Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ọrụ Nkwusa Bụ Ihe Kwesịrị Ncheta n’Ụzọ Pụrụ Iche

Mgbe Ọrụ Nkwusa Bụ Ihe Kwesịrị Ncheta n’Ụzọ Pụrụ Iche

Mgbe Ọrụ Nkwusa Bụ Ihe Kwesịrị Ncheta n’Ụzọ Pụrụ Iche

“Anwụ na-achasi nnọọ ike. Ụzọ ọhịa ahụ dị n’ugwu ahụ eyie e jewe erughị eru. Mgbe anyị gafesịrị ọtụtụ ihe mgbochi, anyị mesịrị ruo ebe anyị na-aga: obodo nta nke kasị dịpụ adịpụ. Mgbe anyị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ mbụ, a nabatakwa anyị nke ọma, anyị malitere inwe ọṅụ n’agbanyeghị na ike gwụrụ anyị. Ka ọ na-erule n’oge uhuruchi, anyị enyefechaala akwụkwọ nile anyị ji bịa ma malite ọtụtụ ọmụmụ Bible. Ndị ebe ahụ chọsiri ike ịmụta ihe. Oge eruola ka anyị lawa, ma anyị kwere ha nkwa ịlọghachi.”

AHỤMAHỤ ndị dị otú ahụ abụghịrị otu ìgwè ndị ozi ọsụ ụzọ nọ na Mexico ihe ọhụrụ. Ha kpebisiri ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ịrụzu ọrụ Jizọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya: “Unu ga-agbakwa àmà banyere m . . . ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Na Mexico, e mere ndokwa maka ụdị ọrụ nkwusa pụrụ iche—nke a na-akpọ ókèala ndị ọsụ ụzọ—iji hụ na a na-eje ozi n’ókèala ndị a na-ekenyeghị ọgbakọ, n’ihi ya kwa, bụrụ ndị a na-adịghị ezikebe ozi ọma Alaeze Chineke na ha. N’ozuzu, ókèala ndị a bụ ndị dịpụrụ adịpụ ma ọ bụ ndị ọ na-esi ike iru na ha. A na-enyekwara ọgbakọ dị n’ebe dịpụrụ adịpụ bụ́ ndị nwere ókèala buru ibu aka.

Iji chọpụta ebe ndị ga-eso n’ókèala ndị ọsụ ụzọ ná mba ahụ, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-enyocha mkpa nke ókèala dị iche iche. * Ozugbo e mere nke a, a na-ekenye ìgwè dị iche iche nke ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ịga rụchapụ ókèala ahụ. A na-enye ha ụgbọala ndị ga-agbali n’ụzọ ọjọọ ndị ahụ a na-eteghị ete. A na-ejikwa ụgbọala ndị ahụ emere ebe a na-ebusa akwụkwọ na ebe a na-ehi ụra mgbe ọ dị mkpa.

Ịzaghachi Ozugbo

Kemgbe October 1996, a kpọwo ndị ọzọ na-ekwusa ozi ọma òkù iso ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-ekere òkè n’ọrụ a. Ndị nkwusa Alaeze nakwa ndị ọsụ ụzọ oge nile bụ́ ndị dị njikere ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, keere òkè ná mkpọsa ahụ n’oge dịgasị iche iche. A na-ekenye ụfọdụ ọrụ n’ọgbakọ ndị dị n’ókèala ahụ isoro ha na-arụ ókèala ha na ịgaghachi na nke ndị gosiri mmasị iji hụ na ha nọgidere na-enwe mmasị. Ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ azawo òkù a ma bụrụ ndị nwetaworo ahụmahụ ndị na-agba nnọọ ume.

Dị ka ihe atụ, Abimael, bụ́ Onyeàmà na-eto eto nke na-arụ ọrụ a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ na ya n’ụlọ ọrụ fon a na-eji agagharị agagharị, kpebiri ikere òkè n’ọrụ nkwusa n’ógbè ndị ahụ dịpụrụ adịpụ. Mgbe ndị were ya n’ọrụ chọpụtara na ọ na-aga ịpụ, ha kwere nkwa ibuli ya n’ọkwá na itinyekwu ihe n’ụgwọ ọnwa ya. Ndị ọrụ ibe ya rụgidere ya, na-agwasi ya ike na ihe a bụ ohere pụrụ iche o nwere nakwa na ọ ga-abụrụ ya ihe nzuzu ịjụ ịnakwere ya. Otú ọ dị, Abimael kpebisiri ike ịkwado ọrụ nkwusa ahụ pụrụ iche ruo ọnwa atọ. Ka Abimael jesịrị ozi a, o kpebiri ịnọgidezi n’otu ọgbakọ dị n’ógbè dịpụrụ adịpụ bụ́ ebe e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ugbu a, o nwere obere ọrụ ọ na-arụ ma mụtakwa ime ka ndụ ya dị mfe.

N’ihe atụ ọzọ, Julissa na-eji bọs eme njem awa 22 iji rute n’ebe e kenyere ya ọrụ. Mgbe o ruru n’ebe ikpeazụ ọ na-aba bọs, bọs ikpeazụ aghaala ya. Otú ọ dị, e nwere otu ụgbọala pikọp na-ebu ndị ọrụ. Julissa katara obi ma gwa ha ka ha buru ya. O kwere nghọta na ụjọ ji ya n’ihi na ọ bụ nanị ya bụ nwanyị nọ n’etiti ọtụtụ ụmụ nwoke. Mgbe ọ malitere ikwusara otu nwa okorobịa ozi ọma, ọ chọpụtara na ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova! “E wezụga nke ahụ,” ka Julissa na-echeta, “onye na-akwọ ụgbọala pikọp ahụ bụ onye okenye n’ọgbakọ e kenyere m ọrụ na ya!”

Ndị Agadi Keere Òkè

Otú ọ dị, ọrụ a abụghị nanị maka ndị na-eto eto. Ọ dịla anya Adela, bụ́ nwanna nwanyị meworo agadi, chọwara itinyekwu oge n’ọrụ nkwusa ahụ. Ọ bịara nweta ohere maka ya mgbe a kpọrọ ya òkù ikere òkè n’ọrụ nkwusa a pụrụ iche. Ọ na-akọ, sị: “Enwere m nnọọ mmasị n’ebe e kenyere m ọrụ nke na arịọrọ m ndị okenye nọ n’ọgbakọ ahụ ka ha kwe ka m nọrọwazie. Obi dị m ụtọ n’ihi na n’agbanyeghị na abụ m agadi, aka m baara Jehova uru.”

N’ụzọ yiri nke ahụ, n’ịbụ onye obi ekele o nwere n’ebe Jehova nọ na ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ ibe ya nọ kpaliri, Martha bụ́ onye dị afọ 60 wepụtara onwe ya ikere òkè n’ọrụ ahụ. Mgbe ọ hụrụ na ịdị anya nke ókèala ahụ na ịdị njọ nke ụzọ ya na-egbochi ìgwè nke ọ nọ na ya ịgakwuru ndị nile bi n’ókèala ahụ, ọ zụrụ obere ụgbọala ndị ọsụ ụzọ ga-eji na-eme ihe. Onyinye nwanna nwanyị a mere ka o kwe omume ịrụzu ókèala ka ukwuu na isoro ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu na-ekerịta eziokwu Bible.

Mmeghachi Omume Na-enye Obi Ụtọ

Ihe mgbaru ọsọ nke ndị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa a pụrụ iche bụ ‘ime ndị na-eso ụzọ.’ N’akụkụ a, a rụpụtawo ihe ndị magburu onwe ha. Ndị bi n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ anatawo eziokwu ndị na-azọpụta ndụ site na Bible. (Matiu 28:19, 20) A malitewo ọtụtụ ọmụmụ Bible. Ndị na-eduzi ha bụ ndị nkwusa bi n’ógbè ahụ ma ọ bụ ndị na-ezisa ozi ọma bụ́ ndị nọgideworo n’ókèala ahụ. N’ebe ụfọdụ, e nweela ìgwè ndị nkwusa, n’ebe ndị ọzọkwa, e guzobewo ọbụna obere ọgbakọ.

Magdaleno na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ ji ụgbọ njem ọha gaa n’ókèala dịpụrụ adịpụ nke e kenyere ha ọrụ na ya. Ka ha nọ n’ụzọ, ha ji ohere ha nwere kwusaara onye na-akwọ ụgbọala ahụ ozi ọma. “Nwoke a gwara anyị na, n’izu gara aga, ụfọdụ Ndịàmà bịara na nke ya mgbe ya na-anọghị ya. Mgbe ọ lọtara, ezinụlọ ya kọọrọ ya ihe ha nụrụ n’ọnụ Ndịàmà ahụ. Anyị gwara ya na anyị esighị n’ógbè ahụ, kama na anyị si n’ọtụtụ steeti ndị dị ná mba a bịa iji kwadoo ọrụ nkwusa a pụrụ iche nakwa na anyị nile kwụọrọ onwe anyị ụgwọ ụgbọ. N’ịbụ onye nke a kpaliri mmasị ya, ọkwọ ụgbọala ahụ kwuru na ya na ezinụlọ ya ga-amalite ịmụ Bible n’otu izu ahụ. Ọbụna o nyere onyinye maka ọrụ ahụ site n’ịghara ịna anyị ego ụgbọ.”

Mmeghachi omume nke ndị bi n’ugwu ndị ahụ dị na Chiapas masịkwara nnọọ Magdaleno. “Mụ na nwunye m nwere ahụmahụ nke isoro ìgwè ndị ntorobịa 26 na-aga Chọọchị Presbyterian kerịta ozi Alaeze ahụ. Ha nile gere ntị nke ọma ruo minit 30. Ha wetara Bible ha, anyị bịakwara nwee ike ịgbara ha àmà nke ọma banyere nzube Jehova. Ihe ka ọtụtụ ná ndị ebe ahụ nwere Bible ha n’asụsụ Tzeltal.” A malitere iduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible na-aga n’ihu.

Mmegide Ebelata

E jibeghị ozi Bible gaa n’otu ógbè dị na Chiapas ruo ihe karịrị afọ abụọ n’ihi mmegide nke ụfọdụ ndị bi ebe ahụ. Teresa, bụ́ onye na-ezisa ozi ọma oge nile, chọpụtara na ụfọdụ Ndịàmà na-atụ ụjọ ikwusa ozi ọma n’obodo nta ahụ. “N’ụzọ tụrụ mmadụ nile n’anya, ndị ebe ahụ nwere mmasị ige ntị. Mgbe anyị mesịrị nkwusa, mmiri malitere izosi nnọọ ike. Ka anyị na-achọ ebe anyị ga-agbaba, anyị bịara n’ụlọ otu onye na-ele ọbịa nke ọma aha ya bụ Sebastián, bụ́ onye kwere ka anyị bata n’ime ụlọ ya ma zere mmiri. Ozugbo anyị banyere n’ime ụlọ ya, ajụrụ m ya ma ọ dịla ndị bịara kwusaara ya ozi ọma. Mgbe ọ zara ee e, amalitere m ịgbara ya àmà ma malite iduziri ya ọmụmụ Bible na-eji akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. * Mgbe anyị mesịrị, Sebastián ji anya mmiri rịọ anyị ka anyị lọghachi iji mụọrọ ya ihe.”

Ìgwè ndị ọsụ ụzọ ọzọ letara Chiapas na-akọ, sị: “Site n’enyemaka Jehova, anyị rụpụtara ihe ndị dị mma. N’izu mbụ, anyị malitere ọmụmụ ihe 27; n’izu nke abụọ, anyị kpọrọ ndị mmadụ òkù ịbịa kirie vidio anyị bụ́ The Bible—Its Power in Your Life. Mmadụ 60 bịara kirie ya. Ọ masịrị ha nile. N’ikpeazụ, anyị zubere ịmalite ịmụ Bible n’ìgwè. N’ụzọ dị ịtụnanya, e guzobere ìgwè ọmụmụ ihe abụọ n’obodo nta a.

“Mgbe anyị rụchapụrụ ebe ndị e kenyere anyị ọrụ, anyị lọghachiri ileta obodo nta ahụ iji wusikwuo ndị nwere mmasị ike na iji hụ otú ìgwè ọmụmụ Bible ndị ahụ e guzobere na-eme. Anyị kpọrọ ha òkù ịbịa nzukọ ihu ọha na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Otú ọ dị, ọ dịghị ebe ga-aba ịnọ nwee nzukọ ndị ahụ. Onye wepụtara ebe obibi ya ka ìgwè ọmụmụ ihe ahụ jiri ya na-eme ihe tụrụ aka n’azụ ụlọ ya ma kwuo, sị: ‘A pụrụ ịnọ n’azụ ụlọ nwee ya bụ́ nzukọ.’”

Ná ngwụsị izu ahụ, ma ndị ọsụ ụzọ ahụ si esi bịa ma ndị nwere mmasị ji ịnụ ọkụ n’obi nye aka kwadebe mbara èzí ahụ ka e wee nwee ike ịnọ na ya nwee nzukọ ndị ahụ. Mmadụ 103 gara nzukọ nke mbụ ahụ. Ugbu a, a na-eduzi ọmụmụ Bible 40 n’obodo nta ahụ.

“Ahụmahụ Magburu Onwe Ya”

E wezụga ihe ndị magburu onwe ha a rụpụtaworo n’ọrụ nkwusa ahụ, ndị kewooro òkè n’ọrụ izisa ozi ọma a eritewo uru nke ukwuu n’onwe ha. María, bụ́ nwa agbọghọ bụ́ ọsụ ụzọ nke keere òkè n’otu n’ime mkpọsa ndị a si otú a kwupụta mmetụta ya: “Ọ bụ ahụmahụ magburu onwe ya n’ihi ihe abụọ. Ọṅụ m na-enwe n’ọrụ nkwusa ahụ mụbara, mmekọrịta mụ na Jehova bịakwara chikwuo anya. N’otu oge, ka anyị na-arị otu nnukwu ugwu, ike gwụrụ anyị. Mgbe anyị rịọsịrị Jehova maka enyemaka, anyị hụrụ mmezu nke ihe Aịsaịa 40:29-31 na-ekwu: ‘Ndị na-ele anya Jehova ga-enwetaghachi ike ha.’ Ya mere, anyị rutere ebe ahụ ma duziere ndị nabatara anyị nke ọma ọmụmụ ihe.”

Onye ọsụ ụzọ ọzọ na-eto eto, bụ́ Claudia dị afọ 17, na-agwa anyị, sị: “Eritewo m uru nke ukwuu. Amụtawo m ịbụ onye nwekwuru nkà n’ozi, bụ́ nke nyeworo m ọṅụ dị ukwuu, nke a emewokwa ka m setịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. Etozuwokwa m okè n’ụzọ ime mmụọ. N’ụlọ anyị, ọ bụ nne m na-emere m ihe nile. Ugbu a, n’ịbụ onye nwekwuru ahụmahụ, aghọwo m onye jikwu ihe kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, ana m ahọbu nri. Ma ugbu a m na-aghaghị imezigharị ihe iji kwekọọ n’ọnọdụ dị iche iche, adịghịzi m eme mkpesa banyere ihe oriri. Ụdị ozi a enyeworo m aka inweta ezigbo ndị enyi. Anyị na-ekerịta ihe nile anyị nwere ma na-enyerịtara ibe anyị aka.”

Owuwe Ihe Ubi nke Na-enye Ọṅụ

Gịnị siworo ná mgbalị a pụrụ iche pụta? Ka ọ na-erule ná mmalite afọ 2002, ihe dị ka ndị ọsụ ụzọ 28,300 ejewo ozi n’ókèala ndị ọsụ ụzọ a. Ha eduziwo ihe karịrị ọmụmụ Bible 140,000, na-etinye ihe karịrị nde awa abụọ n’ọrụ nkwusa ahụ. Iji nyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu Bible, ha enyefewo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akwụkwọ 121,000 na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ magazin 730,000. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ iduzi ọmụmụ Bible 20 ma ọ bụ karịa.

Ndị e gosiri obiọma a na-enwe ekele dị ukwuu maka mgbalị e tinyekwuru iji wetara ha ozi Bible. N’agbanyeghị na ha dara ogbenye, ọtụtụ na-esi ọnwụ ka ndị nkwusa nara onyinye ndị ha na-enye. Otu nwanyị dị afọ 70 nke nọ ná mkpa na-enyekarị ndị ọsụ ụzọ na-abịa na nke ya ihe. Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara ya, ọ na-amalite ibe ákwá. Otu ezinụlọ ọ na-enweghị ka ọ hà ha na-agwa ndị ahụ na-ezisa ozi ọma oge nile na ọ bụ ha ka nnekwu ọkụkọ yiere àkwá ụfọdụ ma na-agba ha ume iwere àkwá ndị ahụ.

Nke ka mkpa bụ na ndị ahụ nwere ezi obi na-egosipụta ezi ekele maka ihe ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ na-eji awa atọ na ọkara aga nzukọ Ndị Kraịst nanị ya, ọ dịghịkwa agha nzukọ ọ bụla. N’agbanyeghị na otu agadi nwanyị nwere nsogbu n’ikpere, ọ na-eme njem awa abụọ iji nweta ntụziaka sitere na Bible n’oge onye nlekọta na-ejegharị ejegharị letara ha. Ụfọdụ ndị na-amaghị ịgụ na ide ihe na-amụ ya ka ha wee nwee ike iritekwu uru site ná nkụzi Bible. A gọziwo mgbalị ha n’ụba.

N’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, Luk kọwara ọhụụ Pọl onyeozi hụrụ, sị: “Otu nwoke Masedonia guzo na-arịọsi ya arịrịọ ike na-asị: ‘Gafeta na Masedonia nyere anyị aka.’” Pọl ji ọchịchọ obi ya za òkù ahụ. Taa, n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ na Mexico, ọtụtụ ndị ejiriwo otu mmụọ ahụ mee ihe site n’iwepụta onwe ha ikwusa ozi ọma ahụ “ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.”—Ọrụ 1:8; 16:9, 10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 N’otu afọ na-adịbeghị anya, ọgbakọ Ndịàmà Jehova adịghị ejechi ozi anya n’ihe karịrị pasent 8 nke ókèala ndị dị na Mexico. Nke a pụtara na e nwere ihe karịrị mmadụ 8,200,000 bi n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ bụ́ ndị a na-adịghị arụchi ọrụ nkwusa anya na ha.

^ par. 17 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ọtụtụ Ndịàmà nọ na Mexico ekerewo òkè n’ọrụ nkwusa pụrụ iche