Ọmụmụ Ihe Onwe onye nke Na-akwadebe anyị Dị Ka Ndị Ozizi
Ọmụmụ Ihe Onwe onye nke Na-akwadebe anyị Dị Ka Ndị Ozizi
“Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè nye mmadụ nile. Na-elezi onwe gị nakwa ozizi gị anya mgbe nile.” —1 Timoti 4:15, 16.
1. Gịnị bụ eziokwu banyere oge na ọmụmụ ihe onwe onye?
“IHE ọ bụla nwere oge,” ka Bible na-ekwu n’Eklisiastis 3:1. Otú ahụ ka ọ dị n’ezie ma a bịa n’ọmụmụ ihe onwe onye. Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ichebara ihe ime mmụọ echiche ma ọ bụrụ na ha na-eme ya n’oge ma ọ bụ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị. Dị ka ihe atụ, mgbe ị rụsisịrị ọrụ ike n’ụbọchị ma rijuo nnọọ nri abalị afọ, ọ̀ ga-adị gị ka gị mụwa ihe, karịsịa ma ọ bụrụ na ị nọdụrụ ala n’oche dị nnọọ ntụsara ahụ́ na-ekiri TV? O yighị ka ọ ga-adị gị. Ya mere, gịnị bụ ihe ngwọta ya? N’ụzọ doro anya, anyị aghaghị ịhọrọ oge anyị ga-eji na-amụ ihe na ebe anyị ga-anọ na-amụ ya, na-eburu n’uche inweta abamuru kasịnụ ná mgbalị anyị.
2. Olee oge na-akasị mma mgbe mgbe iji na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye?
2 Ọtụtụ ndị na-achọpụta na oge kasị adị ha mma iji na-amụ ihe bụ isi ụtụtụ bụ́ mgbe uche ha Abụ Ọma 143:8) Aịzaịa onye amụma gosipụtara nghọta yiri nke ahụ mgbe ọ sịrị: “Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, enyewo m ire nke ndị mmụta, ka m wee mara iwere okwu kwagide onye dara mbà: Ọ na-akpọte ntị m kwa ụtụtụ, Ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị mmụta.” Ihe a na-ekwu bụ na ọ dị anyị mkpa ịmụ ihe na iso Jehova na-enwe mkparịta ụka chiri anya mgbe uche anyị dị nkọ, oge ọ sọrọ ya ya bụrụ.—Aịsaịa 50:4, 5; Abụ Ọma 5:3; 88:13.
kasị adị nkọ dị ka o kwesịrị. Ndị ọzọ na-eji oge ezumike ehihie amụ ihe nwa oge. Rịba ama aka e zoro n’oge maka ihe ime mmụọ ndị dị mkpa n’ihe atụ ndị na-esonụ. Eze Devid nke Izrel oge ochie dere, sị: “Mee m ka m nụrụ ebere Gị n’ụtụtụ; n’ihi na Gị ka m tụkwasịworo obi: mee m ka m mara ụzọ nke m ga-eje ije n’ime ya; n’ihi na Gị ka m buliworo mkpụrụ obi m nye.” (3. Olee ọnọdụ ndị a chọrọ maka ọmụmụ ihe dị irè?
3 Ihe ọzọ na-eme ka ọmụmụ ihe dị irè bụ na anyị ekwesịghị ịhọrọ ịnọdụ ala n’oche kasị dị ntụsara ahụ́ ma ọ bụ n’oche e ji emere ihe ndina. Nke a abụghị ụzọ e si eme ka uche dịrị n’ihe. Mgbe anyị na-amụ ihe, uche anyị aghaghị ịdị n’ihe anyị na-amụ, o yikwara ka ịnọ n’ọnọdụ dị ntụsara ahụ́ nke ukwuu ọ̀ ga-eme ihe megidere nke ahụ. Ihe ọzọ a chọrọ maka ọmụmụ ihe na ntụgharị uche bụ ebe dịtụ jụụ na ebe a na-enweghị ihe ndọpụ uche. Mmadụ ịnwa ịnọ ebe redio, TV, ma ọ bụ ụmụaka na-adọpụ uche ya na-amụ ihe agaghị arụpụta ihe kasị mma. Mgbe Jizọs chọrọ ịtụgharị uche, ọ gara n’ebe dị jụụ. O kwukwara banyere uru dị n’ịga n’ebe zoro ezo maka ikpe ekpere.—Matiu 6:6; 14:13; Mak 6:30-32.
Ọmụmụ Ihe Onwe Onye nke Na-akwadebe Anyị Ịza Ajụjụ
4, 5. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka broshuọ Na-achọ si bụrụ ihe enyemaka dị irè?
4 Ọmụmụ ihe onwe onye na-enye afọ ojuju mgbe anyị ji ihe ndị na-enye aka n’ịmụ Bible enyocha isiokwu n’ụzọ miri emi karị, karịsịa mgbe anyị na-eme ya iji zaa ajụjụ mmadụ ji ezi obi jụọ. (1 Timoti 1:4; 2 Timoti 2:23) Ọtụtụ ndị ọhụrụ na-amalite site n’ịmụ broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, * bụ́ nke e nwere ugbu a n’asụsụ 261. Ọ bụ akwụkwọ dị nnọọ mfe ma kpọọ okwu aha, ọ dabekwaara kpam kpam na Bible. Ọ na-enyere ndị na-agụ ya aka ịghọta ngwa ngwa ihe Chineke chọrọ n’aka ha maka ezi ofufe. Otú ọ dị, ụzọ e si hazie ya adịghị enye ohere maka ihe ọmụmụ sara mbara n’isiokwu nke ọ bụla. Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ Bible ajụọ ezigbo ajụjụ banyere otu isi ihe dabeere na Bible nke unu na-amụ banyere ya, olee otú ị ga-esi nwetakwuo ihe ọmụma dabeere na Bible nke ga-enyere ya aka ịza ajụjụ ndị ahụ?
5 Ọ dịịrị ndị nwere Watchtower Library nke dị na CD-ROM n’asụsụ ha mfe iji kọmputa chọta ọtụtụ ebe a pụrụ inweta ihe ọmụma. Ma gịnị banyere ndị na-enweghị kọmputa? Ka anyị nyochaa isiokwu abụọ a tụlere na broshuọ Na-achọ iji hụ otú anyị pụrụ isi nwetakwuo nghọta ma nwee ike inye azịza zuru ezu karị—nke ka nke ma ọ bụrụ na mmadụ ajụọ ajụjụ ndị dị ka, Ònye bụ Chineke? na gịnị ka Jizọs dị ka ya n’ezie?—Ọpụpụ 5:2; Luk 9:18-20; 1 Pita 3:15.
Ònye Bụ Chineke?
6, 7. (a) Ajụjụ dị aṅaa na-ebilite banyere Chineke? (b) Olee otu ihe dị oké mkpa nke otu ụkọchukwu hapụrụ ikwu n’okwuchukwu ya?
6 Ihe Ọmụmụ nke 2 na broshuọ Na-achọ zara ajụjụ ahụ dị oké mkpa bụ́, Ònye Bụ Chineke? Nke a bụ isi ihe metụtara nkwenkwe n’ihi na mmadụ apụghị ife ezi Chineke ahụ ofufe ma ọ bụrụ na ọ maghị Ya ma ọ bụ ikekwe na-enwe obi abụọ ma ọ̀ dị adị. (Ndị Rom 1:19, 20; Ndị Hibru 11:6) Ma, ndị mmadụ gburugburu ụwa nwere ọtụtụ echiche banyere onye Chineke bụ. (1 Ndị Kọrint 8:4-6) Nkà ihe ọmụma okpukpe nile na-enye azịza dịgasị iche iche banyere onye Chineke bụ. Na Krisendọm, ọtụtụ okpukpe na-ewere Chineke dị ka Atọ n’Ime Otu. Otu ụkọchukwu a ma ama na United States kwuru okwuchukwu nke isiokwu ya bụ “Ị̀ Maara Chineke?” ma ọ kpọtụghị aha Chineke n’okwu ya dum, n’agbanyeghị na o hotara ihe ọtụtụ ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ihe mere bụ na Bible o ji mee ihe bụ nsụgharị nke ji “Onyenwe anyị” nke a pụrụ ịghọta n’ọtụtụ ụzọ na nke a na-amaghị onye e bu n’uche na ya mee ihe kama ịbụ nke ji Jehova ma ọ bụ Yahweh mee ihe.
7 Legodị otu isi ihe dị mkpa ụkọchukwu ahụ na-ekwughị mgbe o hotara Jeremaịa 31:33, 34: “‘Ọ dịghịzi onye ga-akụziri onye agbata obi ya, ọ dịghịkwa onye ga-akụziri nwanne ya, sị, “Maranụ Onyenwe anyị” [Hibru, “Maranụ Jehova”], n’ihi na ha nile ga-amara M, site n’onye kasị nta n’ime ha ruo n’onye kasị ukwuu n’ime ha,’ ka Onyenwe anyị [Hibru, Jehova] na-ekwu.” Nsụgharị o ji mee ihe ejighị aha ahụ e ji mara Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe.—Abụ Ọma 103:1, 2.
8. Gịnị na-egosi mkpa iji aha Chineke na-eme ihe dị?
8 Abụ Ọma 8:9 na-egosi ihe mere o ji dị oké mkpa iji aha Jehova na-eme ihe: “Jehova, Onyenwe anyị, lee otú aha Gị dị ebube n’ụwa nile!” Jiri nke ahụ tụnyere: “ONYENWE ANYỊ, bụ́ Onyenwe anyị, lee ka aha gị si magbuo onwe ya n’ụwa nile!” (King James Version; leekwa The New American Bible, The Holy Bible—New International Version, Tanakh—The Holy Scriptures) Ma, dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, anyị pụrụ inweta “ihe ọmụma Chineke” ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka Okwu ya na-enye anyị nghọta. Ma olee ihe e ji amụ Bible nke ga-aza ajụjụ anyị ngwa ngwa banyere mkpa aha Chineke dị?—Ilu 2:1-6.
9. (a) Olee akwụkwọ pụrụ inyere anyị aka ịkọwa mkpa iji aha Chineke eme ihe dị? (b) Olee otú ọtụtụ ndị nsụgharị siworo ghara ịkwanyere aha Chineke ùgwù?
9 Anyị pụrụ ịga na broshuọ bụ́ Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, nke a sụgharịworo n’asụsụ 69. * Nkebi bụ́ “Aha Chineke—Ihe Ọ Pụtara na Ụzọ E Si Akpọ Ya” (peeji nke 6-11) na-egosi n’ụzọ doro anya na Tetragrammaton Hibru (site n’okwu Grik pụtara “mkpụrụ akwụkwọ anọ”) pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 n’ihe odide Hibru oge ochie. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ụkọchukwu na ndị nsụgharị nke okpukpe ndị Juu na Krisendọm amarawo ụma wepụ ya n’ihe ka ukwuu ná nsụgharị Bible ha. * Hà ga-esi aṅaa na-ekwu na ha maara Chineke ma soro ya na-enwe mmekọrịta dị mma ma ọ bụrụ na ha ajụ ịkpọ ya aha ya? Ezigbo aha ya na-eme ka a ghọta ihe ndị bụ́ nzube ya na onye ọ bụ. Ọzọkwa, olee uru okwu ndị bụ́ “nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ” bụ́ nke Jizọs kpenyere n’ekpere nlereanya ya bara ma ọ bụrụ na a dịghịdị eji aha Chineke eme ihe?—Matiu 6:9; Jọn 5:43; 17:6.
Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
10. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi nweta nkọwa zuru ezu banyere ndụ na ozi Jizọs?
10 Isiokwu nke Ihe Ọmụmụ nke 3 na broshuọ Na-achọ bụ “Ònye Bụ Jizọs Kraịst?” Nanị n’ime paragraf isii, o nyere nkọwa dị mkpirikpi banyere Jizọs, mmalite ya, na nzube o ji bịa n’ụwa. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị chọrọ inweta nkọwa zuru ezu banyere ndụ ya, ọ dịghị ebe ọzọ ị ga-enweta ya—e wezụga n’ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ n’onwe ha—ma ọ́ bụghị n’akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, bụ́ nke e nwere n’asụsụ 111. * Akwụkwọ a nyere nkọwa zuru ezu banyere ndụ na ozizi Kraịst n’usoro ha ji mee, na-adabere n’otú e si dekọọ ha n’Oziọma anọ ndị ahụ. Isiakwụkwọ ya dị 133 tụlere ihe ndị mere ná ndụ na n’ozi Jizọs. Ọ bụrụ na ị chọrọ ebe a tụlere ya n’ụzọ dị iche ma kewasịa ya ekewasịa, ị pụrụ ịga n’Insight, Mpịakọta nke 2, n’isiokwu bụ́ “Jizọs Kraịst.”
11. (a) Olee ihe mere ka Ndịàmà Jehova dị iche n’ihe ha kweere banyere Jizọs? (b) Olee ụfọdụ ihe odide Bible ndị na-agbagha ozizi Atọ n’Ime Otu n’ụzọ doro anya, oleekwa akwụkwọ na-enye aka n’akụkụ a?
11 Na Krisendọm, arụmụka a na-enwe banyere Jizọs hiwere isi na ma ọ̀ bụ “Ọkpara Chineke,” bụrụkwa “Chineke Ọkpara”—n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụ arụmụka banyere ihe akwụkwọ katkizim ndị Katọlik na-akpọ “ihe omimi bụ́ isi nke okwukwe Ndị Kraịst,” bụ́ Atọ n’Ime Otu. N’ịbụ ndị dị nnọọ iche n’okpukpe dị iche iche nke Krisendọm, Ndịàmà Jehova kweere na ọ bụ Chineke kere Jizọs ma na ọ bụghị Chineke. Ebe a tụlere isiokwu a n’ụzọ magburu onwe ya bụ na broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, bụ́ nke a sụgharịrị n’asụsụ 95. * Ụfọdụ n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke o ji gbaghaa ozizi Atọ n’Ime Otu bụ Mak 13:32 na 1 Ndị Kọrint 15:24, 28.
12. Olee ajụjụ ọzọ kwesịrị ka anyị lebara anya?
12 Ihe ndị a tụlere n’elu banyere Chineke na Jizọs Kraịst na-egosi ụzọ ndị anyị pụrụ isi na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, na-eburu n’uche inyere ndị na-amaghị eziokwu Bible aka inweta ezi ihe ọmụma. (Jọn 17:3) Otú ọ dị, gịnị banyere ndị soworo ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpakọrịta ruo ọtụtụ afọ? N’ịbụ ndị nwetaworo ihe ọmụma dị ukwuu nke Bible, ọ̀ ka dị ha mkpa ilezi otú ha si enwe ọmụmụ ihe onwe onye nke Okwu Jehova anya?
Gịnị Mere Anyị Ga-eji ‘Na-elezi Onwe Anyị Anya Mgbe Nile’?
13. Echiche dị aṅaa hiere ụzọ ka ụfọdụ pụrụ inwe banyere ọmụmụ ihe onwe onye?
13 Ụfọdụ ndị nọworo n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ pụrụ ịzụlite àgwà nke ịdabere n’ihe ọmụma Bible ha nwetara n’ime afọ ndị mbụ ha ghọrọ Ndịàmà Jehova. Ọ dị mfe iche, sị: “Ọ dịghị m mkpa ịmụsi ihe ike dị ka ndị ka chegharịrị ọhụrụ. E kwuwerị, legodị ugboro ole m gụchapụrụla Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’ime afọ ndị gafeworonụ.” Nke a ga-adị ka ịsị: “Ọ dịghịzi m mkpa n’ezie ilebara ihe oriri m anya, legodị ihe nile m riworo n’oge ndị gara aga.” Anyị maara na ahụ́ anyị chọrọ ihe ndị na-edozi ahụ́ site n’ihe oriri ndị dị mma e siri nke ọma iji hụ na ọ nọgidere na-agbasi ike. Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu karị ma a bịa n’ịnọgide na-enwe ezi ahụ́ ike na ume n’ụzọ ime mmụọ!—Ndị Hibru 5:12-14.
14. Gịnị mere o ji dị anyị mkpa ilezi onwe anyị anya mgbe nile?
14 N’ihi ya, ma ànyị abụwo ndị mmụta Bible ruo ogologo oge ma ọ bụ na anyị abụbeghị, ọ dị anyị nile mkpa ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl nyere Timoti, onye bụ́ n’oge ahụ onye nlekọta tozuru okè ma nwee ibu ọrụ: “Na-elezi onwe gị nakwa ozizi gị anya mgbe nile. Nọgide n’ihe ndị a, n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-azọpụta ma onwe gị ma ndị na-ege gị ntị.” (1 Timoti 4:15, 16) Gịnị mere anyị kwesịrị iji ṅaa ntị na ndụmọdụ Pọl? Cheta, Pọl kwukwara na anyị nwere ọgụ anyị na-alụso “nzupụta ọjọọ dị iche iche [nzụpụta aghụghọ nile] nke Ekwensu” na “ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” Pita onyeozi dọkwara aka ná ntị na Ekwensu “na-achọ onye ọ ga-eripịa,” “onye” ahụ pụkwara ịbụ onye ọ bụla n’ime anyị. Anyị ime ka ndị onwe ha juru afọ pụrụ ịbụ nnọọ ụdị ohere ọ na-achọ.—Ndị Efesọs 6:11, 12; 1 Pita 5:8.
15. Olee ihe anyị nwere iji chebe onwe anyị n’ụzọ ime mmụọ, oleekwa otú anyị pụrụ isi na-elekọta ya?
15 Ya mere, olee ihe anyị nwere iji chebe onwe anyị? Pọl onyeozi na-echetara anyị, sị: “Chịrịnụ ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke, ka unu wee nwee ike iguzogide n’ajọ ụbọchị ahụ nakwa, mgbe unu mezuchaworo ihe nile, iguzosi ike.” (Ndị Efesọs 6:13) Ka ekike agha ime mmụọ ahụ wee na-arụ ọrụ nke ọma, ọ na-adabere ọ bụghị nanị n’otú ọ dị ná mmalite kamakwa n’ilekọta ya mgbe nile. N’ihi ya, ekike agha zuru ezu bụ́ nke sitere n’aka Chineke aghaghị ịgụnye inwe ihe ọmụma ndị dị ọhụrụ banyere Okwu Chineke. Nke a na-ezo aka ná mkpa ọ dị ịnọgide na-enweta nghọta ndị dị ọhụrụ banyere eziokwu ahụ dị ka Jehova si ekpughe ya n’Okwu ya nakwa site n’aka òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche. Ịmụchi Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible anya n’onwe anyị dị oké mkpa iji hụ na ihe agha ime mmụọ anyị na-arụ ọrụ nke ọma.—Matiu 24:45-47; Ndị Efesọs 6:14, 15.
16. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji jide n’aka na ‘ọta ukwu anyị bụ́ okwukwe’ na-arụ ọrụ nke ọma?
16 Pọl kwuru na otu akụkụ dị mkpa nke ihe agha anyị ji echebe onwe anyị bụ “ọta ukwu bụ́ okwukwe,” nke anyị pụrụ iji kụchapụ ma menyụọ akụ́ ụta nile na-ere ọkụ nke Setan bụ́ ebubo ụgha na ozizi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ. (Ndị Efesọs 6:16) Ya mere, ọ dị oké mkpa ka anyị chọpụta otú ọta anyị bụ́ okwukwe siruru n’ike na ihe ndị anyị ga-eme iji hụ na ọ nọgidere na-arụ ọrụ nke ọma ma na-esikwu ike. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee otú m si akwadebe maka ọmụmụ Bible e ji Ụlọ Nche enwe kwa izu? Àmụwo m ya nke ọma iji “kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ” site n’ịza ajụjụ ndị e chebaara echiche nke ọma mgbe a na-enwe nzukọ ahụ? M̀ na-asape Bible m ma na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha ma bụrụ ndị a na-ehotaghị ehota? M̀ na-agba ndị ọzọ ume site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè ná nzukọ?’ Nri ime mmụọ anyị siri ike, ọ dịkwa mkpa ịgbari ya nke ọma ka o wee baara anyị uru n’ụzọ zuru ezu.—Ndị Hibru 5:14; 10:24.
17. (a) Olee nsí Setan ji anwa imebi ọnọdụ ime mmụọ anyị? (b) Olee ọgwụ e ji agwọ elù Setan?
17 Setan maara adịghị ike nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè, nzupụta ọjọọ ya nile dịkwa aghụghọ. Otu n’ime ụzọ ndị o si agbasa mmetụta ọjọọ ya bụ ime ka ihe na-akpali agụụ mmekọahụ bụrụ nnọọ ihe a na-ahụ mgbe nile na TV, Intanet, vidio, nakwa n’akwụkwọ ndị e biri ebi. Ụfọdụ Ndị Kraịst ekwewo ka nsí a banye n’ihe nchebe ha ndị na-esighị ike, o mewokwa ka a napụ ụfọdụ ndị ihe ùgwù ndị ha nwere n’ọgbakọ ma ọ bụ ọbụna kpata ihe ndị ọzọ ka nke ahụ njọ. (Ndị Efesọs 4:17-19) Olee ọgwụ e ji agwọ elù ime mmụọ nke Setan? Anyị agatụghị eleghara inwechi ọmụmụ Bible onwe onye anya, ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anyị anya, na ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke. Ihe a nile na-agbakọ aka enye anyị ikike nke ịmata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ na ịkpọ ihe Chineke kpọrọ asị asị.—Abụ Ọma 97:10; Ndị Rom 12:9.
18. Olee otú “mma agha nke mmụọ nsọ” pụrụ isi nyere anyị aka n’ọgụ ime mmụọ anyị?
18 Ọ bụrụ na anyị anọgide na-enwe àgwà nke ịmụchi Bible anya, ọ bụghị nanị ihe nchebe siri ike nke anyị na-enweta site n’ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke ka anyị ga-enwe kamakwa anyị ga-enwe ikike nke iji “mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke” na-eme mwakpo n’ụzọ dị irè. Okwu Chineke dị “nkọ karịa mma agha ihu Ndị Efesọs 6:17; Ndị Hibru 4:12) Ọ bụrụ na anyị aghọọ ndị ọkà n’iji “mma agha” ahụ eme ihe, mgbe ahụ, mgbe anyị chere ọnwụnwa ihu, anyị ga-enwe ike ịmata ihe pụrụ iyi ihe na-adịghị emerụ ahụ́, ma ọ bụ ọbụna ihe na-adọrọ adọrọ, ma gbaa ya n’anwụ dị ka ọnyà na-egbu egbu nke ajọ onye ahụ. Nkwakọba nke ihe ọmụma na nghọta Bible anyị nwere ga-enyere anyị aka ịjụ ihe ọjọọ na ime ihe dị mma. Ya mere, ọ dị anyị nile mkpa ịjụ onwe anyị, sị: ‘Mma agha m ọ̀ dị nkọ, ka ọ̀ nyụrụ nkọ? Ọ̀ na-esiri m ike icheta akụkụ Bible ndị pụrụ ime ka m mee mwakpo n’ụzọ siri ike?’ Ka anyị nọgide na-enwe ezi àgwà nke ịmụ Bible n’onwe anyị ma si otú ahụ na-eguzogide Ekwensu.—Ndị Efesọs 4:22-24.
abụọ ọ bụla, na-amapukwa amapu ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, nakwa nkwonkwo na ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” (19. Uru ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ irite ma ọ bụrụ na anyị na-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya?
19 Pọl dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.” Ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị n’ihe Pọl gwara Timoti, anyị pụrụ ime ka ọnọdụ ime mmụọ anyị sikwuo ike, anyị pụkwara ime ka ozi anyị dịkwuo irè. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe pụrụ ịbara ọgbakọ uru n’ụzọ ka ukwuu, anyị nile pụkwara ịnọgide na-agbasi ike n’okwukwe.—2 Timoti 3:16, 17; Matiu 7:24-27.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Dị ka o kwesịrị ịdị, onye ọhụrụ nwere mmasị nke na-amụ broshuọ Na-achọ ga-agafe n’akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha abụọ. Aro ndị a tụrụ ebe a ga-enye aka iwepụ ihe ndị na-egbochi mmadụ inwe ọganihu ime mmụọ.
^ par. 9 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Ndị nwere Insight on the Scriptures n’asụsụ ha pụrụ ịga ná Mpịakọta nke 2, n’okpuru isiokwu bụ́ “Jehova.”
^ par. 9 Ọtụtụ nsụgharị Spanish na Catalonian gbapụrụ iche n’ụzọ dị ịrịba ama n’otú ha si sụgharịa Tetragrammaton Hibru ahụ, na-eji okwu ndị bụ́ “Yavé,” “Yahveh,” “Jahvè,” na “Jehová” eme ihe.
^ par. 10 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 11 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
• Olee ọnọdụ ndị na-eme ka e nwee ọmụmụ ihe onwe onye dị irè?
• Gịnị ka ọtụtụ nsụgharị Bible mehiere banyere aha Chineke?
• Olee akụkụ Bible ndị ị ga-eji gbaghaa ozizi Atọ n’Ime Otu?
• Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji chebe onwe anyị ná nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Setan, n’agbanyeghị ma ànyị abụwo ezi Ndị Kraịst ruo ọtụtụ afọ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 19]
Iji na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye dị irè, ọ dị gị mkpa ịnọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị ma hụ na i nweghị ihe ndọpụ uche
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
“Mma agha” gị ọ̀ dị nkọ ka ọ̀ nyụrụ nkọ?