Ha Na-ejere Òtù Ụmụnna Ndị Kraịst Ozi ná Mba Ndị Ọzọ
Ha Na-ejere Òtù Ụmụnna Ndị Kraịst Ozi ná Mba Ndị Ọzọ
Ị̀ NỤTỤLA okwu ndị bụ́ “ndị ozi nke mba nile” na “ndị ọrụ afọ ofufo nke mba nile”? Ndịàmà Jehova bụ́ ndị mejupụtara ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo ndị a na-ewepụta oge na nkà ha iji nye aka n’iwu ebe ndị a na-anọ ebipụta ma na-ekesa ozi Alaeze nke Bible. Ndị ọrụ afọ ofufo dị otú a na-enyekwa aka n’iwu Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche, bụ́ ndị a na-anọ na ha akụzi Bible. Ka ọ dị ugbu a, ndị ọrụ afọ ofufo ndị a na-enye aka n’iwu ihe owuwu ná mba 34, karịsịa n’ala ndị nwere ihe onwunwe dị nta. Olee ihe ịma aka na ọṅụ ndị pụrụ iche ụdị ndị ozi a na-enwe ka ha na-ejere òtù ụmụnna Ndị Kraịst ozi ná mba ndị ọzọ? Olee otú “ozi dị nsọ” ha na-eje na-adị ha? (Mkpughe 7:9, 15) Iji chọpụta nke ahụ, ka anyị kpọtụrụ ụfọdụ ndị ọrụ afọ ofufo jere ozi na Mexico.
Mgbe mbụ ndị ọrụ afọ ofufo si mba ọzọ bịarutere Mexico bụ na May 1992. Ngwa ngwa ha rutere, ha butere ụzọ n’ọrụ iwusawanye alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ahụ, bụ́ nke na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova na Mexico. Ọrụ mwusawanye ahụ gụnyere iwu ụlọ 14 ọhụrụ, gụnyere ụlọ obibi maka ndị na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, ụlọ obibi akwụkwọ, na ụlọ ọfịs.
Iji nye aka n’ọrụ iwu ihe a, ihe karịrị ndị ọrụ afọ ofufo 730 bụ́ ndị si Canada, Great Britain, United States, na mba ndị ọzọ so ọtụtụ narị ndị ọrụ afọ ofufo si n’akụkụ nile nke Mexico rụkọọ ọrụ. Tụkwasị na nke ahụ, ihe karịrị Ndịàmà 28,000 nọ n’ihe dị ka ọgbakọ 1,600 dị nso n’alaka ụlọ ọrụ ahụ nyere aka n’ọrụ owuwu ihe ahụ ná ngwụsị izu. Ha nile ji mmụọ afọ ofufo jee ozi ma jiri nkà ha mee ihe n’anaghị ego ọ bụla. Ha gụrụ ya dị ka ihe ùgwù ijere Jehova ozi n’ụzọ dị otú a. N’oge ahụ nile ha wuru ihe ndị ahụ, ha buuru n’uche okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị n’Abụ Ọma 127:1: “Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.”
Ihe Ịma Aka Ndị Ha Na-eche Ihu
Gịnị bụ ihe ịma aka ndị ndị ọrụ afọ ofufo nke mba nile na-eche ihu mgbe ha na-eje ozi ná mba ọzọ? Lee ụfọdụ n’ime ihe ndị ha kwuru. Curtis na Sally, bụ́ di na nwunye si United States, enyewo aka n’iwu ihe owuwu na Germany, India, Mexico, Paraguay, Romania, Russia, Senegal, na Zambia. Curtis na-akọ, sị:
“Ihe ịma aka nke mbụ bụ ịhapụ nwa anyị nwanyị, bụ́ onye na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ [onye ozi oge nile], na ịhapụ ọgbakọ anyị nọ na ya n’obodo anyị bụ́ Minnesota. Mụ na nwunye m anọwo n’ọgbakọ ahụ ruo afọ 24, ahụ́ rukwara anyị nnọọ ala n’ebe ahụ.”Sally na-ekwu sị: “Mmadụ ibi ndụ n’ọnọdụ ndị na-amaraghị ya ahụ́ bụ ihe ịma aka, ikekwe ọbụna nye nwanyị karịa nwoke, ma amụtara m na o kwere omume ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ e nwere. Ọbụna amụtara m ịnagide ọtụtụ ụmụ ahụhụ!” Ọ na-agbakwụnye, sị: “N’otu mba, mmadụ iri n’ime anyị bụ́ ndị ọrụ afọ ofufo bi n’otu ụlọ obibi nke na-enweghị kichin ma nwee nanị ụlọ ịsa ahụ́ abụọ. N’ebe ahụ, amụtara m inwekwu ndidi.”
Ịmụ asụsụ ọhụrụ bụ ihe ịma aka ọzọ nke na-achọ mgbalị na ịdị umeala n’obi. Sharon, bụ́ onye ya na di ya jeworo ozi n’iwu ihe owuwu ná mba dị iche iche, na-asị: “Amaghị asụsụ nke mba ị na-eje ozi na ya bụ ihe ịma aka. Ná mmalite, ọ na-esi ike iru ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ gị nso mgbe ị na-apụghị ikwupụta mmetụta gị n’enweghị ihe mgbochi. Nke ahụ na-akụda mmụọ. Ma ụmụnna ndị anyị zutere n’ebe ndị e kenyere anyị ọrụ ná mba ọzọ nwere nnọọ ndidi n’ebe anyị nọ ma nwee mmasị dị ukwuu n’ọdịmma anyị. N’oge na-adịghị anya, anyị malitere iso ha na-ekwurịtatụ okwu.”
Ikere Òkè n’Ozi Na-achọ Obi Ike
Ọ bụ ezie na ndị ọrụ afọ ofufo dị otú ahụ na-achụ onwe ha n’àjà iji na-enye aka nke ukwuu n’ọganihu nke ọrụ owuwu ihe, nke kasị mkpa bụ na ha ghọtara na ha bụ ndị nkwusa nke ozi ọma Alaeze Chineke. N’ihi ya, ha na-akwado ọrụ nkwusa nke ọgbakọ ha so na-amụ ihe, n’ụzọ zuru ezu. Åke na Ing-Mari, bụ́ di na nwunye nyere aka n’iwu ihe owuwu na Guadeloupe, Malawi, Mexico, na Nigeria, kwetara na iji asụsụ ọzọ eme ihe mgbe ị na-ekere òkè n’ozi ná mba ọzọ na-achọ obi ike.
Ing-Mari na-akọ, sị: “Ná mmalite, anyị na-ekere òkè dị nta, ebe ọ bụ na anyị na-esonyekarịrị Ndịàmà bụ́ ndị ebe ahụ, iji ghara imenye onwe anyị ihere, ọtụtụ mgbe anyị na-ahapụ ha ka nanị ha na-ekwu okwu. Otú ọ dị, otu ụtụtụ, anyị kpebiri ịga ozi ubi nanị anyị. Ahụ́ na-ama anyị jijiji mgbe anyị na-aga. Anyị zutere otu nwa agbọghọ nke gere ntị n’ozi ọma m bụ́ nke m ziri ya ihe ndị m bu n’isi. Agụrụ m otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma nyefee ya akwụkwọ ụfọdụ. Nwanyị ahụ kwuziri sị: ‘Gwa m ihe m ga-eme. O nwere onye ikwu m nke ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Olee otú mụ onwe m pụrụ isi malite ịmụ ihe?’ Amaghị m ihe m ga-ekwu. Mgbe e mesịrị, akatara m obi ma kwe nkwa ịmụrụ ya Bible.”
Ing-Mari na-agbakwụnye, sị: “Cheedị banyere ọṅụ na ekele m nwere n’ebe Jehova nọ maka ịgọzi mgbalị na ọchịchọ anyị ịgwa ndị ọzọ banyere eziokwu ahụ.” Nwanyị a nwere ezigbo ọganihu, e meekwa ya baptizim dị ka Onyeàmà n’otu mgbakọ e nwere na Mexico City. Åke na Ing-Mari si otú a kọwaa ozi ha: “Anyị ji ọrụ anyị na-arụ n’ihe owuwu dị iche iche kpọrọ ihe nke ukwuu, ma ọ dịghị ihe karịrị ọṅụ na afọ ojuju anyị na-enwe n’inyere ndị ọzọ aka ịnakwere eziokwu ahụ.”
Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà
N’eziokwu, ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ ndị hapụrụ ezinụlọ na ndị enyi ha na-achụ ihe ụfọdụ n’àjà iji jeere ụmụnna ha ozi n’ala ndị ọzọ, ma ha na-enwetakwa ọṅụ na-enweghị atụ. Gịnị bụ ọṅụ ha?
Howard, bụ́ onye ya na nwunye ya, bụ́ Pamela, soworo jee ozi n’Angola, Colombia, Ecuador, El Salvador, Guyana, Mexico, na Puerto Rico na-akọwa, sị: “Ọ bụ ihe ùgwù izute ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị si ná mba dị iche iche na ịnụ ụtọ nkekọ ịhụnanya nke dị n’òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ n’onwe gị. Anyị na-agụkarị banyere ya n’akwụkwọ, ma mgbe gị na ndị nwere ọdịbendị dị iche na ndị a zụlitere n’ụzọ dị iche bikọrọ, i sorokwa ha jee ozi, ị ga-ejikwu òtù ụmụnna anyị dị oké ọnụ ahịa kpọrọ ihe.”
Gary, bụ́ onye nyeworo aka n’iwu ihe owuwu na Colombia, Costa Rica, Ecuador, Mexico, na Zambia, chekwara na ihe omume a abaworo ya uru dị ukwuu. Ọ na-akọ, sị: “Ọzụzụ m nwetara n’ime ọtụtụ afọ gaworo aga site n’iso ụmụnna tozuru okè bụ́ ndị na-eje ozi n’alaka ndị dị ná mba ndị e kenyere m ọrụ na-akpakọrịta enyeworo m aka ịbụ onye a kwadebere nke ọma karị iche ihe ịma aka ndị m na-enwe n’ọrụ m ihu. Ọ bụwo ihe na-ewusi okwukwe ike n’ihi na ọ na-enye m ohere ịnụ ụtọ ịdị n’otu nke e ji mara nzukọ zuru ụwa ọnụ nke Jehova—ịdị n’otu nke ndịrịta iche nke asụsụ, agbụrụ, ma ọ bụ ọdịbendị na-adịghị egbochi.”
Ka ọ dịgodị, e wuchaala ihe ndị a na-ewu na Mexico, a rarawokwa ihe owuwu alaka ahụ nke e wusawanyere ewusawanye nye n’afọ a. N’ịbụ ndị ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ kpaliri, ndị ozi mba nile na ndị ọrụ afọ ofufo nke mba nile enyewo aka n’ụzọ dị ukwuu n’ịgbasawanye ezi ofufe na Mexico nakwa n’ebe ndị ọzọ. Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ji mmụọ afọ ofufo na nke ịchụ onwe onye n’àjà ha na-egosipụta iji na-ejere ụmụnna ha bụ́ Ndị Kraịst ozi ná mba ọzọ, kpọrọ ihe.
[Foto dị na peeji nke 25]
Ecuador
[Foto dị na peeji nke 25]
Colombia
[Foto dị na peeji nke 25]
Angola
[Foto dị na peeji nke 26]
Ubi nke dị n’alaka ụlọ ọrụ ahụ
[Foto dị na peeji nke 26]
A malite iwu ihe owuwu ndị ọhụrụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Mexico
[Foto dị na peeji nke 26]
N’okpuru: Ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ ná Ngalaba Ihe Owuwu ka ha nọ n’ihu otu n’ime ihe owuwu ọhụrụ ndị ahụ
[Foto dị na peeji nke 27]
Ndị ọrụ afọ ofufo na-ewu ihe owuwu na-enwe obi ụtọ iso ọgbakọ ndị dị n’ebe e kenyere ha ọrụ na-akwado ọrụ nkwusa ahụ