Ụzọ Isi Mee Ka Alụmdi na Nwunye Gị Sikwuo Ike
Ụzọ Isi Mee Ka Alụmdi na Nwunye Gị Sikwuo Ike
CHEEDỊ echiche banyere otu ụlọ nke e leghaara anya. Ágbá ya na-ekpepụsị ekpepụsị, gbamgbam ya emebiela, ọbụnakwa ahịhịa etochiwo ụlọ ahụ. O doro anya na oké mmiri ozuzo amakwasịwo ụlọ a ruo ọtụtụ afọ, e legharawokwa ya anya. È kwesịrị ịkwatu ya? Ọ dịchaghị mkpa ime otú ahụ. Ọ bụrụ na ntọala ya siri ike, ide ji ụlọ ahụ aka siekwa ike, o yiri ka a pụrụ ịrụzi ụlọ ahụ.
Ọnọdụ ụlọ ahụ ọ̀ na-echetara gị alụmdi na nwunye gị? N’afọ ndị gafeworonụ, ọ pụrụ ịbụ na oké mmiri ozuzo, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, akpawo mmekọrịta alụmdi na nwunye gị aka ọjọọ. Ọ pụrụ ịbụ na otu onye n’ime unu ma ọ bụ unu abụọ elegharawo alụmdi na nwunye unu anya ruo n’ókè ụfọdụ. Ị pụrụ inwe ụdị mmetụta Sandy nwere. Ka ọ lụworo di ihe dị ka afọ 15, o kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ jikọrọ anyị ma ọ bụghị na anyị bụ di na nwunye. Nke ahụ ezughịkwa.”
Ọ bụrụgodị na alụmdi na nwunye gị eruwo n’ọnọdụ dị otú a, adịla ngwa ikpebi na e kwesịrị itisa ya. O yikarịrị ka a pụrụ idozi nsogbu alụmdi na nwunye gị. Ọ dabeere n’ụzọ dị ukwuu ná mkpebi siri ike gị na onye òtù ọlụlụ gị mere. Mkpebi siri ike dị otú ahụ pụrụ ime ka alụmdi na nwunye gị kwụsie ike n’oge nsogbu. Gịnị bụ mkpebi siri ike? Olee otú Bible pụrụ isi nyere gị aka ime ka mkpebi a sikwuo ike?
Mkpebi Siri Ike Na-agụnye Ibu Ọrụ
Mkpebi siri ike na-ezo aka n’ọnọdụ ma ọ bụ mmetụta nke ịbụ onye nwere ibu ọrụ ma ọ bụ onye iwu ji ime ihe. Mgbe ụfọdụ, a na-eji okwu ahụ eme ihe n’ihe na-abụghị mmadụ, dị ka ná nkwekọrịta azụmahịa. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdị onye na-ewu ụlọ ka iwu ò ji ya iwuzu ụlọ o kwere nkwa iwu. O nwere ike ọ maghịdị onye nwe ọrụ ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-enwe mkpali nke imezu ihe o kwuru.
Ọ bụ ezie na alụmdi na nwunye abụghị nkwekọrịta achụmnta ego nke mmetụta na-adịghị na ya, mkpebi siri ike ọ chọrọ na-agụnye ibu ọrụ. Ma eleghị anya, gị na onye òtù ọlụlụ gị ekwewo nkwa siri ike n’ihu Chineke na mmadụ ibikọ ọnụ, n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Jizọs sịrị: “Onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwanyị wee sị, ‘N’ihi nke a, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya.’” Jizọs gbakwụnyere, sị: “Ya mere, ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:4-6) N’ihi ya, mgbe nsogbu bilitere, gị na onye òtù ọlụlụ gị kwesịrị ikpebisi ike ịkwanyere mkpebi ahụ siri ike unu mere ùgwù. * Otu nwunye kwuru, sị: “Ọ bụ nanị mgbe anyị kwụsịrị ile ịgba alụkwaghịm anya dị ka otu n’ime ihe ndị anyị pụrụ ime ka ihe malitere dịwa mma.”
Otú ọ dị, mkpebi ichebe alụmdi na nwunye gụnyere ihe karịrị ibu ọrụ. Gịnị ọzọ ka ọ gụnyere?
Ịrụkọ Ọrụ Ọnụ Na-eme Ka Mkpebi Ichebe Alụmdi na Nwunye Sikwuo Ike
Mkpebi ichebe alụmdi na nwunye apụtaghị na di na nwunye ga-ekwekọrịta n’ihe nile. Mgbe nsogbu bilitere, e kwesịrị inwe ọchịchọ siri ike idozi nsogbu ahụ ọ bụghị nanị n’ihi nkwa a na-aghaghị imezu kamakwa n’ihi nkekọ nke mmetụta uche. Jizọs kwuru banyere di na nwunye, sị: “Ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama otu.”
Gịnị ka gị na onye òtù ọlụlụ gị ịbụ ‘otu anụ ahụ́’ pụtara? Pọl onyeozi dere na “ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha.” (Ndị Efesọs 5:28, 29) Ya mere, n’otu akụkụ, ịbụ ‘otu anụ ahụ́’ pụtara gị inwe nchegbu maka ọdịmma onye òtù ọlụlụ gị dị nnọọ ka ị na-enwe banyere nke gị. Ọ dị ndị di na nwunye mkpa isi n’iche echiche banyere “nke m” gaa n’iche banyere “nke anyị,” site na “mụ” gaa ‘n’anyị.’ Otu onye ndụmọdụ dere, sị: “Ndị di na nwunye aghaghị ịkwụsị ịbụ ndị na-alụbeghị di na nwunye n’obi ma bụrụ ndị lụrụ di na nwunye n’obi.”
Gị na onye òtù ọlụlụ gị ùnu bụ “di na nwunye n’obi”? Ọ pụrụ ịbụ ihe kwere omume ibikọ ọnụ ruo ọtụtụ afọ ma ghara ịbụ ‘otu anụ ahụ́’ n’echiche ahụ. Ee, nke ahụ pụrụ ime, ma akwụkwọ bụ́ Giving Time a Chance na-ekwu, sị: “Alụmdi na nwunye pụtara imekọ ihe ọnụ, ka mmadụ abụọ ahụ na-emekọ ihe ọnụ karị otú ahụ ka alụmdi na nwunye ha na-enwe ihe ịga nke ọma karị.”
Ụfọdụ di na nwunye na-enweghị obi ụtọ na-ebikọ ọnụ n’ihi ụmụ ha ma ọ bụ n’ihi ego. Ndị ọzọ na-edi ya n’ihi na ha weere ịgba alụkwaghịm dị ka àgwà jọgburu onwe ya ma ọ bụ n’ihi na ha na-atụ ụjọ ihe ndị ọzọ ga-eche banyere ha ma ọ bụrụ na ha etisaa. Ọ bụ ezie na a pụrụ ịja ha mma n’ihi ịnọgide n’alụmdi na nwunye, cheta na ihe mgbaru ọsọ unu kwesịrị ịbụ inwe mmekọrịta na-enye obi ụtọ, ọ bụghị nanị nke na-adịgide adịgide.
Omume Achọghị Ọdịmma Onwe Onye Nanị Na-akwalite Mkpebi Ichebe Alụmdi na Nwunye
Bible buru amụma na “n’ụbọchị ikpeazụ,” ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya.” (2 Timoti 3:1, 2) Dị ka amụma ahụ si kwuo, ihe a na-emesi ike taa yiri ka ọ bụ mmadụ ife onwe ya ofufe. N’ọtụtụ alụmdi na nwunye, a na-ele mmadụ inyefe onwe ya n’atụghị anya na a ga-akwụghachi ya ụgwọ anya dị ka ihe àmà nke adịghị ike. Otú ọ dị, n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma, ndị òtù ọlụlụ na-egosipụta mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà. Olee otú ị pụrụ isi na-egosipụta mmụọ ahụ?
Kama ịdị na-ajụ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m na-enweta site ná mmekọrịta a?’ jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m na-eme iji mee ka alụmdi na nwunye m sikwuo ike?’ Bible na-ekwu na Ndị Kraịst kwesịrị ịdị “na-elekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara [ha], kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.” (Ndị Filipaị 2:4) Ka ị na-atụgharị uche n’ụkpụrụ Bible a, tụlee ihe ndị i mere n’izu gara aga. Ugboro ole ka ị rụrụ ọrụ obiọma maka nanị abamuru nke onye òtù ọlụlụ gị? Mgbe onye òtù ọlụlụ gị chọrọ ikwu okwu, ị̀ gere ntị—ọbụna ma ọ bụrụ na ọ bụchaghị ọchịchọ gị ime otú ahụ? Ihe omume ole ka i mere bụ́ ndị masịrị onye òtù ọlụlụ gị karịa ka ha masịrị gị?
Ka ị na-atụle ajụjụ ndị dị otú a, echegbula onwe gị na a gaghị ahụta ọrụ ọma gị ma ọ bụ na a gaghị akwụghachi gị ụgwọ. “N’ọtụtụ mmekọrịta,” ka otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, “a na-eji omume ọma akwụ ụgwọ omume ọma, ya mere mee ihe nile i nwere ike ime iji gbaa onye òtù ọlụlụ gị ume ime omume ndị dị mma site na gị onwe gị ime omume ndị dị mma karị.” Omume ịchụ onwe onye n’àjà na-eme ka alụmdi na nwunye gị sikwuo ike n’ihi na ha na-egosi na i ji ya kpọrọ ihe ma chọọ ime ka ọ dịgide.
Ọ Dị Oké Mkpa Ile Alụmdi na Nwunye Anya Dị Ka Ihe Ga-adịgide Adịgide
Jehova Chineke ji iguzosi ike n’ihe kpọrọ ihe. N’ezie, Bible na-ekwu, sị: “N’ebe onye ebere [“onye na-eguzosi ike n’ihe,” NW] nọ [Jehova] ga-egosi onwe [ya] onye ebere [“onye na-eguzosi ike n’ihe,” NW].” (2 Samuel 22:26) Iguzosi ike n’ihe nye Chineke na-agụnye iguzosi ike n’ihe nye ndokwa alụmdi na nwunye nke o guzobere.—Jenesis 2:24.
Ọ bụrụ na gị na onye òtù ọlụlụ gị na-eguzosi ike n’ihe nye ibe unu, unu ga-enwe njikọ na-adịgide adịgide. Mgbe unu na-eche banyere ọnwa, afọ na iri afọ ndị ka dị n’ihu, unu na-ahụ onwe unu ka unu nọkọtara ọnụ. Echiche nke ịbụ ndị na-abụghịkwa di na nwunye ga-abụ nnọọ ihe a na-agatụghị eche n’echiche, echiche a na-eme ka mmekọrịta unu nọrọ ná nchebe. Otu nwunye na-ekwu, sị: “Ọbụna mgbe m na-ekosa [di m] ọnụma, ihe kasị ewe m iwe bụ ihe na-eme anyị, adịghị m enwe nchegbu banyere alụmdi na nwunye anyị ịbịa ná njedebe. Ihe na-echegbu m bụ otú anyị ga-esi dịghachi ná mma. Enweghị m obi abụọ ọ bụla na anyị ga-adịghachi ná mma—ọ bụ nanị na n’oge ahụ amaghị m otú anyị ga-esi mee nke ahụ.”
Ile alụmdi na nwunye anya dị ka ihe ga-adịgide adịgide bụ akụkụ dị mkpa nke mkpebi siri ike gị na onye òtù ọlụlụ gị mere, ma n’ụzọ dị mwute ọ bụ ihe kọrọ ụkọ n’ọtụtụ alụmdi na nwunye. Mgbe a na-enwe arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ, otu onye n’ime ndị òtù ọlụlụ Jems 3:8) Iyi egwu na inye iwu na-enye echiche bụ́: ‘Eleghị m alụmdi na nwunye anyị anya dị ka ihe ga-adịgide adịgide. Apụrụ m ịhapụ gị oge ọ bụla.’ Inye echiche dị otú ahụ pụrụ imebi ihe n’alụmdi na nwunye.
pụrụ iji iwe kwuo, sị, “Aga m ahapụ gị!” ma ọ bụ, “Aga m achọ onye ga-eji m kpọrọ ihe!” N’ezie, ihe ka ọtụtụ n’okwu ndị ahụ adịghị esi n’obi. N’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-ekwu na ire pụrụ ‘ijupụta ná nsí na-eweta ọnwụ.’ (Mgbe i lere alụmdi na nwunye anya dị ka ihe ga-adịgide adịgide, ị na-atụ anya na gị na onye òtù ọlụlụ gị ga-ebi ma n’oge ihe siri ike ma n’oge ihe dị mma. Nke a bakwara uru. Ọ ga-eme ka ọ dịkwuoro gị na onye òtù ọlụlụ gị mfe ịnakwere adịghị ike na mmejọ ma nọgide na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam. (Ndị Kọlọsi 3:13) “N’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma,” ka otu akwụkwọ nta na-ekwu, “unu abụọ pụrụ imehie ihe, alụmdi na nwunye unu pụkwara ịga nke ọma n’agbanyeghị nke ahụ.”
N’ụbọchị agbamakwụkwọ unu, i kwere nkwa, ọ bụghị ndokwa alụmdi na nwunye ka i kwere ya, kama i kwere ya mmadụ dị ndụ—onye òtù ọlụlụ gị. Eziokwu a kwesịrị inwe mmetụta n’otú i si eche echiche ma na-eme omume ugbu a dị ka onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Í kwetaghị na gị na onye òtù ọlụlụ gị kwesịrị ịnọgide na-ebikọ ọ bụghị nanị n’ihi na i kwenyesiri ike n’ịdị nsọ nke alụmdi na nwunye kamakwa n’ihi na ị hụrụ onye ahụ ị lụrụ n’anya?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 N’ọnọdụ ndị dị oké njọ, a pụrụ inwe ezi ihe mere di na nwunye pụrụ iji kewaa. (1 Ndị Kọrint 7:10, 11; lee Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, peeji nke 160-161, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.) Ọzọkwa, Bible na-enye ohere maka ịgba alụkwaghịm n’ihi ịkwa iko (mmekọahụ rụrụ arụ).—Matiu 19:9.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]
Ihe Ị Pụrụ Ime Ugbu A
Olee otú mkpebi unu ichebe alụmdi na nwunye unu siruru n’ike? Ikekwe, unu hụrụ ebe unu pụrụ imeziwanye ihe. Iji mee ka mkpebi unu sikwuo ike, gbalịa ime ihe ndị na-esonụ:
● Mee nnyocha onwe onye. Jụọ onwe gị, sị: ‘Àbụ m onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye n’obi n’ezie, ka m ka na-eche echiche ma na-eme omume dị ka onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye?’ Chọpụta ihe onye òtù ọlụlụ gị na-eche banyere gị n’akụkụ a.
● Soro onye òtù ọlụlụ gị gụọ isiokwu a. Mgbe ahụ, jirinụ obi dị nwayọọ tụlee ụzọ ndị unu pụrụ isi mee ka mkpebi unu ichebe alụmdi na nwunye unu sikwuo ike.
● Soro onye òtù ọlụlụ gị na-eme ihe ndị ga-eme ka mkpebi unu sikwuo ike. Dị ka ihe atụ: Kirienụ foto agbamakwụkwọ unu na nke ihe omume ndị ọzọ kwesịri ncheta. Na-emenụ ihe unu na-enwe mmasị ime n’oge unu na-eme mbedo ma ọ bụ n’afọ ndị mbụ nke alụmdi na nwunye unu. Na-amụnụ isiokwu ndị dabeere na Bible bụ́ ndị metụtara alụmdi na nwunye bụ́ ndị dị n’Ụlọ Nche na Teta!
[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]
N’alụmdi na Nwunye, Mkpebi Siri Ike Na-agụnye . . .
● Ibu Ọrụ “Ihe ị na-ekwe ná nkwa, kwụghachi ya. Ọ dị mma ka ị ghara ikwe nkwa, karịa ikwe nkwa ma ị dịghị akwụghachi.”—Eklisiastis 5:4, 5.
● Ịrụkọ Ọrụ Ọnụ “Abụọ dị mma karịa otu . . . N’ihi na ọ bụrụ na ha adaa, otu n’ime ha ga-eme ka ibe ya bilie.”—Eklisiastis 4:9, 10.
● Ịchụ Onwe Onye n’Àjà “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
● Ile Alụmdi na Nwunye Anya Dị Ka Ihe Ga-adịgide Adịgide “Ịhụnanya . . . na-atachiri ihe nile obi.”—1 Ndị Kọrint 13:4, 7.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Mgbe onye òtù ọlụlụ gị chọrọ ikwu okwu, ị̀ na-ege ntị?