwa pụrụ irite uru n’usoro ihe omume a. Biko atụla ụjọ ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu.