Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

Olee otú “izuzu” pụrụ isi bụrụ ihe nchebe? (Ilu 1:4)

Ọ pụrụ ime ka anyị mara ihe ize ndụ ime mmụọ ma kwalie anyị ime atụmatụ ịgbaso ụzọ amamihe dị na ya, dị ka izere ọnwụnwa inwe mmekọahụ a na-enweta n’ebe ọrụ. Ọ na-enyere anyị aka ịghọta na Ndị Kraịst ibe anyị ezughị okè, bụ́ nke pụrụ ịkpali anyị izere imeghachi omume ọkụ ọkụ mgbe a kpasuru anyị iwe. Ọ pụkwara ime ka anyị nwee ike izere nrụgide nke ịhụ ihe onwunwe n’anya bụ́ nke pụrụ ịkwapụ anyị n’ụzọ ime mmụọ.—8/15, peeji nke 21-24.

Olee otú mmadụ pụrụ isi bụrụ onye agbata obi bara uru?

Ụzọ abụọ e si abụ ezigbo onye agbata obi bụ ịbụ ezi onye na-enye ihe na ịbụ onye ji ekele anara ihe. Ọ bara uru ịbụ ezigbo onye agbata obi mgbe ọdachi mere. Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ịbụ ezigbo ndị agbata obi site n’ịdọ ndị ọzọ aka ná ntị banyere oké ihe omume nke ga-ewere ọnọdụ n’isi nso, bụ́ ihe Chineke ga-eme iji kwụsị ajọ omume.—9/1, peeji nke 4-7.

Dị ka Bible si kwuo, olee ndị bụ́ ezi ndị senti, oleekwa otú ha ga-esi enyere ihe a kpọrọ mmadụ aka?

Ndị Kraịst oge mbụ nile bụ ezi ndị senti, ma ọ bụ ndị nsọ, ndị ọ bụ Chineke mere ha ya, ọ bụghị mmadụ ma ọ bụ òtù ọ bụla. (Ndị Rom 1:7) Ozugbo a kpọlitere ndị nsọ n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe, ha ga-eso Kraịst kere òkè n’ịgọzi ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’ụwa. (Ndị Efesọs 1:18-21)—9/15, peeji nke 5-7.

Olee uru ịmara ihe ụfọdụ banyere egwuregwu e mere na Gris oge ochie pụrụ ịbara Ndị Kraịst?

N’ihe odide nke ndịozi bụ́ Pita na Pọl, e nwere ihe atụ ndị dabeere n’egwuregwu oge ochie ma ọ bụ aka ndị e zoro na ha. (1 Ndị Kọrint 9:26; 1 Timoti 4:7; 2 Timoti 2:5; 1 Pita 5:10) Nye onye na-eme egwuregwu n’oge ochie, ọ dị mkpa inwe ezigbo onye ọzụzụ, inwe njide onwe onye, na itinye mgbalị ya n’ihe bara uru. Otú ahụ ka ọ dị ma a bịa ná mgbalị ime mmụọ nke Ndị Kraịst taa.—10/1, peeji nke 28-31.

Olee ihe ịma aka na ụgwọ ọrụ ndị dị n’ịzụlite ụmụ n’ala ọzọ?

Ọtụtụ ụmụaka na-amụta asụsụ ọhụrụ ngwa ngwa karịa ndị mụrụ ha, bụ́ ndị ọ pụrụ isiri ike ịghọta echiche na mmeghachi omume nke ụmụ ha. E nwekwara ike ọ gaghị adịrị ụmụaka mfe ịghọta ozizi Bible n’asụsụ nke ndị mụrụ ha. Ma, a pụrụ ime ka nkekọ ezinụlọ sikwuo ike ka ndị nne na nna na-akụziri ụmụ ha asụsụ obodo ha, bụ́ ndị pụrụ isi otú a mara asụsụ abụọ na ọdịbendị abụọ.—10/15, peeji nke 22-26.

N’ihi gịnị ka ịmụta ịrịọ mgbaghara ji dị mkpa?

Mgbaghara e ji ezi obi rịọ na-abụkarị ụzọ e si edozi mmekọrịta mebiri emebi. Bible na-enye ihe atụ dị iche iche banyere ike ịrịọ mgbaghara pụrụ inwe. (1 Samuel 25:2-35; Ọrụ 23:1-5) Mgbe mgbe, mgbe mmadụ abụọ na-ese okwu, ọ pụrụ ịbụ na o nwere otú ụta si dịrị onye nke ọ bụla n’ime ha. N’ihi ya, a na-achọ ịnakwerịta mmejọ na ịrịọrịta mgbaghara.—11/1, peeji nke 4-7.

N’ihi gịnị ka ịgba chaa chaa, ọbụna nke e ji obere ego na-agba, ji dị njọ?

Ịgba chaa chaa pụrụ ịkpali mmadụ ịbụ onye onwe ya na-ebu isi, mmụọ asọmpi, na anyaukwu, bụ́ ihe ndị Bible katọrọ. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọtụtụ ndị ịgba chaa chaa riri ahụ́ malitere n’oge ha dị obere site n’iji obere ego eti ebé.—11/1, peeji nke 31.

Ebe ọ bụ na e dere ọtụtụ akwụkwọ Bible n’asụsụ Grik, gịnị mere e ji nwee mkpa nke ịsụgharị Bible n’asụsụ Grik, gịnị sikwa na ya pụta?

Grik ọgbara ọhụrụ dị nnọọ iche na Grik e ji dee nsụgharị Septuagint nke Akwụkwọ Nsọ Hibru na nke e ji dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ime narị afọ ndị na-adịbeghị anya, e mewo ọtụtụ mgbalị iji sụgharịa akụkụ ụfọdụ nke Bible ma ọ bụ ha nile n’asụsụ Grik e ji akparịta ụka. Taa, e nwere ihe dị ka nsụgharị 30 nke Bible, n’ozuzu ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, bụ́ ndị ndị nkịtị nọ na Gris pụrụ ịgụ, nke dị ịrịba ama n’ime ha bụ New World Translation of the Holy Scriptures, bụ́ nke e bipụtara na 1997.—11/15, peeji nke 26-29.

Gịnị mere na a chọghị ka Ndị Kraịst na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri?

N’okpuru Iwu ahụ e nyere Izrel oge ochie, inye otu ụzọ n’ụzọ iri bụ ụzọ e si na-akwado ebo Livaị ma na-elekọta ndị nọ ná mkpa. (Levitikọs 27:30; Deuterọnọmi 14:28, 29) Ọnwụ ịchụàjà Jizọs kagburu Iwu ahụ na otu ụzọ n’ụzọ iri o kwuru ka a na-enye. (Ndị Efesọs 2:13-15) N’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ, usoro a gbasoro bụ Onye Kraịst ọ bụla inye dị ka ihe ọ na-akpata hà nakwa dị ka o kpebiri n’obi ya. (2 Ndị Kọrint 9:5, 7)—12/1, peeji nke 4-6.

Mkpughe 20:8 ọ̀ na-apụta na n’oge ule ikpeazụ ahụ, Setan ga-eduhie imerime mmadụ?

Ihe odide ahụ na-ekwu na ndị a ga-eduhie ga-adị ka “ájá nke oké osimiri.” Na Bible, okwu ahụ na-apụtakarị ọnụ ọgụgụ a na-amaghị ole ọ dị, n’enyeghị echiche na ọ karịrị akarị. Mkpụrụ Ebreham, bụ́ nke e kwuru na ọ ga-aha “ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri,” mesịrị bụrụ mmadụ 144,000, ma e wepụ Jizọs Kraịst. (Jenesis 22:17; Mkpughe 14:1-4)—12/1, peeji nke 29.