Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Hụrụ Obiọma n’Anya

Ọ Hụrụ Obiọma n’Anya

Ọ Hụrụ Obiọma n’Anya

MILTON G. HENSCHEL, onye nọteworo aka n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, jesịrị ozi elu ala ya na Saturday, March 22, 2003. Ọ gbara afọ 82.

Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, Milton Henschel sonyere ná ndị ọrụ nke isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ma jiri ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ruo ihe karịrị afọ 60. A matara ya ngwa ngwa maka ikike iche echiche ya nakwa n’ihi mmasị sitere n’ezi obi o nwere n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. Na 1939 ọ ghọrọ odeakwụkwọ N. H. Knorr, bụ́ onye na-elekọta ebe Ndịàmà Jehova na-ebi akwụkwọ na Brooklyn. Mgbe Nwanna Knorr malitere idu ndú n’etiti Ndịàmà n’ụwa nile na 1942, ọ nọgidere jiri Nwanna Henschel na-eme ihe dị ka osote ya. Nwanna Henschel lụrụ Lucille Bennett na 1956, ha abụọ kerịtara ọṅụ na ihe ịma aka nke ndụ.

Nwanna Henschel sooro Nwanna Knorr rụkọọ ọrụ n’ụzọ chiri anya ruo mgbe Knorr nwụrụ na 1977. Nwanna Henschel sooro Nwanna Knorr mee njem gaa ihe karịrị mba 150, na-eleta ma na-agba Ndịàmà Jehova ume gburugburu ụwa, karịsịa ndị ozi ala ọzọ na ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche. Mgbe ụfọdụ, njem ndị dị otú ahụ na-esi ike, ọbụna na-adị ize ndụ. Na 1963, mgbe ọ na-eleta otu mgbakọ na Liberia, Nwanna Henschel nwetara mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ n’ihi ịjụ ikere òkè n’ememe nke ịhụ mba n’anya. * N’atụghị egwu, Nwanna Henschel laghachiri Liberia mgbe ọnwa ole na ole gasịrị iji hụ president nke mba ahụ na ime mgbalị ka Ndịàmà Jehova nọ ebe ahụ nweta nnwere onwe okpukpe ka ukwuu.

A maara Nwanna Henschel dị ka onye na-ahụ ihe otú ọ dị, onye na-eme mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ e nwere na onye nwere ezi uche n’ihe banyere ịhụ maka nsogbu na ihe ịma aka ndị siri ike. Karịsịa, ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ na-eji ịdị n’usoro, obi umeala, na omume ịkpa ọchị ya akpọrọ ihe. N’ihi ịbụ onye na-echeta ihe n’ụzọ dị ịrịba ama, o mere ka ndị ozi ala ọzọ gburugburu ụwa nwee obi ụtọ n’ihi inwe ike icheta aha ha ngwa ngwa, ikwu otu nkebi ahịrịokwu ma ọ bụ abụọ n’asụsụ ógbè ndị ọ gara, na ikwu okwu n’ụzọ ga-eme ka ọ pụta ihe karịrị otu ihe—nke ọ na-ekwu n’ụzọ na-akpa ọchị.

Maịka 6:8 na-echetara anyị na Jehova Chineke na-achọ ka anyị ‘na-ahụ ebere [“obiọma,” NW] n’anya.’ A ga na-echeta Milton Henschel n’ihi isetịpụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a. N’agbanyeghị ibu ọrụ dị arọ o nwere, ọ nọgidere bụrụ onye a pụrụ ijekwuru, onye dị nwayọọ na onye nwere obiọma. Ọ na-enwe mmasị ikwu, sị, “Mgbe ị na-amaghị ihe ị ga-eme, cheta na ihe na-egosi obiọma bụ ihe kasị mma ime.” Ọ bụ ezie na anyị na-enwe mwute n’ihi ọnwụ nke nwanna anyị nwoke a anyị hụrụ n’anya, anyị nwere obi ụtọ na ọ tachiri obi ruo ọgwụgwụ, nweekwa obi ike na ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya, bụ́ “okpueze bụ́ ndụ.”—Mkpughe 2:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee 1977 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 171-177.

[Foto dị na peeji nke 31]

M. G. Henschel na N. H. Knorr

[Foto dị na peeji nke 31]

Ya na nwunye ya, bụ́ Lucille