Inye Ihe nke Na-eweta Ọṅụ
Inye Ihe nke Na-eweta Ọṅụ
GENIVAL, bụ́ onye bi n’otu ógbè nke jupụtara ná nkịrịka ụlọ n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Brazil, ji obere ego a na-akwụ ya dị ka onye nche n’ụlọ ọgwụ akwado nwunye ya na ụmụ ya. N’agbanyeghị na ihe siiri ya ike, Genival nyezuru otu ụzọ n’ụzọ iri ya. “Mgbe ụfọdụ ezinụlọ m na-anọ agụụ,” ka ọ na-echeta ka ọ na-ahịọ aka n’afọ, “ma achọrọ m inye Chineke ihe kasị mma m nwere, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu m.”
Ka a chụsịrị ya n’ọrụ, Genival nọgidere na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri. Ụkọchukwu ya gbara ya ume ịnwale Chineke site n’inye onyinye buru ibu. Ụkọchukwu ahụ kwere ya nkwa na Chineke ga-awụsarịrị ya ngọzi. N’ihi ya, Genival kpebiri ire ụlọ ya ma nye chọọchị ego o retere.
Ọ bụghị nanị Genival ji ezi obi dị otú ahụ enye ihe. Ọtụtụ ndị ogbenye ọnụ ntụ na-enyezu otu ụzọ n’ụzọ iri dị ka ihe iwu ji ha ime n’ihi na chọọchị ha kụziiri ha na ọ bụ ihe Bible chọrọ n’aka ha. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?
Inye Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri na Iwu Ahụ
Inye otu ụzọ n’ụzọ iri so n’Iwu ahụ Jehova Chineke nyere ebo 12 nke Izrel oge ochie ihe karịrị afọ 3,500 gara aga. Iwu ahụ kwuru ka a na-enye ebo Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe a kọpụtara n’ala na ihe ndị sitere n’osisi ndị na-amị mkpụrụ na otu ụzọ n’ụzọ iri nke mmụba ha nwere n’ìgwè anụ ụlọ ha, iji kwado ozi ha na-eje n’ụlọikwuu.—Levitikọs 27:30, 32; Ọnụ Ọgụgụ 18:21, 24.
Jehova mesiri ụmụ Izrel obi ike na Iwu ahụ ‘agaghị abụ ihe karịrị ha ime.’ (Deuterọnọmi 30:11) Ọ bụrụhaala na ha ejiri ikwesị ntụkwasị obi debe iwu Jehova, gụnyere inye otu ụzọ n’ụzọ iri, ha ga-ahụ mmezu nke nkwa o kwere na ha ga-ewe ihe ubi n’ụba. Dịkwa ka ihe nchebe, mgbe nile, a na-ewepụta otu ụzọ n’ụzọ iri ọzọ iche kwa afọ, bụ́ nke a na-ejikarị eme ihe mgbe mba ahụ zukọtara maka ememe okpukpe ha. N’ụzọ dị otú a, a pụrụ ime ka afọ ju ‘onye ọbịa, na nwa mgbei, na nwanyị di ya nwụrụ.’—Deuterọnọmi 14:28, 29; 28:1, 2, 11-14.
Iwu ahụ ekwughị kpọmkwem ntaramahụhụ a ga-enye onye na-enyeghị otu ụzọ n’ụzọ iri, ma iwu jisiri onye Izrel ọ bụla ike ịkwado ezi ofufe n’ụzọ dị otú a. N’ezie, Jehova boro ụmụ Izrel bụ́ ndị leghaara inye otu ụzọ n’ụzọ iri anya n’oge Malakaị ebubo ‘ịpụnara ya ihe n’otu ụzọ n’ụzọ iri nile na àjà mbuli nile.’ (Malakaị 3:8) À pụrụ ibo Ndị Kraịst na-adịghị enye otu ụzọ n’ụzọ iri otu ebubo ahụ?
Ọ dị mma, tụlee nke a. Iwu otu mba anaghị adịkarị irè ná mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, iwu nke chọrọ ka ndị ọkwọ ụgbọala nọ na Britain na-akwọ ụgbọala n’aka ekpe emetụtaghị ndị ọkwọ ụgbọala nọ na France. N’otu aka ahụ, iwu ahụ nke chọrọ ka a na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri so n’ọgbụgba ndụ dị n’etiti nanị Chineke na mba Izrel. (Ọpụpụ 19:3-8; Abụ Ọma 147:19, 20) Ọ bụ nanị ụmụ Izrel ka iwu ahụ ji.
Tụkwasị na nke ahụ, ọ bụ ezie na Chineke adịghị agbanwe agbanwe, ihe ndị ọ chọrọ n’aka mmadụ na-agbanwe mgbe ụfọdụ. (Malakaị 3:6) Bible na-ekwu hoo haa na ọnwụ ịchụàjà nke Jizọs nwụrụ na 33 O.A., ‘hichapụrụ,’ ma ọ bụ ‘wepụ,’ Iwu ahụ na ‘iwu e nyere ịnakọta otu ụzọ n’ụzọ iri.’—Ndị Kọlọsi 2:13, 14; Ndị Efesọs 2:13-15; Ndị Hibru 7:5, 18.
Inye Ihe nke Ndị Kraịst
Otú ọ dị, ọ ka dị mkpa inye onyinye iji kwado ezi ofufe. Jizọs enyewo ndị na-eso ụzọ ya iwu ‘ịbụ ndị àmà ruo n’akụkụ kasị anya nke ụwa.’ (Ọrụ 1:8) Ka ọnụ ọgụgụ nke ndị kwere ekwe mụbara, otú ahụ ka ọ bịara dịwanye mkpa ka ndị nkụzi na ndị nlekọta bụ́ Ndị Kraịst leta ma wusie ọgbakọ dị iche iche ike. Mgbe ụfọdụ, a ghaghị ilekọta ndị inyom di ha nwụrụ, ụmụ mgbei, na ndị ọzọ nọ ná mkpa. Olee otú Ndị Kraịst narị afọ mbụ si nweta ego iji hụ maka mmefu ndị a?
Ihe dị ka n’afọ 55 O.A., a rịọrọ Ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl nọ na Europe na Asia Minor arịrịọ n’aha ọgbakọ dara ogbenye dị na Judia. N’akwụkwọ ozi ndị o degaara ọgbakọ dị na Kọrint, Pọl onyeozi kọwara otú e si hazie ‘ịnakọta onyinye a maka ndị nsọ.’ (1 Ndị Kọrint 16:1) Ihe okwu Pọl kpughere banyere inye ihe nke Ndị Kraịst pụrụ iju gị anya.
Pọl onyeozi amanyeghị ndị kwere ekwe ibe ya inye ihe. N’ezie, Ndị Kraịst nọ na Masedonia bụ́ ndị nọ “n’okpuru mmekpa ahụ́” nakwa ‘n’oké ịda ogbenye,’ aghaghị ‘ịrịọsi ya ike maka ihe ùgwù nke iji obiọma na-enye ihe na maka ikere òkè n’ozi ahụ nke a kara aka maka ndị nsọ.’—2 Ndị Kọrint 8:1-4.
N’ezie, Pọl gbara ndị Kọrint bara ọgaranya karị ume iṅomi ụmụnna ha na-emesapụ aka nọ na Masedonia. N’agbanyeghị nke ahụ, ka otu akwụkwọ na-ekwu, ‘ọ jụrụ inye ntụziaka, kama nke ahụ ọ họọrọ ịrịọ arịrịọ, ịtụ aro, ma ọ bụ ịgba ume. Ndị Kọrint agaraghị eji obi ha na obi ụtọ enye ihe ma ọ bụrụ na a manyere ha amanye.’ Pọl maara na “Chineke hụrụ onye na-eji mgbasapụ ihu na-enye ihe n’anya,” ọ bụghị onye na-enye ‘n’enweghị ọchịchọ inye ihe ma ọ bụ ná mmanye.’—2 Ndị Kọrint 9:7.
Okwukwe siri ike na ihe ọmụma bara ụba ndị Kọrint nwere, tinyere ezi ịhụnanya maka Ndị Kraịst ibe ha, ga-abụwo ihe kpaliri ha inye ihe dị ka obi ha si kwalie ha.—2 Ndị Kọrint 8:7, 8.
‘Dị Ka O Kpebiworo n’Obi Ya’
Kama ikwu ego ole ma ọ bụ pasent ole a ga-enye, nanị ihe Pọl mere bụ ịtụ aro na “n’ụbọchị mbụ nke izu ọ bụla, onye ọ bụla . . . kwesịrị iwepụta ego ụfọdụ iche dị ka mkpata ya si dị.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche; 1 Ndị Kọrint 16:2, New International Version) Site n’ime atụmatụ na iwepụta ego ụfọdụ iche mgbe nile, ọ gaghị adị ndị Kọrint ka a manyere ha amanye inye ihe n’enweghị ọchịchọ inye ihe ma ọ bụ inye ya na mberede mgbe Pọl bịara. Nye Onye Kraịst ọ bụla, ego ole a ga-enye bụ mkpebi onwe onye, nke “o kpebiworo n’obi ya.”—2 Ndị Kọrint 9:5, 7.
Iji ghọrọ mkpụrụ n’ụba, ndị Kọrint aghaghị ịgha mkpụrụ n’ụba. Ọ dịtụghị mgbe a tụrụ aro ka e nye ruo mgbe akpa tọgbọrọ chakoo. ‘Ebughị m n’uche ka o siere unu ike,’ ka Pọl mesiri ha obi ike. ‘A na-anara onyinye nke ọma karịsịa dị ka ihe mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe mmadụ na-enweghị si dị.’ (2 Ndị Kọrint 8:12, 13; 9:6) N’akwụkwọ ozi onyeozi ahụ dere mgbe e mesịrị, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, ọ jụwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.’ (1 Timoti 5:8) Pọl agbaghị ume ka e nye ihe n’ụzọ ga-emebi ụkpụrụ a.
O kwesịrị ịrịba ama na Pọl hụrụ maka ‘ịtụkọta ihe maka ndị nsọ’ nọ ná mkpa. Ọ dịghị ebe anyị gụtara n’Akwụkwọ Nsọ na Pọl ma ọ bụ ndịozi ndị ọzọ haziri maka ịnakọta ihe ma ọ bụ ịnata otu ụzọ n’ụzọ iri iji kwado ozi ha. (Ọrụ 3:6) N’inwe ekele mgbe nile maka onyinye nke ọgbakọ dị iche iche ziteere ya, Pọl ji nlezianya zere ibokwasị ụmụnna ya “oké ibu arọ.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:9; Ndị Filipaị 4:15-18.
Inye Ihe n’Afọ Ofufo Taa
N’ụzọ doro anya, na narị afọ mbụ, ụmụazụ Kraịst nyere ihe n’afọ ofufo, ọ bụghị otu ụzọ n’ụzọ iri. Otú ọ dị, ị pụrụ iche ma nke a ọ̀ bụ ụzọ dị irè isi na-enweta ego iji na-akwado nkwusa ozi ọma ahụ na isi na-elekọta Ndị Kraịst nọ ná mkpa.
Tụlee ihe na-esonụ. Na 1879, ndị na-ebipụta magazin a kwuru hoo haa na ha ‘agaghị arịọ arịrịọ ma ọ bụ kpọọ òkù ka ndị mmadụ nyere ha aka.’ Mkpebi ahụ ò gbochiwo mgbalị Ndịàmà Jehova na-eme ịgbasa eziokwu Bible?
Ka ọ dị ugbu a, Ndịàmà na-ekesa Bible, akwụkwọ Ndị Kraịst, na akwụkwọ ndị ọzọ n’ala 235. Ná mmalite, kwa ọnwa, a nọ na-ekesa mkpụrụ 6,000 nke Ụlọ Nche, bụ́ magazin na-akụzi Bible, nke a nọ na-ebipụta n’otu asụsụ. Ọ dịwo anya ọ ghọrọ magazin a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa nke a na-ebipụta ihe karịrị 24,000,000 n’asụsụ 146. Iji hazie ọrụ nkụzi Bible ha zuru ụwa ọnụ, Ndịàmà ewuwo ma ọ bụ zụta alaka ụlọ ọrụ ná mba 110. Tụkwasị na nke ahụ, ha ewuwo ọtụtụ puku ebe ndị a na-anọ enwe nzukọ nakwa ụlọ mgbakọ ndị buru ibu iji hụ na e nwere ebe ga-aba ndị nwere mmasị inwetakwu ihe ọmụma Bible.
Ọ bụ ezie na igbo mkpa ime mmụọ nke ndị mmadụ bụ ihe kasị mkpa, Ndịàmà Jehova adịghị eleghara mkpa anụ ahụ́ nke ndị kwere ekwe ibe ha anya. Mgbe ụmụnna ha na-ata
ahụhụ n’ihi agha, ala ọma jijiji, oké ọkọchị, na oké ifufe, ha na-adị ngwa ibugara ha ọgwụ, ihe oriri, uwe, na ihe ndị ọzọ dị mkpa. E ji onyinye afọ ofufo nke Ndị Kraịst n’otu n’otu na ọgbakọ dị iche iche na-enye ahụ maka ihe ndị a.Tụkwasị n’ịbụ nke dị irè, inye onyinye n’afọ ofufo na-ebupụ ibu arọ n’ubu ndị ogbenye, dị ka Genival, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite. Ọ dabara nke ọma na tupu Genival eree ụlọ ya, Maria, bụ́ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, letara ya. “Mkparịta ụka ahụ chebere ezinụlọ m pụọ n’ọtụtụ ihe isi ike na-enweghị isi,” ka Genival na-echeta.
Genival chọpụtara na ọrụ Onyenwe anyị adịghị adabere n’otu ụzọ n’ụzọ iri. N’ezie, inye otu ụzọ n’ụzọ iri abụghịzi ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ. Ọ mụtara na a na-agọzi Ndị Kraịst mgbe ha ji mmesapụ aka na-enye ihe nakwa na iwu ejighị ha inye karịa ihe ha nwere ike inye.
Inye ihe n’afọ ofufo ewetaworo Genival ezi ọṅụ. O si otú a kwuo ya: “Enwere m ike na-enye ma ọ bụ ghara inye pasent 10, ma ana m enwe obi ụtọ n’ihe m na-enye, ejikwa m n’aka na Jehova na-enwekwa obi ụtọ.”
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6]
Ndị Nna Chọọchị Mbụ Hà Kụziri Inye Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri?
“Ndị bara ọgaranya n’etiti anyị na-enyere ndị nọ ná mkpa aka . . . Ndị bụ́ aka ji akụ̀, ndị dịkwa njikere inye ihe, nyere ihe onye ọ bụla chere na o kwesịrị ekwesị.”—The First Apology, Justin Martyr, ihe dị ka 150 O.A.
“N’ezie, ndị Juu nyere Ya otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe onwunwe ha, ma ndị ahụ e meworo ka ha nwere onwe ha na-ewepụta ihe onwunwe ha nile iche maka nzube nke Onyenwe anyị, . . . dị ka nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye mere bụ́ onye tinyere ihe nile o ji biri n’ihe e ji etinye ego nke Chineke.”—Against Heresies, Irenaeus ihe dị ka 180 O.A.
“Ọ bụ ezie na anyị nwere igbe ego anyị, ego e ji azụta nzọpụta adịghị n’ime ya, dị ka nke okpukpe a pụrụ iji ego zụrụ. Otu ugboro n’ọnwa, ọ bụrụ na ọ chọọ, onye ọ bụla na-etinye onyinye nta; kama nanị ma ọ bụrụ na ọ chọrọ, ọ bụkwa nanị ma o nwee ike ime ya: n’ihi na a dịghị amanye mmadụ amanye; ihe nile bụ n’afọ ofufo.”—Apology, Tertullian, ihe dị ka 197 O.A.
“Ka Chọọchị na-amụba, ọtụtụ okpukpe ana-ebilitekwa, ọ bịara dị mkpa ka e mee iwu nke ga-enye aka hụ na a nọgidere na-akwado ndị ụkọchukwu nke ọma. E ṅomitere inye otu ụzọ n’ụzọ iri n’Iwu Ochie ahụ . . . O yiri ka iwu mbụ e tiri banyere nke a ọ̀ dị n’akwụkwọ ozi nke ndị bishọp gbakọtara na Tours na 567 nakwa [n’ụkpụrụ iwu] nke Kansụl nke Macon na 585.”—The Catholic Encyclopedia.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Mkpụrụ ego, n’elu aka ekpe: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Inye ihe n’afọ ofufo na-eweta ọṅụ
[Foto dị na peeji nke 7]
E ji onyinye afọ ofufo akwado ọrụ nkwusa, ihe ndị e ji enye aka n’ọnọdụ mberede, na owuwu nke ebe ndị a na-anọ enwe nzukọ