Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kasie Ndị Na-eru Újú Obi

Kasie Ndị Na-eru Újú Obi

Kasie Ndị Na-eru Újú Obi

“Jehova etewo m mmanụ . . . ịkasi ndị nile na-eru újú obi.”—AỊSAỊA 61:1, 2.

1, 2. Olee ndị anyị kwesịrị ịkasi obi, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

JEHOVA, bụ́ Chineke nke ezi nkasi obi nile, na-akụziri anyị igosi mmetụta mgbe ọdachi dakwasịrị ndị ọzọ. Ọ na-akụziri anyị ‘ịgụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà’ na ịkasi ndị nile na-eru újú obi. (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Mgbe ọ dị mkpa, anyị na-enyere ndị anyị na ha na-efekọ ofufe aka n’ụzọ dị otú a. Anyị na-egosikwa ịhụnanya n’ebe ndị na-anọghị n’ọgbakọ nọ, ọbụna n’ebe ndị ọ pụrụ ịbụ na, tupu mgbe ahụ, ha enyebeghị ihe àmà na-egosi na ha hụrụ anyị n’anya nọ.—Matiu 5:43-48; Ndị Galeshia 6:10.

2 Jizọs Kraịst gụrụ ozi amụma a ma jiri ya mee ihe n’ebe ya onwe ya nọ: “Mmụọ nke Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, dị n’ahụ́ m; n’ihi na Jehova etewo m mmanụ izi ndị e wedara n’ala ozi ọma; O zitewo m ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, . . . ịkasi ndị nile na-eru újú obi.” (Aịsaịa 61:1, 2; Luk 4:16-19) Ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge a adịla anya ha matara na ọrụ a gbasakwara ha, “atụrụ ọzọ” ahụ jikwa obi ụtọ na-esonyere ha n’ọrụ ahụ.—Jọn 10:16.

3. Mgbe ndị mmadụ jụrụ, sị, “N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ọdachi na-eme?” olee otú anyị pụrụ isi nyere ha aka?

3 Mgbe ọdachi mere, ndị mmadụ enweekwa obi mgbawa, ha na-ajụkarị, sị, “N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ọdachi na-eme?” Bible na-aza ajụjụ ahụ n’ụzọ doro anya. Otú ọ dị, ọ pụrụ iwe onye na-abụbeghị onye mmụta Bible oge ịghọta azịza ya nke ọma. A na-enweta enyemaka n’akwụkwọ Ndịàmà Jehova na-ebipụta. * Otú ọ dị, iji malitegodị, ọ bụworo ụfọdụ ndị ihe nkasi obi nanị ịhụ n’ime Bible ihe odide dị ka nke dị n’Aịsaịa 61:1, 2, ebe ọ bụ na ọ na-egosipụta ọchịchọ Chineke ka ụmụ mmadụ na-enweta nkasi obi.

4. Olee otú otu Onyeàmà nọ na Poland si nwee ike inyere nwata akwụkwọ obi na-erughị ala aka, oleekwa otú ahụmahụ ahụ pụrụ isi nyere gị aka inyere ndị ọzọ aka?

4 Nkasi obi dị ma ndị na-eto eto ma ndị agadi mkpa. Otu onye dara mbà n’obi nke dị afọ iri na ụma na Poland rịọrọ enyi ya maka ndụmọdụ. Site n’iji olu dị nro jụpụta ya okwu n’ọnụ, enyi ya ahụ, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, chọpụtara na nwa agbọghọ ahụ nwere ọtụtụ ajụjụ na ihe ndị na-eme ya obi abụọ: “N’ihi gịnị ka ihe ọjọọ ji baa ụba? N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji ahụju anya? N’ihi gịnị ka nwanne m nwanyị nke akụkụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ ji ahụju anya? N’ihi gịnị ka m ji nwee ọrịa obi? Chọọchị na-asị na ọ bụ otú Chineke si chọọ ya. Ma ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, aga m akwụsị ikwere na ya!” Onyeàmà ahụ kpekuru Jehova ekpere n’ime obi ya ma kwuzie, sị: “Obi dị m ụtọ na ị jụrụ m ihe a. Aga m agbalị inyere gị aka.” Ọ kọọrọ ya na ya onwe ya nwekwara ihe ndị mere ya obi abụọ mgbe ya dị obere nakwa na Ndịàmà Jehova nyeere ya aka. Ọ kọwara, sị: “Amụtara m na Chineke adịghị eme ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Ọ hụrụ ha n’anya, na-achọ ka ha nweta ihe kasị mma, ọ ga-ewetakwa mgbanwe ndị dị ịrịba ama n’ụwa n’oge na-adịghị anya. Ọrịa, nsogbu nke ịka nká, na ọnwụ agaghịzi adị, ndị na-erube isi ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi—kpọmkwem na mbara ala a.” O gosiri nwa agbọghọ ahụ Mkpughe 21:3, 4; Job 33:25; Aịsaịa 35:5-7 na 65:21-25. Mgbe ha kparịtasịrị ụka ruo ogologo oge, nwa agbọghọ ahụ ji mgbasapụ ihu kwuo, sị: “Ugbu a ka m matara ihe bụ́ nzube nke ndụ m. Ọ̀ bụ m bịa oge ọzọ ka anyị nọrịa?” A malitere iduziri ya ọmụmụ Bible ugboro abụọ n’izu.

Jiri Nkasi Obi Chineke Na-enye

5. Mgbe anyị na-egosipụta ọmịiko, gịnị ga-enye ezi nkasi obi?

5 Mgbe anyị chọrọ ịkasị ndị ọzọ obi, okwu ọmịiko na-abụ ihe dabara adaba n’ezie. Anyị na-agbalịsi ike iji okwu ọnụ na ụda olu anyị na-eme ka onye ahụ na-eru újú mara na ọnọdụ ya na-emetụ anyị n’ahụ́ nke ukwuu. A dịghị emezu nke a site n’ikwu ihe na-enweghị isi. Bible na-agwa anyị na ‘anyị pụrụ isite ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.’ (Ndị Rom 15:4) N’iburu nke a n’uche, anyị pụrụ ịkọwa n’oge kwesịrị ekwesị ihe Alaeze Chineke bụ, anyị pụkwara iji Bible gosi otú ọ ga-esi edozi nsogbu ndị a na-enwe n’oge a. Mgbe ahụ, anyị pụrụ ịkọwa ihe mere o ji bụrụ olileanya a pụrụ ịdabere na ya. N’ụzọ dị otú a, anyị ga-enye nkasi obi.

6. Gịnị ka anyị kwesịrị inyere ndị mmadụ aka ịghọta ka ha wee nwee ike irite uru zuru ezu ná nkasi obi dị n’Akwụkwọ Nsọ?

6 Iji rite uru zuru ezu ná nkasi obi e nyere, ọ dị mmadụ mkpa ịmara ezi Chineke ahụ, ụdị Onye ọ bụ, na otú nkwa ya si bụrụ ihe a pụrụ ịdabere na ha. Mgbe anyị na-achọ inyere onye na-abụbeghị onye na-efe Jehova ofufe aka, ọ dị mma ịkọwara ya isi ihe na-esonụ. (1) Okwu nkasi obi dị na Bible si n’aka Jehova, bụ́ ezi Chineke ahụ. (2) Jehova bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, Onye kere eluigwe na ala. Ọ bụ Chineke nke ịhụnanya, bụrụkwa Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu. (3) A pụrụ ime ka anyị nwekwuo ike ịtachi obi n’ọnọdụ dị iche iche ma ọ bụrụ na anyị abịaruo Chineke nso site n’inweta ezi ihe ọmụma site n’Okwu ya. (4) N’ime Bible, e nwere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kọrọ banyere ọnwụnwa mmadụ dị iche iche chere ihu.

7. (a) Gịnị ka a pụrụ ịrụzu site n’imesi ya ike na nkasi obi Chineke na-enye ‘jupụtara site na Kraịst ahụ’? (b) Olee otú ị pụrụ isi kasie onye matara na omume ya adịghị mma obi?

7 Ụfọdụ emewo ka ndị na-eru újú bụ́ ndị maara Bible nweta ngọzi ime mmụọ site n’ịgụrụ ha 2 Ndị Kọrint 1:3-7. Mgbe ha na-eme otú ahụ, ha emesiwo okwu bụ́ “nkasi obi anyị na-enweta jupụtakwara site na Kraịst ahụ” ike. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a pụrụ inyere mmadụ aka ịghọta na Bible bụ isi iyi nke nkasi obi nke o kwesịrị ichebakwuru echiche. Ọ pụkwara inye ihe ndabere maka inwekwu mkparịta ụka, ikekwe n’oge ndị ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ echee na ihe kpatara nsogbu ya bụ ihe ọjọọ ndị o meworo, mgbe ahụ, n’amaghị ya ikpe, anyị pụrụ ịgwa ya na ọ bụ ihe nkasi obi ịmara ihe e dekọrọ na 1 Jọn 2:1, 2 nakwa n’Abụ Ọma 103:11-14. N’ụzọ ndị dị otú a, anyị na-eji nkasi obi Chineke na-enye akasi ndị ọzọ obi n’ezie.

Mgbe Ihe Ike Ma Ọ Bụ Nsogbu Akụ̀ na Ụba Kpara Ndụ Aka Ọjọọ

8, 9. Olee otú a pụrụ isi na-akasi ndị e mesoworo ihe ike obi n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

8 Ndụ ọtụtụ nde mmadụ abụrụwo nke ihe ike—ihe ike ndị omekome mere n’ógbè ha ma ọ bụ ihe ike nke agha—kpara aka ọjọọ. Olee otú anyị pụrụ isi kasie ha obi?

9 Ezi Ndị Kraịst na-akpachara anya ka ha ghara isite n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’omume dụnyere otu òtù ma ọ bụ ọzọ úkwù n’esemokwu ụwa. (Jọn 17:16) Ma, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ha na-eji Bible egosi na ọnọdụ ndị tara akpụ a na-enwe n’oge a agaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ha pụrụ ịgụ Abụ Ọma 11:5 iji gosi otú Jehova si ele ndị hụrụ ime ihe ike n’anya anya ma ọ bụ Abụ Ọma 37:1-4 iji rụtụ aka n’agbamume Chineke nyere ịghara imegwara ihe e mere anyị kama ka anyị na-atụkwasị Chineke obi. Okwu ndị dị n’Abụ Ọma 72:12-14 na-egosi mmetụta Solomọn ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, onye na-achị ugbu a dị ka Eze eluigwe, na-enwe banyere ndị aka ha dị ọcha e mesoro ihe ike.

10. Ọ bụrụ na i biwo n’ebe a lụrụ agha na ya ruo ọtụtụ afọ, olee otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ e zoro aka na ha pụrụ isi kasie gị obi?

10 Ụfọdụ ndị ebiwo n’ebe e nwere ọgba aghara ugboro ugboro ka òtù ndị na-asọrịta mpi na-azọ ọkwá ọchịchị. Ha na-ewere ya nnọọ na agha na ihe ndị ọ na-akpata bụ ihe e bu pụta ụwa. Nanị olileanya ha na-enwe bụ na ihe pụrụ ịkara ha mma ma ọ bụrụ na ha enwee ike ịgbaga ala ọzọ. Ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha enwebeghị ihe ịga nke ọma n’ime otú ahụ, ọtụtụ ndị nwara ime ya anwụwo. Ndị nke gbagaliri ala ọzọ na-achọpụtakarị na nanị ihe ha mere bụ isi n’otu nsogbu banye n’ọzọ. A pụrụ iji Abụ Ọma 146:3-6 nyere ndị dị otú ahụ aka inwe olileanya n’ihe a pụrụ ịtụkwasị obi karịa ịkwaga ala ọzọ. Amụma dị na Matiu 24:3, 7, 14 ma ọ bụ 2 Timoti 3:1-5 pụrụ inyere ha aka ịhụ ọnọdụ ahụ n’ụzọ ka saa mbara nakwa ihe ọnọdụ ndị ha na-atachi obi na ha pụtara, ya bụ, na anyị na-ebi n’ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie a. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Abụ Ọma 46:1-3, 8, 9 na Aịsaịa 2:2-4 pụrụ inyere ha aka ịghọta na e nwere olileanya n’ezie na a ga-enwe ọdịnihu udo.

11. Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kasiri otu nwanyị obi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

11 N’oge a nọ na-alụ agha n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, otu nwanyị si n’ebe obibi ya gbapụ ka mgbọ nọ na-ezo ka mmiri. Egwu jidere ya nke ukwuu, iwe eju ya obi, ya enweekwa ndakpọ olileanya n’ụzọ na-agbawa obi. Mgbe e mesịrị, ka ezinụlọ ahụ bi ná mba ọzọ, di ya kpebiri ịgba satifiketi alụmdi na nwunye ha ọkụ, chụọ nwunye ya bụ́ onye dị ime n’oge ahụ na nwa ha nwoke dị afọ iri, ma ghọọ ụkọchukwu. Mgbe a gụọrọ nwanyị ahụ Ndị Filipaị 4:6, 7 na Abụ Ọma 55:22, tinyere isiokwu ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị dị n’Ụlọ Nche na Teta!, o nwetara nkasi obi n’ikpeazụ ma mata nzube nke ndụ.

12. (a) Olee ahụ́ efe Akwụkwọ Nsọ na-enye ndị ihe na-esiri ike n’ụzọ akụ̀ na ụba? (b) Olee otú otu Onyeàmà nọ n’Eshia si nwee ike inyere onye ahịa ya aka?

12 Ndakpọ akụ̀ na ụba ebibiwo ndụ ọtụtụ nde mmadụ. Mgbe ụfọdụ, ihe na-akpata ya na-abụ agha na ihe ndị ọ na-akpata. N’oge ndị ọzọ, ụkpụrụ ime ihe gọọmenti ndị amamihe na-adịghị na ha nakwa anyaukwu na emeghị ihe n’eziokwu nke ndị nọ n’ọchịchị agbakọwo aka mịkọrọ ego ndị mmadụ kpatara ma manye ha ịgbahapụ ihe onwunwe ha. Ndị ọzọ adịtụbeghị mgbe ha nwere ọtụtụ n’ime ihe ndị a na-enweta n’ụwa. Ndị nile dị otú ahụ pụrụ inweta nkasi obi site n’ịmara na Chineke na-emesi ndị tụkwasịrị ya obi obi ike na ha ga-enwe ahụ́ efe ma na-eme ka e jide n’aka na a ga-enwe ụwa ezi omume ebe ndị mmadụ ga-eri ihe aka ha rụtara. (Abụ Ọma 146:6, 7; Aịsaịa 65:17, 21-23; 2 Pita 3:13) Mgbe otu Onyeàmà nọ n’otu ala dị n’Eshia nụrụ ka onye ahịa ya na-ekwupụta nchegbu ya banyere ọnọdụ akụ̀ na ụba e nwere n’ebe ahụ, ọ kọwaara ya na ihe na-eme ebe ahụ so n’usoro ihe ndị na-eme gburugburu ụwa. Ntụle ha tụlere Matiu 24:3-14 na Abụ Ọma 37:9-11 dugara n’inwechi ọmụmụ Bible anya.

13. (a) Mgbe ndị mmadụ nwere ndakpọ olileanya n’ihi nkwa ndị na-enweghị isi e kwere ha, olee otú anyị pụrụ isi jiri Bible nyere ha aka? (b) Ọ bụrụ na ndị mmadụ echee na ọnọdụ ọjọọ na-egosi na Chineke adịghị, olee otú ị pụrụ isi gbalịa iso ha tụgharịa uche?

13 Mgbe ndị mmadụ tara ahụhụ ruo ọtụtụ afọ ma ọ bụ bụrụ ndị nwere ndakpọ olileanya n’ihi ọtụtụ nkwa na-enweghị isi e kwere ha, ha pụrụ ịdị ka ndị Izrel nọ n’Ijipt, bụ́ ndị na-egeghị ntị n’ihi ‘enweghị ntachi obi n’ime mmụọ ha.’ (Ọpụpụ 6:9) N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ pụrụ ịba uru igosi ha ụzọ ndị Bible pụrụ isi nyere ha aka ịnagide nsogbu ndị ha na-enwe n’oge a nke ọma ma zere ọdachi ndị na-ala ndụ ọtụtụ mmadụ n’iyi n’ụzọ na-enweghị isi. (1 Timoti 4:8b) Ụfọdụ pụrụ iwere ọnọdụ ọjọọ ndị ha nọ na ya dị ka ihe àmà na-egosi na Chineke adịghị ma ọ bụ na ọ dịghị eche banyere ha. Ị pụrụ iso ha tụgharịa uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwesịrị ekwesị iji nyere ha aka ịghọta na Chineke ewetawo ihe enyemaka kama na ọtụtụ ndị anakwerebeghị ya.—Aịsaịa 48:17, 18.

Mgbe Oké Ifufe na Ala Ọma Jijiji Kpara Mmadụ Aka Ọjọọ

14, 15. Mgbe otu ọdachi mere ka akpata oyi wụọ ọtụtụ mmadụ n’ahụ́, olee otú Ndịàmà Jehova si gosipụta mmetụta ha?

14 Oké ifufe, ala ọma jijiji, ọkụ, ma ọ bụ mgbawa nke bọmbụ pụrụ ịkpata ọdachi. Nke a pụrụ ime ka ọtụtụ mmadụ ruwe újú. Gịnị ka a pụrụ ime iji kasie ndị nke dị ndụ obi?

15 Ọ dị ndị mmadụ mkpa ịmara na ọ dị onye na-eche banyere ha. Mgbe ndị na-eyi ọha egwu mesịrị mwakpo ha n’otu mba, akpata oyi wụrụ ọtụtụ mmadụ n’ahụ́. Ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị ndị òtù ezinụlọ ha, ndị na-akpa afọ ha, na ndị enyi ha nwụnahụrụ. Ndị ọzọ ghọrọ ndị na-enweghịzi ọrụ ma ọ bụ ihe ọ bụla ha chere na ọ bụ ihe ha ji biri. Ndịàmà Jehova nyeere ndị nọ n’ógbè ha aka, na-egosi ọmịiko maka ọtụtụ ihe ndị funahụrụ ha ma na-agwa ha okwu nkasi obi ndị sitere na Bible. Ọtụtụ nwere ekele dị ukwuu maka mmetụta ahụ ha gosipụtara.

16. Mgbe ọdachi mere n’otu ógbè dị na El Salvador, n’ihi gịnị ka ozi ubi nke Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ ji dị nnọọ irè?

16 Na El Salvador, mgbe oké ala ọma jijiji mesịrị na 2001, a bịara nwee nnukwu apịtị nke riri ọtụtụ mmadụ. Nwa nwoke dị afọ 25 nke otu Onyeàmà na ụmụnne nwanyị abụọ nke onye nwa Onyeàmà ahụ kwere nkwa ọlụlụ nwụrụ n’ọdachi ahụ. Nne nwa okorobịa ahụ nakwa onye nwa okorobịa ahụ kwere nkwa ọlụlụ gawara ozi ubi n’egbughị oge. Ọtụtụ ndị gwara ha na ọ bụ Chineke kpọọrọ ndị ahụ nwụrụnụ ma ọ bụ na ọ bụ uche Chineke. Ndịàmà ahụ hotara Ilu 10:22 iji gosi na Chineke adịghị achọ ka anyị na-enwe ihe mwute. Ha gụrụ Ndị Rom 5:12 iji gosi na ihe mere ndị mmadụ ji anwụ bụ mmehie nke mmadụ, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ uche Chineke. Ha rụtụkwara aka n’ozi nkasi obi dị n’Abụ Ọma 34:18, Abụ Ọma 37:29, Aịsaịa 25:8, na Mkpughe 21:3, 4. Ndị mmadụ gere ha ntị nke ọma, nke ka nke ebe ọ bụ na ndị òtù ezinụlọ nke ndị inyom abụọ ahụ nwụnahụrụ ha, ha malitekwara iduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible.

17. Olee ụdị aka anyị pụrụ inyere ndị mmadụ mgbe e nwere ọdachi?

17 Mgbe ọdachi mere, ị pụrụ ịhụ onye enyemaka nkịtị dị mkpa ngwa ngwa. Nke a pụrụ ịgụnye ịkpọ dọkịta, inyere mmadụ aka iru n’ụlọ ọgwụ, ma ọ bụ ime ihe ọ bụla kwere omume iji nye ha ihe oriri na ụlọ. Na 1998, n’oge ọdachi dị otú ahụ mere n’Ịtali, otu odeakụkọ chọpụtara na Ndịàmà Jehova “na-arụ ọrụ n’ụzọ dị irè, na-enyere ndị na-ahụsi anya aka, n’achọghị ịma okpukpe ha nọ na ya.” N’ebe ụfọdụ, ihe ndị e buru n’amụma na ha ga-eme n’ụbọchị ikpeazụ na-akpata oké nhụjuanya. N’ebe ndị ahụ, Ndịàmà Jehova na-eme ka a mara amụma Bible, ma na-eji ihe mmesi obi ike dị na Bible nke bụ́ na Alaeze Chineke ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ nwee ezi nchebe, na-akasi ndị mmadụ obi.—Ilu 1:33; Maịka 4:4.

Mgbe Onye Òtù Ezinụlọ Nwụrụ

18-20. Mgbe mmadụ nwụrụ n’ime ezinụlọ, gịnị ka ị pụrụ ikwu ma ọ bụ mee iji weta nkasi obi?

18 Kwa ụbọchị, ọtụtụ nde mmadụ na-eru újú n’ihi ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Ị pụrụ izute ndị na-eru újú mgbe ị na-ekere òkè n’ozi Ndị Kraịst ma ọ bụ mgbe ị na-ahụ maka ihe ndị dịịrị gị ná ndụ kwa ụbọchị. Olee ihe ị pụrụ ikwu ma ọ bụ mee nke ga-akasi ha obi?

19 Onye ahụ ọ̀ na-enwe obi mgbawa? Ndị ikwu na-eru újú hà jupụtara n’ụlọ ahụ? Ị pụrụ inwe ọtụtụ ihe ị ga-enwe mmasị ikwu, ma ọ dị mkpa iji ezi uche mee ihe. (Eklisiastis 3:1, 7) Ikekwe ihe ga-ekwesị ekwesị ime ga-abụ igosipụta ọmịiko, inye ha akwụkwọ kwesịrị ekwesị dabeere na Bible (broshuọ, magazin, ma ọ bụ traktị), ma bịaghachizie mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị iji mara ma ị pụrụ inyekwuru ha aka. N’oge kwesịrị ekwesị, gwa ha ka ị kọọrọ ha ihe ụfọdụ ndị na-agba ume sitere na Bible. Nke a pụrụ ime ka ahụ́ ruo ha ala ma mee ka ha nweta onwe ha. (Ilu 16:24; 25:11) Ị pụghị ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, dị ka Jizọs mere. Ma ị pụrụ ịkọrọ ha ihe Bible na-ekwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na mgbe ahụ nwere ike ọ gaghị abụ oge kwesịrị ekwesị iji gbaghaa echiche na-ezighị ezi. (Abụ Ọma 146:4; Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4) Ị pụrụ isoro ha gụọ nkwa Bible kwere banyere mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Ị pụrụ ịkọwara ha ihe nke a pụtara, ikekwe na-eji mbilite n’ọnwụ nke a kọrọ banyere ya n’ime Bible mee ihe. (Luk 8:49-56; Jọn 11:39-44) Dọrọkwa uche gaa n’àgwà nke Chineke na-ahụ n’anya bụ́ onye na-enye anyị olileanya dị otú ahụ. (Job 14:14, 15; Jọn 3:16) Kọwaa otú ozizi ndị a siworo baara gị uru na ihe mere obi ji sie gị ike na ha.

20 Ịkpọ onye na-eru újú oku ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze pụrụ inyere ya aka ịmara ndị hụrụ ndị agbata obi ha n’anya n’ezie, ndị makwaara otú e si ewuli ibe ha elu. Otu nwanyị nọ na Sweden chọpụtara na nke a bụ ihe ọ nọworo na-achọ ná ndụ ya nile.—Jọn 13:35; 1 Ndị Tesalonaịka 5:11.

21, 22. (a) Gịnị ka a chọrọ n’aka anyị ma ọ bụrụ na anyị gaje ịkasi mmadụ obi? (b) Olee otú ị pụrụ isi kasie onye maaralarị Akwụkwọ Nsọ nke ọma obi?

21 Mgbe ị maara na mmadụ na-eru újú, ma ọ bụ n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst ma ọ bụ n’èzí, ọ̀ na-adị gị mgbe ụfọdụ ka ị maghị ihe ị ga-ekwu ma ọ bụ mee? Okwu Grik a na-asụgharịkarị ịbụ “nkasi obi” n’ime Bible pụtara n’ụzọ nkịtị “mmadụ ịkpụdewe [mmadụ] n’akụkụ ya.” Ịbụ ezi onye nkasi obi na-agụnye ịnọ ndị na-eru újú nso.—Ilu 17:17.

22 Gịnị ma ọ bụrụ na onye ị na-achọ ịkasị obi amaralarị ihe Bible na-ekwu banyere ọnwụ, ihe mgbapụta ahụ, na mbilite n’ọnwụ? Nanị ọnụnọ enyi nke ya na ya nwere otu nkwenkwe nọ n’ebe ahụ pụrụ ịbụ ihe nkasi obi. Ọ bụrụ na ọ chọọ ikwu okwu, gee ya ntị nke ọma. Echela na ọ dị gị mkpa ikwu okwu toro ogologo. Ọ bụrụ na ọ dị akụkụ Akwụkwọ Nsọ a gụrụ, were ya dị ka okwu si n’ọnụ Chineke nke na-eme ka obi sikwuo gị na ya ike. Kwupụta nkwenye siri ike unu abụọ nwere na nkwa ndị e kwere n’Akwụkwọ Nsọ ga-emezurịrị. Site n’igosipụta mmetụta ọmịiko nke Chineke nakwa site n’iso ha tụlee eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa dị n’Okwu Chineke, ị pụrụ inyere ndị na-eru újú aka inweta nkasi obi na ume site n’aka “Chineke nke nkasi obi nile,” bụ́ Jehova.—2 Ndị Kọrint 1:3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee akwụkwọ ndị bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, isi nke 8; Reasoning From the Scriptures, peeji nke 393-400, 427-431; Is There a Creator Who Cares About You?, isi nke 10; na broshuọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?

Gịnị Bụ Azịza Gị?

• Ònye ka ọtụtụ ndị na-ata ụta maka ọdachi, oleekwa otú anyị pụrụ isi nyere ha aka?

• Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ndị ọzọ aka irite uru zuru ezu ná nkasi obi Bible na-enye?

• Olee ọnọdụ ndị na-eme ka ọtụtụ ndị bi n’ógbè unu na-eru újú, oleekwa otú ị pụrụ isi kasie ha obi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Izi ndị ọzọ ozi nke ezi nkasi obi n’oge e nwere nsogbu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ogige ndị gbara ọsọ ndụ: UN PHOTO 186811/J. Isaac

[Foto dị na peeji nke 24]

Nanị ọnụnọ enyi nọ ya pụrụ ịbụ ihe nkasi obi