Iṅomi Chineke Nke Eziokwu
Iṅomi Chineke Nke Eziokwu
“Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.”—NDỊ EFESỌS 5:1.
1. Gịnị ka ụfọdụ ndị kweere banyere eziokwu, n’ihi gịnịkwa ka echiche ha na-ejighị zie ezie?
“GỊNỊ bụ eziokwu?” (Jọn 18:38) Ajụjụ ahụ, bụ́ nke Pọntịọs Paịlet ji nlelị jụọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, na-enye echiche na eziokwu dị nnọọ n’ebe aka mmadụ na-apụghị iru. Ọtụtụ ndị taa ga-ekweta. E nwere echiche dịgasị iche iche banyere ihe eziokwu bụ n’ezie. Ị pụrụ ịnụwo ebe e kwuru na onye ọ bụla na-ekpebiri onwe ya ihe bụ́ eziokwu, ma ọ bụ na eziokwu dabeere n’uche onye, ma ọ bụkwanụ na eziokwu na-agbanwe agbanwe mgbe nile. Echiche dị otú ahụ ezighị ezi. Nzube bụ́ isi e ji eme nchọpụta ma na-aga akwụkwọ bụ iji mụta ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ụwa anyị bi n’ime ya. Eziokwu abụghị ihe mmadụ na-ekpebiri onwe ya. Dị ka ihe atụ, ma ọ́ bụghị na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ ya abụrụ na ọ na-anwụ anwụ. Ma ọ́ bụghị na Setan dị adị ya abụrụ na ọ dịghị adị. Ma ọ́ bụghị na ndụ nwere nzube ya abụrụ na o nweghị. Na nke ọ bụla n’ime echiche ndị a, ọ bụ nanị otu pụrụ ịbụ eziokwu. Otu bụ eziokwu, nke ọzọ bụ ụgha; ha abụọ apụghị ịbụ eziokwu.
2. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova bụ Chineke nke eziokwu, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka a ga-atụle ugbu a?
2 N’isiokwu bu ụzọ, anyị tụlere na Jehova bụ Chineke nke eziokwu. Ọ maara ihe bụ́ eziokwu banyere ihe nile. N’ụzọ dị nnọọ iche n’ebe onye iro ya bụ́ onye nduhie bụ́ Setan Ekwensu nọ, Jehova bụ onye eziokwu mgbe nile. Ọzọkwa, Jehova na-ekpughere ndị ọzọ eziokwu n’ụba. Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) Dị ka Ndịàmà Jehova, olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ya n’ikwu eziokwu na n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu? N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ime otú ahụ? Oleekwa ihe na-emesi anyị obi ike na Jehova na-akwado ndị na-agbaso ụzọ nke eziokwu? Ka anyị hụ.
3, 4. Olee otú ndịozi bụ́ Pọl na Pita si kọwaa ihe gaje ime “n’ụbọchị ikpeazụ” a?
3 Anyị na-ebi n’ọgbọ nke ụgha okpukpe jupụtara na ya. Dị ka Pọl onyeozi buru n’amụma n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọtụtụ ndị “n’ụbọchị ikpeazụ” a na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya. Ụfọdụ na-eguzogide eziokwu ahụ, na-abụ “ndị e merụrụ uche ha kpam kpam.” Ọzọkwa, “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie [na-anọgide] na-ajọwanye njọ, na-eduhie ma bụrụ ndị a na-eduhie.” Ọ bụ ezie na ndị dị otú ahụ na-amụ ihe mgbe nile, ha adịghị ‘abịaru n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu’ ma ọlị.—2 Timoti 3:1, 5, 7, 8, 13.
4 E nyekwara Pita onyeozi ike mmụọ nsọ ide banyere ụbọchị ikpeazụ. Dị nnọọ ka o buru n’amụma, ọ bụghị nanị na ndị mmadụ na-ajụ eziokwu ahụ kamakwa ha na-akwa Okwu Chineke na ndị na-ekwusa eziokwu dị na ya emo. “Dị ka ọchịchọ ha si dị,” ndị ọkwa emo dị otú ahụ na-eleghara eziokwu ahụ bụ́ na e ji iju mmiri bibie ụwa nke oge Noa anya, na-egosi otú ụbọchị ikpe a ga-enwe n’ọdịnihu ga-adị. Ikwere n’echiche efu ha ga-akpatara ha ọdachi mgbe oge Chineke ga-eru maka ibibi ndị na-adịghị asọpụrụ ya.—2 Pita 3:3-7.
Ndị Ohu Jehova Maara Eziokwu Ahụ
5. Dị ka Daniel onye amụma si kwuo, gịnị ga-eme na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” oleekwa otú amụma a siworo mezuo?
5 Ná nkọwa o nyere banyere “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” Daniel onye amụma buru Daniel 12:4) Onye Nduhie ukwu ahụ adịghị emegharị ndị Jehova anya ma ọ bụ na-eme ka ha kpuo ìsì. N’ịbụ ndị na-ejegharị n’ime Bible, ha enwetawo ezi ihe ọmụma. Na narị afọ mbụ, Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya nweta nghọta. O “mepere obi ha nke ọma ka ha ghọta ihe Akwụkwọ Nsọ pụtara.” (Luk 24:45) N’ụbọchị anyị, Jehova emewo ihe yiri nke ahụ. Site n’Okwu ya, mmụọ ya, na nzukọ ya, o mewo ka ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile nwee ike ịghọta ihe ya onwe ya matarala—eziokwu ahụ.
amụma banyere ihe dị nnọọ iche nke a ga-ahụ n’etiti ndị Chineke—mweghachi nke eziokwu okpukpe. O dere, sị: “Ọtụtụ mmadụ ga na-ejegharị, ihe ọmụma ga-abakwa ụba.” (6. Olee eziokwu Bible ndị ndị Chineke taa na-aghọta?
6 Dị ka ndị Chineke, anyị na-aghọta ọtụtụ ihe ndị anyị na-agaraghị aghọta ma a sị na anyị abụghị ndị Chineke. Anyị maara azịza nye ajụjụ ndị nọworo na-enye ndị amamihe nke ụwa nsogbu ruo ọtụtụ puku afọ. Dị ka ihe atụ, anyị maara ihe mere nhụjuanya ji dịrị, ihe mere ndị mmadụ ji anwụ anwụ, na ihe mere na ụmụ mmadụ apụghị iweta udo na ịdị n’otu ga-ezu ụwa ọnụ. E mewokwa ka anyị hụ ihe ọdịnihu ga-abụ—Alaeze Chineke, ụwa paradaịs, na ndụ na-enweghị ngwụsị n’izu okè. Anyị abịawo mara Jehova, bụ́ Onye Kasị Elu. Anyị amụtawo banyere àgwà ya ndị na-adọrọ adọrọ tinyere ihe anyị na-aghaghị ime iji nweta ngọzi ya. Ịmara eziokwu ahụ na-eme ka anyị nwee ike ịmata ihe na-abụghị eziokwu. Itinye eziokwu ahụ n’ọrụ na-echebe anyị pụọ ná nchụso ndị na-enweghị isi, na-eme ka anyị nwee ike inweta ihe kasị mma ná ndụ, na-emekwa ka anyị nwee olileanya dị ebube maka ọdịnihu.
7. Olee ndị na-enwetali eziokwu Bible, oleekwa ndị na-adịghị enwetali ya?
7 Ị̀ na-aghọta eziokwu Bible? Ọ bụrụ otú ahụ, a gọziwo gị n’ụba. Mgbe onye edemede dere akwụkwọ, ọ na-edekarị ya otú ọ ga-esi masị otu ìgwè mmadụ kpọmkwem. E dere akwụkwọ ụfọdụ maka ndị gụrụ oké akwụkwọ, dee ndị ọzọ maka ụmụaka, deekwa ndị ọzọ maka ndị bụ́ ọkachamara n’otu ọrụ. Ọ bụ ezie na Bible na-eru mmadụ nile aka n’ụzọ dị mfe, e dere ya otú otu ìgwè mmadụ kpọmkwem ga-esi ghọta ma jiri ya kpọrọ ihe. Jehova kwadebere ya maka ndị dị umeala n’obi, ndị dị nwayọọ n’obi nọ n’ụwa. Ndị dị otú ahụ pụrụ ịghọta ihe Bible na-ekwu, n’agbanyeghị ókè ha gụruru akwụkwọ, ọdịbendị ha, ọkwá ha ná ndụ, ma ọ bụ agbụrụ ha. (1 Timoti 2:3, 4) N’aka nke ọzọ, e nyeghị ndị na-enweghị ezi ọchịchọ obi ikike ịghọta eziokwu Bible, n’agbanyeghị otú ụbụrụ pụrụ ịdị na-aghọru ha nkọ ma ọ bụ ókè ha gụruru akwụkwọ. Ndị mpako, ndị nganga, apụghị ịghọta eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa nke Okwu Chineke. (Matiu 13:11-15; Luk 10:21; Ọrụ 13:48) Ọ bụ nanị Chineke pụrụ iwepụta akwụkwọ dị otú ahụ.
Ndị Ohu Jehova Bụ Ndị Eziokwu
8. N’ihi gịnị ka Jizọs ji bụrụ eziokwu ahụ n’onwe ya?
8 Dị ka Jehova, Ndịàmà ya na-ekwesị ntụkwasị obi bụ ndị eziokwu. Jizọs Kraịst, bụ́ Onyeàmà kasịnụ nke Jehova, mere ka eziokwu ahụ pụta ìhè site n’ihe ndị ọ kụziri nakwa site n’ụzọ o si bie ndụ ma nwụọ. Ọ kwadoro eziokwu nke okwu Jehova na nkwa Ya. N’ihi ya, Jizọs bụ eziokwu ahụ n’onwe ya, dị ka o kwuru n’onwe ya.—Jọn 14:6; Mkpughe 3:14; 19:10.
9. Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ikwu eziokwu?
9 Jizọs ‘jupụtara n’obiọma na-erughịrị mmadụ na eziokwu,’ “ọ dịghịkwa aghụghọ dị n’ọnụ ya.” (Jọn 1:14; Aịsaịa 53:9) Ezi Ndị Kraịst na-agbaso ụkpụrụ Jizọs setịpụrụ n’ịdị na-agwa ndị ọzọ eziokwu. Pọl dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu, n’ihi na anyị bụ akụkụ ahụ nke dịịrị ibe anyị.” (Ndị Efesọs 4:25) Tupu mgbe ahụ, Zekaraịa onye amụma dere, sị: “Kwuonụ, onye ọ bụla ọ gwa ibe ya, eziokwu.” (Zekaraịa 8:16) Ndị Kraịst bụ ndị eziokwu n’ihi na ha na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Jehova bụ onye eziokwu ma mara nsogbu ụgha na-akpata. N’ihi ya, ọ na-atụ anya n’ụzọ ziri ezi ka ndị ohu ya na-ekwu eziokwu.
10. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji agha ụgha, oleekwa ihe ọjọọ ndị na-esi na ya apụta?
10 Nye ọtụtụ ndị, ịgha ụgha pụrụ iyi ngwá ọrụ dị mfe iji na-erite uru ụfọdụ. Ndị mmadụ na-agha ụgha iji zere ntaramahụhụ, iji rite uru n’ụzọ ụfọdụ, ma ọ bụ iji nweta otuto n’aka ndị ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ịgha ụgha bụ omume ọjọọ. Ọzọkwa, onye ụgha apụghị inweta ihu ọma Chineke. (Mkpughe 21:8, 27; 22:15) Mgbe a maara anyị dị ka ndị na-ekwu eziokwu, ndị ọzọ na-ekwere ihe anyị na-ekwu; ha na-atụkwasị anyị obi. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e jide anyị ebe anyị ghara ọbụna otu ụgha, ndị ọzọ pụrụ inwe obi abụọ ma ihe ọ bụla anyị ga-ekwu n’ọdịnihu ọ̀ bụ eziokwu. Otu ilu Africa na-ekwu, sị: “Otu okwu ụgha na-eme ka a ghara ịma mgbe e kwuru eziokwu.” Ilu ọzọ na-ekwu, sị: “A dịghị ekwere ihe onye ụgha kwuru, ọbụna mgbe o kwuru eziokwu.”
11. N’ụzọ dị aṅaa ka ịbụ onye eziokwu si pụta ihe karịrị nanị ịdị na-ekwu eziokwu?
11 Ịbụ onye eziokwu pụtara ihe karịrị nanị ịdị na-ekwu eziokwu. Ọ bụ ụzọ ndụ. Ọ na-akọwa ụdị mmadụ anyị bụ. Anyị na-eme ka ndị ọzọ mara eziokwu ahụ ọ bụghị nanị site n’ihe anyị na-ekwu kamakwa site n’ihe anyị na-eme. “Gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị?” ka Pọl onyeozi jụrụ. “Gị, onye na-ekwusa ‘Ezula ohi,’ ị̀ na-ezu ohi? Gị, onye na-asị ‘Akwala iko,’ ị̀ na-akwa iko?” (Ndị Rom 2:21, 22) Ọ bụrụ na anyị gaje ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ahụ, anyị aghaghị ịbụ ndị eziokwu n’ihe nile anyị na-eme. Anyị ịbụ ndị a maara dị ka ndị eziokwu na ndị na-eme ihe n’eziokwu ga-enwe mmetụta dị ike n’otú ndị mmadụ si emeghachi omume n’ihe anyị na-akụzi.
12, 13. Gịnị ka otu onye na-eto eto dere banyere ime ihe n’eziokwu, gịnịkwa mere o ji nwee ụkpụrụ omume dị elu?
12 Ndị na-eto eto nọ n’etiti ndị ohu Jehova na-aghọtakwa mkpa ọ dị ịbụ onye eziokwu. N’otu edemede e nyere ya n’ụlọ akwụkwọ, Jenny, bụ́ onye dị afọ 13 n’oge ahụ, dere, sị: “Ime ihe n’eziokwu bụ ihe m ji kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ụzọ dị mwute, ọ bụghị mmadụ nile na-emecha ihe n’eziokwu taa. Ekwere m onwe m nkwa na m ga-anọgide na-eme ihe n’eziokwu ná ndụ m. Aga m na-emekwa ihe n’eziokwu ọbụna ma a sị na ikwu eziokwu agaghị abara mụ onwe m ma ọ bụ ndị enyi m uru ozugbo. Ana m ejide n’aka na ndị enyi m bụ ndị na-ekwu eziokwu na ndị na-eme ihe n’eziokwu.”
13 Ka onye nkụzi Jenny na-agwa ya okwu banyere edemede a, o kwuru, sị: “Ị ka bụ nnọọ nwata ịzụlitewo ụkpụrụ omume siri ike otú ahụ. Amaara m na ị ga-anọgide na-agbaso ụkpụrụ omume gị n’ihi na i nwere àgwà siri ike.” Gịnị mere nwata akwụkwọ a ji nwee àgwà siri ike? N’okwu mmalite nke edemede ya, Jenny kwuru na okpukpe ya “na-esetịpụrụ [ya] ụkpụrụ.” Afọ asaa agaala kemgbe Jenny dere edemede ahụ. Dị ka onye nkụzi ya chere, Jenny nọgidere na-egosipụta ụkpụrụ omume dị elu ná ndụ ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.
Ndị Ohu Jehova Na-ekpughe Eziokwu Ahụ
14. N’ihi gịnị ka ndị ohu Chineke karịsịa ji nwee ibu ọrụ dị ukwuu ịkwado ihe bụ́ eziokwu?
14 N’ezie, ndị ọzọ na-abụghị Ndịàmà Jehova pụrụ ikwu eziokwu ma gbalịa ime ihe n’eziokwu. Otú ọ dị, dị ka ndị ohu Chineke, anyị nwere ibu ọrụ dị ukwuu karịsịa ịkwado ihe bụ́ eziokwu. E nyefewo anyị eziokwu Bible—eziokwu ndị pụrụ iduga ná ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, ọ bụ ibu ọrụ anyị iso ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma ahụ. “Onye ọ bụla e nyere ihe dị ukwuu,” ka Jizọs kwuru, “a ga-achọ ihe dị ukwuu n’aka ya.” (Luk 12:48) N’ezie, ‘a na-achọ ihe dị ukwuu’ n’aka ndị e jiworo ihe ọmụma dị oké ọnụ ahịa nke Chineke gọzie.
15. Olee obi ụtọ ị na-enweta n’ịgwa ndị ọzọ eziokwu Bible?
15 Ịgwa ndị ọzọ eziokwu Bible na-enye obi ụtọ. Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ Matiu 9:36; 1 Timoti 4:1) Jọn onyeozi dere, sị: “Ọ dịghị ihe ga-akpatara m inwe obi ekele nke karịrị ihe ndị a, na m ga na-anụ na ụmụ m nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Ikwesị ntụkwasị obi nke “ụmụ” Jọn—ikekwe ndị o mere ka ha nata eziokwu ahụ—wetaara ya ọṅụ dị ukwuu. Anyị na-enwe ọṅụ mgbe anyị hụrụ ka ndị mmadụ na-eji ekele anabata Okwu Chineke.
mbụ, anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ—ozi olileanya nke na-enye obi ụtọ—nye ndị ‘a gbara akpụkpọ, chụsasịakwa dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha’ nakwa nye ndị e ji “ozizi ndị mmụọ ọjọọ” na-emegharị anya ma na-eme ka ha kpuo ìsì. (16, 17. (a) Gịnị mere na ọ bụghị mmadụ nile na-anakwere eziokwu ahụ? (b) Olee ọṅụ ị pụrụ inweta ka ị na-akpọsa eziokwu Bible?
16 N’eziokwu, ọ bụghị mmadụ nile ga-anakwere eziokwu ahụ. Jizọs kwuru eziokwu banyere Chineke, ọbụna mgbe ọha na eze na-achọghị ịnụ ya. Ọ gwara ndị Juu na-emegide ya, sị: “N’ihi gịnị ka unu ji ghara ikwere ihe m na-ekwu? Onye si na Chineke na-ege ntị n’okwu Chineke. Ọ bụ nke a mere unu adịghị ege ntị, n’ihi na unu esiteghị na Chineke.”—Jọn 8:46, 47.
17 Anyị onwe anyị, dị ka Jizọs, adịghị ala azụ ịgwa ndị ọzọ eziokwu dị oké ọnụ ahịa banyere Jehova. Anyị adịghị atụ anya na mmadụ nile ga-ekwere ihe anyị na-agwa ha, n’ihi na ọ bụghị mmadụ nile kweere ihe Jizọs kwuru. Otú o sina dị, anyị na-enwe ọṅụ nke ịmara na anyị na-eme ihe ziri ezi. Jehova, n’ihi obiọma ya sitere n’ịhụnanya, na-achọ ka e kpugheere ihe a kpọrọ mmadụ eziokwu ahụ. Dị ka ndị ji eziokwu, Ndị Kraịst na-aghọ ndị na-enye ìhè n’ụwa nke gbara ọchịchịrị. Site n’ikwe ka ìhè nke eziokwu ahụ na-enwu site n’okwu na n’omume anyị, anyị pụrụ inyere ndị ọzọ aka inye Nna anyị nke eluigwe otuto. (Matiu 5:14, 16) Anyị na-eme ka a mara n’ihu ọha na anyị jụrụ eziokwu adịgboroja nke Setan ma na-akwado Okwu Chineke nke dị ọcha, nke a na-etinyeghịkwa nnu na ose. Eziokwu anyị maara ma na-eso ndị ọzọ ekerịta pụrụ ime ka ndị nakweere ya nwere onwe ha n’ezie.—Jọn 8:32.
Na-agbaso Ụzọ nke Eziokwu
18. N’ihi gịnị ka Jizọs ji nwee ihu ọma n’ebe Nataniel nọ, oleekwa otú o si gosipụta ya?
18 Jizọs hụrụ eziokwu ahụ n’anya ma kwuo ya. N’oge o jere ozi n’ụwa, o gosipụtara ihu ọma ya n’ebe ndị eziokwu nọ. Banyere Nataniel, Jizọs kwuru, sị: “Lee, onye Izrel n’ezie, bụ́ onye aghụghọ ọ bụla na-adịghị n’ime ya.” (Jọn 1:47) Mgbe e mesịrị, a họọrọ Nataniel, bụ́ onye o yiri ka ọ bụ ya bụ Batọlọmiu, ịbụ otu n’ime ndịozi 12 ahụ. (Matiu 10:2-4) Lee ihe ùgwù nke ahụ bụ!
19-21. Olee otú e si gọzie otu nwoke kpuburu ìsì n’ihi eziokwu o ji obi ike kwuo?
19 Otu isiakwụkwọ dum nke dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Jọn na-akọ banyere nwoke ọzọ na-eme ihe n’eziokwu bụ́ onye Jizọs gọziri. Anyị amaghị aha ya. Ihe anyị maara bụ na nwoke ahụ bụ onye arịrịọ nke kpuru ìsì site n’ọmụmụ. Ọ tụrụ ndị mmadụ n’anya mgbe Jizọs mere ka ọ malite ịhụ ụzọ. Akụkọ banyere ọrịa a a gwọrọ n’ụzọ ọrụ ebube ruru ụfọdụ ndị Farisii ntị, bụ́ ndị kpọrọ eziokwu asị, ndị kwekọrịtaworo n’etiti onwe ha na ha ga-achụpụ onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe n’ebe Jizọs nọ n’ụlọ nzukọ. N’ịmata nkata ha na-akpa, ndị mụrụ nwoke ahụ kpuburu ìsì, bụ́ ndị ụjọ ji, ghaara ndị Farisii ụgha, na-ekwu na ha amaghị ihe mere nwa ha nwoke jizi na-ahụ ụzọ ma ọ bụ onye mere ka ọ malite ịhụ ụzọ.—Jọn 9:1-23.
20 A kpọrọ nwoke ahụ a gwọrọ ka ọ bịaghachi n’ihu ndị Farisii. N’achọghị ịma ihe ọ bụla ga-esi na ya pụta, o ji obi ike kwuo eziokwu. Ọ kọwara otú e si gwọọ ya nakwa na ọ bụ Jizọs gwọrọ ya. N’ịbụ onye ọ tụrụ n’anya na ndị ikom a a ma ama bụ́ ndị gụrụ akwụkwọ ekweghị na Jizọs sitere n’ebe Chineke nọ, nwoke ahụ a gwọrọ gbara ha ume n’atụghị egwu ka ha kweta nke bụ́ eziokwu, sị: “Ọ bụrụ na nwoke a esighị na Chineke, ọ pụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.” Ebe ọ bụ na ndị Farisii apụghị ịgbagha okwu ahụ, ha boro nwoke ahụ ebubo na ọ kparịrị ha ma chụpụ ya.—Jọn 9:24-34.
21 Mgbe Jizọs nụrụ nke a, o ji ịhụnanya wepụta oge iji chọta nwoke ahụ. Mgbe ọ chọtasịrị ya, o mere ka okwukwe ahụ nwoke ahụ kpuburu ìsì gosipụtara sikwuo ike. Jizọs kọwaara ya n’ezoghị ọnụ na ọ bụ ya bụ Mezaịa ahụ. Lee ka e si gọzie nwoke ahụ maka ikwu eziokwu! N’ezie, ndị na-ekwu eziokwu na-enweta ihu ọma Chineke.—Jọn 9:35-37.
22. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịgbaso ụzọ nke eziokwu?
22 Ime ihe n’eziokwu bụ ihe anyị kwesịrị nnọọ iji kpọrọ ihe. Ọ dị oké mkpa iji nwee ike iso ndị mmadụ na Chineke na-enwe ezi mmekọrịta na iji hụ na mmekọrịta ahụ dịgidere. Ịbụ onye eziokwu pụtara ịbụ onye na-adịghị ezo ọnụ, onye ziri ezi, onye a pụrụ ịbịakwute abịakwute, na onye a pụrụ ịtụkwasị obi, ọ na-emekwa ka anyị nweta ihu ọma Jehova. (Abụ Ọma 15:1, 2) Ịbụ onye ụgha pụtara ịbụ onye aghụghọ, onye a na-apụghị ịdabere n’ebe ọ nọ, na onye na-agha ụgha, ọ na-emekwa ka anyị ghara inweta ihu ọma Jehova. (Ilu 6:16-19) N’ihi ya, kpebisie ike ịgbaso ụzọ nke eziokwu. N’ezie, iji na-eṅomi Chineke nke eziokwu, anyị aghaghị ịmara eziokwu, na-ekwu eziokwu, na-ebikwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji na-enwe obi ekele na anyị maara eziokwu ahụ?
• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jehova n’ịbụ ndị eziokwu?
• Olee uru ndị a na-erite site n’ime ka ndị ọzọ mụta eziokwu Bible?
• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịgbaso ụzọ nke eziokwu?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
N’ịbụ ndị e nyefere eziokwu Bible, Ndị Kraịst ji ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ya ndị ọzọ
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
A gọziri nwoke ahụ kpuru ìsì nke Jizọs gwọrọ nke ukwuu n’ihi ikwu eziokwu