Ịda Ogbenye—Ịchọta Ihe Ngwọta Na-adịgide Adịgide
Ịda Ogbenye—Ịchọta Ihe Ngwọta Na-adịgide Adịgide
N’AGBANYEGHỊ akụkọ ọjọọ ndị a na-anụ gburugburu ụwa banyere ịda ogbenye, a ka nwere ndị nwere olileanya na a pụrụ ime ihe gbara ọkpụrụkpụ banyere ya. Dị ka ihe atụ, dị ka isi akụkọ nke gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Manila Bulletin si kwuo, Ụlọ Akụ̀ Na-ahụ Maka Mmepe n’Eshia kọrọ na “Ndị Eshia pụrụ ime ka ọ gharazie ịdị onye ga-ada ogbenye n’obodo ha n’ime afọ 25 na-abịanụ.” Ụlọ akụ̀ ahụ tụrụ aro ịhụ na ọnọdụ akụ̀ na ụba mụbara dị ka ụzọ isi mee ka ndị mmadụ gharazie ịda ogbenye.
Òtù na gọọmenti ndị ọzọ atụwo ọtụtụ aro ma mee ọtụtụ atụmatụ iji gbalịa ịgwọta nsogbu ahụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ: atụmatụ ịnshọransị maka ọha na eze, ịgụkwu akwụkwọ, ịkagbu ụgwọ mba ndị na-emepe emepe ji mba ndị mepeworo emepe, iwepụ ihe mgbochi maka ịtụbata ngwá ahịa ka mba ndị ogbenye buru ibu na ha wee nwee ike ire ihe ndị ha na-emepụta ngwa ngwa, na iwu ụlọ ndị dị ọnụ ala maka ndị ogbenye.
N’afọ 2000, ndị so ná Nzukọ Ezumezu nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ ndị a ga-eru n’afọ 2015. Ha gụnyere ime ka a gharazie inwe ndị dara ogbenye ọnụ ntụ na ndị agụụ na-egbu nakwa ime ka ókè ihe mmadụ ụfọdụ nọ ná mba dị iche iche na-akpata ji akarị nke ibe ha gharazie ihi nne. N’agbanyeghị otú ihe mgbaru ọsọ ndị dị otú ahụ pụrụ ịdịru ná mma, ọtụtụ ndị na-enwe obi abụọ ma à pụrụ iru ha n’ụwa a na-adịghị n’otu.
Ihe Ndị Dị Irè A Pụrụ Ime Iji Kwụsị Ịda Ogbenye
Ebe ọ bụ na e nwechaghị olileanya na a ga-enwe ezi ọganihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ, ebee ka mmadụ pụrụ ilega anya maka enyemaka? Dị ka e kwuru na mbụ, e nwere ebe a pụrụ inweta ezi amamihe nke pụrụ inyere ndị mmadụ aka ugbu a. Olee ebe ọ bụ? Ọ bụ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.
Gịnị mere ka Bible dị iche n’ebe nile ọzọ e si enweta ihe ọmụma? Ọ bụ n’ihi na o si n’aka onye kasị ihe nile elu, bụ́ Onye Okike anyị. N’ime ya, o deturu okwu amamihe ndị bara uru—ụkpụrụ ndị dị irè mmadụ nile pụrụ iji mee ihe n’ebe nile, na n’oge nile. Ọ bụrụ na a gbasoo ụkpụrụ ndị a, ha pụrụ inyere ndị ogbenye aka ibi ndụ na-eju afọ ọbụna ugbu a. Ka anyị tụlee ihe atụ ole na ole.
Nwee echiche ziri ezi banyere ego. Bible na-ekwu, sị: “Amamihe bụ ndò, ego bụkwa ndò: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:12) Gịnị ka nke a pụtara? Ego abụghị ebe okwu biri. N’eziokwu, ọ na-echebetụ mmadụ. Ọ na-eme ka o kwe anyị omume ịzụta ihe ụfọdụ dị anyị mkpa, ma o nwere ihe ndị ọ na-agaghị emeli. E nwere ihe ndị bara uru karị bụ́ ndị ego na-apụghị ịzụta. Ịghọta eziokwu a ga-enyere anyị aka idebe ihe onwunwe n’ọnọdụ kwesịrị ha, si otú ahụ na-ezere obi nkoropụ nke ndị ndụ ha hiwere isi n’ịkpakọba ego na-enwe. Ego apụghị ịzụta ndụ, ma iji amamihe eme ihe pụrụ ichebe ndụ ugbu a, ọbụnakwa ọ pụrụ ime ka o kwe omume inweta ndụ ebighị ebi.
Kowe akpa gị ebe aka gị ga-eru. Ihe ndị anyị chọrọ abụchaghị ihe ndị dị anyị mkpa. Anyị kwesịrị ibu ụzọ lebara ihe ndị dị anyị mkpa anya. Ọ pụrụ ịdịrị anyị mfe ịgwa onwe anyị na otu ihe dị anyị mkpa mgbe nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ahụ bụ ihe anyị chọrọ ọ bụghị ihe na-akpa anyị. Onye maara ihe na-ebu ụzọ eke ego ọ kpatara iji gboo mkpa ndị o nwere mgbe ahụ—nri, uwe, ebe obibi, na ihe ndị ọzọ. Mgbe o mesịrị, tupu ya azụwa ihe ọ bụla ọzọ, ọ na-ekpebi ma ego fọdụrụnụ ọ ga-ezu iji zụta ihe ndị ahụ. N’otu n’ime ihe atụ ya, Jizọs tụrụ aro ka mmadụ ‘buru ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, iji hụ ma ò nwere ihe ga-ezu.’—Luk 14:28.
Na Philippines, Eufrosina, bụ́ nne nanị ya na-azụ ụmụ atọ, nwere ihe ịma aka nke ịkpata ihe e ji ebi ndụ na iji nlezianya emefu ego ọ na-akpata kemgbe di ya hapụrụ ya afọ ole na ole gara aga. Ka ọ na-eme otú ahụ, ọ zụrụ ụmụ ya ịmata ihe ndị ka mkpa n’ime ihe ndị a ga-azụ. Dị ka ihe atụ, ụmụ ya pụrụ ịhụ ihe masịrị ha. Kama ịsị nnọọ na ya agaghị azụtara ha ya, ọ na-eso ha atụgharị uche site n’ikwu, sị: “Ọ dị mma, m pụrụ ịzụtara gị ya ma ị chọọ, ma ị ghaghị ikpebi nke ka gị mma. Anyị nwere ego ga-ezu iji zụta nanị otu ihe. Anyị pụrụ ịzụta ihe a masịrị gị, ma ọ bụ anyị pụrụ ịzụta ntakịrị anụ ma ọ bụkwanụ akwụkwọ nri anyị ga-eji sie osikapa n’izu a. Ugbu a, olee nke ga-amasị gị? Kwuo.” Ụmụaka ahụ na-aghọtakarị okwu ya ma kwere na ha ga-enwe mmasị ka a zụọ nri kama ịzụ ihe ọ bụla ọzọ.
Na-enwe afọ ojuju. “Ebe anyị nwere ihe oriri na ihe mgbokwasị, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a,” ka ụkpụrụ ọzọ nke Bible na-ekwu. (1 Timoti 6:8) Ego n’onwe ya adịghị eweta obi ụtọ. Ọtụtụ ndị ọgaranya adịghị enwe obi ụtọ, ebe ọtụtụ ndị ogbenye na-enwe nnọọ obi ụtọ. Ndị ogbenye a amụtawo inwe afọ ojuju nanị n’ihe ndị dị mfe bụ́ ndị dị mkpa ná ndụ. Jizọs kwuru okwu banyere inwe ‘anya na-elegide n’otu ebe’ bụ́ nke na-elegide n’ihe ndị ka mkpa. (Matiu 6:22) Nke a na-enyere mmadụ aka inwe afọ ojuju. Ọtụtụ ndị ogbenye na-enwe nnọọ afọ ojuju n’ihi na ha esorowo Chineke na-enwe ezi mmekọrịta ma na-ebi ndụ obi ụtọ n’ezinụlọ ha—ihe ndị a na-apụghị iji ego zụta.
Ndị a bụ nanị ihe atụ ole na ole nke aro ndị dị irè a tụrụ na Bible bụ́ ndị pụrụ inyere ndị ogbenye aka ịnagide ọnọdụ ha. E nwere ọtụtụ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, zere àgwà ọjọọ ndị dị ka ise siga na ịgba chaa chaa, bụ́ ndị na-ala ego n’iyi; mata ihe ndị ka mkpa ná ndụ, karịsịa ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ; n’ebe ọrụ dị ụkọ, gbalịa ịzụlite nkà ma ọ bụ ịrụ ọrụ dị ndị ọzọ mkpa. (Ilu 22:29; 23:21; Ndị Filipaị 1:9-11) Bible na-atụ aro ka i jiri “[ezi amamihe] na izuzu” dị otú ahụ na-eme ihe n’ihi na ‘ha ga-abụrụ mkpụrụ obi gị ndụ.’—Ilu 3:21, 22.
Ọ bụ ezie na aro ndị Bible na-atụ pụrụ inyere ndị dara nnọọ ogbenye aka inwetụ ahụ́ efe, a ka nwere ajụjụ ndị a ga-ajụ banyere ọdịnihu. Ndị ogbenye hà ga-anọgiderịrị na-ada ogbenye ruo mgbe ebighị ebi? Ọ̀ dị mgbe a ga-eme ka ndị bara ọgaranya nke ukwuu na ndị dara ogbenye ọnụ ntụ hara nhata? Ka anyị tụlee ihe ngwọta nke ọtụtụ ndị na-amaghị banyere ya.
Bible Na-ekwu Ihe Mere A Ga-eji Nwee Olileanya
Ọtụtụ ndị kweere na Bible bụ ezigbo akwụkwọ. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe ha adịghị ama na ọ na-enye ihe ọmụma a kapịrị ọnụ nke na-ekwu banyere oké mgbanwe ndị ga-ewere ọnọdụ n’isi nso.
Chineke na-ezube ime ihe iji gwọta nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ, gụnyere ịda ogbenye. Ebe ọ bụ na ọchịchị ụmụ mmadụ enweghị ike ma ọ bụkwanụ na ha adịghị njikere ime otú ahụ, Chineke na-ezube idochi ha. N’ụzọ dị aṅaa? Bible na-ekwu hoo haa na Daniel 2:44, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”
Mgbe e wepụsịrị “alaeze” ma ọ bụ ọchịchị ndị a, Onye Ọchịchị Chineke ji aka ya họpụta ga-eme ihe. Onye Ọchịchị ahụ abụghị mmadụ kama ọ bụ onye dị ike nọ n’eluigwe bụ́ onye dị ka Chineke n’onwe ya, nwere ike ime ka e nwee mgbanwe dị mkpa iji kpochapụ ahaghị nhata ndị e nwere n’oge a. Chineke ahọrọwo Ọkpara ya ime nke a. (Ọrụ 17:31) Abụ Ọma 72:12-14 na-akọwa ihe Onye Ọchịchị a ga-eme, na-asị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.” Lee atụmanya magburu onwe ya nke ahụ bụ! Ha ga-aṅụrụ mmiri tọgbọ iko n’ikpeazụ! Onye Ọchịchị Chineke họpụtara ga-eme ihe n’ihi ndị ogbenye na ndị na-enweghị ike.
A ga-agwọta ọtụtụ nsogbu ndị ha na ịda Abụ Ọma nke 72 na-ekwu, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” A gaghịzi enwe ụkọ nri n’ihi ụnwụ nri, ụkọ ego, ma ọ bụ ọchịchị gbara ọrụ.
ogbenye na-agakọ. Amaokwu nke 16 nkeA ga-agwọtakwa nsogbu ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, taa, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị bi n’ụwa enweghị ebe obibi nke ha. Otú ọ dị, Chineke na-ekwe nkwa, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi [vaịn], rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.” (Aịsaịa 65:21, 22) Onye ọ bụla ga-enwe ụlọ nke ya ma rie ihe aka ya rụtara. Ya mere Chineke na-ekwe nkwa na a ga-agwọta nsogbu nke ịda ogbenye kpam kpam na n’ụzọ na-adịgide adịgide. A gaghịzi enwe nnukwu ọdịiche dị n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye, a gaghịkwa enwe ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ iji kpata ihe ha ga-eri.
Mgbe mbụ mmadụ nụrụ nkwa ndị a dị na Bible, ọ pụrụ iche na ọ gaghị ekwe omume. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nyochakwuo Bible nke ọma, a ga-achọpụta na nkwa nile Chineke kwere n’oge ndị gara aga mezuru. (Aịsaịa 55:11) Ya mere, ihe bụ́ isiokwu abụghị ma ọ̀ ga-eme. Kama nke ahụ, ajụjụ gbara ọkpụrụkpụ bụ, Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji rite uru na ya mgbe ọ ga-eme?
Ị̀ Ga-anọ n’Ebe Ahụ?
Ebe ọ bụ Chineke nwe ọchịchị ahụ, anyị aghaghị ịbụ ụdị ndị Chineke ga-anabata dị ka ụmụ amaala n’okpuru ọchịchị ahụ. Ọ hapụghị anyị n’agwaghị anyị otú e si eru eru maka ya. E depụtara ụkpụrụ nduzi banyere ya n’ime Bible.
Onye Ọchịchị ahụ a họpụtara, bụ́ Ọkpara Chineke, bụ onye ezi omume. (Aịsaịa 11:3-5) N’ihi ya, a ga-atụkwa anya ka ndị a ga-ekwe ka ha dị ndụ n’okpuru ọchịchị a bụrụ ndị ezi omume. Ilu 2:21, 22 na-ekwu, sị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”
È nwere ụzọ ọ bụla e si amụta otú e si emezu ihe ndị a a chọrọ? Ee, e nwere. Site n’ịmụ Bible na itinye ntụziaka ya n’ọrụ, ị ga-enwe ike iso nweta ọdịnihu a magburu onwe ya. (Jọn 17:3) Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmụ ya. Anyị na-agba gị ume iji ohere a mee ihe iji bụrụ onye a ga-agụnye n’ọha mmadụ ndị na-agaghị ada ogbenye ọzọ na ndị a na-agaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi ọzọ ma ọlị.
[Foto dị na peeji nke 5]
Eufrosina: “Iji nlezianya emefu ego enyeworo ezinụlọ m aka inweta ihe ndị na-akpa ha”
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
A pụghị iji ego zụta iso Chineke enwe ezi mmekọrịta na ndụ ezinụlọ obi ụtọ