Ọmụmụ Jizọs—Otú O Si Mee na Ihe Mere O ji Mee
Ọmụmụ Jizọs—Otú O Si Mee na Ihe Mere O ji Mee
“Ọ GAGHỊ ekwe omume!” Ihe a ka ọtụtụ ndị na-abụghị Ndị Kraịst na-ekwu ozugbo ha nụrụ akụkọ banyere ọmụmụ Jizọs. Ọ na-adị ha ka o kwekọghị na nkà mmụta sayensị bụ́ ikwere na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke pụrụ ịtụrụ ime ma mụọ nwa n’esoghị nwoke nwee mmekọahụ. Gịnị ka i chere?
Na 1984, magazin bụ́ The Times nke London bipụtara akwụkwọ ozi nke kọwara okwu a, na-asị: “Ezi uche adịghị na ya iji nkà mmụta sayensị mee ihe dị ka ihe ịrụ ụka megide ọrụ ebube. Ikwere na ọrụ ebube apụghị ime eme bụ nnọọ ihe na-esite n’okwukwe dị ka ikwere na ha pụrụ ime eme.” Mmadụ 14 na-akụzi nkà mmụta sayensị na mahadum ndị dị na Britain bịanyere aka n’akwụkwọ ozi ahụ. Ha kwuru, sị: “Anyị ji obi ụtọ na-anakwere akụkọ banyere ịmụ nwa n’enweghị mmekọahụ, ọrụ ebube ndị e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ, na mbilite n’ọnwụ Kraịst dị ka ihe ndị mere eme.”
Ma, ọ bụ ihe kwere nghọta na ọ ga-eju mmadụ anya mgbe mbụ ọ nụrụ akụkọ banyere ọmụmụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mụrụ Jizọs. O jukwara nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke nke mụrụ Jizọs anya mgbe mmụọ ozi Chineke kwuru, sị: “Lee! ị ga-atụrụ ime n’akpa nwa gị ma mụọ nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jizọs.” Meri jụrụ, sị: “Olee otú nke a ga-esi mee, ebe mụ na nwoke ọ bụla na-adịghị enwe mmekọahụ?” Mmụọ ozi ahụ kọwaziri na Chineke ga-eji mmụọ nsọ Ya rụọ ọrụ ebube a, na-agbakwụnye, sị: “Nye Chineke, ọ dịghị okwu ọ bụla e kwupụtaworo nke ga-abụ ihe na-apụghị ime eme.” (Luk 1:31, 34-37) N’ezie, Onye ahụ nke kere usoro dị mgbagwoju anya nke na-eme ka mmadụ nwee ike ịmụ nwa pụkwara ime ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke tụrụ ime Jizọs ma mụọ ya. Ọ bụrụ na Chineke kere eluigwe na ala na iwu ya ndị a haziri nke ọma, ọ pụkwara iji àkwá nke si n’ahụ́ Meri mepụta Ọkpara zuru okè nke bụ́ mmadụ.
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa
Nwoke ahụ na-asọpụrụ Chineke bụ́ Josef kwere Meri nkwa ọlụlụ n’oge ọ tụụrụ ime. Ná nrọ, mmụọ ozi Chineke kọwaara Josef ihe dị ebube mere nwa agbọghọ na-amaghị nwoke o kwere nkwa ọlụlụ ji dị ime. Mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Atụla egwu ịkpọrọ Meri nwunye gị laa, n’ihi na ihe ahụ e meworo ka ọ dị ime ya bụ site ná mmụọ nsọ. Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ghaghịkwa ịkpọ aha ya Jizọs, n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.” (Matiu 1:20, 21) N’asụsụ Hibru, aha ahụ bụ́ Jizọs pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” Ọ na-echetara anyị mkpa ọ dị ịbụ ndị a zọpụtara ná mmehie na ọnwụ nakwa ndokwa Jehova Chineke mere maka nzọpụta dị otú ahụ site n’aka Jizọs.
Ebe ọ bụ na nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam, mehiere, a mụrụ ụmụ ya nile dị ka ndị na-ezughị okè, na-enwe ọchịchọ nke imebi iwu Chineke. (Ndị Rom 5:12) Olee otú a pụrụ isi zọpụta ụmụ Adam pụọ ná mmehie ma mee ka ha zuo okè? A ghaghị iji ndụ mmadụ ọzọ zuru okè, nke ya na nke Adam ha nhata, kwụọ ụgwọ iji mee ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ikpe ziri ezi guzozie. Ọ bụ ya mere Chineke ji jiri ụzọ ọrụ ebube mee ka a mụọ nwoke ahụ zuru okè, bụ́ Jizọs, ọ bụkwa ya mere Jizọs ji kwere ka ndị iro ya gbuo ya. (Jọn 10:17, 18; 1 Timoti 2:5, 6) Mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ na mgbe ọ rịgosịrị iji bie ndụ n’eluigwe, ọ pụrụ iji obi ike kwuo, sị: “Aghọkwara m onye nwụrụ anwụ, ma, lee! ana m adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi, achịkwa m mkpịsị ugodi nke ọnwụ na nke Hedis [ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ].”—Mkpughe 1:18.
Jizọs ji mkpịsị ugodi ihe atụ nke ọnwụ na Hedis meghee ụzọ maka ụmụ mmadụ na-emehie emehie inwetaghachi ihe Adam tụfuru. Jizọs kọwara, sị: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye na-egosipụta okwukwe na mụ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ga-abịa dịrị ndụ; onye ọ bụla nke dị ndụ ma na-egosipụta okwukwe na mụ adịghị mgbe ọ ga-anwụ ma ọlị.” (Jọn 11:25, 26) Lee nkwa dị ebube ọ bụ! Ma, e nwekwara ihe ka nke ahụ mere e ji mụọ Jizọs.
Ihe Kasị Mkpa Mere E Ji Mụọ Ya
Ọ bụghị mgbe a tụụrụ ime Jizọs n’akpa nwa Meri ka ọ malitere ịdị ndụ. “Esiwo m n’eluigwe bịa,” ka o kwuru n’ụzọ doro anya. (Jọn 6:38) Jizọs esowo Nna ya nke eluigwe biri n’ógbè ndị bụ́ mmụọ site ná mmalite nke okike. N’ezie, Bible na-akọwa ya dị ka “mmalite nke ihe Chineke kere.” (Mkpughe 3:14) Jizọs nọ n’eluigwe hụ nnupụisi nke otu mmụọ ọjọọ bụ́ onye mere ka ụmụ mmadụ mbụ megide ịchịisi Chineke. Nke a mere ka Jizọs nwee ihe kasị mkpa mere o ji chọọ ka a mụọ ya dị ka Ọkpara Chineke zuru okè nke bụ́ mmadụ. Gịnị ka ọ bụ?
Ọ bụ iji gosipụta na ọ bụ Nna ya nke eluigwe ka o ruuru ịchị eluigwe na ala. Site n’ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi site n’oge a mụrụ ya ruo oge ọ nwụrụ n’ụwa, Jizọs gosipụtara njikere ọ dị ịnakwere ụzọ Jehova si achị ihe ndị O kere eke. Tupu ndị iro Chineke egbuo ya, Jizọs kwuru hoo haa ihe mere o ji dị njikere ịnwụ ọnwụ ịchụàjà. Ọ sịrị na ọ bụ ka ụwa wee mara na ya hụrụ Nna ya n’anya. (Jọn 14:31) A sị na mmadụ abụọ mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, zụlitere ịhụnanya dị otú ahụ, ha gaara ekwesịwo ntụkwasị obi n’okpuru ule ha dị nnọọ mfe karị.—Jenesis 2:15-17.
Ikwesị ntụkwasị obi Jizọs gbakwara ajọ mmụọ ozi ahụ, bụ́ Setan, n’anwụ dị ka onye ụgha. Setan ekwutọwo Chineke na ụmụ mmadụ site n’ikwu n’ihu ndị mmụọ ozi n’eluigwe, sị: “Ihe Job 2:1, 4) Setan boro ebubo ụgha na ụmụ mmadụ nile ga-enupụrụ Chineke isi iji chebe ndụ ha.
nile nke mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya.” (Ihe iseokwu ndị ahụ e kwuru n’elu mara izi ezi nke ịchịisi Chineke aka. Iji dozie ha, Jizọs ji ọchịchọ obi ya kwere ka a mụọ ya dị ka mmadụ ma kwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.
N’ihi ya, isi ihe mere e ji mụọ Jizọs n’ụwa bụ, dị ka ya onwe ya kwuru, ka o “wee gbaara eziokwu [ahụ] àmà.” (Jọn 18:37) O mere nke ahụ site n’igosi site n’okwu ọnụ na n’omume na ịchịisi Chineke ziri ezi n’ozuzu ya nakwa na ido onwe onye n’okpuru ya na-eweta obi ụtọ na-adịgide adịgide. Jizọs kọwakwara na ya bịara n’ụwa inye ndụ ya dị ka “ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ,” na-emeghe ụzọ maka ụmụ mmadụ na-emehie emehie iru izu okè na inweta ndụ ebighị ebi. (Mak 10:45) Ka ihe a kpọrọ mmadụ wee ghọta isi ihe ndị a dị mkpa, ọ dị mkpa inwe ihe ndekọ banyere ọmụmụ Jizọs. Ọzọkwa, ihe omume ndị gbara ọmụmụ Jizọs gburugburu na-akụzi ihe ndị ọzọ dị mkpa, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.
[Foto ndị dị na peeji nke 4]
Olee otú a pụrụ isi zọpụta ụmụ Adam ná mmehie?