Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ Na-akpali Okwukwe na Obi Ike—Ndịàmà Jehova na Ukraine

Akụkọ Na-akpali Okwukwe na Obi Ike—Ndịàmà Jehova na Ukraine

Akụkọ Na-akpali Okwukwe na Obi Ike—Ndịàmà Jehova na Ukraine

DỊ NNỌỌ ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ nwetara mkpagbu, otú ahụ kwa ka ọ dị ndị Chineke taa. (Matiu 10:22; Jọn 15:20) Ọ bụ nanị n’ebe ole na ole ka mkpagbu ahụ dịruworo ogologo oge ma ọ bụ sie ike karịa na Ukraine, bụ́ ebe a machibidoro ọrụ nkwusa Alaeze ahụ iwu ruo afọ 52.

2002 Yearbook of Jehovah’s Witnesses kọrọ akụkọ banyere ndị Chineke ná mba ahụ. Ọ bụ akụkọ nke okwukwe, obi ike, na ume n’agbanyeghị ahụhụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ihe na-esonụ bụ ụfọdụ okwu ekele ndị alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Ukraine natara:

“Agụsịwo m 2002 Yearbook ahụ. Apụghị m ijide onwe m ka m ghara ibe ákwá mgbe m na-agụ banyere ọrụ unu na Ukraine. Achọrọ m ime ka unu mara ụdị agbamume m nwetaworo site n’ihe nlereanya nke ịnụ ọkụ n’obi na okwukwe unu siri ike. Ọ bụụrụ m nnukwu ihe ùgwù na mụ na unu nọ n’otu ezinụlọ ime mmụọ. Ana m ekele unu site n’ala ala obi m!”—Andrée, France.

“O nweghị okwu m ga-eji kọwaa otú m nweruru ekele nye unu na Jehova maka 2002 Yearbook ahụ. Anya mmiri gbara m n’anya ka m na-agụ ọtụtụ ahụmahụ nke ụmụnna anyị ndị tufuru oge afọ ndụ ha ndị kasị mma n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ. Obi ike ha masịrị m. Ọ bụ ezie na abụwo m Onyeàmà ruo afọ 27, aka m nwere ike ịmụta ihe n’aka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ahụ. Ha mere ka okwukwe m nwere n’ebe Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova nọ sikwuo ike.”—Vera, n’ebe bụ́bu Yugoslavia.

“Eji m ọṅụ na-ede akwụkwọ ozi a n’ihi ezi ihe nlereanya nke ntachi obi na ikwesị ntụkwasị obi unu n’ime afọ ahụ nile nke mmegide. Obi ike zuru ezu unu nwere na Jehova na mkpebi siri ike unu nwere ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi na-ewetara unu nsọpụrụ. Tụkwasị na nke ahụ, ịdị umeala n’obi unu mgbe unu na-eche ule ihu mere ka nkwenye m nwere na Jehova anaghị ahapụ ndị ya sikwuo ike. N’ihi ezi ihe nlereanya nke obi ike, nkwụsi ike na nnọgidesi ike unu, anyị pụrụ ịnagide ntakịrị nsogbu ndị anyị na-enwe n’ụzọ ndị dị mfe karị.”—Tuteirihia, French Polynesia.

“Ka m gụsịrị Yearbook ahụ, aghaghị m idetara unu akwụkwọ. Ahụmahụ nile ahụ na-agba ume metụrụ m nnọọ n’ahụ́ nke ukwuu. Ọ bụụrụ m nnọọ ihe obi ụtọ iso ná nzukọ a dị n’otu, na-eguzosi ike n’ihe nke Nna anyị nke na-ahụ n’anya ma na-eche banyere anyị, onye na-enyekwa anyị ume n’oge kwesịrị, na-eduzi. O wutere m na ọtụtụ ndị ohu Jehova na-anụ ọkụ n’obi tara ahụhụ nke ukwuu ọbụna tụfuo ndụ ha. Ma enwekwara m ọṅụ n’ihi na obi ike na ịnụ ọkụ n’obi ha mere ka ọtụtụ ndị mmadụ mụta eziokwu ahụ ma bịa mara Nna anyị nke na-ahụ n’anya.”—Colette, Netherlands.

“Mụ na nwunye m aghaghị nnọọ idetara unu akwụkwọ iji gwa unu otú o si metụ anyị n’obi mgbe anyị na-agụ akụkọ banyere Ukraine n’ime Yearbook ahụ. Unu ụmụnna kwesịrị ntụkwasị obi esetịpụwo ihe nlereanya dị ịrịba ama nke ntachi obi n’okpuru oké ihe isi ike nọrọ ogologo oge. N’ikwekọ n’okwu dị n’Ilu 27:11, lee ka Jehova ga-esiworị nwee obi ụtọ ịmara na ọtụtụ ụmụnna kwesịrị ntụkwasị obi sitere Ukraine guzosiri nnọọ ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ọrụ ọjọọ nile nke Ekwensu.”—Alan, Australia.

“Anya mmiri rujuru m anya mgbe m gụrụ banyere ụmụnna ndị a nọ na Ukraine. Ha tachiri obi n’ọtụtụ ihe—ọtụtụ afọ nke ịtụ mkpọrọ, mmekpọ ọnụ, mmegbu, na nkewa nke ezinụlọ. Achọrọ m ịgwa ụmụnna nile ndị a ka nọ n’ọgbakọ ndị dị n’obodo unu na ahụrụ m ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù n’ebe o buru ibu. Obi dị m ụtọ nke ukwuu n’ihi obi ike na nguzosi ike ha. Amaara m ihe nyere ha ike, ọ bụ mmụọ Jehova. Jehova nọ anyị nso, ọ chọkwara inyere anyị aka.”—Sergei, Russia.

“Agụrụ m 2002 Yearbook ahụ wee bee ákwá. Ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị nọ n’ọgbakọ anyị ekwuwo banyere unu. Unu dị nnọọ oké ọnụ ahịa. Enwere m nnukwu obi ụtọ iso n’ezinụlọ ime mmụọ buru ibu dị otú ahụ.”—Yeunhee, South Korea.

“Ihe ndekọ nke okwukwe unu, ntachi obi, na ịhụnanya na-adịghị ada ada unu nwere n’ebe Jehova na Alaeze ya nọ kpaliri m nke ukwuu. Mgbe ụfọdụ anyị anaghị enwe ekele maka nnwere onwe anyị nwere na ụbara nri ime mmụọ nke Jehova na-enye anyị. Ma nke a adịghị otú ahụ n’akụkụ nke unu. Ihe nlereanya nke okwukwe unu na-enyere anyị aka ịmara na ọ bụrụ na anyị na Chineke enwee mmekọrịta chiri anya, ọ ga-enye anyị ume iji nagide ụdị ule ọ bụla.”—Paulo, Brazil.

“Enwere m ihe ùgwù nke ịgụ ahụmahụ unu na 2002 Yearbook. Ha kpaliri m nke ukwuu, karịsịa ahụmahụ na-emetụ n’ahụ́ nke Nwanna Nwanyị Lydia Kurdas. A dọtara m n’ebe nwanna nwanyị a nọ.”—Nidia, Costa Rica.

“Taa ka m gụsịrị 2002 Yearbook ahụ. Ka m na-agụ ya, okwukwe m n’ebe Jehova nọ sikwuru ike. Otu ihe m na-agaghị echezọ bụ akụkọ nke mgbe a kụnyere obi abụọ banyere ndị na-edu ndú. Ọ kụziiri m ịghara ịdị na-enwe obi abụọ ma ọlị banyere ụmụnna ndị na-edu ndú. Unu emeela nnọọ! Nri ime mmụọ dị otú a dị mma iji wulie okwukwe ma na-akwadebe anyị maka oge e nwere ike itinye okwukwe anyị n’ule.”—Leticia, United States.

“Anyị nwere ekele maka Yearbook a magburu onwe ya. Nke a bụ nke mbụ ya ọtụtụ ndị nkwusa na-agụ banyere ọrụ ụmụnna anyị ndị nọ na Ukraine. A gbara ụmụnna anyị ndị nọ n’ebe a ume. Ọtụtụ ndị, karịsịa n’etiti ndị na-eto eto, amụbawo ije ozi ha. Ụfọdụ ebidola ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ nke inyeaka. Ihe nyere ha nile agbamume bụ akụkọ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị jeere Jehova ozi n’oge mmachibido iwu ahụ.”—Otu kọmitii ije ozi ọgbakọ, Ukraine.

Ikwesị ntụkwasị obi nke ụmụnna anyị ndị nọ na Ukraine abụrụwo n’ezie ihe agbamume nye ndị Jehova n’ụwa nile. N’eziokwu, ịgụ mgbe nile akụkọ ndị na-enye obi ụtọ bụ́ ndị na-apụta na Yearbook kwa afọ bụ ụzọ magburu onwe ya isi wusie okwukwe na ntachi obi anyị ike n’oge ndị a dị mkpa.—Ndị Hibru 12:1.