Ozi Ọma ahụ Amịa Mkpụrụ na São Tomé na Príncipe
Ozi Ọma ahụ Amịa Mkpụrụ na São Tomé na Príncipe
ELEGHỊ anya, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ anụtụbeghị banyere São Tomé na Príncipe. A dịghị akpọsakarị obodo ndị a n’akwụkwọ ndị e ji akpọsa ebe ndị a pụrụ ịga njem ezumike. Na map ụwa, ha dị ka kpọm ndị dị na Gulf of Guinea ná mpụga ụsọ oké osimiri nke ebe ọdịda anyanwụ Africa, São Tomé nọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’akara kere ụwa abụọ, Príncipe anọrọkwa ya n’akụkụ ebe ugwu ọwụwa anyanwụ. Ọnọdụ ihu igwe ya dị udè ma na-ezo mmiri emewo ka e nwee oké ọhịa mmiri ozuzo ndị osisi jupụtara na ha, na-ekpuchi mkpọda nke ugwu ndị ịdị elu ha karịrị mita 2,000.
Ọ bụ ndị nwere omume enyi na obi ọmịiko bụ́ ndị si Africa na Europe, nke mere ka e nwee ngwakọta ọdịbendị mara mma, bi n’àgwàetiti ndị a na-ekpo ọkụ ndị mmiri na-acha anụnụ anụnụ na ụsọ mmiri ndị nkwụ nọcha n’akụkụ ha gbara gburugburu. Mmadụ 170,000 bi n’ebe ndị a na-arụpụta ihe bụ́ isi a na-esi ná mba ndị a ebuga ná mba ọzọ bụ́ koko, ma ọ bụ na-arụ ọrụ ugbo na ọrụ ịkụ azụ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, inweta ọbụna nri ụbọchị anọwo na-esiri ha ike.
Otú ọ dị, n’afọ iri ikpeazụ nke narị afọ nke 20, otu ihe omume dị mkpa nke metụtara ndụ nke ọtụtụ ndị bi n’àgwàetiti a mere. Na June 1993, gọọmenti mba São Tomé na Príncipe debanyere aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro, na-eweta ogologo oge nke nwere ọtụtụ ihe isi ike n’akụkọ ihe mere eme nke Ndịàmà Jehova n’àgwàetiti ndị a ná njedebe.
Mkpụrụ A Ghara n’Oge Ihe Isi Ike
O yiri ka Onyeàmà mbụ ọ̀ bịara ná mba a ná mmalite nke afọ ndị 1950 mgbe e sitere n’ógbè ndị ọzọ Portugal na-achị ziga ndị mkpọrọ ịrụ ọrụ n’ogige ọrụ mmanye ndị dị n’àgwàetiti ndị a. E si na Mozambique gbaara Onyeàmà ahụ, bụ́ onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ onye ozi oge nile bụ́ onye Africa ụgbọ nwa mkpi n’ihi na ọ na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ala ahụ. Onyeàmà a nanị ya nọ rụsiri ọrụ ike, n’ime ọnwa isii kwa, e nwere mmadụ 13 ndị ọzọ bụ́ ndị sonyere n’ịgbasa ozi ọma ahụ. Ka oge na-aga, Ndịàmà ọzọ bụ́ ndị nọ n’otu ọnọdụ ahụ si Angola bịa. N’oge ha nọ mkpọrọ, ha ji ohere ọ bụla dapụtaranụ soro ndị bi n’ógbè ndị ahụ kerịta ozi ọma ahụ.
Ka ọ na-erule 1966, ụmụnna nile nọ mkpọrọ na São Tomé alaghachila n’obodo ndị bụ́ isi nke Africa. Ìgwè nta nke ndị nkwusa Alaeze fọdụrụnụ ji obi ike were ozi ọma ahụ gaa n’ihu. A kpagburu ha, tie ha ihe, tụọkwa ha mkpọrọ n’ihi na ha na-agbakọta ọnụ ịmụ Bible, ọ dịghịkwa onye letara ha ma ọ bụ gbaa ha ume. Obodo ahụ nweere onwe ya pụọ n’aka Portugal n’afọ 1975, mkpụrụ eziokwu Alaeze ahụ malitekwara ịmị mkpụrụ.
Mmụba na Iwu Ihe Owuwu
Kpọmkwem n’ọnwa ahụ e debanyere aha Ndịàmà n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro n’afọ 1993, e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 100 ndị nkwusa Alaeze. N’otu afọ ahụ, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche si Portugal bịa. Mgbalị ha tinyere iji mụta asụsụ Portuguese Creole mere ka ndị bi n’ógbè ahụ hụ ha n’anya. Ịchọta ala ebe a ga-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ghọrọ ihe kasị mkpa. Mgbe ọ nụrụ banyere mkpa a, otu nwanna nwanyị aha ya bụ Maria wepụtara ọkara nke ala ebe ọ rụrụ obere ụlọ ya. Ala ahụ buru nnọọ ibu ịba nnukwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Maria amaghị na n’ihi na ya enweghị onye ikwu ka dị ndụ na anya ndị na agba mgbere ala nwere oké ọchịchọ dị n’ala ahụ. Otu ụbọchị, otu onye ọchụ nta ego a ma ama bịara ịgwa Maria okwu.
“Ihe m na-anụ banyere gị adịghị mma!” ka ọ dọrọ ya aka ná ntị. “Anụrụ m na i ji ala gị nye onyinye. Ọ̀ bụ na ị maghị na ị ga-ereta ya ezigbo ego n’ihi na ọ dị n’obodo ukwu a?”
“Ọ bụrụ na m resị gị ala ahụ, ego ole ka ị ga-akwụ m?” ka Maria jụrụ ya. Mgbe nwoke ahụ
na-ekwughị okwu, Maria gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụrụgodị na ị kwụọ m ego nile dị n’ụwa a, ọ gaghị ezu n’ihi na ego apụghị ịzụta ndụ.”“I nweghị ụmụ, ka ì nwere?” ka nwoke ahụ jụrụ.
Iji mechie mkparịta ụka ahụ, Maria sịrị: “Ala ahụ bụ nke Jehova. O nyere m ya ruo ọtụtụ afọ, ugbu a kwa, enyeghachiwo m ya ala ya. Ana m atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi.” Mgbe ahụ ọ jụrụ nwoke ahụ, sị: “I nweghị ndụ ebighị ebi ị ga-enye m, ka ì nwere?” N’ekwughị ihe ọ bụla, nwoke ahụ tụgharịrị ma laa.
Ihe si n’ime ya pụta bụ na a rụrụ ọmarịcha ụlọ elu nwere okpukpu abụọ n’ebe ahụ site n’enyemaka nke ụmụnna ruru eru si Portugal. O nwere ụlọ dị n’okpuru, Ụlọ Nzukọ Alaeze buru ibu, na ebe obibi. O nwekwara ọnụ ụlọ klas maka ụlọ akwụkwọ ndị okenye, ndị ohu na-eje ozi na ndị ọsụ ụzọ. Ọgbakọ abụọ na-amụ ihe n’ime ya ugbu a nke mere ka ọ bụrụ ebe agụmakwụkwọ mara mma maka ezi ofufe n’isi obodo ahụ.
Na Mé-Zochi, e nwere otu ọgbakọ nke nwere ndị nkwusa 60 na-anụ ọkụ n’obi. Ebe ọ bụ na a na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nwa oge, nke dị n’otu ọdọ unere, ọ bịara doo anya na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị mma n’anya dị mkpa. E mere ka ndị ọchịchị ime obodo mara maka ya, ndị ọrụ gọọmenti ihe na-emetụ n’obi nyere anyị otu ala mara mma nke dị n’okporo ámá bụ́ isi n’obodo ahụ. N’ime ọnwa abụọ, a rụrụ otu ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe ahụ site n’enyemaka nke ụmụnna si Portugal, bụ́ ndị ji ụzọ iwu ihe ọsọ ọsọ wuo ya. Ihe ndị bi n’ógbè ahụ hụrụ juru ha anya. O juru otu injinịa bụ́ onye Sweden nke nwetara ọrụ iwu ihe n’obodo ukwu ahụ anya ịhụ ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-arụsi ọrụ ike. “Nke a dị ịtụnanya!” ka o kwuru. “Ndịàmà Jehova, n’ebe a na Mé-Zochi, iji usoro iwu ihe ọsọ ọsọ eme ihe! Ọ bụ otú a ka anyị kwesịrị isi hazie ọrụ anyị.” A raara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ nye na June 12, 1999, ndị bịara nraranye ahụ dị mmadụ 232. Ụlọ nzukọ ahụ ghọrọ ebe na-adọrọkarị mmasị ndị bịara njem nleta n’obodo Mé-Zochi.
Mgbakọ Mere Ihe Akụkọ
Ihe omume nke meere Ndịàmà Jehova ihe akụkọ na São Tomé na Príncipe bụ Mgbakọ
Distrikti “Izi Ihe Chineke” nke were ụbọchị atọ na January 1994—nke mbụ ya n’àgwàetiti ndị a. E mere ya n’ụlọ mgbakọ kasị mma nwere ntụoyi e nwere ná mba ahụ. Ị̀ pụrụ iche banyere ọṅụ nke ndị nkwusa Alaeze 116 nwere mgbe ha hụrụ ìgwè mmadụ dị 405 na nke mbụ ya ka ha na-elere ihe nkiri Bible ma na-anata akwụkwọ ndị e wepụtara ná mgbakọ ahụ? Ọ bụ n’otu ụsọ oké osimiri na-ekpo ọkụ ka a nọ mee mmadụ 20 raara onwe ha nye baptizim.Ihe ọhụrụ dọọrọ uche ọha na eze bụ baajị uwe pụrụ iche nke ndị nile bịara mgbakọ ahụ yi. Ọbịbịa nke ndị ọbịa 25 si Portugal na Angola bịara mere ka o yie mgbakọ mba nile. Ịhụnanya Ndị Kraịst na-ekpo ọkụ tolitere ozugbo, anya mmiri malitekwara ịgba ọtụtụ ndị ná ngwụsị nke nnọkọ ikpeazụ, bụ́ mgbe ha sịrịtara onwe ha laa nke ọma.—Jọn 13:35.
Ndị odeakụkọ si n’Ụlọ Ọrụ Redio Mba ahụ bịara ma gbaa onyeisi oche mgbakọ ahụ ajụjụ ọnụ. Ha gbasakwara akụkụ ụfọdụ nke ọtụtụ n’ime okwu ndị e kwuru na redio. Ọ bụ n’ezie ihe omume mere ihe akụkọ, o nyekwara aka mee ka Ndịàmà a na-ekwesị ntụkwasị obi nọpụworo iche ruo ogologo oge nwekwuo mmetụta nke ịnọ nzukọ Jehova a na-ahụ anya nso.
Ịmị Mkpụrụ Iji Wetara Jehova Otuto
Mgbe ozi Alaeze mịrị mkpụrụ, ọ na-amịpụta àgwà ọma ndị na-ewetara Jehova otuto na nsọpụrụ. (Taịtọs 2:10) Otu nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma nwere mmasị n’ihe ọ na-amụta n’ọmụmụ Bible ọ na-enwe kwa izu. Ma, nna ya machiri ya ịga nzukọ ọgbakọ. Mgbe o ji nkwanye ùgwù kọwaara ya ịdị mkpa nke nzukọ Ndị Kraịst na ọchịchọ ya ịga, nna ya chụpụrụ ya n’ụlọ ya n’egbughị oge. Ọ pụrụ ịbụ na nna ya tụrụ anya ka o mee ka ọtụtụ ndị na-eto eto ndị ọzọ—ịgbakwuru nwoke nke ga-elekọta ya. Mgbe nna ya chọpụtara na ọ na-ebi ndụ kwesịrị nṅomi na nke dị ọcha dị ka Onye Kraịst, a kpaliri ya ịnabataghachi ya ma nye ya ohere ife Jehova.
Ihe atụ ọzọ bụ nke otu onye ndú nke otu òtù egwú. Ụzọ ndụ ya gwụrụ ya ike. Mgbe ọ nọ na-achọ ihe bụ́ nzube nke ndụ, Ndịàmà kpọtụụrụ ya. Mgbe ọ malitere ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume nke Bible, ọ ghọrọ okwu a kpụ n’ọnụ n’obodo ahụ. N’oge na-adịghị anya, ọ hụrụ mkpa nke ịkwụsị mkpakọrịta ọjọọ nile. (1 Ndị Kọrint 15:33) O weziiri nzọụkwụ dị mkpa nke ịbụ onye e mere baptizim ná ngosipụta nke nrara ọ raara onwe ya nye Jehova.
Otu ìgwè nke ndị na-eto malitere ịchọ ezi okpukpe. Ọchịchọ ha na-achọ ezi okpukpe dujere ha n’iso ndị pastọ nke ìgwè ndị okwuchukwu dị iche iche kwurịta okwu, ma ihe si n’ime ya pụta bụ mgbagwoju anya na ndakpọ olileanya. N’ihi nke a, ha ghọrọ ndị agamevu na ndị na-akwa ihe ọ bụla metụtara okpukpe emo.
Otu ụbọchị, otu onye ozi ala ọzọ bụ́ Onyeàmà Jehova na-aga iduzi ọmụmụ Bible ma si n’akụkụ ebe ndị a na-eto eto nọ na-agafe. Ndị òtù a chọrọ ka onye ozi ala ọzọ ahụ zaa ha ajụjụ ụfọdụ, n’ihi ya, ha duuru ya gaa n’azụ ụlọ, bụ́ ebe ha gwara ya ka ọ nọdụ ala n’otu oche dị ala. Ihe sochiri ya bụ ọtụtụ ajụjụ n’isiokwu ndị dị ka mkpụrụ obi, ọkụ ala mmụọ, ndụ n’eluigwe, na ọgwụgwụ ụwa. Onyeàmà ahụ zara ajụjụ nile ha jụrụ site na Bible nke onye ndú nke òtù ahụ nyere ya. Otu awa mgbe nke a gasịrị, onye ndú òtù ahụ nke aha ya bụ Law gwara onye ozi ala ọzọ ahụ, sị: “Mgbe anyị kpọrọ gị ka ị bịa zaa ajụjụ, ebumnobi anyị bụ ịkwa gị emo dị ka anyị meworo ndị si n’okpukpe ndị ọzọ. Anyị chere na ọ dịghị onye pụrụ ịza ajụjụ ndị ahụ. Ma ị zara ha, i jikwa nanị Bible mee ihe! Gwa m, olee otú m pụrụ isi mụtakwuo Bible?” A malitere iduziri Law ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ malitere ịbịa nzukọ. Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ndị òtù ahụ ma kwụsị ụzọ ndụ ime ihe ike ya. N’ime otu afọ, ọ raara onwe ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim. Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka ohu na-eje ozi.
Otu omenala nke gbanyesiworo mkpọrọgwụ ike bụ nwoke na nwanyị ibikọ ọnụ n’alụghị dị na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro. Ọtụtụ 2 Ndị Kọrint 10:4-6; Ndị Hibru 4:12.
ebikọwo ọnụ ruo ọtụtụ afọ, mụtakwa ụmụ. Ọ na-esiri ha ike ịnakwere echiche Chineke banyere okwu ahụ. Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ otú Okwu Chineke si nyere otu onye aka imeri ihe mgbochi a.—Antonio ghọtara na o kwesịrị idebanye alụmdi na nwunye ya n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro, o mekwara atụmatụ ime otú ahụ ma ọ ghọchaa ọka ya, bụ́ oge ọ ga-enwe obere ego iji kpọọ oriri agbamakwụkwọ. Otu abalị kpọmkwem tupu ya agaa ịghọ ọka ahụ, ndị ohi bịara ghọọ ya. O kpebiri ichere ruo oge ọka nke afọ ọzọ, a ghọkwara ya n’ohi ọzọ. Mgbe ọzọ mgbalị ya inweta ego maka agbamakwụkwọ ya kụrụ afọ n’ala, Antonio ghọtara onye na-emegide ya. “Setan agaghị eji m gwurie egwu ọzọ,” ka o kwuru. “N’ime otu ọnwa na ọkara, anyị ga-agba akwụkwọ, ma anyị kpọrọ oriri ma ọ bụ na anyị akpọghị!” N’ihi ya, ha gbara akwụkwọ, n’ụzọ tụkwara ha n’anya, ndị enyi ha wetara ọkụkọ, ọbọgwụ, na otu ewu maka oriri agbamakwụkwọ ahụ. Mgbe ha debasịrị alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ, e mere Antonio na nwunye ya—tinyere ụmụ ha isii—baptizim ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Jehova.
Ileba Anya n’Àgwàetiti Príncipe
Onye nlekọta sekit na ndị ọsụ ụzọ si São Tomé ejewo leta mmadụ 6,000 bi na Príncipe mgbe ụfọdụ n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ndị bi n’àgwàetiti ahụ na-ele ọbịa nke ọma ma chosie ike ịnụ ihe Ndịàmà ahụ nwere ikwu. Mgbe otu nwoke gụsịrị traktị e nyere ya, ọ malitere ịchọ ndị ọsụ ụzọ ahụ n’echi ya ma rịọ ka o nyere ha aka kesakwuo traktị. Ndị ọsụ ụzọ ahụ kọwara na ọ bụ ọrụ dịịrị ha, ma nwoke ahụ siri ọnwụ na ya kwesịrị isoro ha gaa site n’ọnụ ụlọ ruo n’ọnụ ụlọ ka ya wee nwee ike ịkọwara ndị nwe ụlọ ndị ha bụ ma gbaa ha ume ige ha ntị nke ọma. Nwoke ahụ mesịrị laa mgbe ọ jasịrị ndị ọsụ ụzọ ahụ mma n’ihi ọrụ ahụ dị mkpa ha na-arụ.
Na 1998, ndị ọsụ ụzọ abụọ si São Tomé gara Príncipe, n’oge na-adịghịkwa anyị, ha nọ na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi 17. Ọrụ ahụ nọgidere na-amụba, n’ime obere oge kwa, nkezi nke ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ruru mmadụ 16, ihe karịkwara mmadụ 30 na-abịa okwu ihu ọha. A gwara ọchịchị ime obodo banyere mkpa nke inwe ebe nzukọ, n’ụzọ na-enyekwa obi ụtọ, ha nyere ala maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụmụnna ndị sitere na São Tomé wepụtara onwe ha ịrụ otu obere Ụlọ Nzukọ Alaeze nke nwekwara ebe obibi maka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche abụọ.
Obi abụọ adịghị ya na ozi ọma ahụ na-amị ọtụtụ mkpụrụ ma na-amụba n’àgwàetiti ndị a dịpụrụ adịpụ. (Ndị Kọlọsi 1:5, 6) Na January 1990, e nwere ndị nkwusa 46 na São Tomé na Príncipe. N’afọ ije ozi 2002, ha ruru ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị nkwusa Alaeze 388! Ihe karịrị pasent 20 nke ndị nkwusa bụ ndị ozi oge nile, ha na-eduzikwa ọmụmụ Bible ebe obibi 1,400. Na 2001, e nwere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị bịara Ememe Ncheta bụ́ 1,907. Ee, n’àgwàetiti ndị a na-ekpo ọkụ, okwu Jehova anọgidewo jiri ọsọ ọsọ na-aga n’ihu ma bụrụ nke a na-enye otuto.—2 Ndị Tesalonaịka 3:1.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 12]
Mgbasa Ozi Redio A Ma Ama
Otu akwụkwọ e ji kpọrọ oké ihe n’àgwàetiti ndị a bụ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. * N’izu abụọ ọ bụla, Ụlọ Ọrụ Redio Mba ahụ na-eme ihe omume na-ewe minit 15 nke nwere isiokwu ahụ. Lee ihe obi ụtọ ọ bụ ịnụ ka onye mkpọsa ozi na-ajụ, sị, “Ndị na-eto eto, olee otú unu ga-esi mara ma ọ bụ ezi ịhụnanya ka ọ bụ ịhụnanya nzuzu?” ma jirizie ngụpụta nke otu akụkụ nke akwụkwọ ahụ sochie ya! (Lee isi nke 31.) E nwekwara ihe omume yiri nke ahụ nke na-akpọsa akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. *
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 33 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 33 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 9]
Ụlọ Nzukọ Alaeze Mbụ na São Tomé na 1994
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
1. Ụlọ Nzukọ Alaeze e wuru ọsọ osọ na Mé-Zochi
2. E mere mgbakọ distrikti mere ihe akụkọ n’ụlọ mgbakọ a
3. Ndị e mere baptizim obi dị ụtọ ná mgbakọ ahụ
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 8]
Ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.