Ụlọikpe Kasị Elu Akwadoo Ezi Ofufe “n’Ala Ararat”
Ụlọikpe Kasị Elu Akwadoo Ezi Ofufe “n’Ala Ararat”
Otu nwoke chara isi awọ bụ́ onye Armenia nke mụrụ ụmụ atọ guzo n’ihu ụlọikpe kasị elu nke mba ya. A na-achọ ịnapụ ya na ndị kwere ekwe ibe ya nnwere onwe ha. Ndị ọkàikpe nọ na-ege ntị ka ọ na-ehota ihe site na Bible iji kọwaa nkwenkwe ya. Iji ghọta otú okwu ikpe a si mee ka ezi ofufe nwee oké mmeri n’ala ahụ, ka anyị tụlee ihe ndị dugara na ya.
ARMENIA dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Turkey nakwa n’ebe ndịda nke nnukwu usoro ugwu Caucasus. Ihe karịrị nde mmadụ atọ bi n’ebe ahụ. A na-anọ n’isi obodo ya, bụ́ Yerevan, ahụ ọnụ ọnụ ugwu abụọ nke Ugwu Ararat nke ọma, bụ́ ebe, dị ka a kọrọ n’akụkọ, ụgbọ Noa tọgbọrọ mgbe Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ gasịrị.—Jenesis 8:4. *
Ndịàmà Jehova anọwo na-arụ ọrụ Ndị Kraịst ha n’Armenia kemgbe 1975. Mgbe Armenia nweresịịrị onwe ya na 1991 site n’aka mba ndị bụbu Soviet Union, e guzobere Kansụl Mba Na-ahụ Maka Okpukpe idebanye aha òtù okpukpe n’akwụkwọ. Otú ọ dị, kansụl a
anọgidewo na-ajụ idebanye aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ, karịsịa n’ihi ihe metụtara nnọpụiche Ndị Kraịst. N’ihi ya, kemgbe 1991, a mawo ihe karịrị 100 Ndịàmà na-eto eto bụ́ ndị Armenia ikpe ma tụọ ọtụtụ n’ime ha mkpọrọ n’ihi nguzo dabeere na Bible ha weere n’ihe banyere ije ozi agha.Kansụl ahụ gwakwara ụlọ ọrụ ndị ọkàiwu gọọmenti ka o mee nchọpụta banyere ọrụ okpukpe nke Lyova Margaryan, bụ́ Onye Kraịst bụ́ okenye na ọkàiwu na-arụsi ọrụ ike nke ụlọ ọrụ na-emepụta ikike atọm n’ógbè ahụ were n’ọrụ. Ka e mesịrị, e boro Nwanna Margaryan ebubo na ọ dara Akụkụ nke 244 nke Ụkpụrụ Iwu mba ahụ, bụ́ nke e nwetara n’iwu Soviet a tụpụtara n’oge ọchịchị Khrushchev, bụ́ nke a tụpụtara iji gbochie ma mee ka Ndịàmà Jehova na òtù okpukpe ndị ọzọ ghara ịdị.
Iwu ahụ mere ka ọ bụrụ mpụ ịhazi ma ọ bụ iduzi òtù okpukpe bụ́ nke, n’ime ka a ga-asị na ha na-ekwusa nkwenkwe okpukpe, ‘na-arata ndị na-eto eto ịga nzukọ okpukpe nke òtù okpukpe a na-edebanyeghị aha ya n’akwụkwọ’ ma ‘na-akpali ndị òtù ya ịjụ ịrụ ọrụ dịịrị ha n’obodo.’ Iji kwado ihe o kwuru, ọkàiwu ahụ lekwasịrị anya n’ọnụnọ ụmụaka na-anọ ná nzukọ ndị Nwanna Margaryan na-eduzi n’obodo Metsamor. Ọkàiwu ahụ bokwara Nwanna Margaryan ebubo na ọ manyere ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ ahụ ịjụ ije ozi agha.
A Malite Ikpe Ahụ
A malitere ikpe ahụ na Friday, July 20, 2001, n’ụlọikpe dị n’ógbè Armavir, bụ́ nke Ọkàikpe Manvel Simonyan nọ n’isi ya. E kpegidere ya ruo n’August. Mgbe ndị akaebe nke ndị ọkàiwu ahụ na-agba akaebe ha, ha mesịrị kweta na ndị ọrụ nke Ministri Na-ahụ Maka Nchebe Mba (nke bụbu KGB) gwara ha ụfọdụ ihe ndị ha dere n’akwụkwọ megide Nwanna Margaryan ma manye ha ịbịanye aka na ha. N’otu oge, otu nwanyị kwetara na otu onye ọrụ Ministri Na-ahụ Maka Nchebe gwara ya ka o kwuo na “Ndịàmà Jehova na-emegide gọọmenti anyị na okpukpe anyị.” Nwanyị ahụ kwupụtara na ya onwe ya amaghị Ndịàmà Jehova kama na ọ bụ nanị na telivishọn mba ahụ ka ya nụrụ ebubo ndị e boro ha.
Mgbe o ruru Nwanna Margaryan n’aka ikwu okwu, o kwuru na ụmụntakịrị ndị na-abịa nzukọ Ndịàmà Jehova na-eme nke ahụ site ná nkwado nke ndị mụrụ ha. Ọ kọwakwara na ije ozi agha bụ mkpebi onwe onye. Ọkàiwu ahụ gbagidere ya ajụjụ ọnụ ruo ọtụtụ ụbọchị. Site n’iji Bible mee ihe, Nwanna Margaryan ji olu dị nro zaa ajụjụ ndị metụtara nkwenkwe ya, ka ọkàiwu ahụ nọ na-asapeta ebe ndị ahụ o hotara n’Akwụkwọ Nsọ na Bible nke ya.
Na September 18, 2001, ọkàikpe ahụ kwuru na “ikpe amaghị” Margaryan, na-asị na “ọ dịghị ihe ọ bụla n’ọrụ ya gosiri na ọ na-eme mpụ.” Otu akụkọ kpughere ihe banyere okwu ikpe ahụ gbara n’Associated Press. Ọ na-agụ, sị: “A tọhapụrụ onye ndú nke Ndịàmà Jehova taa n’ebubo metụtara ime ntọghata na ịmanye ndị na-eto eto izere ije ozi agha. Mgbe e kpesịrị ya ikpe ruo ọnwa abụọ, Ụlọikpe ahụ kwuru na e nweghị ihe àmà zuru ezu megide onye ndú ahụ, bụ́ Levon Markarian [Lyova Margaryan]. Ọ gaara aga mkpọrọ
afọ ise. . . . Ọ bụ ezie na Ụkpụrụ Iwu Armenia kwadoro nnwere onwe okpukpe, ọ na-esiri òtù okpukpe ọhụrụ ike idebanye aha ha n’akwụkwọ, okpukpe ụkpụrụ ahụ dabaara bụ Armenian Apostolic Church bụ́ nke ihe ka ọtụtụ na-aga na ya.” N’akụkọ ha nyere ka e bipụtara ọha mmadụ na September 18, 2001, Òtù Na-ahụ Maka Nchebe na Imekọ Ihe Ọnụ na Europe (OSCE) kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na òtù OSCE nabatara mkpebi ikpe ahụ, ọ nọgidere na-akwa ụta ihe mere e jidị gbaa akwụkwọ ahụ agbaa.”Okwu Ikpe ahụ Agaa n’Ihu
Otú o sina dị, ndị ọkàiwu gọọmenti tinyere akwụkwọ maka mkpegharị ikpe, o wekwuru ọnwa anọ iji kpegharịa ikpe ahụ. Ná mmalite ikpe ahụ, mgbe o ruru Nwanna Margaryan n’aka ikwu okwu, ọ bụ otu n’ime ndị ọkàikpe na-ekpe ikpe ahụ jụrụ ya ajụjụ mbụ. Ka Nwanna Margaryan malitere ịza ya, onyeisi oche ndị ọkàikpe ahụ napụrụ ya okwu n’ọnụ ma baara ya mba. Mgbe e mesịrị, o kweghị ka Nwanna Margaryan zachaa ọbụna otu ajụjụ. N’ekwughị ihe kpatara ya, ọ kachapụkwara n’ihe ndekọ ha, ihe ka ọtụtụ n’ajụjụ ọkàiwu na-ekpechitere Nwanna Margaryan jụrụ nwanna ahụ. Mgbe a na-ekpe ikpe ahụ, ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè na-emegide Ndịàmà, bụ́ ndị jupụtara n’ụlọikpe ahụ, gwara Nwanna Margaryan okwu mkparị ugboro ugboro. Mgbe e kpesịrị ikpe n’ụbọchị ahụ, a kọrọ ọtụtụ akụkọ na-abụghị eziokwu na ndị e tinyere nnu na ose banyere ikpe ahụ na telivishọn, na-ekwu dị ka ihe atụ, na Nwanna Margaryan, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ekwetawo na ikpe mara ya.
Ka a na-ekpe ikpe ahụ, onyeisi oche nke ìgwè ndị ọkàikpe ahụ mmadụ atọ mejupụtara mere ihe juru ndị na-ekiri ihe na-emenụ anya site n’ịgụ akwụkwọ ozi sitere n’aka Kansụl Mba Na-ahụ Maka Okpukpe bụ́ nke kwuru ka ụlọ ọrụ ndị ọkàiwu gọọmenti mee ihe megide Nwanna Margaryan. Omume a wụrụ ndị si mba ọzọ bụ́ ndị na-ege ikpe ahụ akpata oyi n’ahụ́, ebe ọ bụ na n’akwụkwọ Armenia dejupụtara iji sonye na Kansụl Europe, ọ nakweere ọrụ dịịrị ya “ịhụ na Chọọchị nile ma ọ bụ òtù
okpukpe nile, karịsịa ndị e weere dị ka ‘ndị a na-amaghị ama,’ pụrụ ịdị na-ekpe okpukpe ha n’abụghị ndị a kpara ókè megide.”Ka ikpe ahụ gara n’ihu n’izu na-esonụ, e nwekwuru ọgba aghara n’ụlọikpe ahụ. Ndị mmegide nọgidere na-amaja ma na-awakpo Ndịàmà n’ime ụlọikpe ahụ nakwa na mbara èzí ya. A gbara ndị inyom bụ́ Ndịàmà ụkwụ n’akụkụ ikpere. Mgbe a wakporo otu Onyeàmà ma o kweghị emegwara, a kụrụ ya ihe n’ọkpụkpụ azụ, e bugakwara ya ụlọ ọgwụ.
Ka ọ dịgodị, a họpụtara ọkàikpe ọzọ ịbụ onyeisi oche n’okwu ikpe ahụ. N’agbanyeghị mgbalị mmadụ ole na ole nọ n’etiti ndị na-ege ntị mere iji majaa ọkàiwu na-ekpechitere Nwanna Margaryan, onyeisi oche ọhụrụ a chịkwara ihe nile, ọbụna na-enye ndị uwe ojii iwu ka ha si n’ụlọikpe ahụ kpọpụ otu nwanyị nke ji oké olu na-eyi ọkàiwu ahụ egwu.
A Gaa n’Ụlọikpe Kasị Elu nke Armenia
N’ikpeazụ, na March 7, 2002, ụlọikpe mkpegharị ikpe ahụ kwadoro ihe ụlọikpe mbụ ahụ kpebiri. N’ụzọ dị ịtụnanya, e kposara Kansụl Na-ahụ Maka Okpukpe ná Mba ahụ n’ụbọchị bọtara ụbọchị e kpebiri ikpe a. Ọzọkwa, ndị ọkàiwu gọọmenti tinyere akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ahụ, na nke ugbu a, n’ụlọikpe kasị elu nke Armenia—Ụlọikpe Cassation. Ndị ọkàiwu gọọmenti rịọziri Ụlọikpe ahụ ka o lebagharịa anya n’okwu ikpe ahụ maka “ịma ikpe.”
Ìgwè ndị ọkàikpe mmadụ isii mejupụtara, bụ́ nke Ọkàikpe Mher Khachatryan bụ onyeisi ya, zukọrọ n’elekere 11 nke ụtụtụ n’April 19, 2002. N’okwu mmalite ya, otu n’ime ndị ọkàiwu gọọmenti kwupụtara iwe ya na ụlọikpe abụọ bu ụzọ kpee ikpe ahụ amalighị Nwanna Margaryan ikpe. Otú ọ dị, na nke ugbu a, ọ bụ ọkàiwu a ka a napụrụ okwu n’ọnụ, mmadụ anọ n’ime ndị ọkàikpe ahụ agbaakwa ya nnọọ ajụjụ ọnụ. Otu ọkàikpe baara ọkàiwu ahụ mba n’ihi ịnwa ime ka o yie ka Ụlọikpe ahụ o nwere ajọ mbunobi megide Ndịàmà Jehova site n’ịgụnye ọrụ nkwusa na ndeba a na-edebaghị okpukpe ha n’akwụkwọ, n’akwụkwọ ọ gbara Nwanna Margaryan—ndị ọ na-adịghị nke ọ bụla n’ime ha a kọwara dị ka mpụ n’Akụkụ nke 244 nke Ụkpụrụ Iwu mba ahụ. Ọkàikpe ahụ kọwaziri omume ọkàiwu ahụ dị ka “mkpagbu site n’ibo mmadụ ebubo na o mere mpụ.” Ọkàikpe ọzọ kpọtụrụ uche n’ọtụtụ ikpe ndị e kpere n’Ụlọikpe Europe bụ́ ebe e kwetara na Ndịàmà Jehova bụ “okpukpe a ma ama” nke ruru eru inweta nchebe nke Nkwekọrịta Europe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ. N’oge a, otu onye ụkọchukwu nọ n’ụlọikpe ahụ ji oké olu kwuo na Ndịàmà Jehova na-ekewa mba ahụ. Ụlọikpe ahụ nyere ya iwu ka o mechie ọnụ.
Ndị ọkàikpe ahụ kpọpụtaziri Lyova Margaryan—ihe ụlọikpe a kasị elu na-emetụbeghị. Nwanna Margaryan gbara àmà dị mma banyere nguzo Ndịàmà Jehova na-ewere dị ka Ndị Kraịst n’ihe ndị dịgasị iche iche. (Mak 13:9) Mgbe ndị ọkàikpe ahụ gbarịtasịrị izu, ha lọghachiri ma jiri otu olu kwado na “ikpe amaghị” Nwanna Margaryan dị ka e kwuburu. Ahụ́ bịara nnọọ ruo Nwanna Margaryan ala. Ná mkpebi ha dere ede, Ụlọikpe ahụ sịrị: “Iwu a na-agbaso ugbu a ewereghị ọrụ a [nke Lyova Margaryan na-arụ] dị ka mpụ, ebubo dị otú a megidekwara Akụkụ nke 23 nke Ụkpụrụ Iwu Armenia na Akụkụ nke 9 nke Nkwekọrịta Europe.”
Mmetụta Mkpebi Ikpe ahụ Nwere
A sị na ikpe laara ndị ọkàiwu gọọmenti ahụ, ọ gaara eme ka a gbaa Ndịàmà ndị ọzọ bụ́ ndị okenye nọ n’ọgbakọ ndị dị n’akụkụ nile nke Armenia akwụkwọ. Anyị nwere olileanya na mkpebi ikpe doro anya nke Ụlọikpe ahụ ga-egbochi mwakpo dị otú ahụ. Ịma Ndịàmà Jehova ikpe pụkwara ịghọ ihe a gaara agbakwasị ụkwụ wee nọgide na-ajụ idebanye aha ha n’akwụkwọ. Anyị nwere ekele na Ụlọikpe ahụ ewepụla ihe mgbakwasị ụkwụ a na-ekwesịghị ekwesị.
Anyị ga-ama, ka oge na-aga, ma a ga-edebanyekwa aha Ndịàmà Jehova 7,000 nọ ná mba ahụ n’akwụkwọ. Ka ọ dịgodị, ezi ofufe ka dị ma nọgide na-aga n’ihu “n’ala Ararat.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Nke a bụ otu ihe mere ndị Armenia ji jiri Ugwu Ararat mara obodo ha. N’oge ochie, Armenia bụ alaeze buru ibu nke ókèala ya gụnyere ugwu ndị ahụ. N’ihi ya, n’Aịsaịa 37:38, nsụgharị Bible nke Septuagint Grik sụgharịrị okwu bụ́ ‘ala Ararat’ ịbụ “Armenia.” Ugwu Ararat dịzi na Turkey, na nso ókè ya nke ebe ọwụwa anyanwụ.
[Foto dị na peeji nke 12]
Lyova Margaryan mgbe a na-ekpe ya ikpe
[Foto dị na peeji nke 13]
Nwanna Margaryan na ezinụlọ ya