Ihe Mere na Anyị Apụghị Ịnọ n’Adabereghị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ
Ihe Mere na Anyị Apụghị Ịnọ n’Adabereghị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ
“Abụọ dị mma karịa otu . . . Ọ bụrụ na [otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ] ga-eme ka ibe ya bilie.”—Eze Solomọn
EZE SOLOMỌN nke Izrel oge ochie kwuru, sị: “Abụọ dị mma karịa otu; n’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ n’ime ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ. N’ihi na ọ bụrụ na [otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ] ga-eme ka ibe ya bilie: ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke nanị ya dị mgbe ọ na-ada, ọ dịghịkwa onye abụọ o nwere ime ka o bilie.” (Eklisiastis 4:9, 10) Onye a ji amamihe nyochaa akparamàgwà ụmụ mmadụ si otú ahụ mee ka mkpa anyị nwere iso ndị ọzọ na-akpakọrịta na mkpa ọ dị ịghara ịdị na-anọpụ iche, pụta ìhè. Otú ọ dị, nke a abụghị nnọọ echiche mmadụ. Ihe Solomọn kwuru sitere n’amamihe Chineke na n’ike mmụọ nsọ Ya.
Ọ bụghị ihe amamihe dị na ya anyị ịdị na-anọrọ onwe anyị. Ndị mmadụ dịrịta ibe ha mkpa. Ike na enyemaka anyị pụrụ inweta n’aka mmadụ ndị ọzọ dị anyị nile mkpa. “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ,” ka otu ilu Bible na-ekwu. “Ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.” (Ilu 18:1) Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ndị ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-agba ndị mmadụ ume isonye n’otu òtù na inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ.
Prọfesọ Robert Putnam hotara “ime ka ihe ime mmụọ na-enwekwu mmetụta n’ahụ́ ndị mmadụ,” dị ka otu n’ime ihe ndị ga-eme ka ọha mmadụ maliteghachi imekọ ihe ọnụ. Ndịàmà Jehova pụtara ìhè n’akụkụ a n’ihi na ha na-enweta nchebe n’ọgbakọ ndị yiri ezinụlọ e nwere gburugburu ụwa. N’ikwekọ n’okwu Pita onyeozi, ha ‘nwere ịhụnanya maka òtù ụmụnna dum,’ bụ́ ndị ‘na-atụ Chineke egwu’ nsọpụrụ. (1 Pita 2:17) Ndịàmà na-ezerekwa ịnọrọ onwe onye na nsogbu ndị ọ na-akpata n’ihi na ọtụtụ ihe omume ndị dị mma e jikọtara ha na ezi ofufe na-eme mgbe nile ka ha nọrọ n’ọrụ inyere ndị agbata obi ha aka ịmụta eziokwu ahụ a na-achọta n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.—2 Timoti 2:15.
Ịhụnanya na Mkpakọrịta Gbanwere Ndụ Ha
Ihe mejupụtara Ndịàmà Jehova bụ ọha mmadụ dị n’otu nke onye ọ bụla so na ya na-ekere òkè dị mkpa. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Miguel, Froylán, na Alma Ruth, bụ́ mmadụ atọ si n’otu ezinụlọ bi na Latin America. Ha nwere ọrịa ọkpụkpụ mgbe a mụrụ ha, bụ́ nke mere ka ha yie ndị akakpọ. Ha atọ jicha oche nkwagharị agagharị. Olee otú ha iso Ndịàmà na-akpakọrịta siworo metụta ndụ ha?
Miguel na-ekwu, sị: “E nwere oge ihe siiri m
nnọọ ike, ma mgbe m malitere iso ndị Jehova na-akpakọrịta, ndụ m gbanwere. Mmadụ ịdị na-anọ nanị ya dị nnọọ ize ndụ. Iso ndị kwere ekwe ibe m na-akpakọrịta ná nzukọ Ndị Kraịst, iso ha na-anọ kwa izu, nyeere m aka nke ukwuu inweta afọ ojuju.”Alma Ruth na-agbakwụnye, sị: “Ana m adabu mbà n’obi nke ukwuu; iwe na-adị eju m obi. Ma mgbe m mụtara banyere Jehova, ọ bịara dị m ka m pụrụ iso ya nwee mmekọrịta chiri anya. Nke ahụ bịara bụrụ ihe kasị ọnụ ahịa ná ndụ nye m. Ezinụlọ anyị akwadowo anyị nke ukwuu, nke ahụ emewokwa ka anyị dịkwuo n’otu.”
Nna Miguel ji ịhụnanya kụziere Miguel ịgụ na ide ihe. E mesịa, Miguel enyere Froylán na Alma Ruth aka ime otú ahụ. Nke a dị oké mkpa maka ọnọdụ ime mmụọ ha. “Ịmụta ịgụ ihe baara anyị uru nke ukwuu n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka anyị bịara nwee ike iriju afọ n’ụzọ ime mmụọ site n’ịgụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible,” ka Alma Ruth na-ekwu.
Ka ọ dị ugbu a, Miguel na-eje ozi dị ka Onye Kraịst bụ́ okenye. Froylán agụchapụwo Bible ugboro itoolu. Alma Ruth amụbawo ozi ọ na-ejere Jehova site n’ije ozi dị ka onye ozi ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa Alaeze oge nile, kemgbe 1996. Ọ na-ekwu, sị: “Site n’enyemaka Jehova, eruwo m ihe mgbaru ọsọ a, ebe m nwere nkwado nke ụmụnna m nwanyị m hụrụ n’anya bụ́ ndị nyeere m aka ọ bụghị nanị ime nkwusa kamakwa ịkụzi ihe site n’iduzi ọmụmụ Bible 11 m maliteliri.”
Emelia, bụ́ onye nwere ihe ọghọm nke mere ka ọ dị mkpa na ọ ga-eji oche nkwagharị na-agagharị n’ihi ahụ́ o merụrụ n’ụkwụ na n’ọkpụkpụ azụ, setịpụrụ ihe nlereanya ọzọ magburu onwe ya. Ndịàmà Jehova nọ na Mexico City duziiri ya ọmụmụ Bible, e meekwa ya baptizim na 1996. Emelia na-ekwu, sị: “Tupu m mụta eziokwu ahụ, achọrọ m igbu onwe m; achọghịzi m ịdị ndụ. Ọ bịara dị m ka m tọgbọ nnọọ chakoo, ebere m ákwá ehihie na abalị. Ma mgbe mụ na ndị Jehova kpakọrịtawara, ahụrụ m ịhụnanya nke ụmụnna ahụ nwere. Mmasị onwe onye ha gosiri m abụworo m ihe agbamume. Otu n’ime ndị okenye abụworo m nwanne ma ọ bụ nna. Ya na ụfọdụ ndị ohu na-eje ozi na-akpọ m aga nzukọ nakwa ozi ubi n’oche nkwagharị m.”
José, bụ́ onye e mere baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova na 1992, bi nanị ya. Ọ dị afọ 70, ọ lara ezumike nká na 1990. José daburu mbà n’obi, ma mgbe otu Onyeàmà kwusasịịrị ya ozi ọma, ọ malitere ịga nzukọ Ndị Kraịst ozugbo. Ndị Filipaị 1:1; 1 Pita 5:2) Ndị kwere ekwe ibe ya dị otú ahụ bụụrụ ya ‘ndị enyemaka na-eme ka a dị ike.’ (Ndị Kọlọsi 4:11) Ha na-akpọgara ya dọkịta, na-eleta ya n’ebe obibi ya, ha akwadowokwa ya ugboro anọ a warala ya ahụ́. Ọ na-ekwu, sị: “Ha na-elebara m anya. Ha bụ ezinụlọ m n’ezie. Mkpakọrịta mụ na ha na-atọ m ụtọ.”
Ihe ọ nụrụ ma hụ n’ebe ahụ masịrị ya. Dị ka ihe atụ, ọ hụrụ mkpakọrịta ụmụnna ahụ nwere na nchegbu ha nwere n’ebe ya onwe ya nọ. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nọ n’ọgbakọ ya na-elekọtazi ya. (A Na-enwe Ezi Obi Ụtọ n’Inye Ihe
Mgbe Eze Solomọn sịrị na “abụọ dị mma karịa otu,” ọ ka kwupụrụ banyere ihe efu dị na mmadụ itinye ike ya nile n’ịchụ akụ̀ na ụba. (Eklisiastis 4:7-9) Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe ọtụtụ mmadụ na-achụso taa, n’agbanyeghị na nke a na-apụta ịchụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma n’ime ezinụlọ ma n’èzí n’àjà.
Mmụọ anyaukwu na nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị dị otú ahụ emewo ka ọtụtụ ndị na-anọrọ onwe ha. Nke a ewetabereghị ha ma obi ụtọ ma afọ ojuju ná ndụ, n’ihi na ndị nwere mmụọ dị otú ahụ na-enwekarị obi nkoropụ, ha adịghịkwa enwe olileanya. N’ụzọ dị iche, akụkọ ndị ahụ a ka kọpụrụ na-egosi mmetụta dị mma a na-enweta site n’iso ndị na-ejere Jehova ozi, bụ́kwa ndị ihe na-akwali ha bụ ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ nakwa n’ebe ndị agbata obi ha nọ, na-akpakọrịta. Ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya, nkwado nke Ndị Kraịst ibe ha nakwa nchegbu ha nwere n’ebe ha nọ, na iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi bụ ihe ndị dị mkpa nyeere mmadụ ndị a aka ịhụ na ha adịghịzi enwe mmetụta ọjọọ ndị ịnọrọ onwe onye kpataara ha.—Ilu 17:17; Ndị Hibru 10:24, 25.
Ebe ọ bụ na anyị na-adabererịta n’ebe ibe anyị nọ, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị na anyị na-enweta afọ ojuju site n’imere ndị ọzọ ihe. Albert Einstein, bụ́ onye ihe ọ rụpụtara baara ndị ọzọ uru, kwuru, sị: “E kwesịrị ịhụ uru mmadụ bara . . . n’ihe o nyere ọ bụghị n’ihe o nwetaliri.” Nke a kwekọrọ n’okwu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụ́: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ya mere, ọ bụ ezie na ọ dị mma ịbụ ndị e gosiri ịhụnanya, ọ dịkwa nnọọ mma igosi ndị ọzọ ịhụnanya.
Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị bụ́ onye letaworo ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ iji nyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ, bụ́kwa onye nyeworo aka n’iwuru Ndị Kraịst ọ na-enweghị ka ọ hà ha ebe ndị ha na-anọ enwe nzukọ, si otú a kwupụta mmetụta ya: “Ọṅụ nke ijere ụmụnna m ozi na ịhụ ka ihu ha bụ sọ ọchị ọchị na-akpali m ịnọgide na-achọ ohere ndị m ga-eji nyere ha aka. Ahụmahụ m abụwo na inwe mmasị onwe onye n’ebe ndị ọzọ nọ bụ isi ihe na-eweta obi ụtọ. Amakwaara m na dị ka ndị okenye, anyị kwesịrị ịdị ka ‘ebe izonahụ ifufe, . . . dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.’”—Aịsaịa 32:2.
Lee Ka O Si Dị Mma Ibikọ n’Otu!
N’ezie, e nwere uru dị ukwuu na ezi obi ụtọ n’inyere ndị ọzọ aka nakwa n’ịchọ iso ndị na-ejere Jehova ozi na-akpakọrịta. Ọbụ abụ ahụ ji oké olu kwuo, sị: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!” (Abụ Ọma 133:1) Ịdị n’otu ezinụlọ bụ otu ihe dị oké mkpa n’inyerịta nkwado, dị ka e gosiri n’ihe banyere Miguel, Froylán, na Alma Ruth. Leekwa ngọzi ọ bụ mmadụ ịbụ onye e jikọtara ya na ndị ibe ya n’ezi ofufe! Mgbe Pita onyeozi nyesịrị Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye ndụmọdụ, o dere, sị: “N’ikpeazụ, ka unu nile nwee otu obi, na-egosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna, na-enwe obi ọmịiko, na-adị umeala n’obi.”—1 Pita 3:8.
Ezi ọbụbụenyi na-aba uru nke ukwuu, ma n’ụzọ mmetụta uche ma n’ụzọ ime mmụọ. Ka Pọl onyeozi na-agwa ndị kwere ekwe ibe ya okwu, ọ dụrụ ha ọdụ, sị: “Na-agụgụnụ mkpụrụ obi ndị dara mbà, na-akwadonụ ndị na-adịghị ike, na-enwenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ. . . . Na-achụsonụ ihe dị mma mgbe nile n’ebe ibe unu nọ nakwa n’ebe ndị ọzọ nile nọ.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:14, 15.
Ya mere, na-achọ ụzọ ndị dị irè isi na-emere ndị ọzọ ihe ọma. “Na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ [gị] n’okwukwe nọ,” n’ihi na nke a ga-eme ka ndụ gị nwekwuo ezi nzube ma mee ka i nwekwuo afọ ojuju. (Ndị Galeshia 6:9, 10) Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems dere, sị: “Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị na-agba ọtọ, n’enweghịkwa ihe oriri zuru ezu maka ụbọchị ahụ, ma otu onye n’ime unu agwa ha, sị: ‘Laanụ n’udo, nyaanụ ọkụ, rijuokwanụ afọ,’ ma unu adịghị enye ha ihe na-akpa ahụ́ ha, olee uru ọ bara?” (Jems 2:15, 16) Azịza ya doro anya. Ọ dị anyị mkpa ‘ilekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara anyị, kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.’—Ndị Filipaị 2:4.
Tụkwasị n’inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ihe onwunwe mgbe e nwere mkpa pụrụ iche maka ya ma ọ bụ mgbe ọdachi mere, Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike n’ime ihe ga-abara ụmụ mmadụ ibe ha uru n’ụzọ dị oké mkpa—site n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Òkè ihe karịrị Ndịàmà 6,000,000 na-ekere n’ikwusa ozi olileanya na nkasi obi a bụ ihe àmà na-egosi na ha ji ịhụnanya na-enwe ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Ma iwetara ndị mmadụ enyemaka sitere n’Akwụkwọ Nsọ na-enyekwa aka igbo mkpa ọzọ na-akpa mmadụ. Olee mkpa ọ bụ?
Igbo Mkpa Dị Oké Mkpa
Iji na-enwe ezi obi ụtọ, ọ dị anyị mkpa iso Chineke na-enwe mmekọrịta kwesịrị ekwesị. E kwuwo, sị: “Eziokwu ahụ bụ́ na ụmụ mmadụ, n’ebe nile n’oge nile, site ná mmalite ruo ugbu a, abụwo ndị a na-akpali ịkpọku ihe ha kweere na ọ dị elu ma dị ike karịa ha, na-egosi na okpukpe bu ihe e bu pụta ụwa, sayensị kwesịkwara ikwere nke ahụ. . . . Otú ụmụ mmadụ nọ n’ebe nile si achọ onye kasị elu, ma na-ekwere na ya, kwesịrị ịwụ anyị akpata oyi n’ahụ́, iju anyị anya, na ịkpali anyị ịtụ ya egwu nsọpụrụ.”—Man Does Not Stand Alone, nke A. Cressy Morrison, dere.
Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ihe anaghị agaziri ndị mmadụ ma ha nọpụ iche n’ebe ndị ọzọ nọ ruo ogologo oge. Otú ọ dị, ịnọpụ iche n’ebe Onye Okike anyị nọ dị nnọọ njọ karị. (Mkpughe 4:11) Inweta na itinye “ihe ọmụma Chineke” n’ọrụ kwesịrị ịbụ ihe dị mkpa ná ndụ anyị. (Ilu 2:1-5) N’ezie, anyị kwesịrị ikpebisi ike igbo mkpa ime mmụọ anyị, n’ihi na anyị apụghị ịnọrọ onwe anyị ma nọpụ iche n’ebe Chineke nọ. Ndụ na-enye obi ụtọ ma na-akwụghachi ụgwọ n’ezie na-adabere n’iso Jehova, bụ́ “Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile,” na-enwe ezi mmekọrịta.—Abụ Ọma 83:18.
[Foto dị na peeji nke 5]
Miguel: “E nwere oge ihe siiri m nnọọ ike, ma mgbe m malitere iso ndị Jehova na-akpakọrịta, ndụ m gbanwere”
[Foto dị na peeji nke 5]
Alma Ruth: “Mgbe m mụtara banyere Jehova, ọ bịara dị m ka m pụrụ iso ya nwee mmekọrịta chiri anya”
[Foto dị na peeji nke 6]
Emelia: “Tupu m mụta eziokwu ahụ, . . . Ọ bịara dị m ka m tọgbọ nnọọ chakoo”
[Foto dị na peeji nke 7]
Iso ndị na-efe ezi ofufe na-akpakọrịta na-enye aka egbo mkpa ime mmụọ anyị